Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/1 p. 18-22
  • Ọrụ Dịịrị Ndị Na-achị Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Dịịrị Ndị Na-achị Isi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ndị Kraịst Adịghị ‘Edo Onwe Ha Megide Ịchịisi’
  • Irube Isi n’Iwu
  • Ihe Egwu
  • “Ọ Bụ Onye Na-ejere Chineke Ozi”
  • Mkpa nke Inwe Okwukwe
  • Mgbe Ndị Ọchịchị Na-achọghị Inye Aka
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịbụisi Ònye Ka I Kwesịrị Ịnakwere?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/1 p. 18-22

Ọrụ Dịịrị Ndị Na-achị Isi

“Ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi n’ebe ị no iwetara gị ezi ihe. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu.”—NDỊ ROM 13:4.

1, 2. Olee ụzọ ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm siworo tinye aka n’ihe omume ndị e ji achọ mgbanwe ọchịchị?

AFỌ abụọ gara aga otu nzukọ ndị bishọp mere na London kpaliri odide nke otu akụkọ bụ isi nke na-egosi mkpasu iwe n’akwụkwọ akụkọ New York Post. Nzukọ ahụ bụ Lambeth Conference, nke ihe karịrị 500 ndị bishọp nke òtù Anglican bịara. Ihe wetara mkpasu iwe ahụ bụ nkwado nke otu atụmatụ nzukọ ahụ mere, bụ́ nke gosiri nkwado nye mmadụ “ndị, mgbe ha gbalịsịworo isi ụzọ nile ọzọ mee ihe, họọrọ ụzọ nke iji ngwá agha mee ihe dị ka nanị ụzọ ha pụrụ isi nweta ikpe ziri ezi.”

2 Akwụkwọ akụkọ Post ahụ kwuru na nke a, dị ka ihe ọ pụtara si dị, bụ ịkwado iyi ọha egwu. Otú ọ dị, ihe ndị bishọp ahụ mere bụ nanị ịgbaso omume ọha na eze nke na-abawanye ụba ugbu a. Àgwà ha adịghị iche na nke onye ụkọchukwu Katọlik ahụ nọ na Ghana onye kwadoro ibu agha nzuzo dị ka ụzọ kasị dịrị ngwa, a kasị jiri n’aka, nke kasịkwa bụrụ ihe na-adịghị ize ndụ, a ga-esi tọhapụ Africa site n’agbụ; ma ọ bụ onye Africa ahụ bụ bishọp okpukpe Methodist, onye ṅụrụ iyi iburu “agha nke ntọhapụ ahụ ruo n’ọgwụgwụ ya dị ilu”; ma ọ bụ nke ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ndị soroworo ndị na-enupụrụ ọchịchị isi buo agha megide ọchịchị ndị e guzobere eguzobe n’Esia na South America.

Ezi Ndị Kraịst Adịghị ‘Edo Onwe Ha Megide Ịchịisi’

3, 4. (a) Ụkpụrụ dịgasị anaa ka ndị ahụ a na-akpọ ndị Kraịst, bụ́ ndị na-akwalite ihe omume e ji achọ mgbanwe ọchịchị, na-emebi? (b) Gịnị ka otu onye chọpụtara banyere Ndịàmà Jehova?

3 N’ime narị afọ mbụ, Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Onye ọ bụla a na-akpọ onye Kraịst, bụ́ onye na-akwalite ọchịchọ mgbanwe ọchịchị bụ nnọọ akụkụ nke ụwa. Ọ bụghị onye na-eso ụzọ Jisọs; ọ dịghịkwa ‘edo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.’ (Ndị Rom 13:1) Ọ ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na ọ gbasoo ịdọ aka ná ntị nke Pọl onyeozi nke bụ na “onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere: ma ndị na-eguzogide ga-anata ikpe nye onwe ha.”—Ndị Rom 13:2.

4 N’ụzọ na-eyighị nke ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm, Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka ọ bụla n’iji ngwá agha eme ihe ike. Otu nwoke bi na Europe chọpụtara nke a. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ ihe okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụpụtaworo, araara m onwe nye ịkwatu usoro ọha mmadụ nke dị adị. Esonyeere m otu òtù ndị na-eyi ọha egwu, natakwa ọzụzụ n’iji ụdị ngwá agha nile eme ihe; ekeere m òkè n’iji égbè ezu ohi ọtụtụ mgbe. Ndụ m nọ n’ihe ize ndụ mgbe nile. Mgbe oge na-agabiga, ọ pụtara ìhè na agha ahụ anyi na-ebu bụ nke anyi na-agaghị enwe mmeri na ya. Aghọrọ m onye nwere nkụda aka, onye enweghị olileanya ọ bụla ná ndụ rikpuru kpam kpam. Mgbe ahụ, otu nwanyi Onyeàmà kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyi. Ọ gwara m banyere Alaeze Chineke. N’ịnọgide na-ekwu na nke a bụ igbu oge m, atụrụ m aro ka nwunye m gee ya nti. O gere ya nti, ha malitekwara ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ikpeazụ, ekweere m isonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Ọ dịghị okwu zuru ezu iji kọwaa ụdị mmetụta nnwere onwe m nwere n’ịghọta ike ahụ nke na-akpali ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’ime ihe ọjọọ. Nkwa Alaeze ahụ dị ebube enyewo m olileanya na-akwado akwado nakwa nzube ná ndụ.”

5. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi n’ụzọ dị n’udo, ọ̀ bụkwa ruo òle mgbe ka ọ ga-adịgide otú ahụ?

5 Ndị Kraịst bụ ndị nnọchianya ma ọ bụ ndị ozi nke Chineke na nke Kraịst. (Aịsaịa 61:1, 2; 2 Ndị Kọrint 5:20; Ndị Efesọs 6:19, 20) N’ihi nke ahụ, ha na-anọgide ná nnọpụiche ha ná mburita agha nile nke ụwa nke a. Ọ bụ ezie na usoro ọchịchị ụfọdụ pụrụ iyi ka hà na-enwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ akụ na ụba karịa ndị ọzọ, ụfọdụ na-enyekwa ndị mmadụ nnwere onwe dị ukwuu karịa ndị ọzọ, ndị Kraịst adịghị akwalite ma ọ bụ na-edo otu n’ọkwa dị elu karịa ibe ya. Ha maara na usoro nile adịghị nke zuru okè. Ọ bụ ‘ndokwa Chineke mere’ ka usoro ndị a nọgide na-adị ruo mgbe Alaeze ahụ ga-eweghara ọkwa. (Daniel 2:44) Ya mere, ndị Kraịst na-anọgide jiri udo na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi mgbe ha nọ na-akwa-lite ọdịmma ebighị ebi nke ndị ọzọ site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ.—Matiu 24:14; 1 Pita 3:11, 12.

Irube Isi n’Iwu

6. N’ihi gịnị ka ọtụtụ iwu ụmụ mmadụ mere ji dị mma, ọ bụ, ezie na “ụwa nile na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ”?

6 Gọọmenti mba dị iche iche na-esetịpụ usoro iwu dị iche iche, ihe ka ọtụtụ n’ime iwu ndị a dịkwa mma. Nke a ò kwesịrị ịbụrụ anyị ihe ijuanya, n’iburu n’uche eziokwu ahụ nke bụ na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ”? (1 Jọn 5:19) Ee e. Jehova nyere nna anyị mbụ, bụ́ Adam, akọ na uche, echiche nke a mmadụ bu pụta ụwa nke ezi ihe na ihe ọjọọ bụkwa nke a na-egosipụta n’ọtụtụ ụzọ n’iwu ụmụ mmadụ dị iche iche. (Ndị Rom 2:13-16) Hammurabi, bụ́ onye na-enye iwu na Babilọn oge ochie, dere okwu mmeghe dị n’akwụkwọ iwu ya n’ụzọ dị otú a: “N’oge ahụ [ha] họpụtara m ịkwalite ọdịmma nke ndị mmadụ, mụ, bụ́ Hammurabi, ọkpara eze ahụ ji okpukpe kpọrọ ihe, nke na-atụ egwu chi, ịhụ na ikpe ziri ezi dịrị n’ala ahụ, ibibi ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị ajọ mmadụ, ka ndị siri ike ghara imegbu ndị na-esighị ike.”

7. Ọ bụrụ na mmadụ emebie iwu, ònye ruru eru inye ya ahụhụ, ọ̀ bukwa n’ihi gịnị?

7 Ihe ka ọtụtụ na gọọmenti dị iche iche ga-ekwu na nzube iwu ha nile yiri nke ahụ: ịkwalite ọdịmma nke ụmụ amaala ha na inwe usoro dị mma n’etiti ọha mmadụ. N’ihi ya, ha na-enye ahụhụ maka ihe omume ndị megidere ọha mmadụ, dị ka igbu ọchụ na izu ohi, na-edebekwa iwu nduzi, ndị dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ụgbọ ala ga na-agba na iwu ndị metụtara ndọba ụgbọ ala. Onye ọ bụla nke leziri anya mebie iwu ha na-eguzogide ndị na-achị isi, ha “ga-anata ikpe nye onwe ha.” Ikpe site n’aka onye? Ọ bụghị iwu na ọ bụ site n’aka Chineke. Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ikpe pụrụ izo aka n’okwu ikpe nke metụtara ụmụ mmadụ kama ịbụ ikpe nke Jehova. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 6:7.) Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee ihe n’ụzọ megidere iwu, ndị na-achị isi nwere ikike inye ya ahụhụ.

8. Olee ụzọ ọgbakọ ga-esi emeghachi omume ma ọ bụrụ na otu onye nọ n’ime ya emee mpụ dị oké njọ?

8 Ndịàmà Jehova bụ ndị nwere aha ọma maka ịbụ ndị na-adịghị eguzogide ịchịisi ụmụ mmadụ. Ọ bụrụ na otu onye n’ime ọgbakọ emebie iwu, ọgbakọ ahụ agaghị enyere ya aka izere inweta ntaramahụhụ dị ka iwu si dị. Ọ bụrụ na mmadụ ezuo ohi, gbuo mmadụ, dee okwu ụgha megide onye ọzọ, ghọọ aghụghọ n’ihe banyere ụtụ isi, dịnaa mmadụ n’ike, gwuo wayo, jiri ọgwụ ọjọọ mee ihe, ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ na-emegide ịchịisi nke iwu kwadoro, ọ ga-anata ahụhụ siri ike site n’ọgbakọ—o kwesịghịkwa iche na ọ bụ mkpagbu ka a na-akpagbu ya mgbe ndị ọchịchị nkịtị nyere ya ahụhụ.—1 Ndị Kọrint 5:12, 13; 1 Pita 2:13-17, 20.

Ihe Egwu

9. N’òle ebe ka ndị Kraịst na-echigharikwuru n’ụzọ ziri ezi ma ọ bụrụ na ndị na-emebi iwu eyie ha egwu?

9 Pọl gara n’ihu n’okwu ya banyere ndị na-achị isi, na-asị: “N’ihi na ndị isi abụghị ihe egwu n’ebe ezi ọrụ dị, kama n’ebe ọrụ ọjọọ dị. Ma ị́ chọghị ka ị tụọ egwu onye ahụ na-achị isi? Na-eme ezi ihe, ị ga-enwekwa otuto site n’aka ya.” (Ndị Rom 13:3) Ọ bụghị ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe kwesịrị ịtụ egwu ahụhụ sitere n’aka ndị na-achị achị, kama ọ bụ ndị ajọ omume, ndị ahụ ndị na-arụ “ọrụ ọjọọ,” ya bụ, ndị na-eme mpụ. Mgbe ndị mmebi iwu dị otú a yiri ha egwu, ọ pụrụ ịbụ ihe kwesịrị ekwesị Ndịàmà Jehova ịnata nchebe ndị uwe ojii ma ọ bụ nke ndị agha site n’aka ndị na-achị achị.—Ọrụ 23:12-22.

10. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova siworo ‘nata otuto’ site n’aka ndị na-achị isi?

10 Pọl na-agwa onye Kraịst nke na-edebe iwu ndị na-achị achị, sị: “Ị ga-enwekwa otuto site n’aka ya.” Dị ka ihe atụ nke a, tụlee akwụkwọ ozi ụfọdụ Ndịàmà Jehova nọ na Brazil natara mgbe ha mesịrị mgbakọ distrikti ha n’ebe ahụ. Site n’aka onye na-elekọta otu ngalaba egwuregwu obodo ukwu: “Ihe àgwà ọma unu nke udo rụpụtara kwesịrị inweta otuto kasị elu. Ọ bụ ihe nkasi obi ịmara na n’ime ụwa nke oge a nke nọ ná nsogbu, na e nwere ọtụtụ ndị ka kwenyere na Chineke, na-efekwa ya ofufe.” Site n’aka onye nlekọta nke ámá egwuregwu dị n’otu obodo ukwu: “N’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu ndị bịaranụ, e meghị ihe ndekọ ọ bụla banyere otu ihe omume nke mechuru ihe omume ahụ ihu, nke a bụkwa n’ihi nhazi na-enweghị ntụpọ.” Site n’ụlọ ọrụ nke otu onye isi obodo ukwu: “Anyị chọrọ iji ohere a jaa unu mma maka ịdị n’usoro unu na àgwà ọma dị ebube unu kpara n’enweghị onye gwara unu mee otú ahụ, anyị na-ekpekwara unu ekpere ihe ịga nke ọma maka ihe omume ọ bụla ọzọ unu ga-eme n’ọdịnihu.”

11. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na ikwusa ozi ọma ahụ adịghị ụzọ ọ bụla ọ pụrụ isi bụrụ ajọ ọrụ?

11 Okwu ahụ bụ “ọrụ ọma” na-ezo aka n’ihe omume ndị e mere ná nrubeisi nye iwu nke ndị na-achị isi. Ọzọkwa, ọrụ nkwusa anyị, nke ọ bụ Chineke nyere iwu ka a rụọ ya, ọ bụghị mmadụ, abụghị ọrụ ọjọọ—bụ́ isi ihe nke ndị na-achị achị kwesịrị ịghọta. Ọ bụ ozi ọha na eze nke na-akwalite ụkpụrụ omume nke ndị na-anakwere ya. N’ihi ya, anyị na-enwe olileanya na ndị na-achị isi ga-echebe ihe ruuru anyị, bụ́ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. Pọl kpọkuru ndị na-achị achị ka o wee guzobe nkwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ iwu kwadoro. (Ọrụ 16:35-40; 25:8-12; Ndị Filipaị 1:7) N’oge na-adịghị anya gara aga, Ndịàmà Jehova achọwo, nwetakwa nkwado iwu nye ọrụ ha na East Germany, Hungary, Poland, Romania, Benin, na Myanmar (Burma).

“Ọ Bụ Onye Na-ejere Chineke Ozi”

12-14. Olee ụzọ ọchịchị siworo mee ihe dị ka onye na-ejere Chineke ozi (a) n’oge e dere Bible? (b) n’oge dị ugbu a?

12 N’ikwu okwu banyere onye ọchịchị nkịtị, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi n’ebe ị nọ iwetara gị ezi ihe. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu; n’ihi na ọ bụghị n’efu ka ọ na-ebu mma agha: n’ihi na ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye ọ̀bọ̀ iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe.”—Ndị Rom 13:4.

13 Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị mba dị iche iche emewo ihe dị ka onye na-ejere Chineke ozi n’ụzọ ụfọdụ kpọmkwem. Saịrọs mere otú ahụ mgbe ọ kpọkọtara ndị Juu ka ha si Babilọn laa ije wughachi ụlọ Chineke. (Ezra 1:1-4; Aịsaịa 44:28) Ataksakses bụ onye na-ejere Chineke ozi mgbe o ji ego onyinye zipụ Ezra maka mwughachi nke ụlọ ahụ, mgbe e mesịkwara, mgbe o nyere Nehemaịa iwu iwughachi mgbidi nile nke Jerusalem. (Ezra 7:11-26; 8:25-30; Nehemaịa 2:1-8) Ọchịchị Rom jekwara ozi n’ụzọ dị otú ahụ mgbe ọ napụtara Pọl site n’aka ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike na Jerusalem, chebe ya n’oge ụgbọ ọ nọ n’ime ya kpuru, meekwa ndokwa ka o nwee ụlọ nke aka ya na Rom.—Ọrụ 21:31, 32; 28:7-10, 30, 31.

14 N’otu aka ahụkwa, ndị ọchịchị nkịtị ejewo ozi dị ka onye na-ejere Chineke ozi n’oge a. Dị ka ihe atụ, na 1959, Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada mere mkpebi na otu n’ime Ndịàmà Jehova e boro ebubo na Quebec na o bipụtara akwụkwọ ndị na-akpata inupụrụ ndị ọchịchị isi, na-akatọkwa mmadụ, bụ onye ikpe na-amaghị ma ọlị wee si otú a na-eme ihe megidere ịkpọasị nke onye minista ukwu nke Quebec n’oge ahụ, bụ́ Maurice Duplessis.

15. N’ụzọ dị aṅaa bụ isi ka ndị ọchịchị si na-eje ozi dị ka onye na-ejere Chineke ozi, ikike dịkwa aṅaa ka nke a na-enye ha?

15 Ọzọkwa, n’ụzọ bụ isi, gọọmenti mba dị iche iche na-eje ozi dị ka ndị na-ejere Chineke ozi site n’ịhụ na ihe omume ọha mmadụ gara n’usoro ruo mgbe Alaeze Chineke ga-eweghara ibu ọrụ ahụ. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, ọ bụ n’ihi nke a ka onye na-achị isi “na-ebu mma agha,” nke sere onyinyo ikike o nwere inye mmadụ ahụhụ. Dị ka ọ na-adịkarị, nke a metụtara ịga mkpọrọ ma ọ bụ ịkwụ nhá. N’ala ụfọdụ, ọ pụrụ ịgụnyekwa amamikpe ọnwụ.a N’aka nke ọzọ, ọtụtụ mba ahọrọwo ịhapụ inwe amamikpe ọnwụ, nke ahụ bụkwa ihe ruuru ha.

16. (a) Ebe onye na-achị isi bụ onye na-ejere Chineke ozi, gịnị ka ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke leworo anya dị ka ihe ziri ezi ka ha mee? (b) Ụdị ọrụ dị aṅaa ka onye Kraịst na-agaghị anakwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

16 Eziokwu ahụ nke bụ na ndị na-achị isi bụ onye na-ejere Chineke ozi na-akọwa ihe mere Daniel, ndị Hibru atọ ahụ, Nehemaịa, na Mọdekaị ji nwee ike ịnara ọkwa nlekọta dị iche iche n’ọchịchị Babilọn na nke ndị Peasia. Ha pụrụ isi otú a kpọkuo ndị ọchịchị Obodo maka ọdịmma nke ndị Chineke. (Nehemaịa 1:11; Esta 10:3; Daniel 2:48, 49; 6:1, 2) Taa, ụfọdụ ndị Kraịst na-arụkwa ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti. Ma ebe ha bụ ndị dị iche site n’ụwa, ha adịghị esonyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, ma ọ bụ na-achọ ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ na-anara ọkwá ọrụ ebe ha ga na-eme mkpebi n’òtù ọchịchị dị iche iche.

Mkpa nke Inwe Okwukwe

17. Ọnọdu dịgasị aṅaa pụrụ ịkpali ụfọdụ ndị na-abụghị ndị Kraịst iguzogide ndị na-achị isi?

17 Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ndị na-achị isi ekwere ka arụrụala ma ọ bụ ọbụna mkpagbu dịrị? Ndị Kraịst hà kwesịrị ịnwa ịgbanwe ọchịchị ma jiri nke ha chere na ọ ka mma dochie anya ya? N’ezie, ikpe na-ezighị ezi na arụrụala nke ndị ọchịchị abụghị ihe ọhụrụ. N’ime narị afọ mbụ, Ọchịchị Alaeze Rom nabatara ikpe na-ezighị ezi ndị dị ka ịgba ohu. Ọ gbachikwara nkịtị ka ndị ọrụ na-arụ arụrụala nọgide n’ọkwá. Bible kwuru okwu banyere ndị na-ana ụtụ ndị na-aghọ aghụghọ, onye ikpe nke na-adịghị eme ezi omume, na onye na-achị otu ókèala nke chọrọ ịnata ihe ngó.—Luk 3:12, 13; 18:2-5; Ọrụ 24:26, 27.

18, 19. (a) Olee ụzọ ndị Kraịst na-esi emeghachi omume ma ọ bụrụ na ndị ọrụ gọọmenti emee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ na-arụ arụrụala? (b) Olee ụzọ ndị Kraịst siworo meziwanye ndụ ndị mmadụ, dị ka otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme na igbe nke dị n’okpuru ebe a gosiri?

18 Ndị Kraịst pụrụ ịgbalịworịị ime ihe iji kwụsị ihe ndị ahụ a na-eme n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ha emeghị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Pọl ekwusaghị ọgwụgwụ nke ịgba ohu, ọ gwaghịkwa ndị Kraịst nwere ndị ohu ka ha tọhapụ ha. Kama nke ahụ, o nyere ndị ohu na ndị nwe ndị ohu ndụmọdụ ka ha gosi ọmịiko ndị Kraịst mgbe ha na-emesorịta ibe ha ihe.’ (1 Ndị Kọrint 7:20-24; Ndị Efesọs 6:1-9; Faịlimọn 10-16; leekwa 1 Pita 2:18.) N’otu aka ahụ, ndị Kraịst etinyeghịkwa aka n’ihe omume e ji achọ mgbanwe ọchịchị. Ha tinyere onwe ha n’ọrụ nke ukwuu n’ikwusa “ozi ọma nke udo.” (Ọrụ 10:36) N’afọ 66 nke Oge Anyị, usuu ndị agha Rom nọchibidoro Jerusalem ma mesịa laghachi azụ. Kama ịnọgide soro ndị nnupụisi ahụ na-echebe obodo ahụ, ndị Kraịst bụ ndị Hibru ‘gbalagara n’ugwu’ n’irube isi ná ntụzi nke Jisọs.—Luk 21:20, 21.

19 Ndị Kraịst oge mbụ ahụ nakweere ihe nile otú ha dị ma gbalịa imeziwanye ndụ nke ndị mmadụ n’otu n’otu site n’inyere ha aka ịgbaso ụkpụrụ Bible dị iche iche. Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ John Lord, n’akwụkwọ ya bụ The Old Roman World, dere, sị: “A hụrụ ezi mmeri nile nke Iso Ụzọ Kraịst n’ime ka ndị ahụ na-ekwupụta na ha kwenyere n’ozizi ya nile bụrụ ndị ezi mmadụ, kama ịgbanwe n’ụzọ a na-ahụ anya òtù dị iche iche nke ọha mmadụ nakweere, ma ọ bụ ọchịchị, ma ọ bụ iwu dị iche iche.” Ndị Kraịst nke oge a hà kwesịrị ime ihe n’ụzọ dị iche?

Mgbe Ndị Ọchịchị Na-achọghị Inye Aka

20, 21. (a) Olee ụzọ otu ọchịchị si daa n’ịnọ dị ka onye na-ejere Chineke ozi maka ezi ihe? (b) Olee ụzọ Ndịàmà Jehova kwesịrị isi emeghachi omume mgbe Ọchịchị tinyere aka n’ịkpagbu ha?

20 Na September 1972, ajọ mkpagbu tiwapụrụ megide Ndịàmà Jehova n’otu mba dị n’etiti Africa. A pụnaara ọtụtụ puku n’ime ha ihe nile ha nwere, mekpọọkwa ha ọnụ n’ụzọ ndị ọzọ, gụnyere iti ha ihe, ịta ha ahụhụ, na igbu ha egbu. Ọchịchị ọ̀ rụzuru ọrụ ya nke ichebe Ndịàmà ahụ? Ee e! Kama nke ahụ, ọ gbara ime ihe ike ahụ ume, na-arụgide ndị Kraịst ndị a na-adịghị onye ọ bụla ha na-enye nsogbu ịgbalaga n’ala ndị agbata obi ha maka nchebe.

21 Ọ̀ bụ na Ndịàmà Jehova ekwesịghị iji iwe wee bilie megide ndị mmekpaahụ dị otú ahụ? Ee e. Ndị Kraịst kwesịrị iji ntachi obi nagide mmechuihu ndị dị otú ahụ, na-eme ihe n’obi umeala n’iṅomi Jisọs: “Mgbe ọ na-ahụ ahụhụ, ọ dịghị aba mba; kama ọ raara onwe ya nye n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Ha chetara na mgbe e jidere Jisọs n’ogige Getsemane ahụ, ọ baara otu onye na-eso ụzọ ya mba, bụ́ onye ji mma agha chọọ ichebe ya, o mesịkwara gwa Pọntịọs Paịlat, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a: ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.”—Jọn 18:36; Matiu 26:52; Luk 22:50, 51.

22. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka ụfọdụ Ndịàmà nọ n’Africa setipụrụ mgbe ha nwetara ajọ mkpagbu?

22 N’iburu ihe nlereanya nke Jisọs n’uche, Ndịàmà ahụ bụ ndị Africa nwere obi ike iji gbasoo okwu ndụmọdụ Pọl, bụ́: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Burunụ ụzọ na-eche ihe ọma n’ihu mmadụ nile. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị [Jehova, NW] kwuru.” (Ndị Rom 12:17-19; tụlee Ndị Hibru 10:32-34.) Lee nnọọ ihe nlereanya na-akpali akpali ụmụnna anyị ndị Africa bụụrụ anyị nile taa! Ọbụna mgbe ndị ọchịchị jụrụ ime ihe n’ụzọ dị ùgwù, ezi ndị Kraịst adịghị agbakụta ụkpụrụ Bible azụ.

23. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka ọ fọdụrụ ka a tụlee?

23 Ma, gịnị ka ndị na-achị isi pụrụ ịtụ anya ya n’aka ndị Kraịst? È nwekwara ịkpa ókè ọ bụla dịịrị ihe ndị ha kwesịri ịchọ n’aka mmadụ? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iwu ahụ Chineke nyere n’Israel oge ochie gụnyere amamikpe ọnwụ maka mpụ ndị dị oké njọ.—Ọpụpụ 31:14; Levitikọs 18:29; 20:2-6; Ọnụ Ọgụgụ 35:30.

Ị̀ Pụrụ Ikọwa?

◻ Olee ụzọ ụfọdụ mmadụ pụrụ isi ‘doo onwe ha imegide’ ndị na-achị isi?

◻ Gịnị bụ ‘ndokwa Chineke’ n’ihe banyere ike ndị ọchịchị?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-achị isi si bụrụ “ihe egwu”?

◻ Olee ụzọ ọchịchị dị iche iche nke mmadụ si nọrọ dị ka “onye na-ejere Chineke ozi”?

[Igbe dị na peeji nke 21]

Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Onye Isi Ndị Uwe Ojii

OTU akwụkwọ ozi nke e dekwasịrị n’elu ya “Ọrụ Obodo nke Steti Minas Gerais” bịarutere n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brazil. O sitere n’aka onyeisi ndị uwe ojii nke obodo Conquista. Ọ̀ dị ihe ọjọọ merenụ? Ka akwụkwọ ozi ahụ kọwaa. Ọ na-asị:

“Nna Anyị Ukwu:

“Ọ bụ ihe na-enye m obi ụtọ ịkọwara gị onye m bụ site n’akwụkwọ ozi nke a. Abụwo m onye isi ndị uwe ojii n’obodo Conquista, Minas Gerais, ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ. Mgbe m nọ n’ọrụ, ana m agbalịsi ike iji ezi akọ na uche na-eme ihe, ma ọ na-esiri m ike ime ka udo dịgide n’ụlọ mkpọrọ. Ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, Ọ bụ ezie na a na-enye ha ọzụzụ n’ọrụ dị iche iche, na-anọ n’ọgba aghara mgbe nile.

“Ọnwa ole na ole gara aga, Mazi O—— bịara n’obodo ahụ wee kọwaa onwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ malitere ikwusara ụfọdụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ banyere Bible, na-akụziri ha otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe, na-ezikwa ihe omume ụfodụ ndị bụ isi n’ihe banyere idebe onwe ha ọcha na nkà ime ihe metụtara ọha mmadụ, tinyekwara ịgwa ha okwu banyere Bible Nsọ. Ụzọ onye nkwusa nke a si rụọ ọrụ na-egosi nraranye, ịhụnanya, na iji onwe onye chụọ àjà. Àgwà ndị ahụ nọ n’ụlo mkpọrọ gbanwere n’oge na-adịghị anya wee dịwanye mma n’ụzọ a hụrụ anya, nke bụụrụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ ihe ijuanya na ihe obi ụtọ.

“N’iburu ihe mere n’ụlọ mkpọrọ anyị n’uche, achọrọ m iji ohere nke a mee ka ndị Watch Tower Bible and Tract Society mara otú anyị si nwee obi ekele maka ọrụ ọma onye nkwusa nke a kwesịrị ekwesị rụrụ n’obodo anyị.”

N’ihe banyere ndị na-achị achị, Pọl onyeozi sịrị: “Na-eme ezi ihe, ị ga-enwekwa otuto site n’aka ya.” (Ndị Rom 13:3) Nke a bụ nnọọ eziokwu n’ọnọdụ nke a kọrọ banyere ya n’elu ebe a. Lee nnọọ ihe ịgba àmà ọ bụ nye ike mgbanwe nke Okwu Chineke nwere nke bụ na ozi ọma ahụ mezuru n’ime ọnwa ole na ole, ihe usoro inye ahụhụ iwu na-apụghị imezu n’ọtụtụ afọ!—Abụ Ọma 19:7-9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya