Jehova Enyewo M Ume
DỊ KA EKUMBA OKOKA SI KỌỌ
A MỤNYERE m n’ezinụlọ “ndị Kraịst” n’otu mba dị n’Ebe Etiti Africa, m jikwa ịhụnanya maka Chineke wee tolite. Nna m bụ onye nkịtị na-anụ ọkụ n’obi nke na-ekwu okwuchukwu na chọọchị, ọtụtụ mgbe m na-esokwa ya mgbe ọ na-akụzi ihe na chọọchị ma ọ bụ n’oge nnọkọ ekpere n’ụlọ ndị mmadụ. Ebe o yikwara ka m bụ nwa okorobịa ji okpukpe kpọrọ ihe, ndị nkịtị ndị ọzọ na-ekwu okwuchukwu họọrọ m ije ozi n’akụkụ onye ụkọchukwu n’oge a na-edo Mass. Ọbụna na ha gwara m na n’otu ụbọchị m pụrụ ịgụ akwụkwọ iji ghọọ onye ụkọchukwu n’onwe m.
Otú ọ dị, n’abalị ana m abụ onye isi ọgụ egwu nke na-agbakwa egwu n’òtù ndị egwu e nwere n’obodo m, bụ́ Matumba-Ngomo. N’akụkụ nke ahụ, esonyeere m ụmụ okoro na agbọghọ ndị bi ná mpaghara obodo anyị n’ụdị nile nke omume rụrụ arụ. Ma aka m lekwara anya inwe nanị otu nwunye n’ọdịnihu na imesịa gaa eluigwe iji soro “ndị nsọ” biri. Ahụghị m mkpa ọ dị ime ka ndụ m dị ọcha n’ihi na, dị ka ozizi Katọlik si dị, a na-agbaghara mmehie m nile n’uhuruchi Saturday ọ bụla n’oge nkwupụta mmehie.
Ihe Isi Ike Amalite
Na 1969, mgbe m na-agụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ kọleji, amalitere m inwe ihe mgbu ná nkwonkwo m nile. Amataghị m ihe kpatara ya, ma n’ime ọnwa ndị sochiri, ọ dịwanyere njọ. Ndị mụrụ m, n’agbanyeghị na ha bụ ndị Katọlik a ma ama, kpebiri ịkpọga m na nke ndị dibia arụsị dị iche iche, bụ́ ndị sịrị na e nwere onye kegidere m, ma na site n’ekpere na ọgwụ ha nile, ha ga-agwọta m. Otú ọ dị, amalitere m ite ụkwụ, mgbe ọ na-erukwa na 1970, o siiri m ike ịga ije ma ọlị, ọbụna mgbe m ji mkpara. N’oge ahụ echere m na ụbọchị ndị m ga-enwe ike ịga ije ga-agwụsị n’isi nso.
Na February 1972 nna m mesịrị kpebie ịkpọga m n’ụlọ ọgwụ dị na Wembo Nyama. Anọrọ m n’ụlọ ọgwụ ahụ ruo ogologo oge nke na a malitere ịkpọ m onye nwe ya! Ndị mmadụ ga-abịa n’ụlọ ọgwụ ahụ, a gwọọ ha, ha alaa, e mesịa n’oge ọzọ ha alọghachite na-enwe nsogbu ọzọ, aka m ga-anọkwa ebe ahụ! Ọ dị mkpa na nna m laghachiri ụlọ maka owuwe ihe ubi osikapa, ma ugbu a alụwo m nwanyị, nwee ụmụ abụọ, ezigbo nwunye m, ọ bụ ezie na ọ gbara nanị afọ 21, lekọtakwara m anya ma chọta ọrụ ka o wee nwee ike ilekọta mkpa anyị.
Ka o sina dị, enwere m oké nkụda mmụọ n’ihi ọnọdụ ahụ nile. N’afọ ndụ 24, ọnọdụ m ka na-adịwanye njọ, ebe ndị enyi m na-eme nke ọma, ọtụtụ n’ime ha na-arụ ọrụ na-adịgide adịgide. O yiri m ka ọ ga-akara mmadụ nile mma ma ọ bụrụ na mụ egbuo onwe m. N’ihi ya, ekesaara m ụmụ m na ụmụnna m ihe nile m nwere, n’agwaghị ha ihe m bu n’uche. Ọ dịghị ihe m hapụụrụ onwe m e wezụga uwe elu na-amasịkarị m nke m chọrọ ka e jiri lie m.
Mmalite nke Ndụ Ọhụrụ
Mgbe ahụ e kenyere otu n’ime Ndịàmà Jehova àkwà na-eso nke m. Ọ bụ ezie na o kpuru ìsì n’otu anya, ọ nọkwa n’ihe ize ndụ nke ịtụfu ọhụhụ ụzọ n’anya nke ọzọ, ọ malitere ozugbo ịgbara m àmà site na Bible banyere Jehova na Alaeze ahụ. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ọ hapụrụ ụlọ ọgwụ ahụ, ma o tinyere m n’aka nlekọta Ndịàmà ụfọdụ ndị letara ya. Mgbe mkparịta ụka ndị ọzọ gasịrị, ndị a lakwara, ma otu n’ime ha nọgidere na-amụrụ m ihe site n’ide akwụkwọ ozi. O nyekwara m akwụkwọ dị iche iche ndị e ji amụ Bible, bụ́ ndị m ji obi ụtọ dị ukwuu gụọ.
N’ụzọ dị otú a anatara m nri ime mmụọ, nwayọọ nwayọọ nkụda mmụọ m gbanwekwara ịghọ obi ụtọ. O yiri ka chọọchị m anọwo na-enye m “mmiri acid” ka m na-aṅụ, ma ugbu a ana m anata mmiri nke ndụ n’efu. Ekelere m Jehova n’ime obi m n’ihi ịtọhapụ m site na nkwenkwe ndị na-enweghị isi, dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ịtụ egwu ndị nwụrụ anwụ, na ofufe ndị nna ochie.
Ma ugbu a achọrọ m ịhapụ ụlọ ọgwụ ahụ. Mgbe ahụ anụrụ m na a ga-ekenye ezinụlọ abụọ nke ndị ozi ala ọzọ ọrụ na Wembo Nyama, ya mere ekpebiri m ịnọgide ruo ọbịbịa ha. Lee ka m si nwee obi ụtọ mgbe ha mesịrị chọta m n’àkwà ụlọ ọgwụ m! Ugbu a enwere m ike ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible m n’ihu na ihu karịa ịbụ site n’akwụkwọ ozi.
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ajụrụ m ma hà na-enwe nzukọ ha nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, dị ka m gụtaworo na magazin ndị ahụ. Ha ji obi ọma gwa m na ha na-eduzi nzukọ ha nile n’otu obere ụlọ ntu nke otu n’ime ha bi na ya. Ha kwukwara na ha ga-enwe obi ụtọ iji ịnyịnya ígwè kpọga m ebe ahụ! N’agbanyeghị oké ahụ mgbu m na-enwe n’ọkpụkpụ azụ m na nkwonkwo m nile, eji m ọṅụ gaa nzukọ nile. Mgbe m nwekwara iru eru ndị a chọrọ, enwere m ike ọbụna inye akụkọ ozi kwa ọnwa dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism, na-amalite n’April 1974.
Ọnwa atọ mgbe nke a gasịrị, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site ná mmikpu n’ime mmiri. Agbaara m ndị ọrụ ahụ ike nke ụlọ ọgwụ ahụ, ndị ọrịa nọ n’ebe ahụ, ndị ozi ala ọzọ nke Protestant ndị bịara ime nleta, na ndị òtù ezinụlọ m, àmà—n’agbanyeghị oké nguzogide nke ndị ezinụlọ m. N’oge a, agbara m àmà mgbe m na-edina n’àkwà ma ọ bụ nọrọ n’oche nkwagharị nke ụlọ ọgwụ ahụ nyere m ruo mgbe m nwere ike ịzụta nke m.
Ntachi Obi Wetara Uru Dị Iche Iche
N’agbanyeghị nguzogide nke ezinụlọ m, anọgidere m na-eje ije n’ụzọ Jehova, a gọzikwara m nke ukwuu. Nwunye m nakweere eziokwu ahụ, e meekwa ya baptism na 1975. Anyị kpebiri ibi na Katako-Kombe, bụ́ ebe e nwere otu ọgbakọ e guzobewororịị. Ndị mụrụ m chegburu onwe ha banyere anyị n’ihi na otu onye agwawo ha na a ga-egbusisị Ndịàmà nile na 1975. Mgbe anyị jụrụ ịhapụ ndị anyị na ha na-akpakọrịta, ha kwụsịrị izitere anyị nri, anyị dabakwara n’oké mkpa nke ihe onwunwe. Echetara m na n’otu oge nwa m nwoke nke nta tụbọrọ n’ihi agụụ mgbe anyị nọworo otu ụbọchị na ọkara n’enweghị nri. Ma mgbe ahụ ụmụnna anyị ndị Kraịst wetaara anyị azụ na ihe oriri. E mesịa, ndị mụrụ m malitere inyere anyị aka ọzọ, ma ọ dịghị mgbe ụmụnna anyị kwụsịrị inye anyị enyemaka ihe onwunwe.
Na February 1975 aka nri m kpọnwụrụ wee malite ịtalata. Ma ejigidere m okwukwe m, kpebiekwa ịnọgide jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi. Obi dị m ụtọ ikwu na aka m mesịrị sie ike ọzọ, m ka pụkwara imegharị ya taa, bụ́ nke na-enyere m aka imeghe Bible m ma jiri akwụkwọ ndị Society na-ebipụta na-eme ihe.
Obi Ike n’Ihu Ndị Isi Ọchịchị
Na 1977 kọmishọna ógbè anyị boro m ebubo n’ihu ụlọ ọrụ ọchịchị nke ime obodo, bụ́ ndị ka jidere otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke nọ n’ọgbakọ dị nso. Otu ụbọchị onye soja ji akwụkwọ ịkpọ òkù ụlọ ikpe chọta m. Esooro m ezinụlọ m kpee ekpere, gbaa ọgbakọ ahụ ume, wee soro ya gaa. Site ná mmụọ Jehova, enwere m ike iji obi ike zaghachi ebubo nile ahụ, mgbe mụ na ndị isi ọchịchị nkịtị na nke ndị agha nwesịrị nkwurịta okwu dị ogologo, a tọhapụrụ mụ na onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche.
Mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị, onye kọmishọna ọzọ kpọrọ m, ọzọkwa, site n’enyemaka Jehova, enwere m ike iji ọṅụ na obi ike kwuchitere ozi ọma ahụ okwu. Mụ na onye nke a nwere mkparịta ụka dị ogologo, ná ngwụsị ya kwa, ọ tọhapụrụ m ma jiri aka ya kwapụtara m oche nkwagharị m n’èzí ọfis ya. Mgbe ahụ o jiri nwayọọ kwuo, sị: “Bịa n’ụlọ m n’uhuruchi taa.” Mgbe m letasịrị ya ọtụtụ ugbo, enwere m ike ịmalitere ya ọmụmụ Bible. N’ikpeazụ, eduziiri m mmadụ asaa dị iche iche nọ n’ọkwá ọchịchị ọmụmụ Bible ebe obibi. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha gakwara nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ, bụ́ ndị a haziri n’ógbè ahụ.
Ije Ozi Pụrụ Iche
Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka, n’agbanyeghị ọrịa m, imezu nkwa m nke iji ume m nile jeere ya ozi. N’etinyeghị akwụkwọ maka ya, anwara m iru ihe a chọrọ n’aka onye ọsụ ụzọ inyeaka. Jehova nyeere m aka inwe ihe ịga nke ọma, ya mere edejupụtara m akwụkwọ maka ije ozi nke a n’ọnwa June ruo October. E mesịa Society nakweere akwụkwọ m tinyere maka ije ozi ọsụ ụzọ oge nile, a malitekwara ije ozi nke a na November 1976. Na September 1977, e mere ka ọṅụ m zuo ezu mgbe m natara ọrụ dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ dị na Katako-Kombe.
Olee otú m si nwee ike ịrụzu nke a? M na-eji oche nkwagharị m gazuo ókèala ahụ site n’enyemaka ezi nwunye m na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ. Ọbụna na mgbe ụfọdụ ana m eji osisi mkpaabụ gaa nanị m. Adara m ada otu ugbo ma ọ bụ abụọ. Nanị ihe m ga-eme bụ ichere, n’emegharịghị ahụ n’ala, ruo mgbe onye na-agafe agafe ga-enyere m aka ibilite ma nyeghachi m osisi ahụ m ji eje ije. Ana m echeta mgbe nile mkpebi siri ike nke ndị ozi na ndị ahụ na-eso ụzọ Jisọs. (Ọrụ 14: 21, 22; Ndị Hibru 10:35-39) Oge ọ bụla m dara ada, ana m ekpe ekpere ka Jehova ghara ikwe ka m nwee nkụda mmụọ, kama ka o nye m ume ịnọgide na-ejere ya ozi. Ana m echeta mgbe nile nkwa ahụ dị ebube e dekọrọ n’amụma Aịsaịa, nke na “onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.”—Aịsaịa 35:6.
Ka m na-amụba ije ozi m, otú ahụ ka m na-enwe ike karị imeri nkwarụ anụ ahụ ndị m nwere. Na 1978 enwere m ihe ùgwù nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na Lubumbashi, nke gụnyere iji gwongworo, ụgbọ mmiri, na ụgbọ okporo ígwè gaa ngụkọta njem 1,200 maịlụ [2,000 kilomita]. N’ikwu eziokwu, maka njem nke a Jehova mere ka ume dị ukwuu jupụtara m. (Aịsaịa 12:2; 40:29) Ugbu a apụrụ m ọbụna ije ije—site n’oké ihe isi ike—ruo 300 amaụkwụ [100 mita] n’enweghị enyemaka nke nkwà m. Obi siri m ike na Jehova nụrụ ekpere m kpere laa azụ n’afọ 1973 nke inye m ume iji mkpebi siri ike jeere ya ozi.
Ọrụ Ọhụrụ E Kenyere M
Na 1984, mgbe m nọsịworo afọ asaa n’ọgbakọ dị na Katako-Kombe, e kenyere m ọrụ ọhụrụ isoro ọgbakọ dị na Lodja-Centre rụọ ọrụ. Mgbe otu afọ gasịrị anyị malitere ógbè ọmụmụ akwụkwọ ọhụrụ n’ebe dị maịlụ 7 [12 kilomita] n’anya, ngwa ngwa anyị malitekwara ọzọ n’ebe dị 20 maịlụ [30 kilomita] site na nke ahụ. A nakweere nke ikpeazụ a ngwa ngwa dị ka òtù dịpụrụ adịpụ, na 1988 a na-batakwara ya dị ka otu ọgbakọ, bụ́ ebe m na-eje ozi ugbu a dị ka onye okenye.
Ozi ọsụ ụzọ adịwo m nnọọ mma, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ. Mgbe m nọ n’ozi, jiri osisi mkpaabụ m na-eme ihe, enwere m ike inwezu mmegharị ahụ nke ndị dọkịta kwuru ka m na-enwe. Ike adịwo m nke ukwuu ugbu a karịa ka ọ dị m mgbe m malitere ọrụ ọsụ ụzọ, ọchịchọ m bụkwa ka m nọgide n’ọrụ nke a ruo ọgwụgwụ. Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ mgbe Jehova ga-enyere m aka ‘ịmali dị ka ele’ n’oge mgbe ọ na-agaghị adịkwa m mkpa ịnagide oké ihe mgbu nke ọrịa nke a.
Site n’obi m nile, ana m ekele Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye nyeworo m ume, obi ike, na ije ozi oge nile ahụ. Adị m afọ 36 ugbu a, ka m tinyesịwokwara afọ 11 n’ọrụ ọsụ ụzọ, enwere m olileanya ịnọgide n’agbanyeghị ihe ọdịnihu ga-eweta. Ekpebisiri m ike iji oké ike m nile mee ihe n’iwetara Chineke ukwu ahụ bụ Jehova otuto na nsọpụrụ.