N’ihi Gịnị Ka Ikike Chọọchị Ji Ada?
“Onye Stoik ọ bụla bụ onye Stoik; ma n’ime Krisendọm olee ebe onye Kraịst nọ?”
RALPH WALDO EMERSON, ONYE AMERICA NA-EDE EDEMEDE NA ABỤ URI NA NARỊ AFỌ NKE 19.
“ABỤ m onye Katọlik—ma abụghị m nke ezigbo ya,” ka otu nne na-eto eto na-akọwa. “Apụghị m inwe mmasị n’okpukpe,” ka otu onye nọ n’afọ iri na ụma na-agbakwụnye. Okwu ha yiri nke ọgbọ ndị na-emebeghị okenye nke ndị Europe. Ọ bụ ezie na nne na nna ha—ma ọ bụ ma eleghị anya nne na nna ochie ha—ka bụ ndị na-aga chọọchị, nkwenkwe okpukpe agbanwebeghị ọdịiche dị n’ọgbọ abụọ ndị ahụ.
N’ihi gịnị ka e jiworo gbahapụ àgwà okpukpe ndị ọgbọ dị iche iche nke Europe wereworo dị ka ihe dị oké mkpa?
Ụjọ Esokwaghị n’Ihe Na-akpata Ya
Ruo ọtụtụ narị afọ, egwu ọkụ hel ma ọ bụ pọgatrị nwere oké mmetụta n’ahụ ndị Europe. Okwuchukwu ndị jupụtara ná mkpali na ihe osise ndị e sere nke ọma nke chọọchị banyere hel na-ere ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ mere ka ndị aghasa kwenye na nanị ịgachi chọọchị anya pụrụ ịzọpụta ha n’ikpe ọmụma. Ọzọkwa, akwụkwọ Catechism of the Catholic Church na-ekwu na “Chọọchị na-arụgide ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘ikere òkè n’Ememe Oriri Nsọ na Sunday nile na ụbọchị oriri dị iche iche.’”a E nwekwara nrụgide dịtụ ukwuu na-adabere n’ọkwá mmadụ nọ na ya n’ime ime obodo—a tụrụ anya na onye ọ bụla ga-abịa chọọchị na Sunday nile.
Ma oge agbanwewo. Ugbu a ndị mmadụ na-enwere onwe ha ime ihe ha chọrọ. Ụjọ esokwaghị n’ihe na-akpata ya. E jiriwo nwayọọ nwayọọ kwụsị ikwusi okwu ike banyere hel, ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ka ukwu ná ndị Katọlik na Europe ekwekwaghị na ya.
N’ime ya eme, a dịghị ewere “mmehie” nke ịhapụ ịga Mas Sunday dị ka ihe dị oké njọ. Tirso Vaquero, onye ụkọchukwu Katọlik na Madrid, Spain, na-ekwenye, sị: “Ọ bụrụ na onye Kraịst [Katọlik] abịaghị Mas na Sunday, ọ na-ewute anyị n’ezie n’ihi na oge a nke iso Chineke na ụmụnna ya kwurịta okwu efunahụwo ya, ọ bụghị n’ihi na o mewo mmehie. Nke ahụ nọ n’ọkwá nke abụọ.”
Ya mere ọ bụghịzi ụjọ na-akpali ife ofufe. Gịnị banyere ikike omume nke chọọchị na ndị ndú ya—hà pụrụ iji nguzosi ike n’ihe nke ìgwè atụrụ ha n’aka?
Ọgba Aghara nke Ikike
Ịpụ n’anya nke egwu okpukpe na nretọ pụtara ìhè n’ọnọdụ omume chọọchị adabakọwo. “Ruo ọtụtụ narị afọ anyị enwewo . . . ọtụtụ ndị nkụzi nke ụkpụrụ omume na ndị nkụzi ole na ole na-eme omume ọma,” ka onye Itali na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Giordano Bruno Guerri na-eme mkpesa ya. Agha ụwa abụọ ndị tisasịrị Krisendọm mere ka ụkọ idu ndú a nke ụkpụrụ omume pụta ìhè. Chọọchị ndị dị na Europe enweghị ike igbochi ndị kwere ekwe ikere òkè ná mwụfu ọbara ahụ. Ọbụna nke ka njọ, chọọchị dị iche iche tinyere aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ọrụ agha—n’akụkụ abụọ ndị ahụ.
“Agha Ụwa Mbụ, agha obodo n’etiti òtù dị iche iche nke ndị Kraịst, megheere Iso Ụzọ Kraịst oge nke ọdachi na ihere,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Paul Johnson na-ekwu. “Agha Ụwa nke Abụọ tiri ọnọdụ ụkpụrụ omume nke okwukwe ndị Kraịst ihe otiti dị njọ ọbụna karịa nke Mbụ. O kpughere ihe efu nke chọọchị nile na Germany, mmalite nke Mgbanwe ahụ, na enweghị obi ike na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke Ocheeze Popu.”
Nkwekọrịta Vatican sooro ọchịchị Nazi nke Hitler na ọchịchị Fascist nke Mussolini n’Itali na Franco nọ na Spain mee mebikwara ikike chọọchị nwere ịtụpụta ụkpụrụ omume. N’ikpeazụ, ụgwọ okpukpe na-akwụ maka ime ihe ngwa ngwa otú ahụ n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ enwekwaghị ikike.
Chọọchị na Ọchịchị—Ịtọpụ Ihe Nkekọ Ahụ
N’ime narị afọ nke 20, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba ndị dị na Europe atọpụwo ihe nkekọ ahụ jikọtara Chọọchị na Ọchịchị. N’ezie, e nweghị mba ọ bụla bụ isi na Europe ugbu a nke na-ewere okpukpe Roman Katọlik dị ka okpukpe nke mba ya.
Ọ bụ ezie na okpukpe ndị bụ isi ka pụrụ ịdị na-enweta ego nkwado site n’aka gọọmenti, ha enwekwaghị ikike ọchịchị ha nweburu. Ọ bụghị ndị nile na-aga chọọchị narawooro ọnọdụ ọhụrụ a dịnụ. Onye Jesuit a ma ama nke sitere Spain bụ́ José María Díez-Alegría kwetara na “ndị ndú chọọchị [Katọlik] chere—ọtụtụ n’ime ha n’ezi obi nile—na ha apụghị ịrụ ọrụ dịịrị ha ma ọ́ bụghị site ná nkwado ụmụ mmadụ ‘ike’ dị n’aka.”
Ma “nkwado ụmụ mmadụ ‘ike’ dị n’aka” a akụwo afọ n’ala. Spain, bụ nke nweworo ọchịchị “Katọlik zuru mba” ruo 1975, bụ ihe atụ nke ọnọdụ a. N’afọ ndị na-adịbeghị anya ndị ndú okpukpe nke Spain na ọchịchị Socialist anọwo na-alụ ọgụ banyere inye chọọchị nkwado ego. Bishọp nke Teruel, Spain, mere mkpesa n’oge na-adịbeghị anya gwa ndị parish ya na ya chere na “a na-akpagbu ya dị ka onye Katọlik n’ihi na gọọmenti Spain adịghị enye chọọchị nkwado zuru ezu n’ụzọ ego.
Na 1990 ndị bishọp sitere Spain mara ọkwa na “ọgba aghara dị ukwuu nke akọ na uche na omume ọma” na-emetụta ọha mmadụ nke Spain. Ònye ka ha tara ụta maka ‘ọgba aghara a nke ụkpụrụ omume’? Bishọp ndị ahụ zọọrọ na otu n’ime ihe ndị bụ isi kpatara ya bụ echiche dị mgbagwoju anya nke ọchịchị ọha mmadụ [gọọmenti Spain] na-akwalite mgbe mgbe.” Ọ pụtara ìhè na ndị bishọp ahụ na-atụ anya ka gọọmenti kwalite echiche ndị Katọlik, na-enyekwa ha enyemaka ego.
Ndị Ụkọchukwu Hà Na-eme Ihe Ha Na-ekwusa?
Akụ̀ na ụba dị ukwuu nke Chọọchị Katọlik abụrụwo ihe ijuanya mgbe nile nye ndị ụkọchukwu na-arụ ọrụ na parish ndị dara ogbenye. Ọ bụ ọbụna ihe ijuanya karị mgbe a hụrụ aka Ụlọ Akụ̀ Vatican n’ihe magazin Time kpọrọ “akụkọ kasị njọ banyere ego n’Itali kemgbe agha biri.” Na 1987, ndị ọkà ikpe majie nke Itali nyere ikike ka e jide otu achịbishọp na ndị ọrụ abụọ ọzọ nke ụlọ akụ̀ Vatican. Otú ọ dị, n’ihi ọkwá ọchịchị pụrụ iche Vatican nwere, e jideghị ndị chọọchị ahụ e boro ebubo. Ụlọ Akụ̀ Vatican kwusiri ike na ọ dịghị ihe ọjọọ e meworo, ma ọ pụghị ihichapụ echiche e nwere nke bụ na chọọchị adịghị eme ihe ọ na-ekwusa.—Tụlee Matiu 23:3.
Mmekọahụ rụrụ arụ nke a gbasara akụkọ ya nke ukwuu akpatawo ọbụna mmebi ka ukwuu. Na May 1992, otu bishọp sitere Ireland, onye a matara nke ọma n’ihi nkwado ọ na-akwado alụghị nwunye, rịọrọ ndị dayọsis ya ka ha “gbaghara ya” ma “na-ekpere ya ekpere.” A manyere ya ịgba arụkwaghịm mgbe ọ pụtara ìhè na ọ bụ nna otu nwa okoro dị afọ 17, na o jiriwokwa ego chọọchị kwụọ ụgwọ agụmakwụkwọ ya. N’ọnwa bu nke ahụ ụzọ otu ụkọchukwu Katọlik pụtara na telivishọn Germany ya na “onye ibe” ya na ụmụ ha abụọ. Ọ sịrị na ya chọrọ “ịmalite nkwurịta okwu” n’ihe banyere mmekọrịta chiri anya nke ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-enwe na nzuzo.
Akụkọ ọjọọ ndị ahụ na-ahapụrịrị akara ha na-adịgide adịgide. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Guerri, n’akwụkwọ ya bụ́ Gli italiani sotto la Chiesa (Ndị Itali n’Okpuru Chọọchị), na-ekwusi ike na “Chọọchị emebiwo aha ndị Itali eri ọtụtụ narị afọ.” Ọ na-ekwu na otu ihe si na ya pụta bụ “mpụta nke mmegide zuru ebe nile nke a na-emegide ndị ndú okpukpe, ọbụna n’etiti ndị kwesịrị ntụkwasị obi.” Ndị Katọlik iwe na-ewe pụrụ ịchọ ịjụ ndị ụkọchukwu ya otu ajụjụ ahụ Pọl onyeozi jụrụ ndị Rom: “Dị ka ihe atụ, ị na-ekwusa megide izu ohi, ma ì ji ime ihe n’eziokwu nke gị n’aka? Ị na-akatọ ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ma ì ji ịdị ọcha nke gị n’aka?”—Ndị Rom 2:21, 22, Phillips.
Oké Olulu Dị n’Agbata Ndị Ụkọchukwu na Ndị Aghasa
Otu nsogbu na-apụtachaghị ìhè ma bụrụ ma eleghị anya nke kasị na-agwụ ike bụ oké olulu dị n’agbata ndị ụkọchukwu na ndị aghasa. Akwụkwọ ozi ndị bishọp na-ezite maka nlekọta ime mmụọ yiri ka ha na-akpasu ndị nọ na parish iwe kama inye ha ntụziaka. N’otu njụta echiche ndị Spain e mere, nanị 28 pasent nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ “kwenyere n’ihe ndị bishọp ahụ kwuru.” Ọnụ ọgụgụ hà ka nke ahụ “enweghị ebe ha kwụ akwụ,” 18 pasent sịkwara na ha “aghọtaghị ihe ha [ndị bishọp] na-ekwu banyere ya.” Achịbishọp Ubeda sitere Majorca, Spain, kwetara, sị: “Anyị bụ́ ndị bishọp aghaghịkwa ịnakwere òkè ibu ọrụ nke anyị n’ihe banyere ime ihe megidere Iso Ụzọ Kraịst—nke bụ ihe mere eme.”
Enweghị ozi Akwụkwọ Nsọ doro anya na-eme ka ndị aghasa bụrụ ndị a kpapụrụ iche karị. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Catholic Helard kwuru, “ọtụtụ ndị ụkọchukwu [na France] ekpebiwo itinye aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji bụrụ ndị ‘dị mkpa,’” n’agbanyeghị na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nọ na parish ha ga-ahọrọ ka ha tụkwasị uche n’ihe ime mmụọ. Onye Itali bụ́ ụkọchukwu ma bụrụ onye ọkà n’ihe metụtara ọha mmadụ bụ́ Silvano Burgalassi na-ekwenye, sị: “Eleghị anya ha [ndị na-eto eto] esiwo n’ebe Chineke nọ wezụga onwe ha n’ihi ihe nlereanya ọjọọ anyị. Anyị enyewo ha ‘ngwakọta’ nke nkwekọrịta, okpukpe na achụmnta ego, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ngwagbu.” N’ụzọ na-adịghị eju anya, ọkwá ndị ụkọchukwu nwere n’ọha mmadụ na-ada. “Abụ m onye Katọlik, ma adịghị m ekwenyere ihe ndị ụkọchukwu na-ekwu” bụ okwu a na-anụkarị n’ọnụ ndị Spain bụ ndị Katọlik.
Ọ na-esiri ụfọdụ ndị Katọlik ike ịtụkwasị ndị ụkọchukwu obi, ndị ọzọ nwekwara obi abụọ siri ike banyere ozizi chọọchị—karịsịa nkụzi ndị ha na-ele anya dị ka ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ndị na-adịghị irè.
Nkụzi A Na-apụghị Ịghọta Aghọta
Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ nkụzi okpukpe Katọlik n’isiokwu nke hel. Akwụkwọ Catechism of the Catholic Church na-asị: “Nkụzi Chọọchị na-emesi ịdị adị nke hel na ịdịru ebighị ebi ya ike.” Otú o sina dị, nnyocha ndị e mere na nso nso a na-egosi na nanị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke ndị France bụ́ ndị Katọlik na otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị ogbo ha bụ́ ndị Spain kwenyere na hel dị adị.
N’otu aka ahụ, mgbe a bịara n’okwu ndị metụtara ụkpụrụ omume, ọ na-eyikarị ka ndị Europe bụ “ndị Kraịst na-eme otú masịrị ha.” Mimmi, onye Lutheran nọ n’afọ iri na ụma bụ́ onye Sweden, kwetara na okwu metụtara omume ọma, dị ka ịmụ ụmụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, bụ “ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya.” Ọtụtụ ndị France bụ́ ndị Katọlik ga-ekwenyere ya. Mgbe mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ na-eche ha ihu, 80 pasent sịrị na ha ga-agbaso nduzi nke akọ na uche ha kama nke chọọchị.
N’oge gara aga ikike chọọchị nwere zuru ezu ịkpachi ụda olu ọ bụla na-adịghị ekwenye ekwenye. Site n’ụzọ Vatican si ele ihe anya, ihe agbanwechabeghị. Akwụkwọ Catechism ahụ ji ikwesi olu ike na-ekwu na “ihe nile e kwuworo banyere ụzọ e si akọwa Akwụkwọ Nsọ bụ nnọọ ihe Chọọchị ga-ekpebi.” Otú ọ dị, iji aka ike eme ihe banyere ya adịchaghị enwe nkwado. “Ịrụ ụka a na-enwe banyere ikike na-aga n’ihu,” ka Antonio Elorza, onye Spain bụ́ prọfesọ nke nkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-eme mkpesa ya. “Chọọchị na-ahọrọ iji ihe mgbochi gbaa onwe ya gburugburu, na-eme ka ịdị mkpa nke ọdịnala ya dị nsọ n’agbanyeghị ihe akụkọ ihe mere eme na-egosi.” N’azụ “ihe mgbochi” ahụ, mmetụta chọọchị na ikike ya na-ada na-aga n’ihu.
E wezụga nretọ ime mmụọ, ihe omume ọha mmadụ bụ ihe ọzọ dị mkpa nke na-atụnye ụtụ n’enweghị mmasị n’okpukpe. Òtù na-akwalite mmasị nke ndị ji ngwá ahịa eme ihe na-ewepụta ohere ntụrụndụ dị iche iche—ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Europe nwekwara ọchịchọ na ụzọ isi nụ ụtọ ha. N’iji ihe tụnyere ibe ya, o yiri ka ịga chọọchị bụ ụzọ na-adịghị akpali mmasị nke iji ụtụtụ Sunday mee ihe. E wezụga nke ahụ, ihe omume chọọchị adịghị egbocha mkpa ime mmụọ nke ndị mmadụ.
O yiri ihe na-agaghị ekwe omume na okpukpe ọdịnala ga-enwe ike ịchịkwa ìgwè atụrụ nke Europe ọzọ. Okpukpe ọ̀ bụ mmetụta nke oge ya gafeworo—ihe a kaworo aka ka ọ pụọ n’anya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E bipụtara Catechism of the Catholic Church na nke mbụ ya na 1992, e bukwa n’obi ka ọ bụrụ nkwupụta ozizi sitere n’aka ndị ndú maka ndị Katọlik n’ụwa nile. N’okwu mmalite ya, Popu John Paul nke Abụọ na-akọwa ya dị ka “ihe odide ntụaka e ji n’aka nke ziri ezi maka ịkụzi ozizi katọlik.” Afọ 1566 bụ mgbe ikpeazụ e wepụtara katkizim Katọlik nke zuru ụwa ọnụ otú ahụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ife ihe ntụsara ahụ ofufe emeriwo ala dị oké mkpa nke Krisendọm
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe ime nhọrọ n’agbata okwuchukwu na ịnya anwụ chere ha ihu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Europe na-ahọrọ ịga n’ụsọ mmiri n’egbughị oge