Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/1 p. 18-23
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ Dịghị Onye Ọ Bụla Na-achị Isi ma Ọ Bụrụ na Chineke Edoghi Ya”
  • Ndị Kraịst Oge Mbụ na Ndị Ọchịchị Rom
  • Nsọpụrụ Kwesịrị Ekwesị nye Ịbụ Isi
  • Ịbụ Isi n’Ime Ezinụlọ Ndị Kraịst
  • Ịbụ Isi n’Ime Ọgbakọ
  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịbụisi Ònye Ka I Kwesịrị Ịnakwere?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịsọpụrụ Ndị Isi?
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/1 p. 18-23

Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya

“Ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.”—⁠NDỊ ROM 13:1.

1. N’ihi gịnị mere a pụrụ iji kwuo na Jehova bụ Ịbụ Isi Kasị Elu?

EJIKỌTARA ịbụ isi na ịbụ onye okike. Onye ahụ Kasị Elu nke mere ka ihe nile e kere eke dịrị, ihe ndị dị ndụ na ndị na-adịghị ndụ, bụ Jehova Chineke. Ọ bụ n’ụzọ a na-apụghị ịgọnarị agọnarị Ịbụ Isi Kasị Elu. Ezi ndị Kraịst na-enwe otu ụdị mmetụta nke ihe ndị e kere eke bi n’eluigwe ndị sịrị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.”​—⁠Mkpughe 4:11.

2. Olee otú ndị ọchịchị oge gboo bụ́ mmadụ si kweta n’otu ụzọ na ha enweghị ikike e ketara site n’ọmụmụ ịchị ụmụ mmadụ ibe ha, gịnịkwa ka Jisọs gwara Pọntiọs Paịlet?

2 Nanị eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ n’ime ndị ọchịchị oge gboo bụ́ mmadụ nwara ime ka ịbụ isi ha zie ezie site n’ịzọrọ ịbụ chi ma ọ bụ ịbụ onye nnọchiteanya nke otu chi gosipụtara nghọta a na-ekwupụtaghị n’ọnụ na ọ dịghị onye ọ bụla bụ́ mmadụ nke ketara iru eru site n’ọmụmụ ịchị ndị ọzọ.a (Jeremaịa 10:23) Nanị isi iyi ziri ezi nke ịbụ isi bụ Jehova Chineke. Kraịst gwara Pọntiọs Paịlet, onye gọvanọ bụ́ onye Rom nke na-achị Judia, sị: “Ị gaghị enwe ike ọ bụla imegide m, ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya rịị.”​—⁠Jọn 19:11.

“Ọ Dịghị Onye Ọ Bụla Na-achị Isi ma Ọ Bụrụ na Chineke Edoghi Ya”

3. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru banyere “ndị na-achị isi,” ọ bụkwa ajụjụ ndị dị aṅaa ka okwu Jisọs na nke Pọl na-akpalite?

3 Pọl onyeozi dere nye ndị Kraịst nọ n’okpuru ọchịchị Alaeze Ukwu Rom, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.” (Ndị Rom 13:1) Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na e nyewo Paịlet ike ya “site n’elu”? Ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Pọl si were ya na ndị ọchịchị nke oge ya bụ ndị Chineke guzobere? Hà na-ekwu na Jehova n’onwe ya na-ahụ maka nhọpụta nke onye ọchịchị ọ bụla nke ụwa nke a?

4. Gịnị ka Jisọs na Pọl kpọrọ Setan, nzọrọ dị aṅaa nke Setan mere ka Jisọs na-arụghị ụka?

4 Olee ụzọ nke a pụrụ isi dị otú a, ebe Jisọs kpọrọ Setan “onye isi ụwa nke a,” Pọl onyeozi kpọkwara ya “chi nke oge a”? (Jọn 12:31; 16:11; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ọzọkwa, mgbe ọ na-anwa Jisọs, Setan nyere ya “ịbụ isi” n’elu “alaeze nile nke elu ụwa dum mmadụ bi,” na-azọrọ na e nyewo ya ike a. Jisọs jụrụ ihe o nyere ya, ma ọ rụghị ụka na ịbụ isi dị otú ahụ bụ nke Setan inye.​—⁠Luk 4:​5-⁠8.

5. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu Jisọs na Pọl banyere ịbụ isi nke ụmụ mmadụ? (b) Ọ̀ bụ n’echiche dị aṅaa ka ndị na-achị isi si ‘bụrụ ndị Chineke doworo’?

5 Jehova nyefere ịchịisi n’elu ụwa nke a n’aka Setan site n’ikwere ka ọ nọgide na-adị ndụ mgbe o nupụsịrị isi na mgbe ọ nwasịrị Adam na Iv, wee mee ka ha nupụrụ ọkaaka Ya isi. (Jenesis 3:​1-⁠6; tụlee Ọpụpụ 9:​15, 16.) N’ihi ya, okwu Jisọs na Pọl aghaghị ịpụta na mgbe di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ jụsịrị ọchịchị Chineke, ma ọ bụ ịchịisi Chineke, Jehova kwere ka ụmụ mmadụ e kewapụworo mepụta ụdị ịbụ isi ndị ga-enye ha ohere nke ịdị ndụ n’okpuru òtù ụmụ mmadụ dị n’usoro. Mgbe ụfọdụ, iji mezuo nzube ya, Jehova emewo ka ndị ọchịchị ma ọ bụ gọọmentị ụfọdụ daa. (Daniel 2:​19-⁠21) Ndị ọzọ ka o kweworo ka ha nọgide n’ọchịchị. Banyere ndị ọchịchị ndị Jehova kwere ka ha nọgide na-adị, a pụrụ ịsị na ha bụ “ndị Chineke doworo.”

Ndị Kraịst Oge Mbụ na Ndị Ọchịchị Rom

6. Olee otú ndị Kraịst oge gboo si lee ndị ọchịchị nke Rom anya, n’ihi gịnịkwa?

6 Ndị Kraịst oge mbụ esoghị ịrọ òtù dị iche iche nke ndị Juu bụ́ ndị gbara izu nzuzo ma buo agha megide ndị Rom na-achị Israel. Ebe ọ bụ na ndị ọchịchị Rom, site n’usoro iwu ha a haziri ahazi, hụrụ na a nọgidere na-enwe ịdị n’usoro n’ala na ná mmiri; wuru ọtụtụ ọwa mmiri, okporo ụzọ, na àkwà mmiri dị iche iche bara uru; nakwa n’ụzọ bụ isi jee ozi maka ọdịmma nke ọha mmadụ, ndị Kraịst lere ha anya dị ka ‘onye na-ejere Chineke ozi [ma ọ bụ, “ohu,” ntụaka ala ala peji, NW] n’ebe ha nọ iwetara ha ezi ihe.’ (Ndị Rom 13:​3, 4) Iwu na ịdị n’usoro rụpụtara ọnọdụ dị mma nke nyeere ndị Kraịst aka ikwusa ozi ọma ahụ n’ebe nile, dị ka Jisọs nyere n’iwu. (Matiu 28:​19, 20) Site n’ezi akọ na uche nile, ha pụrụ ịtụ ụtụ isi dị iche iche nke ndị Rom tụkwasịrị ha n’isi, ọbụna ma a sị na e ji ụfọdụ n’ime ego ndị ahụ mee ihe ndị Chineke na-akwadoghị.​—⁠Ndị Rom 13:​5-⁠7.

7, 8. (a) Gịnị ka iji nlezi anya gụọ Ndị Rom 13:​1-⁠7 na-ekpughe, gịnịkwa ka okwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi? (b) N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ndị ọchịchị nke Rom na-ejeghị ozi dị ka “onye na-ejere Chineke ozi,” n’ọnọdụ a kwa omume dị aṅaa ka ndị Kraịst oge mbụ mere?

7 Iji nlezianya gụọ amaokwu asaa ndị mbụ nke Ndị Rom isi 13 na-ekpughe na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị “na-achị isi” bụ “onye na-ejere Chineke ozi” ito ndị na-eme ezi ihe na inye ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ. Okwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi na ọ bụ Chineke, ọ bụghị ndị na-achị achị, na-ekpebi ihe bụ ezi ihe na ihe bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye ọchịchị alaeze ukwu Rom ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ na-achị achị achọọ ihe ndị Chineke machibidoro iwu, ma ọ bụ n’aka nke ọzọ, machibido ihe ndị Chineke chọrọ iwu, ọ dịghị eje ozi ọzọ dị ka onye na-ejere Chineke ozi. Jisọs sịrị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) Ọ bụrụ na Ọchịchị Rom achọọ ihe ndị bụ nke Chineke, dị ka ofufe ma ọ bụ ndụ mmadụ, ezi ndị Kraịst na-agbaso ndụmọdụ ndị ozi: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”​—⁠Ọrụ 5:29.

8 Ọjụjụ ndị Kraịst oge mbụ jụrụ ife onye ọchịchị alaeze ukwu ofufe na ikpere arụsị, ịhapụ nzukọ ha dị iche iche nke ndị Kraịst, na ịkwụsị ikwusa ozi ọma ahụ wetara mmegide. Ọ bụ ihe e kwere n’ebe nile na e gburu Pọl onyeozi site n’iwu nke Emperor Nero. Ndị ọchịchị alaeze ukwu ndị ọzọ, karịsịa Domitian, Marcus Aurelius, Septimius Severus, Decius, na Diocletian, sogbukwara ndị Kraịst oge mbụ. Mgbe ndị ọchịchị alaeze ukwu ndị a na ndị ọchịchị ndị nọ n’okpuru ha sogburu ndị Kraịst, n’ezie ha adịghị eje ozi dị ka “onye na-ejere Chineke ozi.”

9. (a) Gịnị nọgidere na-abụ eziokwu banyere ndị na-achị isi, ọ̀ bụkwa n’aka onye ka anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ si nata ike na ịchịisi? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu n’ụzọ ezi uche dị n’ime ya banyere onye Kraịst ido ya n’okpuru ndị na-achị isi?

9 Ihe ndị a nile na-enye aka ịkọwa na ebe ọ bụ ezie na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achị isi na-eje ozi n’ụzọ ụfọdụ dị ka “ndokwa Chineke” (NW) iji hụ na a na-enwe ọha ụmụ mmadụ dị n’usoro, ha nọgidere na-abụ akụkụ nke usoro ihe nke ụwa nke Setan bụ chi ya. (1 Jọn 5:19) Ha bụ akụkụ nke njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị zuru ụwa ọnụ nke e ji “anụ ọhịa” ahụ nke Mkpughe 13:​1, 2 mee ihe nnọchianya ya. Anụ ọhịa ahụ natara ike na ịchịisi ya site n’aka “dragọn ukwu ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu. (Mkpughe 12:9) Ya mere, dị ka ihe ezi uche dị na ya, ndị Kraịst ịnọ n’okpuru ndị ọchịchị dị otú ahụ bụ nke a kpaara ókè, ọ bụghị nke a na-akparaghị ókè.​—⁠Tụlee Daniel 3:​16-⁠18.

Nsọpụrụ Kwesịrị Ekwesị nye Ịbụ Isi

10, 11. (a) Olee otú Pọl si gosi na anyị kwesịrị ịdị na-akwanyere ndị nọ n’isi ùgwù? (b) N’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpee ekpere “n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu”?

10 Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ndị Kraịst ga-eme omume nke iji anya ike jụ irubere ndị na-achị achị isi. N’eziokwu, ọtụtụ n’ime ndị ikom ndị a erughị eru kpọmkwem inweta nsọpụrụ site n’ụzọ ha si adị ndụ n’onwe ha ma ọ bụ ọbụna n’ihu ọha. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’ihe nlereanya ha na ndụmọdụ ha, ndị ozi gosiri na e kwesịrị imeso ndị nọ n’ọchịchị n’ụzọ nsọpụrụ. Mgbe Pọl pụtara n’ihu Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ na-edina onye ikwu ya, ọ gwara ya okwu n’ụzọ na-egosi nsọpụrụ kwesịrị ekwesị.​—⁠Ọrụ 26:​2, 3, 25.

11 Ọbụna na Pọl kwuru na o kwesịrị ekwesị ịkpọtụ ndị ọchịchị ụwa aha n’ekpere anyị, karịsịa mgbe a kpọkuru ha ime mkpebi ndị metụtara ndụ na ọrụ dị iche iche nke ndị Kraịst anyị. O dere, sị: “Ya mere, ihe mbụ m na-adụsi ọdụ ike bụ, ka a na-arịọ arịrịọ, kpeekwa ekpere, rịọkwa arịrịọ a na-arịọrọ ndị ọzọ, keleekwa ekele, n’ihi mmadụ nile; n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu; ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile. Nke a dị mma bụrụkwa ihe a ga-anara nke ọma n’ihu Onye nzọpụta anyị bụ́ Chineke; Onye na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile; ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:​1-⁠4) Omume nsọpụrụ anyị n’ebe ndị ọchịchị dị otú ahụ nọ pụrụ iduga na ha ịhapụ anyị ka anyị nọgide n’ọrụ anyị nke ịnwa “ịzọpụta mmadụ nile” n’ụzọ nnwere onwe karị.

12, 13. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka Pita nyere banyere ịchịisi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi tida “okwu amaghị ihe nke ndị na-enweghị uche” ndị na-akpata ibu ụgha n’uche megide Ndịàmà Jehova?

12 Pita onyeozi dere, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru ịbụ isi ọ bụla mmadụ debere n’ihi Onyenwe anyị; ma ọ bụ eze, dị ka onye nọ n’ike n’elu unu; ma ọ bụ ndị isi, dị ka ndị a na-ezite site n’aka ya ka ha bọọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tookwa ndị na-eme ezi ihe. N’ihi na otú a ka ọchịchọ nke Chineke si dị, ka unu site n’ime ezi ihe mee ka amaghị ihe nke ndị na-enweghị uche kpuchie ọnụ: dị ka ndị nweere onwe ha, ma unu enweghị inwe onwe unu ahụ dị ka ihe mkpuchi nke ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu nke Chineke. Sọpụrụnụ mmadụ nile. Hụnụ òtù ndị bụ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.” (1 Pita 2:​13-⁠17) Lee aha ndụmọdụ kwesịrị ekwesị ọ bụ! Anyị ji Chineke ụgwọ nrubeisi zuru ezu dị ka ndị ohu ya, anyị na-enyekwa ndị na-achị achị e zitere inye ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ nsọpụrụ na nrubeisi a kpaara ókè.

13 A chọpụtawo na ọtụtụ ndị ọchịchị ụwa nwere nghọtahie ndị jọkarịsịrị njọ banyere Ndịàmà Jehova. Nke a na-abụkarị n’ihi na ha bụ ndị a kọọrọ akụkọ na-abụghị ezie site n’ọnụ ndị iro obi ọjọọ nke ndị Chineke. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ha matara ihe nile ha maara banyere anyị site n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi, bụ́ ndị na-adịghị ezi ezi mgbe nile n’akụkọ ha. Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ itida echiche ụgha nke a site n’omume nsọpụrụ anyị, mgbe o kwekwara omume, site n’ime ka ndị ọchịchị nweta nkọwa ziri ezi banyere ọrụ na nkwenkwe dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Nye ndị isi ji ọrụ n’aka, akwụkwọ nta bụ́ Jehovah’s Witnesses in the Twentieth Century na-enye nkọwa e gburu nkenke. Maka ihe ọmụma zuru ezu karị, a pụrụ inye ha akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses​—⁠Proclaimers of God’s Kingdom, ngwá ọrụ mara mma nke kwesịrị ịdị n’ebe ndebe akwụkwọ dị iche iche nke ógbè na nke mba maka ọha na eze.

Ịbụ Isi n’Ime Ezinụlọ Ndị Kraịst

14, 15. (a) Gịnị bụ ihe ndabere nke ịbụ isi n’ime ezinụlọ ndị Kraịst? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ omume ndị Kraịst bụ́ nwunye n’ebe di ha nọ, n’ihi gịnịkwa?

14 O doro anya na ọ bụrụ na Chineke chọrọ n’aka ndị Kraịst igosi nsọpụrụ ruru eru nye ndị ọchịchị ụwa, ha kwesịkwara ịsọpụrụ n’otu aka ahụ ụdị ịbụ isi nke Chineke guzobere n’ime ezinụlọ ndị Kraịst dị iche iche. Pọl onyeozi kwupụtara n’ụzọ dị nkenke ụkpụrụ ịbụ isi nke a na-ahụ n’etiti ndị Jehova. O dere, sị: “Ma ana m achọ ka unu mata na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Nke a bụ ụkpụrụ nke ọchịchị Chineke, ma ọ bụ ịchịisi Chineke. Gịnị ka ọ gụnyere?

15 Nkwanye ùgwù maka ọchịchị Chineke na-amalite n’ụlọ. Onye Kraịst bụ nwunye nke na-adịghị egosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị nye ịbụ isi nke di ya, ma ọ bụ onye kwere ekwe ibe ya ma ọ bụ na ọ bụghị​—⁠abụghị onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke. Pọl dụrụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Na-edorịta onwe unu n’okpuru ibe unu n’ime egwu Kraịst. Ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzukọ Ya, ebe Ya onwe ya bụ Onye nzọpụta nke ahụ. Ma dị ka a na-edo nzukọ ahụ n’okpuru Kraịst anyị, otú a ka ndị bụ́ nwunye dookwa onwe ha n’okpuru di ha n’ihe nile ọ bụla.” (Ndị Efesọs 5:​21-⁠24) Dị nnọọ ka ndị ikom bụ́ ndị Kraịst na-aghaghị ido onwe ha n’okpuru ịbụ isi Kraịst, ndị Kraịst bụ́ ndị inyom kwesịrị ịhụta amamihe dị n’ido onwe ha n’okpuru ịbụ isi Chineke nyere di ha. Nke a ga-ewetara ha afọ ojuju dị omimi na, nke ka mkpa, ngọzi Jehova.

16, 17. (a) Olee otú ụmụaka ndị a zụlitere n’ime ezinụlọ ndị Kraịst pụrụ isi doo onwe ha iche n’ebe ọtụtụ ndị na-eto eto ndị ọzọ nọ taa, oleekwa ihe agbamume ha nwere? (b) Olee otú Jisọs si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ndị na-eto eto taa, gịnịkwa ka a na-agba ha ume ime?

16 Ụmụaka na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke nwere obi ụtọ igosi nsọpụrụ kwesịrị ekwesị nye ndị mụrụ ha. Banyere ọgbọ ndị na-eto eto na mgbe ikpeazụ, e buru amụma na ha ga-abụ “ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha.” (2 Timoti 3:​1, 2) Ma nye ụmụaka bụ́ ndị Kraịst, Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Nkwanye ùgwù maka ịbụ isi nke ndị nne na nna na-atọ Jehova ụtọ, na-ewetakwa ngọzi ya.

17 E gosipụtara nke a n’ihe banyere Jisọs. Ihe ndekọ Luk na-asị: “O wee soo ha [ndị mụrụ ya] rịdaa bịaruo Nazaret; O wee nọdụ n’okpuru ha: . . . Jisọs wee na-aga n’ihu n’amamihe na ogologo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.” (Luk 2:​51, 52) Jisọs bụ onye dị afọ 12 mgbe ahụ, ụdị ngwaa okwu Grik e jikwa mee ihe ebe a na-egosi na ọ ‘nọgidere n’okpuru’ ndị mụrụ ya. Ya mere ido onwe ya n’okpuru akwụsịghị mgbe ọ banyere n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu. Ọ bụrụ na unu ndị na-eto eto chọrọ inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ na n’amara n’ebe Jehova na ndị na-atụ egwu Chineke nọ, unu ga-egosi nkwanye ùgwù maka ịbụ isi ma n’ime ụlọ ma n’èzí.

Ịbụ Isi n’Ime Ọgbakọ

18. Ònye bụ Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, ònyekwa ka o nyefeworo ikike?

18 N’ikwu okwu banyere mkpa ọ dị ime ihe n’usoro n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, Pọl dere, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo. . . . Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya na n’usoro.” (1 Ndị Kọrint 14:​33, 40) Ka e wee mee ihe nile n’ụzọ dị n’usoro, Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, enyewo ikike n’aka ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi. Anyị na-agụ, sị: “Ya onwe ya nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi . . . Kama ka anyị wee na-eso eziokwu n’ime ịhụnanya, wee too eto ruo n’ime Ya n’ihe nile, Onye bụ isi anyị, bụ́ Kraịst.”​—⁠Ndị Efesọs 4:​11, 12, 15.

19. (a) Ònye ka Kraịst meworo onye isi n’elu ihe nile o nwere n’elu ụwa, ònyekwa ka o nyeworo ikike pụrụ iche? (b) Nnyefe ikike dị aṅaa na-ewere ọnọdụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, gịnịkwa ka nke a chọrọ anyị n’aka?

19 N’ime oge ọgwụgwụ a, Kraịst ahọpụtawo ìgwè “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ilekọta “ihe nile o nwere,” ma ọ bụ ọdịmma nke Alaeze ahụ n’ụwa. (Matiu 24:​45-⁠47) Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, òtù na-achị isi nke ndị ikom ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị Kraịst nyefeworo ikike nke ime mkpebi na ịhọpụta ndị nlekọta ndị ọzọ, na-anọchite anya ohu nke a. (Ọrụ 6:2, 3; 15:2) N’otu aka ahụ, Òtù Na-achị Isi na-enyefe ikike n’aka Kọmitii Alaka dị iche iche, ndị nlekọta distrikti na sekit, na ndị okenye nọ n’ọgbakọ ọ bụla n’ime ihe karịrị 73,000 ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. Ndị ikom ndị Kraịst ndị a nile na-arụsi ọrụ ike kwesịrị ịnata nkwado na nkwanye ùgwù anyị.​—⁠1 Timoti 5:17.

20. Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jehova adịghị enwe obi ụtọ n’ebe ndị ahụ na-enweghị nkwanye ùgwù maka ndị Kraịst ibe ha nọ n’isi?

20 A bịa n’ihe banyere nkwanye ùgwù anyị ji ụgwọ inye ndị nọ n’isi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, a pụrụ iji nkwanye ùgwù anyị ji ụgwọ inye ndị ọchịchị ụwa tụnyere ya n’ụzọ dị mma. Mgbe mmadụ mebiri iwu ụmụ mmadụ nke Chineke kwadoro, ahụhụ nke “ndị isi” kenyere onye ahụ bụ n’ezie ngosipụta nke iwe Chineke ‘n’isi onye na-eme ihe ọjọọ’ nke o si n’aka ndị ọzọ nye. (Ndị Rom 13:​3, 4) Ọ bụrụ na Jehova na-ewe iwe mgbe mmadụ mebiri iwu dị iche iche nke ụmụ mmadụ ma na-egosikwa enweghị nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị nye ndị ọchịchị nke ụwa, lee otú ọ na-aghaghị isiwori nwee mwute ka ukwuu ma ọ bụrụ na onye Kraịst raara onwe ya nye emebie ụkpụrụ dị iche iche nke Bible ma na-egosikwa enweghị nkwanye ùgwù maka ndị Kraịst ibe ya ndị nọ n’isi!

21. Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa ka anyị ga-enwe obi ụtọ ịgbaso, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Kama iwetara onwe anyị iwe Chineke site n’ịmalite omume nnupụisi ma ọ bụ nke nnwere onwe, anyị ga-agbaso ndụmọdụ Pọl nye ndị Kraịst nọ na Filipaị: “Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, dị ka unu ṅara ntị mgbe nile, ọ bụghị nanị mgbe m nọ n’etiti unu, kama ugbu a mgbe m na-anọghị, werenụ egwù na ịma jijiji rụpụta karị nzọpụta nke onwe unu nke ukwuu; n’ihi na ọ bụ Chineke Onye na-arụsi ọrụ ike n’ime unu ịchọ achọ unu na ịrụsi ọrụ ike unu, n’ihi na ọ dị Ya ezi mma. Meenụ ihe nile n’ejighị ntamu na ịrụ ụka ọ bụla; ka unu wee ghọọ ndị na-adịghị ịta ụta ndị na-aghọghịkwa aghụghọ, ụmụ Chineke ndị a na-apụghị ịta ụta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie, ndị a na-ahụ unu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Ndị Filipaị 2:​12-⁠15) N’adịghị ka ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke nwekwara anya uhie nke oge a, ndị wetawooro onwe ha ọgba aghara nke ịbụ isi, ndị Jehova na-eji obi ha nile edo onwe ha n’okpuru ịbụ isi. Ha si otú a na-enweta ọtụtụ abamuru, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na⁠-⁠esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu bu ụzọ.

N’ụzọ Ntụleghachi

◻ Ònye bụ Ịbụ Isi Kasị Elu, n’ihi gịnịkwa ka ịchịisi ya ji bụrụ nke ziri ezi?

◻ N’echiche dị aṅaa ka ndị na-achị isi si ‘bụrụ ndị Chineke doworo’?

◻ Olee mgbe ndị na-achị isi na-akwụsị ịbụ “onye na-ejere Chineke ozi”?

◻ Olee ụdị ịbụ isi a na-ahụta n’ime ezinụlọ ndị Kraịst dị iche iche?

◻ Nnyefe ikike dị aṅaa dị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jisọs sịrị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya