Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 3/8 p. 16-17
  • Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịkwado Amamikpe Ọnwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịkwado Amamikpe Ọnwụ?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inye Ndị Ọchịchị Bụ Mmadụ “Mma Agha”
  • E Jiri “Mma Agha” ahụ Mee Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
  • Nnọpụ Iche Ndị Kraịst
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ọrụ Dịịrị Ndị Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • N’ime Ụwa Ma Ghara Isite na Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Teta!—1996
g96 3/8 p. 16-17

Echiche nke Bible

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịkwado Amamikpe Ọnwụ?

“ỌDỊ njọ n’ụzọ omume na ụkpụrụ omume ọma.” “Ọ dị mma, ziekwa ezi.” Echiche ndị a na-emegiderịta onwe ha sitere n’aka ndị ndú okpukpe abụọ, ndị bụcha ndị Kraịst n’aha. Ha na-arụrịta ụka banyere otu n’ime isiokwu ndị dị oké mkpa taa—amamikpe ogbugbu. Isiokwu akwụkwọ akụkọ nke na-ehota ha sịrị: “Mgbe ndị ndú okpukpe na-arụrịta ụka banyere amamikpe ọnwụ, akụkụ nke ọ bụla na-ehota akụkụ Bible iji kwadoo nguzo ha.”

Ụfọdụ na-arụ ụka na amamikpe ogbugbu na-echebe ndị aka ha dị ọcha, na-akwalite ikpe ziri ezi, na-egbochikwa mpụ ndị dị oké njọ. Ndị ọzọ na-esi ọnwụ na ọ bụ omume rụrụ arụ—ụzọ nke iji ime ihe ike ka ukwuu chịkwaa ime ihe ike, nke na-erughịkwa eru n’ibu ọrụ dị elu nke ịgbanwe ndị omempụ, na-enyere ha aka ịghọ ndị òtù ọha mmadụ bara uru.

N’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na United States, arụmụka nke a siri ike karịsịa, ndị ndú okpukpe alabekwaghị azụ n’itinye ọnụ na ya. Otú ọ dị, ị pụrụ ịjụ sị, ‘Ọ̀ dị ihe Bible nwere ikwu n’okwu amamikpe ogbugbu?’ N’ezie, o nwere.

Inye Ndị Ọchịchị Bụ Mmadụ “Mma Agha”

N’oge na-adịghị anya mgbe Iju Mmiri nke ụbọchị Noa gasịrị, Jehova Chineke mesiri ike ịdị oké ọnụ ahịa nke ndụ mmadụ wee kwuo, sị: “Onye na-awụsị ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-awụsị ọbara ya.” (Jenesis 9:6) N’eziokwu, nke a abụghị ihe mgbakwasị ụkwụ a na-akparaghị ókè maka ịbọ ọ́bọ̀. Kama nke ahụ, ọ pụtara na e nyere ndị ọchịchị mmadụ e guzobere eguzobe ohere site na mgbe ahụ gaa n’ihu igbu ndị gburu ndị ọzọ.

N’Israel oge ochie Iwu Chineke nyefere site n’aka Mosis kwupụtara amamikpe ọnwụ maka mmejọ ụfọdụ ndị dị oké njọ. (Levitikọs 18:29) Otú ọ dị, Iwu ahụ mekwara ndokwa maka ikpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu, akaebe nke onye ji anya ya hụ ihe merenụ, na mmachibido iwu megide arụrụala. (Levitikọs 19:15; Deuterọnọmi 16:18-20; 19:15) Ndị ikpe ahụ kwesịrị ịbụ ndị ikom na-asọpụrụ Chineke, ha bụkwa ndị ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke n’onwe ya! (Deuterọnọmi 1:16, 17; 2 Ihe Emere 19:6-10) Otú a e nwere nchebe megide amamikpe ọnwụ n’ụzọ na-ezighị ezi.

Taa ọ dịghị ọchịchị nọ n’ụwa a nke na-anọchite anya ikpe Chineke n’ezie dị ka Israel oge ochie mere. Ma ndị ọchịchị na-eme ihe n’ọtụtụ ụzọ dị ka ‘ndị ozi’ Chineke, ma ọ bụ ndị ọrụ, n’ihi na ha na-echekwa ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị n’usoro na nkwụsi ike, na-ejekwara ọha na eze ozi ndị dị mkpa. Pọl onyeozi chetaara ndị Kraịst ka ha na-erubere ndị a ‘na-achị isi’ isi ma mgbe ahụ gbakwụnye: “Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu; n’ihi na ọ bụghị n’efu ka ọ [ndị ọchịchị] na-ebu mma agha: n’ihi na ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye ọ́bọ̀ iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe.”—Ndị Rom 13:1-4.

“Mma agha” Pọl kpọtụrụ aha na-anọchi anya ikike ndị ọchịchị nwere inye ndị omempụ ahụhụ—ọbụna site n’ọnwụ. Ndị Kraịst na-akwanyere ikike ahụ ùgwù, ma hà kwesịrị ịchọ itinye ọnụ n’otú e si jiri ikike ahụ mee ihe?

E Jiri “Mma Agha” ahụ Mee Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi

Ọchịchị ụmụ mmadụ ejiwo nnọọ “mma agha” ahụ mee ihe maka ikpe ziri ezi ọtụtụ mgbe. Ma a ghaghịkwa ikweta na ha abụwo ndị ikpe mara n’ihi iji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Eklisiastis 8:9) Ikpe mara ndị ọchịchị Rom oge ochie maka iji “mma agha” ime ihe e kpere n’ikpe megide ndị ohu Chineke aka ha dị ọcha. Jọn Onye Na-eme Baptism, Jemes, na ọbụna Jisọs Kraịst so ná ndị o gburu.—Matiu 14:8-11; Mak 15:15; Ọrụ 12:1, 2.

N’oge a ihe yiri nke ahụ emewo. E gbuwo ndị ohu Jehova aka ha dị ọcha n’ala dị iche iche—site n’iji égbè gbagbuo ha, site ná mgbupụ isi, site ná nkwụgbu, site n’ụlọ ebe a na-eji gas egbu mmadụ—ha nile ka ndị ọchịchị na-anwa ịkwatu Iso Ụzọ Kraịst mere “n’ụzọ iwu kwadoro.” Ọchịchị nile na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke. Lee aha ikpe ọmụma ọbara dị egwu ha bu!—Mkpughe 6:9, 10.

Ezi ndị Kraịst na-akụja n’echiche nke iburu ikpe ọmụma ọbara n’ihu Jehova Chineke. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ha na-akwanyere ikike ndị ọchịchị nwere iji “mma agha” eme ihe ùgwù, ha maara nke ọma otú e siworo jiri ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. O jewo ozi dị ka ngwá ọrụ maka mkpagbu, e jiwokwa ya mee ihe mgbe ụfọdụ n’aka ike n’ịkpọasị agbụrụ megide ndị ụfọdụ, na ime ebere na-ekwesịghị ekwesị n’ebe ndị ọzọ nọ.a Ya mere olee otú ndị Kraịst si emeghachi omume n’okwu banyere amamikpe ogbugbu? Hà na-etinye ọnụ na ya ma na-arụgide ka e mee mgbanwe?

Nnọpụ Iche Ndị Kraịst

N’adịghị ka ndị ndú okpukpe ahụ a kpọtụrụ uche ná mmalite, ezi ndị Kraịst na-agbalị iburu otu ụkpụrụ dị mkpa n’uche: Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ‘ịbụ akụkụ nke ụwa.’—Jọn 15:19; 17:16, NW.

Onye Kraịst ọ̀ pụrụ irube isi n’iwu ahụ ma ka na-eso n’arụmụka amamikpe ọnwụ? Ọ dịghị ma ọlị. E kwuwerị, nke ahụ bụ okwu ọha na eze na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Na United States, ndị na-azọ ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ejikarị nguzo ha n’okwu amamikpe ọnwụ—ma hà kwadoro ya ma ọ bụ na ha akwadoghị ya—eme ihe dị ka ihe ndabere siri ike n’ụkpụrụ achụmnta nkwado ha. Ha na-arụ ụka n’isiokwu ahụ n’ụzọ siri ike ma na-eji ịdị ike n’ụzọ mmetụta uche nke isiokwu a na-akpalitekarị eme ihe dị ka ngwá ọrụ iji dọrọ ndị na-atụ votu bịa n’òtù ha.

Ma eleghị anya, ajụjụ onye Kraịst ga-eche echiche n’elu ya bụ: Jisọs ọ̀ gaara etinye ọnụ n’esemokwu n’ihe banyere otú ndị ọchịchị ụwa a si eji “mma agha” eme ihe? Cheta, mgbe ndị obodo ya nwara ime ka o tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Jisọs “wezụgara Onwe ya ọzọ n’ugwu nanị Ya onwe ya.” (Jọn 6:15) Mgbe ahụ, o yikarịrị nnọọ ka ọ gaara ahapụ okwu a ebe Chineke tinyere ya—n’aka ndị ọchịchị.

N’otu aka ahụ taa, a ga-atụ anya ka ndị Kraịst lezie anya ịghara itinye ọnụ n’arụmụka n’isiokwu a. Ha ga-aghọta ikike ndị ọchịchị nwere ime ihe masịrị ha. Ma dị ka ndị ozi ndị Kraịst ndị na-abụghị akụkụ nke ụwa, ha agaghị ekwupụta nkwado maka amamikpe ọnwụ n’ezoghị ọnụ ma ọ bụ na-akwalite nkachapụ ya.

Kama, ha na-eburu okwu ndị dị n’Eklisiastis 8:4 n’uche: “Okwu eze nwere ike; ònye ga-asịkwa ya, Gịnị ka ị na-eme?” Ee, e nyewo ‘ndị eze,’ ma ọ bụ ndị ọchịchị, ụwa a ikike imezu uche ha. Ọ dịghị onye Kraịst nwere ikike ịbara ha mba. Ma Jehova pụrụ. Ọ ga-emekwa ya. Bible na-enye anyị ohere ilepụ anya n’ihu maka ụbọchị mgbe Chineke ga-eweta ikpe ikpeazụ maka mpụ ọ bụla na iji “mma agha” eme ihe n’ụzọ ọ bụla na-ezighị ezi n’ụwa ochie nke a.—Jeremaịa 25:31-33; Mkpughe 19:11-21.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka ihe atụ, a katọwo usoro mkpọrọ United States maka igbu ihe na-erughị pasent 2 nke ndị omempụ ya a mara ikpe ọnwụ kwa afọ. Ndị ka ọtụtụ n’ime ha na-anwụ site n’ihe ndị na-emere onwe ha karịa site n’ogbugbu. E nwewokwa ebubo dị iche iche nke ịkpọasị agbụrụ—dị ka ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na o yikarịrị ka a ga-ama onye gburu mmadụ ikpe ọnwụ ma ọ bụrụ na onye e gburu bụ onye ọcha karịa mgbe onye e gburu bụ onye isi ojii.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]

The Bettmann Archive

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya