Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 3/8 p. 23-28
  • Nwa Akịrị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa Akịrị
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ M Dị Ka Nwa Agbọghọ Na-eme Egwuregwu Ntụrụndụ
  • Ònye Bụ Nne M?
  • Nwa Nwoke n’Etiti Agha
  • Ọrụ Ezinụlọ
  • Inye Nwa M Nwanyị Nkwado
  • Okpukpe Aghọọ Ihe Iseokwu
  • Mgbanwe Dị Iche Iche ná Ndụ M
  • Imezu Nraranye M
  • Nkuchi—Olee Otú M Si Kwekọọ na Ya?
    Teta!—1996
  • Obi Ekele Maka Nkwado Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nsogbu Ndị Na-adị n’Ịbụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 3/8 p. 23-28

Nwa Akịrị

“Nwa akịrị bụ akịrị.”

Ilu ndị Japan nke a pụtara na nwatakịrị na-etolite ịdị nnọọ ka onye mụrụ ya.

Nne m bụ nwanyị na-eme egwuregwu ntụrụndụ.

M TOLITERE n’ụlọ egwuregwu ntụrụndụ nke nne m na-ahụ maka ya. Ya mere malite mgbe m dị obere, ụmụ agbọghọ mara mma ndị na-eyi ákwà kimono ndị kasị daa oké ọnụ gbara m gburugburu. Amaara m na mgbe m tolitere, m ga-esonye n’ọrụ ha. Ọzụzụ m malitere na 1928 n’ụbọchị nke isii n’ọnwa nke isii mgbe m gbara afọ isii. A sịrị na ọnụ ọgụgụ bụ 666 bụ ihe ịga nke ọma e ji n’aka.

Amụrụ m nkà ọdịnala Japan—ite egwú, ịbụ abụ, ịkụ ngwá egwú, ime ememe tii, na ihe ndị ọzọ. Kwa ụbọchị m na-eji ọsọ laruo ụlọ mgbe a gbasasịrị akwụkwọ, gbanwee ákwà m, ma gaa ọmụmụ ihe m. N’ebe ahụ m ga-esonyere ndị enyi ụlọ akwụkwọ m ọzọ n’ihi na anyị nile bụ ụmụaka nke ndị inyom na-eme egwuregwu ntụrụndụ. Ọ bụ oge iji ọrụ n’aka, ọ masịkwara m.

N’ụbọchị ndị ahụ tupu Agha Ụwa nke Abụọ, agụmakwụkwọ a na-aghaghị inwe na-akwụsị n’afọ nke 12, ya mere nke ahụ bụ mgbe m malitere ịrụ ọrụ. Dị ka onye ka na-amalite ọhụrụ ime egwuregwu ntụrụndụ, m na-eyi ákwà kimono mara oké mma ma nwee aka ndị na-agbada ruo ihe fọrọ nke nta ka ha bụrụ n’ụkwụ m. Isi buru m ka m na-aga n’ọrụ mbụ e kenyere m.

Ọrụ M Dị Ka Nwa Agbọghọ Na-eme Egwuregwu Ntụrụndụ

N’ụzọ bụ isi ọrụ m gụnyere ime ndị mmadụ obi ụtọ na ime ihe dị ka nwanyị na-eme ọha mmadụ ihe ọchị. Mgbe ndị ikom bara ọgaranya dokwara nnọkọ nri abalị n’ụlọ nri ọha mmadụ nke ndị aka ji akụ̀, ha ga-akpọtụrụ ụlọ egwuregwu ntụrụndụ ma kwuo ka ụmụ agbọghọ ole na ole na-eme egwuregwu ntụrụndụ bịa mee egwuregwu. A na-atụ anya n’aka ndị ahụ na-eme egwuregwu ntụrụndụ ime ka uhuruchi ahụ kporo ọkụ, jidekwa n’aka na onye ọbịa ọ bụla ji afọ ojuju laruo ụlọ, na-enwe echiche na ya ekporiwo ndụ.

Iji mee nke a, anyị aghaghị iche ihe dị onye ọbịa ọ bụla mkpa ma mezuo ya—ọbụna tupu onye ọbịa ahụ amata na ya nwere mkpa. Echere m na akụkụ kasị sie ike bụ ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe a gwara gị ozugbo. Ọ bụrụ na ndị ọbịa achọọ ikiri ite egwú ozugbo ahụ, anyị na-etekwa egwú. Ọ bụrụ na a chọrọ egwú, anyị na-achịpụta ngwá egwú anyị ma kụọ egwú a chọrọ ma ọ bụ bụọ ụdị abụ ọ bụla e kwuru ka a bụọ.

Nghọtahie a na-enwekarị bụ na ụmụ agbọghọ nile na-eme egwuregwu ntụrụndụ bụ ndị akwụna wara anya, ndị na-ana oké ego. Nke a abụghị eziokwu. Ọ bụ ezie na e nwere ụmụ agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ bụ́ ndị ji ire onwe ha akpata ego, ọ dịghị nwa agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ mkpa iwetu onwe ya ala otú ahụ. Amatara m n’ihi na ọ dịghị mgbe m mere ya. Nwa agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ bụ onye na-eme ndị mmadụ obi ụtọ, ọ bụrụkwa na ọ na-eme nke ọma, nkà ya na-ewetara ya ọrụ, onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa, na onyinye ego ndị ahịa ji afọ ofufo enye.

N’ikwu eziokwu, ole na ole na-eme nke ọma nke na ha na-abụ ndị ọkachamma. Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ na-eji nanị otu n’ime nkà ọdịnala ndị Japan emere ọrụ. Ma enwere m akara ugo diplọma na nkà asaa ndị dị otú ahụ, tinyere ite egwú ndị Japan, ịhazi okooko osisi, ememe tii, ịgbà ndị Japan a matara dị ka taiko, na ụdị egwú atọ ndị e ji shamisen nwere eriri atọ na-akụ. E wezụga iru eru ndị a, iji nweta ihe e ji adị ndụ, eleghị anya agaara m enwe mkpa nke ime ihe ọ bụla ndị ahịa rịọrọ.

Mgbe Japan na-akwụsighị ike n’ụzọ akụ̀ na ụba, ụmụ agbọghọ na-ahọrọ mgbe ụfọdụ ịghọ ndị na-eme egwuregwu ntụrụndụ ka ha wee nwee ike ịkwado ezinụlọ ha. Ha na-agbazite ego iji kwụọ ụgwọ maka ọzụzụ na ákwà kimono ha. Ezinụlọ nke ndị ọzọ na-ere ha n’ụlọ egwuregwu ntụrụndụ dị iche iche. Ndị nwe ha, ebe ọ bụ na ha akwụwo ego buru ibu, na-achọ ka ụmụ agbọghọ ndị ahụ kwụghachi ha. Ụmụ agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ n’ọnọdụ ndị a nwere oké ajọ ihe ndabara, n’ihi na ọzụzụ ha adịghị amalite n’oge, ha na-amalitekwa n’iji ụgwọ buru ibu. Ọtụtụ n’ime ndị a na-eme egwuregwu ntụrụndụ na-etinye aka ma ọ bụ bụrụ ndị a kwanyere n’omume rụrụ arụ iji gboo mkpa ego ha.

Ọrụ m ghọrọ ihe ndị a ma ama n’egwuregwu, ntụrụndụ, azụmahịa, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achọsi ike. Ndị òtù ndụmọdụ onye isi ala na ndị isi ministrị so ná ndị ahịa m. Ndị ikom a ji nkwanye ùgwù meso m ihe, na-ekelekwa m maka ọrụ m. Ọ bụ ezie na adịghị m esonye ná mkparịta ụka ọha mmadụ ma ọ́ bụghị ma a kpọrọ m, mgbe ụfọdụ a na-ajụ m echiche m. Ya mere m na-agụ akwụkwọ akụkọ, na-egekwa ntị na redio kwa ụbọchị iji mata ihe ọhụrụ ndị dị n’akụkọ. A na-enwekarị nnọkọ oriri ndị m na-eje ozi na ha maka ịtụle atụmatụ dị iche iche, ya mere aghaghị m igosi ezi uche ma ghara ikwughachi ihe ndị m nụrụ.

Ònye Bụ Nne M?

Otu ụbọchị na 1941, mgbe m dị afọ 19, a kpọrọ m òkù n’otu ụlọ nri ọha mmadụ, ahụkwara m ndị inyom abụọ nọ na-echere m. Otu n’ime ha kwupụtara na ya bụ nne mụrụ m, nakwa na ya bịara ịkpọrọ m laa n’ụlọ. Nwanyị nke ọzọ na-ewe ụmụ agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ n’ọrụ, o kwekwara nkwa inye m ọrụ. O chere na m kwesịrị ịrụ ọrụ iji kwado nne mụrụ m kama nne nke kuchiri m. Ọ dịbeghị mgbe ọ batara m n’uche na nwanyị nke zụlitere m abụghị nne mụrụ m.

Ná mgbagwoju anya, agbagara m ụlọ ma kọọrọ nne kuchiri m ihe merenụ. Ọ na-achịkwa mmetụta uche ya mgbe nile, ma anya mmiri jupụtara ya anya ugbu a. Ọ sịrị na ya chọburu ịgwa m nke ahụ n’onwe ya mgbe m dị otu afọ, e nyefere m n’ụlọ ndị na-eme egwuregwu ntụrụndụ. Mgbe m nụrụ eziokwu ahụ, m tụfuru ntụkwasị obi nile n’ebe ndị mmadụ nọ ma ghọọ onye na-ekewapụ onwe ya, nke na-anọkwa duu.

Ajụrụ m ịnakwere nne mụrụ m. O doro anya site ná nnọkọ anyị dị nkenke na ọ maara banyere ihe ịga nke ọma m, chọọkwa ka m rụọ ọrụ iji kwado ya. Dị ka ebe ọrụ ego enyi ya dị si dị, amatara m na ịrụ ọrụ n’ebe ahụ gụnyere omume rụrụ arụ. Achọrọ m ire nkà ebumpụta ụwa ndị m nwere, ọ bụghị ahụ m. Otú ahụ ka m chere mgbe ahụ, m ka na-echekwa otú ahụ, na m mere mkpebi ziri ezi.

Ọ bụ ezie na m wesoro nne kuchiri m iwe, ekwenyere m na ọ zụwo m nke na m pụrụ inweta mgbe nile ihe e ji adị ndụ. Ka m chekwuru echiche banyere ya, otú ahụ ka m nwere mmetụta na m ji ya ụgwọ karị. O jiriwo nlezianya na alaghị azụ họrọ ọrụ m, chebe m pụọ n’aka ndị ikom chọrọ ọrụ ụmụ agbọghọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ nanị n’ihi omume rụrụ arụ. Ruo taa, ana m ekele ya maka nke ahụ.

Ọ kụziiri m ụkpụrụ dị iche iche. Otu nke o mesiri ike bụ na ee m kwesịrị ịbụ ee, ee e m abụrụkwa ee e. Ọ kụzikwaara m ịnara ibu ọrụ na itipụta ahụ m ọnyá. N’ịgbaso ụkpụrụ ndị ọ kụziri, enwere m ihe ịga nke ọma n’ọrụ m. Echeghị m na m gaara anata enyemaka dị otú ahụ site n’aka nne mụrụ m. Eleghị anya nkuchi e kuchiri m chebere m pụọ ná ndụ dị ize ndụ, echekwara m na m nwere obi ụtọ na o mere.

Nwa Nwoke n’Etiti Agha

Amụrụ m otu nwa nwoke na 1943. N’ikwekọ n’ọdịbendị Japan, bụ́ nke na-amaghị ihe bụ “mmehie,” echeghị m na m mere ihe ọjọọ ma ọ bụ ihe ihere ọ bụla. Enwere m oké obi ụtọ n’ebe nwa m nwoke nọ. Ọ bụ ihe kasị oké ọnụ ahịa m nwere—onye a ga-adị ndụ ma rụọ ọrụ maka ya.

Na 1945 ịtụ bọmbụ ahụ dị oké njọ na Tokyo, aghaghịkwa m ịkpọrọ nwa m gbapụ n’obodo ukwu ahụ. Ihe oriri dị nta, ọ na-arịakwa ọrịa nke ukwuu. Ndị mmadụ jupụtara ọdụ ụgbọ okporo ígwè n’oké ọgba aghara, ma anyị gbalịrị banye ụgbọ okporo ígwè na-aga n’ebe ugwu wee gaa Fukushima. Anyị nọdụrụ n’ebe ahụ n’ime otu ụlọ iri ihe n’abalị ahụ, ma tupu mụ enwee ike ịkpọga obere nwa m nwoke ụlọ ọgwụ, ọ nwụrụ n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ na ụkọ mmiri ahụ. Ọ dị nanị afọ abụọ. Iru újú rikpuru m. Nwoke na-ahụ maka isi mmiri ọkụ n’ụlọ iri ihe ahụ gbara ozu nwa m ọkụ n’ọkụ o jiri sie mmiri e ji asa ahụ.

Ozugbo nke ahụ gasịrị agha ahụ kwụsịrị, alaghachikwara m Tokyo. Bọmbụ akụpịawo obodo ukwu ahụ. Ebe obibi m na ihe nile m nwere lara n’iyi. Agara m n’ụlọ otu enyi m. Ọ gbazinyere m ákwà kimono ya, amalitekwara m ịrụ ọrụ ọzọ. Nne kuchiri m, bụ́ onye kwapụworo na Tokyo, sịrị ka m zitere ya ego ma wuoro ya ụlọ na Tokyo. Arịrịọ ndị dị otú ahụ mere ka m nwee owu ọmụma karịa mgbe ọ bụla ọzọ. M ka na-eru újú n’ihi nwa m nwoke ma na-atụ anya nkasi obi, ma ọ dịghịdị mgbe ọ kpọtụrụ nwa m aha. Nanị ihe ọ na-echegbu onwe ya banyere ya bụ onwe ya.

Ọrụ Ezinụlọ

Ọdịnala kụziri na ọ bụ nne na nna anyị na ndị nna anyị ochie nwe ihe nile anyị nwere, nakwa na ọ bụ ọrụ dịịrị ụmụaka ịkwụghachi ndị mụrụ ha ihe site n’irubere ha isi n’ajụghị ase, na ilekọta ha ruo mgbe ha nwụrụ. Ya mere arụrụ m ọrụ m, ma ihe ndị nne kuchiri m na-arịọ gabigara ókè. Ọ tụkwara m anya n’aka ịkwado ụmụ abụọ nke nwanne ya nwoke, bụ́ ndị o kuchiworo. Ruo mgbe m dị afọ 19, echere m na ha bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị.

Ọtụtụ ndị inyom na-eme egwuregwu ntụrụndụ adịghị alụ di, ha na-ezerekwa inwe ụmụaka nke ha. Ọtụtụ mgbe ha na-ekuchi ụmụ ọhụrụ bụ ndị inyom a mụrụ n’ezinụlọ ndị ogbenye ma zụọ ha dị ka ndị na-eme egwuregwu ntụrụndụ maka nanị nzube nke ịnata nkwado ego iji na-adị ndụ ntụsara ahụ n’agadi. N’ụzọ dị mwute, amalitere m ịghọta ihe mere m jiworo nweta nlekọta na ọzụzụ nile m nwere. Ọ bụ nanị ịnọ ná ntụkwasị obi ego n’ọdịnihu.

Anakweere m ihe ndị a nile, ọ bụ ezie na o juru m anya ihe kpatara na tụkwasị ná nne kuchiri m, aghaghị m ịkwado ‘nwanne m nwoke’ na ‘nwanne m nwanyị,’ bụ́ ndị ahụ sichara ike ma nwee ike ịrụ ọrụ. Ka o sina dị, akwadoro m ha atọ, na-eme ihe nile ha kwuru. N’ikpeazụ, ụbọchị bu ọnwụ ya ụzọ na 1954, nne m gburu ikpere n’àkwà ya, hulata isi, ma kelee m dị ka o kwesịrị. Ọ sịrị na ihe m mere ezuwo. Otu nnakwere nke a na okwu ekele bụ nkwụghachi maka ọtụtụ afọ nke ọrụ m. Afọ ojuju nke ịmata na m rụzuru ọrụ m nile ka na-agba m anya mmiri.

Inye Nwa M Nwanyị Nkwado

Na 1947, aghọrọ m nne nke obere nwa agbọghọ, ekpebikwara m ịrụsi ọrụ ike iji kpakọbara ya akụ̀ na ụba. Kwa abalị ana m apụ jee ọrụ. Amalitekwara m ime egwuregwu n’ihu ndị nkiri n’ụlọ egwuregwu ndị a ma ama na Japan, dị ka Kabukiza ahụ dị na Ginza. Nke a kwa wetara ego dị ukwuu.

Ma ọ bụ ite egwú ma ọ bụ ịkụ egwú shamisen, m na-anata akụkụ ndị bụ isi mgbe nile. Ma, n’agbanyeghị inwe ihe ịga nke ọma nke ụmụ agbọghọ ọzọ na-eme egwuregwu ntụrụndụ na-arọ nanị nrọ ya, enweghị m obi ụtọ. Ikekwe agaraghị m enwe owu ọmụma otú ahụ ma a sị na m lụrụ di, ma ndụ nwanyị na-eme egwuregwu ntụrụndụ na alụmdi na nwunye adịghị agakọ nke ọma. Nanị nkasi obi m bụ Aiko, nwa agbọghọ nta m, ewulitekwara m ndụ m gburugburu ya.

Dị ka ọ na-adịkarị, nwanyị na-eme egwuregwu ntụrụndụ na-azụ ụmụ ha ndị inyom, ma hà bụ ndị ha mụrụ ma ọ bụ ndị ha kuchiri, ịrụ otu ọrụ ahụ. Agbasoro m omenala ahụ, ma ka oge na-aga amalitere m iche echiche banyere ụdị ndụ m na-akwadebe ya maka ya. Ọ bụrụ na ọ gaa n’ihu, ọ ga-apụta na ọgbọ kwuru ọgbọ agaghị ama ma ọlị ihe o yiri inwe ezinụlọ bụ ezie. Achọrọ m igbubi usoro ahụ. Achọrọ m ka Aiko, na ụmụ ya ndị ga-esochi ya, mara ụtọ alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ dị otú o kwesịrị. Achọghị m ka nwa akịrị nke a bụrụ akịrị!

Mgbe Aiko na-abanye n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu ya, ọ ghọrọ onye a na-apụghị ịchịkwa achịkwa. Eri ọnwụ nne kuchiri m afọ ole na ole bu ụzọ, nanị ndị mkpakọrịta Aiko nwere n’ebe obibi abụrụwo ụmụ odibo m were n’ọrụ. Oge na nleruanya m dị ya oké mkpa. Ya mere ọ bụ ezie na m nọ n’agbata afọ ndị 30 nke ndụ m, nọrọkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ọrụ m, ekpebiri m ịgbahapụ ọrụ nke ime egwuregwu ntụrụndụ ma na-anara nanị ọrụ ite egwú na ịkụ egwú shamisen. Akwụsịrị m n’ihi Aiko. Anyị malitere irikọ nri abalị ọnụ, n’ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ isi jụrụ ya oyi. Inye ya oge m rụpụtara ihe ndị dị ịtụnanya.

Ka oge na-aga, anyị kwagara n’ógbè ụlọ obibi dị jụụ, ebe m mepere obere ụlọ nri ọha mmadụ. Aiko tolitere, enwekwara m ahụ iru ala ịhụ ka ọ lụrụ Kimihiro, nwa okorobịa ọma nke gosiri nghọta ná ndụ m biworo.

Okpukpe Aghọọ Ihe Iseokwu

Na 1968, Aiko mụrụ nwa nwa m mbụ. Oge na-adịghị anya site na mgbe ahụ ọ malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Nke a juru m anya n’ihi na anyị enweworị okpukpe. Eguzobewo m nnukwu ebe ịchụàjà ndị Buddha n’ebe obibi anyị mgbe Nne—nne kuchiri m—nwụsịrị, m na-egbukwa ikpere n’ihu ya mgbe mgbe n’ife nne m ofufe. Ọzọ, ana m eleta ili ezinụlọ kwa ọnwa ịga kọọrọ nne m ihe nile merenụ.

Ife ndị nna ochie ofufe juru m afọ. Echere m na m na-eme ihe m kwesịrị ime iji lekọta ndị nna ochie m na iji gosi ha obi ekele, azụlitekwara m Aiko ime otu ihe ahụ. Ya mere enwere m oké ijuanya mgbe ọ gwara m na ya agaghịzi ekere òkè n’ife ndị nna ochie ofufe, na ya agaghịkwa efe m ofufe mgbe m nwụrụ. ‘Olee otú,’ ka m jụrụ onwe m, ‘m pụrụ isi mụọ nwa dị otú ahụ, oleekwa otú ọ pụrụ isi sonyere okpukpe nke na-akụziri ndị mmadụ ka ha ghara igosi ekele otú a nye nna nna ha?’ Ruo afọ atọ ndị sochiri, o yiri ka igwe ojii gbara ọchịchịrị kpuchiri m.

Oge oké mgbanwe bịara mgbe e mere Aiko baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otu Onyeàmà bụ enyi Aiko, n’inwe ijuanya na mụ anọghị ya mgbe e mere nwa m nwanyị baptism, gwara Aiko na ya ga-abịa na nke m. Iwe juru m obi, ma nanị n’ihi na a kụnyesiwo àgwà ndị ziri ezi ike n’ime m, anabatara m ya mgbe ọ bịara. N’ihi otu ihe ahụ, apụghị m ịsị ee e mgbe ọ sịrị na ya ga-alọghachi n’izu na-eso. Nleta ndị a gara n’ihu ruo ọtụtụ izu, ha na-ewe m iwe nke ukwuu nke na ọ dịghị ihe m mụtara site n’ihe o kwuru. Otú ọ dị, nwayọọ nwayọọ, mkparịta ụka ndị ahụ mere ka m chee echiche.

Amalitere m icheta ihe nne m na-adị na-ekwu. Ọ bụ ezie na ọ chọrọ ka e fee ya ofufe mgbe ọ nwụsịrị, obi esighị ya ike banyere ndụ mgbe a nwụsịrị. Ihe ndị mụrụ ụmụ chọrọ karịsịa, ka ọ ga-ekwu, bụ ka ụmụ ha nwee obi ebere n’ebe ha nọ ma soro ha na-ekwurịta okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ mgbe ha ka nọ ndụ. Mgbe m gụrụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Eklisiastis 9:5, 10, na Ndị Efesọs 6:1, 2, ma hụ na Bible na-agba ume otu ihe ahụ, ọ dị m ka akpịrịkpa dapụtara m n’anya. Ihe ndị ọzọ nne m kụziiri m dịkwa na Bible, dị ka na ee m kwesịrị ịbụ ee, ee e m kwa, ee e. (Matiu 5:37) N’ịtụgharị n’uche ihe ọzọ Bible kụziri, anakweere m ọmụmụ Bible a na-amụchi anya.

Mwute na nkụda mmụọ m nweworo n’ime oge ka ukwuu nke ndụ m gbazepụrụ ka m gara n’ihu n’ihe ọmụma Bible. Mgbe m malitere ije nzukọ Ndịàmà Jehova, o metụrụ m n’ahụ n’ụzọ dị omimi. Ebe a bụ ụwa dị iche. Ndị mmadụ bụ ezi ndị, nwee obi ọma, nweekwa omume enyi, o metụkwara m n’obi. A kwaliri m karịsịa mgbe m mụtara banyere ebere Jehova. O ji ịhụnanya na-agbaghara ndị mmehie nile chegharịrị echegharị. Ee, ọ ga-agbaghara mmejọ m nile gara aga, ọ ga-enyekwara m aka ịdị ndụ ọhụrụ!

Mgbanwe Dị Iche Iche ná Ndụ M

Ọ bụ ezie na m chọrọ ife Jehova, enwere m nkekọ siri ike n’ụwa ntụrụndụ. Agafewo m 50 afọ mgbe ahụ, ma m ka na-eme egwuregwu n’ebe ihe nkiri. Abụkwa m onye ndú na otu n’ime ndị nduzi nke ndị egwú shamisen mgbe Danjuro Ichikawa mere ihe nkiri bụ́ Sukeroku na Kabukiza. Ebe ọ bụ nanị ole na ole n’ime ndị egwú shamisen pụrụ ịkụ ụdị katoubushi nke a chọrọ maka Sukeroku, e nweghị onye ga-anọchi m ma ọ bụrụ na mụ akwụsị. Ya mere eyiri m onye ọnyà ji.

Otú ọ dị, otu Onyeàmà meworo agadi, onye na-emekwa ntụrụndụ ọdịnala ndị Japan, jụrụ m ihe mere m ji chee na mụ aghaghị ịkwụsị. “Ndị mmadụ aghaghị ịrụ ọrụ iji kwado onwe ha,” ka ọ kọwara. O nyeere m aka ịhụ na ihe m na-eme emegideghị Akwụkwọ Nsọ, na m pụkwara ife Jehova ma nọgide na-eme egwuregwu m.

Ruo oge ụfọdụ agara m n’ihu na Kabukiza, ụlọ ihe nkiri mbụ nke Japan. Mgbe ahụ, ime egwuregwu malitere ịdanye n’abalị ndị e nwere nzukọ na ha, ya mere arịọrọ m ka a nọchie anya m n’abalị ndị ahụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, oge anyị ji enwe nzukọ gbanwere, m pụkwara ije ma ọrụ ma nzukọ. Ma, iji rute nzukọ n’oge, ọtụtụ mgbe aghaghị m ịmabanye na tagzi na-echere echere ozugbo egwuregwu ahụ gasịrị kama isoro ndị ọzọ mere ihe nkiri nwee ntụsara ahụ dị ka a na-eme ya mgbe nile. N’ikpeazụ, ekpebiri m ịkwụsị.

N’oge ahụ anyị amụgharịwo ihe ruo ogologo oge maka usoro egwuregwu ga-ewe ọnwa isii n’obodo ndị bụ isi nke Japan. Iwelite isiokwu nke ịhapụ gaara akpata nsogbu buru ibu. Ya mere, n’ekwughị ihe ọ bụla banyere ọchịchọ m, amalitere m inye onye ọzọ ọzụzụ ịbụ onye ga-anọchi m. Mgbe e mezuru njem egwuregwu ahụ, akọwaara m onye ọ bụla o metụtara na emezuwo m ibu ọrụ m, nakwa na m gaje ịkwụsị. Ụfọdụ were iwe. Ndị ọzọ boro m ebubo ịdị mpako na ịkpachara anya na-akpatara ha nsogbu. Ọ bụghị oge dị mfe nye m, ma eguzosiri m ike ná mkpebi m ma kwụsị mgbe 40 afọ nke ime egwuregwu ntụrụndụ gasịworo. Kemgbe ahụ, anọwo m na-akụzi egwú shamisen, nke a na-enyekwa ego dị nta.

Imezu Nraranye M

N’ime afọ ole na ole ndị bu ụzọ, ararawo m ndụ m nye Jehova Chineke. E mere m baptism n’August 16, 1980. Mmetụta nke na-erikpu m ugbu a bụ nke ekele dị omimi nye Jehova. M na-ele onwe m anya dị ka onye yitewere nwanyị Sameria nke a kpọtụrụ aha ya n’ime Bible na Jọn 4:7-42. Jisọs ji obi ọma gwa ya okwu, o chegharịkwara. N’otu aka ahụ, Jehova, onye “na-ele obi,” ji obi ọma gosi m ụzọ, n’ihi ebere ya kwa, enwewo m ike ịmalite ndụ ọhụrụ.—1 Samuel 16:7.

Na March 1990, mgbe m gbara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 68 afọ, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Aiko bụkwa onye ọsụ ụzọ, dịkwa ka ụmụ ya atọ. Ha tolitere wee dị ka nne ha n’ikwekọ n’ilu ndị Japan na-asị: “Nwa akịrị bụ akịrị.” Di Aiko bụ onye okenye ndị Kraịst n’ọgbakọ. Lee ka m si bụrụ onye a gọziri agọzi ịbụ onye ezinụlọ m gbara gburugburu, ha nile bụ ndị nọ n’eziokwu, na inwe ụmụnna ime mmụọ ndị ikom na ndị inyom n’ọgbakọ!

Ọ bụ ezie na m nwere ekele maka ndị nna m ochie, ekele m kasị ukwuu na-agara Jehova, onye mewooro m ihe karịa ka mmadụ ọ bụla pụrụ ime. N’ụzọ bụ isi, ọ bụ ekele maka ebere na nkasi obi ya bara ụba na-akpali m ịchọ inye ya otuto ruo mgbe nile ebighị ebi.—Dị ka Sawako Takahashi si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ịmụgharị ihe, mgbe m dị afọ asatọ

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na nne kuchiri m

[Foto dị na peeji nke 25]

Nwa m nwanyị bụ ihe ịnya isi nke ndụ m

[Foto dị na peeji nke 27]

Efere m Nne ofufe n’ihu ebe ịchụàjà ezinụlọ a

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na nwa m nwanyị, di ya, na ụmụ ụmụ m

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya