Ijiji Ndị Ahụ Na-asọ Oyi—Hà Bara Uru Karịa Otú I Chere?
ỌTỤTỤ n’ime anyị na-ele ijiji anya dị ka akpa nsogbu ma ọ bụ nnọọ dị ka ihe ize ndụ nye ọha mmadụ. Ma ndị ọkà mmụta n’ihe ndị dị ndụ na-achọpụta na ijiji bara uru karịa otú anyị chere, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịdị na-enye nsogbu.
Ọtụtụ ụdị na-etinye ihe ka ukwuu n’ụbọchị ha n’ileta okooko osisi, bụ́ ebe e si enweta nri ratụ ratụ, nke na-enye ụmụ ahụhụ ndị na-adabere na ha ma mmiri ụtọ ma ntụ okooko osisi. Ijiji ụfọdụ ndị pụrụ ịmịrị ihe ndị na-edozi ahụ site ná ntụ okooko osisi—na-abụghị ihe dị mfe n’onwe ya—na-adabere ná nri nke a na-enye oké ike iji zụlite àkwá ha.
Ka ha na-eme nleta site n’otu okooko osisi gaa n’ọzọ, ijiji ndị ahụ na-eburu ụmụ iberibe ihe na-anyakụrụ anyakụrụ nke ntụ okooko osisi, bụ́ ndị na-anyakụrụ n’ahụ ha. Otu ijiji nke ndị ọkà mmụta n’ihe ndị dị ndụ jiri nlezianya nyochaa nwere 1,200 ụmụ iberibe ntụ okooko osisi n’ahụ ya! Ka e meworo nnyocha ka ukwuu n’òkè ijiji na-ekere n’ifesa ntụ, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na okooko osisi ụfọdụ na-adabere na ha maka nlanarị ha.
Magazin bụ́ Natural History na-akọwa usoro nnwale e mere na Colorado, n’Ebe Ugwu America. E tere ijiji muscoid a na-ahụkarị ebe nile, nke yiri ijiji ụlọ, àgwà ndị na-egbukepụ egbukepụ ka e wee nwee ike ịmata ebe ha nọ n’ụzọ dị mfe. Mgbe e nyochasịrị ihe omume kwa ụbọchị ha, o juru ndị ahụ na-eme nnyocha anya ịchọpụta na nye okooko osisi ndị dị n’ime ọhịa, ijiji bụ ndị ka mkpa n’ifesa ntụ okooko osisi karịa aṅụ, nakwa na ha na-eferu ebe dị anya karịa aṅụ.
Ruo n’ókè hà aṅaa ka ọrụ ijiji dị mkpa? E ji ihe kpuchie ụfọdụ okooko osisi ka ijiji wee ghara ileta ha. Okooko osisi ndị a amịghị mkpụrụ ma ọlị—n’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe ndị dị ha nso mịrị mkpụrụ dị bụ́ ndị ijiji fesara ntụ okooko osisi. Ọ bụ ezie na aṅụ fesara ntụ okooko osisi n’ụzọ bụ́ isi n’okooko osisi ụfọdụ, n’ọnọdụ nke ụdị ndị ọzọ, dị ka flax ọhịa ma ọ bụ geranium ọhịa, n’ọnọdụ ịdị elu ụfọdụ, ijiji rụrụ ihe karịrị 90 pasent nke ọrụ a.
Gịnị bụ nkwubi okwu Carol Kearns na David Inouye, mmadụ abụọ n’ime ndị ahụ na-eme nchọpụta? “Mgbe ahụ, nye ọtụtụ okooko osisi ọhịa n’Ugwu Colorado, ijiji na-arụ ọrụ karịa aṅụ, urukurubụba, na nza . . . E wezụga ụmụ ahụhụ ndị a, nke ọtụtụ ndị mmadụ na-enwechaghị mmasị na ha, ọtụtụ n’ime okooko osisi ọhịa ndị na-eme ka ileta ala ahịhịa nke ugwu alp bụrụ ihe oké obi ụtọ agaghị abụ ihe na-adọrọ adọrọ.” Obi abụọ adịghị ya, ijiji nwere uru ndị ha bara!