Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 22-25
  • ‘A Tụdara M n’Ala, Ma A Laghị M n’Iyi’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘A Tụdara M n’Ala, Ma A Laghị M n’Iyi’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndọla Azụ n’Ezie
  • Ezinụlọ Obi Ụtọ
  • Imeri Ahụ Mkpọnwụ nke Ime Mmụọ
  • Ịnagide Ihe Ndọla Azụ Ọzọ
  • Ime Ihe M Pụrụ Imeli
  • Jehova Enyewo M Ume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Obi Ekele Maka Nkwado Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ọrịa M Na-arịa Emeghị Ka Ike Gwụ M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Iji Ọṅụ Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 22-25

‘A Tụdara M n’Ala, Ma A Laghị M n’Iyi’

DỊ KA ULF HELGESSON SI KỌỌ

Na July 1983, ndị dọkịta hulatara ala n’akụkụ m tiri mkpu, sị: “Ọ mụ anya!” A wapụwo akpụ dị sentimita 12 n’ọkpụkpụ azụ m n’ịwa ahụ dị mgbagwoju anya nke were hour 15. Ahụ nile kpọnwụrụ m.

ỤBỌCHỊ ole na ole mgbe nke a gasịrị, e bugara m n’ụlọ ọgwụ dị ihe fọrọ nta ka ọ bụrụ 60 kilomita site n’obodo m bụ́ Hälsingborg, na ndịda Sweden. N’ebe ahụ m sonyeere usoro ihe omume e ji enyere ndị ọrụsị aka ịba uru. Onye ọkà n’usoro ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ sịrị na ọ ga-achọ ihe dị ukwuu, ma ọ dị m ọkụ n’obi ịmalite. M chọrọ ịga ije ọzọ n’ezie. Site n’iji ịdị uchu na-enwe usoro mmega ahụ na-ewe hour ise kwa ụbọchị, enwere m ọganihu dị ngwa.

Otu ọnwa mgbe nke ahụ gasịrị mgbe onye nlekọta na-ejegharị ejegharị bịara leta ọgbakọ anyị, ya na ndị okenye ọgbakọ ndị ọzọ mere njem ahụ tere anya iji nwee nzukọ ndị okenye ọgbakọ n’ọnụ ụlọ m n’ụlọ ọgwụ. Lee otú obi m si ṅụrịa n’ihe àmà nke a nke ịhụnanya ụmụnna! Ndị nọọsụ nọ ná ngalaba ụlọ ọgwụ ahụ nyere ìgwè ahụ nile tii na achịcha mgbe nzukọ ahụ gasịrị.

Ọganihu m tụrụ ndị dọkịta ahụ n’anya na mbụ. Mgbe ọnwa atọ gasịrị m pụrụ ịnọlite n’oche mbugharị m na ọbụna guzo ruo oge nta. Enwere m obi ụtọ ma kpebisie ike ịga ije ọzọ. Ezinụlọ m na ndị Kraịst ibe m nyere m agbamume dị ukwuu n’oge nleta ha. Ọbụna na m nwere ike ịla ụlọ ruo nwa mkpirikpi oge.

Ihe Ndọla Azụ n’Ezie

Otú ọ dị, mgbe nke ahụ gasịrị, enweghị m ọganihu ọzọ. N’oge na-adịghị anya onye ọkà n’usoro ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ nyere m ozi na-egbu mgbu: “Ahụ agaghị adị gị mma karịa nke a!” Ihe a na-achọsizi ike ime ugbu a bụ iwusi m ike ịgagharị n’onwe m n’elu oche mbugharị m. M chere ihe ga-eme m. Olee otú nwunye m ga-esi na-ebi? A wawo ya onwe ya ahụ siri ike, ọ chọkwara enyemaka m. Ọ̀ ga-adị m mkpa ịnọgide na-enweta nlekọta ụlọ ọgwụ?

Adara m mbà n’obi nke ukwuu. Ume, obi ike, na ike m pụchara. Ọtụtụ ụbọchị gafere, m ka nọkwa n’agaghị ije. Ọ bụghị nanị na ahụ kpọnwụrụ m n’elu ahụ kamakwa ahụ kụnwụrụ m ná mmetụta uche na n’ime mmụọ. ‘A tụdara m n’ala.’ M leworị onwe m anya mgbe nile dị ka onye siri ike n’ụzọ ime mmụọ. Enwere m okwukwe gbadosiri mkpọrọgwụ ike n’Alaeze Chineke. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Ekwetara m ná nkwa Bible na a ga-agwọ ọrịa na nrịanrịa nile n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke nakwa na a ga-eweghachi ihe nile a kpọrọ mmadụ ná ndụ zuru okè n’ebe ahụ. (Aịsaịa 25:8; 33:24; 2 Pita 3:13) Ugbu a m na-enwe mmetụta nke onye ahụ kpọnwụrụ ọ bụghị nanị n’anụ ahụ kamakwa n’ime mmụọ. M nwere mmetụta nke ịbụ onye ‘a lara n’iyi.’—2 Ndị Kọrint 4:9.

Tupu mụ agaa n’ihu, ka m kọtụrụ gị banyere ebe a zụlitere m.

Ezinụlọ Obi Ụtọ

A mụrụ m na 1934, ahụ ike m adịwokwa mma mgbe nile. Ná mmalite afọ ndị 1950, ezutere m Ingrid, anyị lụkwara di na nwunye na 1958 ma biri n’obodo Östersund n’ebe etiti Sweden. Oge oké mgbanwe ná ndụ anyị bịara na 1963 mgbe anyị malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. N’oge ahụ anyị nwere ụmụntakịrị atọ—Ewa, Björn, na Lena. N’oge na-adịghị anya ezinụlọ anyị nile nọ na-amụ ihe ma na-aga n’ihu nke ọma n’ihe ọmụma nke eziokwu Bible.

Nwa ntakịrị oge mgbe anyị malitesịrị ịmụ ihe, anyị kwagara Hälsingborg. N’ebe ahụ, mụ na nwunye m raara onwe anyị nye Jehova, e mekwara anyị baptism na 1964. Obi ụtọ anyị mụbara mgbe e mere ada anyị, bụ́ Ewa, baptism na 1968. Afọ asaa n’ihu, na 1975, e mekwara Björn na Lena baptism, n’afọ na-esonụ a họpụtakwara m dị ka okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst.

Ọrụ ego m nyeere m aka inye ezinụlọ m ihe na-akpa ya n’ụzọ ihe onwunwe. Obi ụtọ anyị mụbakwara mgbe Björn na Lena weere ozi oge nile. N’oge na-adịghị anya a kpọrọ Björn ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova n’Arboga. Dị ka a pụrụ ikwu ya, anyị enweghị nsogbu ná ndụ. E mesịa, ná mmalite nke afọ 1980, m malitere inwe mmetụta nke akpụ ahụ nke e mesịrị wepụ n’ịwa ahụ ahụ siri ike na 1983.

Imeri Ahụ Mkpọnwụ nke Ime Mmụọ

Mgbe a gwara m na m gaghị aga ije ọzọ, ndụ yiri m ihe dakpọworo n’enweghị olileanya. Olee otú m si nwetaghachi ume ime mmụọ? Ọ dị mfe karịa ka m chere. Nanị ihe mere bụ iburu Bible mụ wee malite ịgụ ya. Ka m na-agụwanye ya, otú ahụ ka m na-anatawanye ume ime mmụọ. Karịsịa m bịara hụ abamuru nke Ozizi Elu Ugwu Jisọs. M gụghachiri ya ọtụtụ ugboro ma tụgharịa uche na ya.

E weghachiri nchekwube obi ụtọ m banyere ndụ. Site n’ịgụ ihe na ịtụgharị uche, m malitere ịhụ ohere dị iche iche karịa ihe mgbochi. M nwetaghachiri ọchịchọ m isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible, m mezukwara ọchịchọ a site n’ịgbara ndị ọrụ ụlọ ọgwụ na ndị ọzọ m zutere àmà. Ezinụlọ m kwadoro m n’ụzọ zuru ezu ma nata ọzụzụ otú ha ga-esi na-elekọta m. N’ikpeazụ enwere m ike ịhapụ ụlọ ọgwụ ahụ.

N’ikpeazụ m lọtara ụlọ. Lee ụbọchị obi ụtọ nke ahụ bụụrụ anyị nile! Ezinụlọ m haziri usoro ime ihe nke gụnyere ilekọta m. Nwa m nwoke, bụ́ Björn, kpebiri ịhapụ ọrụ ọ na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, ọ lọtakwara ụlọ iji nye aka ilekọta m. Ọ na-akasi obi nke ukwuu ịbụ onye ezinụlọ m wụkwasịrị ịhụnanya na nchebara echiche dị ukwuu otú ahụ.

Ịnagide Ihe Ndọla Azụ Ọzọ

Otú ọ dị, ka oge na-aga, ahụ ike m kara njọ, o sikwaara m ike ịzọpụ ụkwụ. N’ikpeazụ, n’agbanyeghị mgbalị nile ezinụlọ m tinyere, ha enwekwaghị ike ilekọta m n’ụlọ. Ya mere m chere na ọ ga-akasịrị m mma ịbanye n’ebe a na-elekọta ndị nwere mkpa pụrụ iche. Ọzọkwa, ọ pụtara ime mgbanwe na usoro ọhụrụ nke ime ihe. Ma ekweghị m ka nke a bụrụ ihe ndọla azụ ime mmụọ.

Esepụghị m aka n’ọgụgụ na nnyocha Bible. M nọgidere na-atụle ihe m pụrụ ime, ọ bụghị ihe m na-apụghị ime. M tụgharịrị uche ná ngọzi ime mmụọ nile nke Ndịàmà Jehova nwere. M nọrọ Jehova nso n’ekpere ma jiri ohere ọ bụla kwusaara ndị ọzọ ozi ọma.

Ugbu a m na-anọ ọnọdụ abalị m na ụfọdụ ehihie m n’ebe a na-elekọta ndị nwere mkpa pụrụ iche. M na-eji ehihie na uhuruchi nile nọrọ n’ụlọ ma ọ bụ ná nzukọ ndị Kraịst anyị. Ndị ọrụ ebere na-eme ndokwa maka ụgbọ njem ịga na ịlọta nzukọ ndị ahụ na ịga na ịlọta site n’ụlọ m. Ezinụlọ m na-arụsi ọrụ ike, ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ, na ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-elekọta ndị nwere mkpa pụrụ iche na-elekọta m n’ụzọ magburu onwe ya.

Ime Ihe M Pụrụ Imeli

Adịghị m ewere onwe m dị ka onye ọrụsị, ezinụlọ m na ụmụnna m ndị Kraịst adịghịkwa emeso m otú ahụ. E ji ịhụnanya na-elekọta m, na-enyere m aka ịga n’ihu na-eje ozi n’ụzọ dị irè dị ka onye okenye. M na-eduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwa izu, nakwa ọmụmụ ihe ọgbakọ kwa izu nke Ụlọ Nche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O siiri m ike isape peji Bible, ya mere a na-ekenye mmadụ ọrụ inyere m aka ime nke ahụ ná nzukọ ndị ahụ. M na-anọ n’oche nkwagharị m na-eduzi nzukọ ma na-enye okwu ihu ọha.

Otú a m ka pụrụ ime ọtụtụ n’ime ihe ndị na-adị m ụtọ ime na mbụ, tinyere ịga nleta ọzụzụ atụrụ. (1 Pita 5:2) M na-eme nke a mgbe ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bịakwutere m maka enyemaka ma ọ bụ okwu ndụmọdụ. M na-ejikwa telifon eme ihe, na-ebu ụzọ akpọ ndị ọzọ na fon. Agbamume na-esi na ya apụta na-abụ nke mụ na onye ahụ na-enwekọrịta. (Ndị Rom 1:11, 12) Otu enyi m kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Mgbe m nọ nnọọ na-enwe nkụda obi, ị na-akpọtụrụ m iji gbaa m ume.” Ma a na-agbakwa m ume, ebe m maara na Jehova na-agọzi mgbalị m.

Tupu na mgbe nzukọ gasịrị, m na-esoro ụmụaka nọ n’ọgbakọ enwe mkpakọrịta dị mma. Ebe m na-anọdụ n’oche nkwagharị m, anyị na-agwarịta onwe anyị okwu dị ka à ga-asị na anyị hà n’ogo. Obi eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ ha na-amasị m. Otu nwa okorobịa gwara m n’otu mgbe, sị: “Ị bụ onye ọrụsị mara mma pụrụ iche!”

Site n’ilekwasị anya n’ihe m pụrụ ime kama ichegbu onwe m banyere ihe m na-apụghị ime, m nọwo na-anụ ụtọ ijere Jehova ozi. Amụtawo m ọtụtụ ihe site n’ihe meworo m. M ghọtawo na ule ndị anyị na-agafe na-azụ ma na-ewusi anyị ike.—1 Pita 5:10.

Achọpụtawo m na ọtụtụ ndị ahụ dị mma adịghị aghọta na anyị aghaghị iji ofufe nke Nna anyị nke eluigwe kpọrọ ihe mgbe nile. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, usoro ọmụmụ ihe anyị, nzukọ, na ozi ubi pụrụ ịbụ nanị ihe e ji emezu iwu. M na-ele ndokwa ndị a nile anya ịbụ ihe ndị dị mkpa iji lanarị ọgwụgwụ nke ụwa nke a baa n’ime Paradaịs elu ala nke Chineke kwere ná nkwa.—Abụ Ọma 37:9-11, 29; 1 Jọn 2:17.

Anyị aghaghị ime ka olileanya nke ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke na-abịanụ nọgide na-adị ọhụrụ n’obi anyị mgbe nile. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Amụtawokwa m ịghara ịda mbà n’ọgụ m na-alụ megide ọchịchọ ọ bụla nke ịbụ onye a kụdara aka. Amụtawo m ile Jehova anya dị ka Nna m na nzukọ ya dị ka Nne m. Abịawo m ghọta na ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị, Jehova pụrụ iji onye ọ bụla n’ime anyị mee ihe ịbụ onye ohu ya dị irè.

Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ m nwewo mmetụta na, dị ka a pụrụ ikwu ya, ‘a tụdara m n’ala, a labeghị m n’iyi.’ Jehova na nzukọ ya ahapụbeghị m mgbe ọ bụla, ezinụlọ m na ụmụnna m ndị Kraịst ahapụbeghịkwa m. N’ihi iburu Bible na ịmalite ịgụ ya, m nweghachiri ume ime mmụọ. M na-ekele Jehova Chineke, onye na-enye “ọkịka nke ike” mgbe anyị na-atụkwasị ya obi.—2 Ndị Kọrint 4:7.

N’obi ike zuru ezu na ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam, m ji ịnụ ọkụ n’obi na-elepụ anya n’ọdịnihu. Obi siri m ike na n’oge na-adịghị anya Jehova Chineke ga-emezu nkwa ya banyere paradaịs e weghachiri n’ebe a n’elu ala ya na ngọzi nile dị ebube ọ ga-eweta.—Mkpughe 21:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya