Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/15 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịkwado Amamikpe Ọnwụ?
    Teta!—1996
  • Ọrụ Dịịrị Ndị Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Inyeghachi Siza Ihe nke Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/15 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Bible na-egosi banyere amamikpe ogbugbu, amamikpe ọnwụ, maka ndị na-eme mpụ?

N’ụzọ kwere nghọta, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inwe echiche nke onwe anyị banyere nke a, dabere n’ahụmahụ ma ọ bụ ọnọdụ anyị ná ndụ. Ma, dị ka Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị ịgbalị ikwekọ n’echiche Chineke banyere amamikpe ogbugbu, ka anyị na-anọgide na-anọpụ iche n’ihe metụtara nguzo ndọrọ ndọrọ ọchichị nke ọtụtụ na-ewere n’okwu a.

N’ikwu ya hoo haa, n’Okwu ya e dere ede, Chineke egosighị na amamikpe ogbugbu dị njọ.

Ná mmalite akụkọ ihe mere eme mmadụ, Jehova kọwara echiche ya n’okwu a, dị ka anyị na-agụ na Jenesis isi nke 9. Nke a metụtara Noa na ezinụlọ ya, ndị ghọrọ nne na nna ochie nke ezinụlọ mmadụ dum. Mgbe ha pụtasịrị n’ụgbọ ahụ, Chineke kwuru na ha pụrụ iri ụmụ anụmanụ—ya bụ, a pụrụ igbu ụmụ anụmanụ, wụsịa ọbara ha, ma rie ha. Mgbe ahụ, na Jenesis 9:5, 6, Chineke kwuru, sị: “N’ezie ọbara unu, bụ́ nke dịịrị ndụ unu, ka M ga-ajụtakwa; n’aka anụ nile ọ bụla dị ndụ ka M ga-ajụta ya: ọ bụkwa n’aka mmadụ, n’aka nwanne mmadụ ọ bụla, ka M ga-ajụta ndụ mmadụ. Onye na-awụsị ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-awụsị ọbara ya: n’ihi na ọ bụ n’onyinyo Chineke ka O mere mmadụ.” Ya mere Jehova nyere ikike amamikpe ogbugbu n’ihe banyere ndị ogbu mmadụ.

Ọ bụ ezie na Chineke mesoro ụmụ Israel ihe dị ka ndị ya, a na-eji ọnwụ enye ntaramahụhụ maka mmehie dị iche iche ndị ọzọ dị oké njọ megide iwu Chineke. N’Ọnụ Ọgụgụ 15:30, anyị na-agụ okwu a dịịrị onye ọ bụla, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-ewere aka mpako mee ihe, ma ọ bụ onye a mụrụ n’ala ma ọ bụ ọbịa, Jehova ka onye ahụ na-ekwulu; a ga-ebipụkwa mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.”

Ma gịnị banyere mgbe e guzobesịrị ọgbakọ ndị Kraịst? Anyị maara na Jehova nyere ọchịchị mmadụ ikike ịdị, ọ kpọkwara ha ndị ọchịchị ka elu. N’eziokwu, mgbe o nyesịrị ndị Kraịst ndụmọdụ irubere ikike ọchịchị ndị dị otú ahụ isi, Bible na-asị na ha na-arụ ọrụ dị ka “onye na-ejere Chineke ozi n’ebe ị nọ iwetara gị ezi ihe. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu; n’ihi na ọ bụghị n’efu ka ọ na-ebu agha: n’ihi na ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye ọ́bọ̀ iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe.”—Ndị Rom 13:1-4.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na e nyere ọchịchị ikike ọbụna iwepụ ndụ nke ndị mere ajọ mpụ? Site n’okwu ndị dị na 1 Pita 4:15, anyị aghaghị ikwubi, ee. N’ebe ahụ onyeozi ahụ gbara ụmụnna ya ume, sị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu ghara ịhụ ahụhụ dị ka ogbu mmadụ, ma ọ bụ onye ohi, ma ọ bụ onye na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ dị ka onye na-ele ihe na-abụghị nke aka ya anya.” Ị̀ rịbara ama, “ka onye ọ bụla n’etiti unu ghara ịhụ ahụhụ dị ka ogbu mmadụ”? Pita atụghị aro na ọchịchị enweghị ikike ime ka ogbu mmadụ taa ahụhụ maka mpụ ya. N’ụzọ megidere nke ahụ, o gosiri na ogbu mmadụ pụrụ n’ụzọ ziri ezi ịnata ntaramahụhụ kwesịrị ya. Nke ahụ ọ̀ ga-agụnye ntaramahụhụ site n’ọnwụ?

Ọ pụrụ. Nke a doro anya site n’okwu Pọl dị n’Ọrụ isi nke 25. Ndị Juu ebowo Pọl ebubo ịda Iwu ha. N’izigara onye ọchịchị Rom onye mkpọrọ ya, bụ́ Pọl, onye ọchịagha ahụ kọrọ dị ka e kwuru n’Ọrụ 23:29, sị: “Onye m hụrụ na a na-ebo ya ebubo banyere ajụjụ dị iche iche nke iwu ha, ma o nweghị ihe e boro ya kwesịrị ọnwụ ma ọ bụ agbụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe afọ abụọ gasịrị, Pọl chọtara onwe ya n’ihu Gọvanọ Festọs. Anyị na-agụ n’Ọrụ 25:8, sị: “Pọl na-agọpụkwa onwe ya, sị, Emehieghị m ma ọlị megide iwu ndị Juu, ma ọ bụ imegide ụlọ ukwu Chineke, ma ọ bụ imegide Siza.” Ma ugbu a lekwasị anya n’okwu ya banyere ntaramahụhụ, ọbụna amamikpe ogbugbu. Anyị na-agụ n’Ọrụ 25:10, 11, sị:

“Pọl sịrị, Ana m eguzo n’ihu ocheikpe nke Siza, ebe a ghaghị ikpe m: emegideghị m ndị Juu ajọ omume ọ bụla, dị ka gị onwe gị mazukwara nke ọma. Ya mere ọ bụrụ na emee m ajọ omume, ọ bụrụkwa na emewo m ihe kwesịrị ọnwụ, arịọghị m ịgbanarị ọnwụ: ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe bụ eziokwu n’ebubo ndị ikom ndị a na-ebo m, ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ iwere m nye ha n’amara. Ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị pụrụ iche.

Pọl, n’iguzo n’ihu ike ọchịchị e guzobere eguzobe, kwetara na Siza nwere ikike inye ndị mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ, ọbụna igbu ha. O nweghị ihe ọ bụla megide ntaramahụhụ n’ọnọdụ ya ma ọ bụrụ na ikpe mara ya. Ọzọkwa, o kwughị na Siza pụrụ inye nanị ndị ogbu mmadụ amamikpe ogbugbu.

A ghaghị ikweta na usoro ikpe Rom ezughị okè; usoro ụlọikpe ndị mmadụ taa ezughịkwa. Ụfọdụ ndị aka ha dị ọcha laa azụ n’oge ahụ na taa abụwo ndị a mara ikpe ma nye ntaramahụhụ. Ọbụna Paịlet kwuru banyere Jisọs, sị: “Ahụghị m ihe kwesịrị ịnwụ ọnwụ n’ahụ Ya: ya mere m ga-adọ Ya aka ná ntị, wee hapụ Ya.” Ee, ọ bụ ezie na ikike ọchịchị kwetara na ọ dịghị ihe Jisọs mere, e gburu nwoke a na-enweghị ihe o mere.—Luk 23:22-25.

Ikpe na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ akwalighị Pọl ma ọ bụ Pita ịrụ ụka na amamikpe ogbugbu n’ụzọ bụ isi rụrụ arụ. Kama nke ahụ, echiche Chineke n’okwu ahụ bụ na ruo ogologo oge ndị ọchịchị ka elu nke Siza na-adị, ha ‘na-ebu mma agha iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe.’ Nke ahụ na-agụnye iji mma agha ahụ na-eme ihe n’echiche nke iji amamikpe ogbugbu eme ihe. Ma mgbe a bịara n’isiokwu na-akpata esemokwu nke ma ọchịchị ọ bụla nke ụwa a ò kwesịrị iji ikike ya mee ihe n’igbu ndị ogbu mmadụ, ezi ndị Kraịst na-anọgide n’iji nlezianya nọpụ iche. N’adịghị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm, ha adịghị eso ná nrụrịta ụka ọ bụla n’isiokwu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya