Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 3/8 p. 18-19
  • Ezi Enyi M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Enyi M
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • “Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Edebesịwo M Okwukwe Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Teta!—1996
g96 3/8 p. 18-19

Ezi Enyi M

Olee ndị bụ ndị enyi gị? Hà bụ nanị ndị gị na ha bụ ọgbọ? Gụọ akụkọ otu onye ntorobịa banyere otu n’ime ndị enyi ya, bụ́ onye ji ihe dị ka iri afọ asaa tọọ ya.

EZINỤLỌ anyị kwagara Aberdeen, Scotland, ihe dị ka afọ itoolu gara aga, mgbe m dị nanị afọ isii. Nke a bụ oge na-atụ ụjọ nye m n’ihi na aghaghị m ịmalite akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ, aghaghịkwa m ime ndị enyi ọhụrụ. Ma ọ dị ihe mere ka ọ dịrị m mfe ikwekọ n’ọnọdụ ọhụrụ m. Otu nwaada metụrụla agadi, onye ndị mụrụ m zuteworo na mbụ, bi na nso nso ụlọ anyị. A kọwaara ya onye m bụ nke ọma, o jukwara m anya ịhụ otú o si bụrụ onye ọ dị mma ịnọ nso. Ọ bụ onye na-eto eto n’uche, ọ na-ejikwa ejiji n’ụzọ magburu onwe ya.

Anyị bibu n’ụlọ a na-akwụ ụgwọ na ya, ya mere anyị kwagara n’ebe obibi nke aka anyị ihe dị ka otu maịlụ site n’ebe obibi Daada Louie. Ana m eji okwu ahụ bụ́ “daada” eme ihe n’ihi nkwanye ùgwù na dị ka okwu ịhụnanya. Obi jọrọ m njọ mgbe anyị na-aghaghị ịkwaga n’ebe ọzọ, n’ihi na mụ na nwanne m nwoke amalitewo ileta ya n’ụzọ chiri anya.

Otú ọ dị, ụlọ akwụkwọ m na-eje dị nnọọ nso n’ụlọ Daada Louie. Ya mere na Friday ọ bụla mgbe a gbasasịrị akwụkwọ na tupu mụ agaa mmụgharị ihe m nke Ite Egwú Mba Scotland n’uhuruchi n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ana m aga na nke Daada maka tii. Nke a ghọrọ ihe m na-eme mgbe nile. Ana m eweta otu n’ime akwụkwọ akụkọ m mgbe m na-abịa, ọ na-agụkwara m ya ka m na-ata achịcha e ji cucumber mee ma na-aṅụ otu iko mmiri ara ehi jụrụ oyi.

Echetara m na ụbọchị Friday nile yiri ihe na-adịghị aga ngwa ngwa ka m ji ịnụ ọkụ n’obi na-echere mgbịrịgba elekere 3:30 nke ehihie, nke bụ ihe mgbaàmà iji mee ngwa ngwa gawa na nke Daada Louie. Ọ bụ n’oge a ka m mụtara na nke mbụ ya otú ndị meworo agadi pụrụ isi bụrụ ndị na-akpali mmasị na ndị ọ dị mma ịnọ nso. N’eziokwu, eleghị m ya anya dị ka onye kara nká. N’obi m, ọ bụ nnọọ onye na-eto eto. Ọ pụrụ ịkwọ ụgbọ ala, ọ nọgidekwara na-enwe ebe obibi na otu ubi okooko osisi na-esi ísì ọma—gịnị ọzọ ka nwatakịrị chọrọ?

Afọ atọ gabigara, anọkwa m n’afọ ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. Ọ bụ n’oge a ka Daada Louie kpebiri na ubi okooko osisi ya hitụrụ nne nye ya ilekọta nakwa na ụlọ obibi nwere nanị ọnụ ụlọ ole na ole bụ nhọrọ kwesịrị ekwesị karị. N’oge ahụ apụghị m ịghọta ihe ịka nká pụtara. Iwe were m na ụlọ obibi ya dị n’akụkụ dị iche nke obodo. Ụbọchị Friday adịghịzi adọrọ adọrọ nye m dị ka ha na-eme na mbụ.

Na 1990 ọpụpụ m ịga ụlọ akwụkwọ sekọndrị ruru. Gịnị ka m ga-eme n’ụlọ akwụkwọ dị otú ahụ buru ibu? Olee otú m ga-esi anagide? M ga-aga ụlọ akwụkwọ dị iche na nke ndị enyi m, ebe ọ bụ na ezinụlọ anyị bi n’ógbè dị iche. Ọzọkwa Daada Louie nọ n’ebe ahụ n’ihi na ebe obibi ọ kwagaworo na ya bụ kpọmkwem ụlọ nke na-eso ụlọ akwụkwọ sekọndrị m! Ajụrụ m ya ma m pụrụ ịbịa n’ebe obibi ya n’oge nri ehihie ịta achịcha m. Otú a, e guzobere ihe omume ọzọ a na-emechi anya nke dị oké ọnụ ahịa.

Echere m na ọ bụ n’oge a ka mmekọrịta anyị gbanwere site ná mmekọrịta nwata na onye toruworo ogo mmadụ gaa n’ịnụ ụtọ nke mkpakọrịta nke otu onye na ibe ya. Nke a pụtara ìhè n’ọtụtụ ụzọ, ma otu ụzọ kpọmkwem bụ mgbe anyị malitere ịgụkọ akwụkwọ ndị mara mma ọnụ—Jane Eyre, Villette, Pride and Prejudice, na Women in White—kama ịgụ akwụkwọ akụkọ m. Ihe na-amasị m abụghịzi ihe ụmụaka.

Daada Louie kụziiri m na ịhụnanya maka ndị mmadụ bụ nkà. E wezụga Daada Louie, ikekwe agaraghị m aghọta nke ahụ ruo mgbe m meworo nnọọ agadi. Ọ kụziiri m ịṅa ntị, ma ọtụtụ ndị n’ụwa nke a jibiga ọrụ n’aka ókè amụtabeghị nke ahụ ma ọlị, ma hà bụ ndị agadi ma ọ bụ ndị na-eto eto. Ka m na-atụgharị onwe m n’elu oche kushọn ogologo ya, ọ na-akọrọ m akụkọ ndụ ya na ahụmahụ ndị o nweworo. Ihe ọmụma na-enweghị atụ nke nwaada a nwere na-eme ka m jupụta ná mmetụta nke ịhụnanya.

Daada Louie chụrụ ọtụtụ ihe n’àjà—alụmdi na nwunye, ụmụ, ọrụ—ilekọta ndị mụrụ ya na nwanne nne ya nwanyị n’ajọ ọrịa dị iche iche. Nke a nyeere nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ aka ịnọgide n’ozi oge nile.

N’afọ abụọ gara aga, Daada Louie anọwo na-arịa ọrịa, apụkwara m ịhụ nkụda mmụọ, ihe isi ike, na ihe mgbu nke ịka nká na-eweta. N’oge na-adịbeghị anya, mgbe ọ dị 84 afọ, ọ kwụsịrị ịkwọ ụgbọ ala, nke a enyewokwa ya nsogbu nke ukwuu. Ndụ ịrụ ọrụ amarawo ya ahụ, ugbu a kwa ịbụ onye nọ n’ụlọ n’adịghị agagharị agagharị bụ ihe na-akụda mmụọ nke ukwuu. Ọ dịwo ya mkpa ịlụso mmetụta nke na ya na-enye ndị mmadụ nsogbu ọgụ. N’agbanyeghị ugboro ole anyị gwara ya na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na anyị ga-emere ya ihe ọ bụla, ọ na-anọgide na-enwe mmetụta nke ikpe ọmụma.

Ihe kasị njọ ugbu a bụ na ọ na-esiri ya ike ịsa ahụ na iyiri ákwà n’onwe ya. Ọ bụ ezie na o meworo ndị ọzọ nke a, ọ bụ ọnwụnwa ugbu a ịchọta onwe ya n’ọnọdụ nke ịchọ enyemaka dị otú ahụ. Nke a na-akụziri m na ọbụna mgbe ndị mmadụ na-apụghị imere onwe ha ihe nile, ha ka kwesịkwara nkwanye ùgwù anyị.

Otú ọ dị, karịsịa ihe nile, ahụmahụ nke a enyeworo m aka ịghọta ihe ọ dị ka ya ịka nká. Ihe ọ bụla nke Daada Louie na-apụkwaghị ime na-eme ka m bee ákwá. Karịsịa, mgbe m hụrụ ka o nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ nwee oké ihe mgbu, ọ na-agụ m ibe ákwá. Ihe na-ewute m karịsịa bụ na nwata ọzọ dị nta karịa m apụghị ịnụ ụtọ na ịghọta amamihe ya nile.

Mgbe ụfọdụ ana m eche ma m̀ na-emekwara ya ihe ruo otú m kwesịrị. Ọ̀ na-enwe mmasị ma na-ahụ m n’anya dị ka m hụrụ ya? Ma mgbe m gara maka nri ehihie ma makụọ ya, obi abụọ nile na-apụ.

Ana m ewere ya dị ka ihe ùgwù inwe enyi dị otú ahụ. Ọ kụziworo m ọtụtụ àgwà ọma—karịsịa, ọ kụziworo m ịhụnanya. Agaghị m eji otu narị ndị enyi bụ ndị ọgbọ m gbanwere ọbụbụenyi ya. Ọ bụ ezie na m ga-agụsị akwụkwọ n’oge na-adịghị anya, gharakwa ịdị na-aga maka nri ehihie n’ebe obibi ya ọzọ, agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya ma ọlị, ileta ya, na inyere ezi enyi m aka. Ọ kụziworo m na ndụ pụrụ ịbụ ihe obi ụtọ ma na-enye afọ ojuju ma ọ bụrụ na ị na-eche echiche banyere ndị ọzọ tupu onwe gị.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Foto dị na peeji nke 18]

Mụ na Daada Louie

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya