Obi Ekele Maka Nkwado Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
DỊ KA SHARON GASKINS SI KỌỌ
PARADAỊS n’elu ụwa! Ahụrụ m onwe m ka m na-agbagharị n’elu ahịhịa, na-achụgharị urukurubụba, soro ụmụ ọdụm na-egwu egwu. Ọ magburu onwe ya! Ma e nwere ihe ndị na-eme m abụọ. Lee otú olileanya m siworo jedebe n’obi nkoropụ ọtụtụ ugbo!
Laa nnọọ azụ dị ka m nwere ike icheta, oche wheel abụwo ihe mụ na ya na-anọ mgbe nile. Site n’ọmụmụ gaa n’ihu, ọrịa mmebi ụbụrụ anapụwo m ọṅụ nile nke ịbụ nwata. Ụmụaka ndị ọzọ gwuriri egwu nke ịgbagharị n’elu taya nta a rụnyere n’akpụkpọ ụkwụ na ịgba ígwè. M na-anọdụ ala nanị m, n’enweghị ike ịga ọbụna ije. Ya mere mgbe Nne m kpọgara m ná nke ndị dị iche iche ji okwukwe agwọ ọrịa, anyị ji obi anyị nile na-ele anya maka ọrụ ebube. Otú ọ dị, mgbe mgbe nanị ihe ọ ga-eme bụ ịkwara m laa. Ọ bụụrụ m ihe ndakpọ olileanya ma lee ka o si bụrụ ihe na-agbawa obi nye ya!
Site n’ịtụsi anya ike maka ezi olileanya, nne m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ná mmalite 1964. Mgbe ahụ m dị ihe dị ka afọ isii na ọkara.
Ọ bụ ihe dị ebube ịmụta na ọ dịwo mgbe e nwere otu paradaịs mara mma n’elu ụwa a. Dị ka ihe mwute, nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, tụfuru ya, ma achọsiri m ike ịnọ Chineke nso dị ka Adam n’oge mbụ. Olee otú ọ ga-adịworị iso Chineke nwee mmekọrịta? Ma ọ bụ ịdị ndụ mgbe Ọkpara ya onwe ya zọrọ ije n’ụwa? Nrọ m nile na-eburukwa m gaa na Paradaịs ahụ dị n’ihu. Ọbụna na mgbe ahụ m ka bụ nwata, o doro m anya na anyị achọtawo eziokwu ahụ.
Mama m malitere ịkpọrọ ezinụlọ anyị na-aga Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Nzukọ ha nile dị nnọọ iche site n’ihe anyị hụworo na chọọchị dị iche iche! Ndị ahụ na ọnọdụ e nwere metụrụ m n’ahụ n’ụzọ dị omimi.
Ịkpọga anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ihe ule nye nne m. E wezụga m, e nwere ụmụnne m atọ ndị m tọrọ, anyị enweghịkwa ụgbọ ala. Anyị na-agba tagzi mgbe o nwere ike ịkwụ ụgwọ ya. M ka na-echeta otú o si gbalịsie ike n’otu Sunday. Ọ dịghị tagzi a hụrụ anya. Ma, na mberede, otu nwoke ji gwongworo gbafeta wee buru anyị. Anyị bịara mgbe nzukọ ahụ maliteworo, ma anyị rutere ebe ahụ. Leekwa ka anyị si nwee ekele nye Jehova!
N’oge na-adịghị anya, ezi ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom n’ime mmụọ bụ́ ndị nwere ụgbọ ala nta ji ịhụnanya malite ibu anyị n’usoro n’usoro. Agbamume nne m nyere ka anyị ghara ịhapụ nzukọ ọ gwụla ma anyị nọ n’oké ọrịa mesiri ya ike n’uche m ka na-eto eto ịdị mkpa nke ‘anyị ịdị na-ezukọta.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ihi ịbụ onye ihe ọ mụtaworo kwaliri, nne m raara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptism na 1965.
Mgbe ahụ etoruwo m ogo ijikwu nzukọ kpọrọ ihe n’ụzọ zuru ezu. N’Ọgbakọ Cypress Hill dị na Brooklyn, New York, e nwere ndị Europe, ndị isi ojii, ndị Spain, na ndị ọzọ na-efekọ ofufe ọnụ. O yiri nnọọ ihe ziri ezi na ndị na-atụ egwu Chineke ga na-ebi n’òtù ụmụnna dị otú a.—Abụ Ọma 133:1.
Nne m kụziiri m otú e si akwadebe maka nzukọ. Nke a abụghị nsogbu n’ihe banyere ọgụgụ isi, ma ọ bụ ma a bịa n’elu ahụ. Ọrịa mmebi ụbụrụ na-eme ka ọrụ ndị dị mfe ghọọ oké ihe omume. Ọ bụ, ọ ka bụkwa, ihe na-adịghị ekwe omume nye m ịka akara kwụ ọtọ iji kanye akara n’azịza n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Bible. Otú ọ dị, site n’ịdị na-eme ya mgbe mgbe, enwere m ọganihu n’ịkanye akara n’okpuru ahịrị okwu.
Uche m na-ejubiga ókè n’ihe a ga-ekwu. Ma mgbe ha na-apụta n’ọnụ m, okwu ndị ahụ adịghị edo anya. Ntụsara ahụ dị mkpa ka uru ahụ m ghara ikwetị ekwetị. M ghaghịkwa itinye uche n’ịkpọpụta okwu nke ọ bụla n’ụzọ doro anya ruo otú m nwere ike. M ga-enwe ịda mbà n’obi ma ọ bụrụ na okwu m apụtaghị otú o kwesịrị ma ọ bụ mgbe m maara na ndị mmadụ aghọtaghị okwu ahụ. Otú ọ dị, ozugbo ha matara m, ụmụnna ndị ikom na inyom nọ n’ọgbakọ anyị nwere ike ịghọta ihe m na-ekwu nke ọma karị. Otú ọ dị, m ka na-enwekwa ụbọchị ọma na ụbọchị ọjọọ banyere nsogbu a.
Ọnwa Isii nke Ahụ Erughị Ala
Mgbe m dị afọ asatọ, enwere m ahụmahụ ọnwa isii nke metụtaworo m ruo taa. N’agbanyeghị usoro ịgwọ nkwarụ e nyeworo m maka anụ ahụ, ịrụ ọrụ, na okwu, ndị dọkịta zigara m n’ụlọ ọgwụ ebe a na-enyere ndị ọrụsi aka ịba uru na West Haverstraw, New York. Obi gbawara mụ na nne m. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, mgbe ndị dọkịta mere nchọpụta n’ezighị ezi na uche ezuchaghị m okè, ọ gwara ha na ọ dịghị mgbe ọ ga-etinye m n’ụlọ ọgwụ ndị isi mgbaka. Ya mere ọbụna nkewa ruo nwa oge a siiri ya ike. Otú ọ dị, ọ hụrụ na mụ ibi ndụ na-arụpụta ihe n’adabereghị n’ebe ya na nna m nọ pụtara ilebara onwe m anya n’ụzọ anụ ahụ ruo otú o kwere omume.
Ebe ahụ dị mma, ma m nwere mmetụta nke onye a gbahapụrụ. Oké ibe ákwá na oké iwe mere ka mmetụta m banyere ebe ahụ doo anya. Ndị mụrụ m adịghị emekebe njem bọs ahụ na-ewe hour atọ ahụ iji bịa leta m, karịsịa ebe Mama m dị ime nwa nke ise ya. Mgbe ha ga-ala, ọ na-agbakasị m ahụ nke ukwuu nke na dọkịta ahụ sịrị na ha agaghị na-eleta ọtụtụ ugbo. E kwere ka m laa n’ụlọ nanị ugbo abụọ.
Ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ mee ihe kụziiri m otú e si eje ije site n’enyemaka ihe nkwado a na-akwụnye n’ụkwụ na osisi mkpaabụ e ji opu mee ka ọ dị arọ. Ha yiri ihe dị oké arọ. Otú ọ dị, ịdị arọ ha nyeere m aka iguzo nke ọma ma ghara ịda. Nke a bụ nzọụkwụ mbụ n’ịga ije nanị m n’ejighị ihe nkwado a na-akwụnye n’ụkwụ.
Iberisị nri, ịkpọchi bọtin—ọrụ ọ bụla na-achọ iji mkpịsị aka eme ihe—abụworo m ihe isi ike ma ọ bụghị ihe a na-apụghị ime eme nye m. Ma ruo n’ókè ụfọdụ amụtara m ụzọ isi nye onwe m nri ma yikwasị onwe m uwe. Nke a nyeere m aka n’ozi m na-ejere Chineke.
Ka ọzụzụ m gwụsịrị, m lara n’ụlọ ọzọ. Nne m tinyere m n’ọrụ iji nkà ọhụrụ m ndị ahụ eme ihe. Ime otú ahụ bụ ọgụ mmetụta uche, n’ihi na ọ bụ ezie na m chọrọ imere onwe m ihe, imezu ha na-eweta ịda mbà n’obi, na-eri oge, na-agwụkwa ike. Leenụ, iyikwasị onwe m uwe maka nzukọ bụ ọrụ na-ewe hour abụọ!
Mgbe anyị kwagharịrị kwaga kpọmkwem n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze, m na-eji ụkwụ m aga ya n’onwe m. Nke ahụ bụ oké mmeri!
Ụbọchị M Kasị Nwee Obi Ụtọ ná Ndụ M
Nne m hụrụ na ezinụlọ anyị nwere nri ime mmụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma. O duziiri m ọmụmụ ihe, tụọkwa anya n’aka m ịgụ mbipụta ọ bụla nke akwụkwọ anyị, bụ́ Ụlọ Nche na Teta! E nwere nzukọ ndị a ga-akwadebe ma gaa. Ọ bụ ezie na uche na obi m mịkọọrọ ihe ọmụma a ngwa ngwa, echiche siri ike nke ịrara ndụ m nye Jehova na igosipụta ya site na baptism ime mmiri bụ nke na-apụtaghị ìhè. Mama m nyeere m aka ịhụ na n’agbanyeghị ọrụsị m, m ga-aza Chineke ajụjụ n’onwe m banyere ọnọdụ ime mmụọ m. M pụghị ịtụ anya ịbanye n’ụwa ọhụrụ site n’ihe ọ rụtara, ya akwọrọ m n’azụ banye.
M hụrụ Chineke n’anya, ma ọnọdụ m guzopụrụ m iche dị ka onye dị iche site ná ndị ọzọ—nghọta na-egbu mgbu n’obi nye onye nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu. O siiri m ike ịnakwere erughị eru m. Ọtụtụ mgbe iwe ga-ejupụta m n’obi, a ghaghịkwa ịchịkwa nke a tupu baptism. (Ndị Galetia 5:19, 20) Gịnịkwa ma ọ bụrụ na m pụghị imezu nrara m raara onwe m nye Jehova?
N’ihi arịrịọ mama m, otu okenye ọgbakọ gwara m okwu. O hotara ajụjụ onye amụma bụ́ Elaịja jụrụ ndị Israel: “Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-arụgharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a?” (1 Ndị Eze 18:21) N’ụzọ doro anya, obi adịghị Jehova ụtọ n’ihi enweghị mkpebi m.
M tetere ụra n’ime mmụọ ma kpesie ekpere ike maka enyemaka Jehova na maka mkpebi siri ike ịrara ndụ m nye ya. Otu nwanna nwanyị duziiri m ọmụmụ ihe. M tọrọ ya, nne ya nwụkwara mgbe ọ ka dị nnọọ na nwata. Ka o sina dị, ọ rarawo ndụ ya nye Chineke mgbe ọ ka bụ nnọọ nwata.
Mgbe m dị afọ 17, emere m mkpebi m. M chọrọ ijere Jehova ozi ruo otu ikike m hà. August 9, 1974—mgbe e mere m baptism—bụ ụbọchị m kasị nwee obi ụtọ ná ndụ m.
Ọṅụ n’Ozi Ahụ
Ikere òkè n’ozi welitere ihe mgbochi ụfọdụ ndị yiri ugwu. Ihe ịma aka kasị ukwuu bụ ime ka a ghọta ihe m na-ekwu. M ga-ekwu okwu n’ụzọ na-edo anya ruo otú m nwere ike. Mgbe ahụ, mgbe ọ bụla ọ dị mkpa, onye mụ na ya so n’ozi ubi ga-agwaghachi onye nwe ụlọ ihe ndị m kwuru. Ụfọdụ meghachiri n’ụzọ ọjọọ, na-ele m anya dị ka onye Ndịàmà na-aghọrị. Ma ime nkwusa bụ ihe ruuru m na ọchịchọ nke si m n’obi.
Ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ gburugburu otu ebe nanị pụrụ ime ka ike gwụsịa m. Ọtụtụ ụlọ n’ókèala ịgba àmà anyị nwere stepụ, na-eme ka m ghara inwe ike ịga na ha. N’oge oyi, okporo ámá ndị ice dajuru na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ọrụ ụlọ n’ụlọ bụrụ ihe m na-apụghị ime eme. (Ọrụ 20:20) Otú ọ dị, ụmụnna n’ime mmụọ enyewo aka nke ukwuu, Jehova ejiwokwa oche wheel a na-anya anya gọzie m, bụ́ nke na-eme ka ozi ahụ ka mfe nke ukwuu.
Mgbe oge na-aga amalitere m ịgba àmà site n’akwụkwọ ozi. Iji aka ede akwụkwọ ozi agaghị ezu n’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ adịghị agụta ihe m na-ede. Ya mere ígwè typewriter ji ike eletrik arụ ọrụ ghọrọ ode akwụkwọ m. Adịghị m ejili ígwè ahụ ede ihe ngwa ngwa n’ihi na ọ na-esiri m ike ịchịkwa aka m. Ihe dị ka ọkara oge m na-ede ihe, m na-achọ ịkụ otu bọtin, ma kụọ bọtin ọzọ. Ọ pụrụ iwe otu hour ma ọ bụ karịa iji dee nanị otu peji.
N’agbanyeghị enweghị ume, site n’oge ruo n’oge, m na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka, na-etinye 60 hour ma ọ bụ karịa n’ozi kwa ọnwa. Nke a na-achọ ezi nhazi, itinyekwu mgbalị, na nkwado nke ndị kwere ekwe ibe m. Mmụọ ọsụ ụzọ ha gbara m ume. Nne m esetịpụwokwa ezi ihe nlereanya site n’ije ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nke inyeaka mgbe ọ na-eche ihu n’ihe isi ike, ahụ esighị ike, na ihe ịma aka nke ịzụlite ụmụ asaa n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe ihu.
Ibiri Onwe M
Mgbe m gbara 24 afọ, m kpebiri ibiri onwe m. Nkwapụ m gaa mpaghara Bensonhurst nke Brooklyn ghọrọ ihe ngọzi. Ọgbakọ Marlboro dị ka ezinụlọ e jikọtara nnọọ ọnụ. Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịnọnyere ha! Ọ bụ ezie na e nwere nanị ụgbọ ala nta abụọ ma ọ bụ atọ n’ọgbakọ ahụ, ụmụnna n’ime mmụọ na-akwọga m nzukọ nile. Ma ebighị m ebe ahụ ruo ogologo oge.
N’ihi iche na m bụ onye na-abaghị uru ọ bụla, m laghachikwuru ezinụlọ m wee banye n’afọ atọ nke oké nkụda mmụọ. Ntiwapụ iwe malitere ọzọ. Enwekwara m echiche igbu onwe m, nwaakwa ime ya ọtụtụ ugbo. Ọnwụ nọ na-esi m. Ma adabere m na Chineke ma kwee nkwa igosi ya ekele maka onyinye nke ndụ. Nkasi obi na ndụmọdụ bịara site n’aka ndị okenye. Nke a, ya na ekpere, ọmụmụ ihe onwe onye, ndidi n’akụkụ nke ezinụlọ m, na enyemaka ụfọdụ nke ndị ọka, gbaziri echiche m.
Site n’Ụlọ Nche, Jehova n’ụzọ dị nro nyere m ihe ọmụma banyere ajọ nkụda mmụọ. Ee, ọ na-eche banyere ndị ya ma na-aghọta mmetụta ha nile. (1 Pita 5:6, 7) Ka oge na-aga, oké nkụda mmụọ ahụ kwụsịrị. Afọ iri n’ihu, Jehova ka na-enyere m aka ịnagide ịda mbà n’obi na nkụda mmụọ. Mgbe ụfọdụ mmetụta nke abaghị uru na-afọ nke nta ka o rikpuo m. Ka o sina dị, ekpere, ọmụmụ Bible, na ezinụlọ ime mmụọ m bụ ihe enyemaka ndị dị ebube maka ịlanarị.
Mgbe m chọsịrị ụlọ ọzọ, n’enweghị ihe ịga nke ọma, ekpebiwo m iso ezinụlọ m biri ná ndụ m nile fọrọ n’amaghị ihe ọzọ m ga-eme. Mgbe ahụ Jehova zara ekpere m. Ụlọ pụtara ná mpaghara Bedford-Stuyvesant nke Brooklyn. Ná ngwụsị oge ọkọchị nke 1984, m kwabara na ya, anọwokwa m ebe ahụ eri mgbe ahụ.
Ndị nọ n’Ọgbakọ Lafayette bụ́ ndị na-ahụ n’anya ji obi ọma buga m nzukọ nile. Ihe m ka na-echeta nke ọma bụ Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ mbụ m gara. E mere ya n’okpukpu elu ala nke anọ—e nweghịkwa ígwè mbugo! Nanị site n’enyemaka Jehova ka m ji rịgoro ma rịda stepụ ndị ahụ. Mgbe oge na-aga, a chọtaara m ebe ga-akara m mfe ịga. Ugbu a kwa Jehova agọziwo m site n’ihe ùgwù nke inwe otu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’ebe obibi m.
Mmụọ magburu onwe ya nke ọrụ ọsụ ụzọ jupụtara ọgbakọ a. Mgbe m bịara, e nwere ihe dị ka 30 ndị ọsụ ụzọ, ụfọdụ n’ime ha lekọtakwara m n’ụzọ pụrụ iche. Ọnọdụ ịnụ ọkụ n’obi ahụ kwaliri m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ugboro ugboro karị.
N’April 1989, Ọgbakọ Lafayette na Pratt wuru otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ kpọmkwem ná mgbada okporo ámá ebe m bi. Ọ bụkwa nnọọ n’oge dị mma, n’ihi na n’ihi ịdakpọkwu n’ọnọdụ anụ ahụ, ịga ije aghọwokwa nsogbu ọzọ. Otú ọ dị, site n’iji oche wheel m a na-anya anya, na enyemaka ụmụnna m ndị ikom na ndị inyom ime mmụọ, ịga nzukọ ndị ahụ ma lọta bụ ihe na-enye obi ụtọ. Lee ka m si nwee obi ekele miri emi maka enyemaka ịhụnanya dị otú ahụ!
Obi Ekele Maka Nkwado Chineke
Ọ bụ ezie na ụkwụ m adịghị akwụsi ike, obi m kwụsiri ike. Agụmakwụkwọ dị mma mere ka ndụ katụ mfe, ma Chineke enyeworo m nkwado. Mgbe ụfọdụ, adịghị m ama ebe nri ọzọ m ga-esi bịa, ma Jehova akwadowo m, ọ bụwokwa Onye Na-enye Ihe nke na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ezie, okwu ndị ahụ Devid kwuru na-emetụ m n’ahụ nke ukwuu: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Abụ Ọma 37:23-25.
Ọtụtụ mgbe Jehova enyewo m ike ịnọgide ná nguzo Akwụkwọ Nsọ site n’inyere m aka ịjụ ịnakwere ọbara n’oge ịwa ahụ. (Ọrụ 15:28, 29) N’oge na-adịbeghị anya gara aga, nna m nwụrụ. Onye dị m nso otú a ifunahụ m bụ oké ihe na-egbu mgbu n’obi. Nanị ume sitere n’aka Jehova mere ka m gabiga nke a na ule ndị ọzọ.
Ahụ ike m pụrụ ịnọgide na-adakpọ, ma ntụkwasị obi m na Chineke na mmekọrịta mụ na ya bụ ihe ndị dị ndụ n’ime m. Lee ka m si nwee obi ụtọ ịnọ n’etiti ndị Jehova na inwe nkwado ya nke na-adịghị ada ada!