À Gụwo Ụbọchị Okpukpe Ọnụ?
“Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”
AỊSAỊA, NARỊ AFỌ NKE 8 T.O.A. ONYE ISRAEL BỤ́ ONYE AMỤMA.
ONYE Hibru ahụ bụ́ Aịsaịa onye amụma si otú a buo amụma na otu ụbọchị ndị nile nọ n’elu ụwa ga-adị n’otu n’ofufe nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Otú ọ dị, taa, atụmanya dị otú ahụ pụrụ iyi ihe dị anya karịa ka ọ dịworo mgbe ọ bụla ọzọ.
Dị ka ihe atụ, n’oge bu ụzọ n’ime narị afọ a, ndị ome mgbanwe nke ọchịchị Kọmunism na Russia kwenyere na mbibi nke okpukpe bụ nzọụkwụ dị mkpa maka ime ka ndị ọkwá ha kasị ala nwere onwe ha. Ha zọọrọ na ekweghị na Chineke ‘ga-eme ka ndị ọkwá ha dị ala nwere onwe ha pụọ n’ibu arọ nke ịkpọasị na nghọgbu nke oge gara aga.’ Ka ọ na-erule 1939, Stalin egbubilatawo ọnụ ọgụgụ nke chọọchị Orthodox e nwere na Soviet Union gaa na 100, n’ịtụnyere ya ihe karịrị 40,000 e nwere tupu 1917.
Hitler lekwara okpukpe anya dị ka ihe mgbochi nọ n’ụzọ ya inweta ike zuru ezu. “Mmadụ aghaghị ịbụ onye Kraịst ma ọ bụ onye Germany. Ị pụghị ịbụ ha abụọ,” ka o kwuru n’otu oge. O zubere iji nwayọọ nwayọọ kpochapụ ụdị nile nke ofufe ndị ọ na-apụghị ịchịkwa. Iji mezuo nke ahụ, ndị Nazi wulitere ekpere, ememe, baptism, na ọbụna ememe olili ozu ndị nke ha, bụ́ ndị yiri nke ndị okpukpe. Hitler bụ mesaịa ha, ala nna ha bụkwa chi ha. A pụrụ ime ajọ ihe ọ bụla ma ọ bụrụhaala na ọ bụ uche Hitler.
Hà Bụ Ụbọchị Ikpeazụ nke Okpukpe?
Ma Stalin ma Hitler adịghị nke nwere ihe ịga nke ọma ná mgbalị siri ike ha mere ịbịada okpukpe. Ma ugbu a, o yiri ka enweghị mmasị ewegharawo ọnọdụ nke ọchịchị aka ike. Nye ndị mmụta Bible mgbanwe ihe omume a adịghị abịa dị ka ihe ijuanya. Pọl onyeozi gwara Timoti na na “mgbe ikpeazụ” ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1-4.
Bible ọ̀ na-akụzi na “mgbe ikpeazụ” ndị a, ndị e ji enweghị mmasị n’okpukpe mara, ga-ebute ọdịda nke okpukpe nile ụzọ? Ee e. Kama ibu amụma ọgwụgwụ nke okpukpe nile, Bible na-akọwa na okpukpe ụgha—nke e nyere aha ihe atụ bụ́ Babilọn Ukwu ahụ—ga-abịa ná njedebe.a Akwụkwọ Mkpughe na-asị: “Otu mmụọ ozi nke dị ike wee buru nkume, dị ka oké nkume igwe nri, wee tụba ya n’ime oké osimiri, sị, Otú a ka a ga-atụda Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị.”—Mkpughe 18:21.
Otú ọ dị, ọpụpụ okpukpe ụgha pụrụ n’anya agaghị eme ka enwee ụwa nke asọpụrụghị Chineke. N’ụzọ megidere nke ahụ, Abụ Ọma 22:27 na-ebu amụma, sị: “Nsọtụ nile nke ụwa ga-echeta, laghachikwutekwa Jehova: agbụrụ nile nke mba nile ga-akpọkwa isiala n’ihu Gị.” Cheedị echiche mgbe “agbụrụ nile nke mba nile” ga-adị n’otu n’ife otu ezi Chineke ahụ ofufe! N’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke, nkwa ahụ pụrụ iche ga-enwe mmezu dị ebube. (Matiu 6:10) Mgbe oge ahụ bịara, okpukpe—ezi okpukpe—ga-enwe ihe ọ pụtara n’ụzọ dị ukwuu. Ma gịnị banyere ugbu a?
Imechi Oghere Ime Mmụọ Ahụ
Oghere ime mmụọ nke jupụtara ebe nile na Europe taa yiri ọnọdụ dị n’Alaeze Ukwu Rom nke narị afọ mbụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-akọwa otú Iso Ụzọ Kraịst nke narị afọ mbụ si gboo mkpa ime mmụọ e nwere n’oge ahụ n’ụzọ gara nke ọma: “N’ime oghere ụkpụrụ omume nke ọgọ mmụọ na-anwụ anwụ, n’ime ịjụ oyi nke okpukpe Stoik na nretọ nke okpukpe Epikurean, n’ime ụwa nke mmekpọ ọnụ, obi ọjọọ, mmegbu, na ọgba aghara mmekọahụ jupụtara, n’ime alaeze ukwu e mere ka obi jụrụ nke yiri ka ọ chọkwaghị ike aka ndị ikom ma ọ bụ chi dị iche iche nke agha, o wetara ụkpụrụ omume ọhụrụ nke òtù ụmụnna, àgwà obi ọma, ịdị n’usoro, na udo.”
A pụrụ imeju oghere ụkpụrụ omume na nke ime mmụọ dị ná ndụ ndị mmadụ n’oge anyị site n’otu ozi ahụ siri ike ndị Kraịst oge mbụ kwusara n’Alaeze Ukwu Rom nile. E nwekwara ndị na-ege ntị. Ọtụtụ ndị Europe, ọ bụ ezie na ha enweghị mmasị n’okpukpe n’ụzọ nkịtị, ka na-eche na Chineke na-arụ ọrụ dị mkpa ná ndụ ha. Ha pụrụ ịkwụsịworị ịga ihe omume chọọchị ọdịnala, ma ụfọdụ emejuwo oghere ime mmụọ ha n’ebe ọzọ.
Juan José, otu nwa okorobịa sitere Palma de Mallorca, Spain, natara ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik ma jee ozi dị ka nwa okoro na-eje ozi n’ọlta ruo mgbe ọ dị afọ 13. O sooro ezinụlọ ya gaa Mas kwa Sunday, ma ọ kwụsịrị ịga chọọchị mgbe ọ dị afọ iri na ụma. N’ihi gịnị? “Otu ihe bụ na ịga Mas na-agwụ m ike,” ka Juan José na-akọwa. “Amatara m usoro ofufe n’isi. Ihe nile yiri ka ha bụ nkwughachi nke ihe m nụworo na mbụ. Ọzọkwa, onye ụkọchukwu parish anyị na-emesokarị anyị bụ́ ụmụ okoro na-eje ozi n’ọlta n’ụzọ aka ike. Echekwara m na o zighị ezi na ndị mmadụ dara ogbenye ga na-akwụ onye ụkọchukwu ụgwọ iji duzie ememe olili ozu.
“M ka kwere na Chineke, ma echere m na m pụrụ ijere ya ozi n’ụzọ nke m, n’abụghị na chọọchị. Esonyeere m ìgwè ndị enyi ma gbalịa ikpori ndụ ruo n’ókè m nwere ike. Echere m na ị pụrụ ikwu na ntụrụndụ ghọrọ ihe mbụ ná ndụ m.
“Ma mgbe m dị afọ 18, amalitere m iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Gịnị ka ha pụrụ inye m nke m na-ahụbeghị na chọọchị? Okwukwe doro anya nke dabeere na Bible kama ọdịnala na ‘ihe omimi’ ndị m na-apụghị ịghọta mgbe ọ bụla. Otú ọ dị, nkweta ọhụrụ m pụtara mgbanwe ndị buru ibu nye m. Kama iji ngwụsị izu nile na-ahazi nnọkọ oriri na ọṅụṅụ n’ụlọ egwú disko dị iche iche, amalitere m ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ iji soro ndị agbata obi m kerịta okwukwe ọhụrụ m. Imikpu onwe m n’inyere ndị ọzọ aka mere ka ndụ m nwee ihe ọ pụtara. N’ime afọ asaa gara aga, abụwo m onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova.”
Ọ bụghị nanị ndị na-eto eto na-achọ imeju oghere okpukpe ha. Antonia, otu nwanyị meworo agadi nke sitere Extremadura, Spain, jiri ihe ka ukwuu n’ime ndụ ya mee ihe ‘n’ịchọ Chineke,’ dị ka o si ekwu ya. Mgbe ọ dị afọ iri na ụma, ọ na-aga Mas kwa ụbọchị ma mesịakwa gaa biri n’ebe obibi ndị nọn nke Katọlik, ebe ọ bụ na o kwenyere “na ọ bụrụ na a pụghị ịchọta Chineke n’ebe obibi ndị nọn, a pụghị ịchọta ya n’ebe ọzọ.” Ma mgbe afọ atọ gasịrị, ọ hapụrụ ebe obibi ndị nọn, na-enwe ọbụna mmetụta nke nkụda mmụọ na abaghị uru karịa na mbụ.
N’ikpeazụ, mgbe ọ gbara ihe karịrị 50 afọ, ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. “Enwere m obi ụtọ nke ukwuu mgbe Ndịàmà Jehova bịara leta m ma zaa ajụjụ m nile site na Bible nke m,” ka ọ na-akọwa. “Kemgbe m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ndụ m enwewo nzube. Enwere m nsogbu nke m, ma apụrụ m ịnagide ha n’ihi na achọtawo m ezi Chineke ahụ ugbu a.”
Ahụmahụ abụọ ndị a abụghị nanị ndị e nwere. N’imegide ọnọdụ ahụ dị n’okpukpe, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ na-esonyere Ndịàmà Jehova, ha achọpụtawokwa na ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe ha na ikwusa banyere ya gwa ndị ọzọ na-enye ndụ ha nzube.
Ezi Okpukpe Nwere Ihe Ọ Pụtara Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ
Ọ bụ ezie na anyị na-ebi n’oge mgbe ọtụtụ mmadụ na-ajụ okpukpe, ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị ya ikpebi na okpukpe nile abaghị uru. N’eziokwu, n’ime narị afọ nke 20, ndị mmadụ na-atụfu ememe okpukpe ndị na-enweghị ihe ha pụtara na nkwenkwe oge ha gafeworo ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ha na-akwakwa ịga chọọchị emo, nke bụ ịga nanị ka e wee hụ ha. N’ezie, Bible na-ekwu ka anyị zere okpukpe ihu abụọ. Pọl onyeozi buru amụma na n’ime “mgbe ikpeazụ,” ụfọdụ ndị ga-enwe ‘ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha ga-agọnarị ike ya.’ Ndị dị otú ahụ na-enwe ọdịdị nke okpukpe, ma àgwà ha na-agọnarị abamuru ya. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ihu abụọ dị otú ahụ nke okpukpe? ‘Gbakụta ndị a azụ,’ ka Pọl dụrụ ọdụ ya.—2 Timoti 3:1, 5.
Ma Pọl kwukwara na “okpukpe na-eweta oké uru.” (1 Timoti 6:6, New English Bible) Pọl adịghị ekwu banyere nanị ụdị ọ bụla nke okpukpe. Okwu Grik nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “okpukpe” bụ eu·seʹbei·a, nke pụtara “nsọpụrụ ma ọ bụ nsọpụrụ ofufe n’ebe Chineke nọ.” Ezi okpukpe, ezi nsọpụrụ Chineke, “nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.”—1 Timoti 4:8.
Dị ka ihe atụ ndị a kpọtụrụ aha n’elu na-egosi, ezi okpukpe pụrụ ime ka ndụ anyị nwee nzube ma nyere anyị aka iji obi ike na-eche nsogbu dị iche iche ihu. Karị nke ahụ, ezi okpukpe na-eme ka ọdịnihu ebighị ebi bụrụ ihe e ji n’aka. Ụdị ofufe dị otú ahụ kwesịrị ka a gbasoo ya, ebe ọ bụ na a na-emesi anyị obi ike na ọ ga-emesịa ‘jupụta ụwa.’b (Aịsaịa 11:9; 1 Timoti 6:11) N’enweghị obi abụọ banyere ya, ugbu a bụ oge mgbe ezi okpukpe nwere ihe ọ pụtara karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Bible ji obodo ochie bụ́ Babilọn eme ihe dị ihe atụ nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, n’ihi na ọ bụ n’obodo a ka ọtụtụ echiche okpukpe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị malitere. Eri ọtụtụ narị afọ, echiche ndị a nke Babilọn abamiwo n’okpukpe ndị bụ isi nke ụwa.
b Maka ntụle banyere ụzọ e si amata ezi okpukpe ahụ, lee isi nke 5, “Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?” nke akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1995.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]
Akụkọ Banyere Ụlọ Abụọ
Spain jupụtara n’ụlọ okpukpe, ma ịnụ ọkụ n’obi nke mere ka e wuo katidral ndị dara oké ọnụ ahịa na mbụ yiri ka ọ̀ pụwo n’anya. Dị ka ihe atụ, na Mejorada del Campo, ná mpụga nke Madrid, ọrụ owuwu nke otu nnukwu chọọchị Katọlik ka na-aga n’ihu. Justo Gallego Martínez, onye bụbu mọnk nke Benedict, malitere ihe owuwu ahụ n’ihe dị ka 20 afọ gara aga. Ma ụlọ ahụ ka bụ okpokoro ihe efu. Martínez, onye nanị ya na-ewu ụlọ ahụ, agbawo ihe karịrị 60 afọ ugbu a, ya mere chọọchị ahụ eyighị ihe a ga-arụcha mgbe ọ bụla. Otú ọ dị, 300 kilomita site n’ebe ndịda, akụkọ dị iche gbara n’anwụ.
“Okwukwe Na-ebupụ Ugwu” bụ otú akwụkwọ akụkọ ógbè ahụ si kọwaa otu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ji ụbọchị abụọ wuo na Martos, Jaén, Spain. “Olee otú o si kwe omume,” ka akwụkwọ akụkọ ógbè ahụ jụrụ, “na n’ime ụwa a nke na-adabere n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ndị ọrụ afọ ofufo sitere n’ógbè dịgasị iche iche [nke Spain] n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị mere njem gaa Martos iji wuo otu ụlọ nke gafeworo akara kasị elu n’ịdị ngwa, izu okè, na nhazi?” N’ịza ajụjụ a, isiokwu ahụ hotara okwu nke otu n’ime ndị ọrụ afọ ofufo ahụ, sị: “Ịdị mma ya dabeere nnọọ n’eziokwu ahụ bụ na anyị bụ ndị Jehova na-ezi ihe.”
[Foto dị na peeji nke 10]
Mejorada del Campo
[Foto dị na peeji nke 10]
Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Martos