Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/1 p. 15-20
  • Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu ahụ Bụ “Okpukpe” n’Ime Bible
  • “Nke Dị Ọcha nke A Na-emerụghịkwa Emerụ” n’Ụzọ Chineke Si Ele Ihe Anya
  • “N’Enweghị Ntụpọ Site n’Ụwa”
  • Akara Ndị Ọzọ nke Ezi Okpukpe
  • Ezi Okpukpe Ahụ —Ụzọ Ịdị Ndụ
  • Ike Ziri Ezi nke Na-eme Ka A Dị n’Otu
  • Mmeri nke Ezi Okpukpe
  • Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ị̀ Chọtawo Ezi Okpukpe Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/1 p. 15-20

Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị

“Okpukpe nke dị ọcha nke bụkwa ezie n’anya Chineke bụ Nna ga-egosipụta onwe ya site n’ihe ndị dị ka . . . idebe onwe onye n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—JEMES 1:27, Phillips.

1. Olee ụzọ e siworo kọwaa okpukpe, ọ̀ bụkwa onye ka ezi uche gosiri na ọ bụ ya ga-ekpebi ọdịiche dị n’etiti okpukpe ụgha na ezi okpukpe?

A KỌWAWO okpukpe dị ka “ngosipụta nke ihe mmadụ kwere na ya na nsọpụrụ ọ na-enye ike karịrị nke mmadụ nke a matara dị ka onye okike na onye ọchịchị nke eluigwe na ala dum.” Ya mere, n’ụzọ ezi uche dị na ya, ònye ruru eru ikpebi ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha? Ọ bụ ihe e ji n’aka na ọ ghaghị ịbụ Onye ahụ nke e kweere na ya, na-enyekwa ofufe, Onye Okike ahụ. Jehova esetịpụwo n’ụzọ doro anya n’Okwu ya, ọnọdụ ya n’ihe banyere ezi okpukpe na okpukpe ụgha.

Okwu ahụ Bụ “Okpukpe” n’Ime Bible

2. Olee ụzọ akwụkwọ ọkọwa okwu dị iche iche si akọwa okwu Grik mbụ ahụ a sụgharịrị ịbụ “ụzọ ife ofufe” ma ọ bụ “okpukpe,” ọ̀ bụkwa ụdị ofufe dịgasị aṅaa ka a pụrụ iji ya kọwaa?

2 Okwu Grik nke a sụgharịrị ịbụ “ụzọ ife ofufe,” ma ọ bụ “okpukpe” bụ thre·skeiʹa. Akwụkwọ bụ A Greek-English Lexicon of the New Testament kọwara okwu a dị ka “ofufe nke Chineke, okpukpe, karịsịa dị ka ọ na-egosipụta onwe ya n’ije ozi okpukpe ma ọ bụ inye ofufe.” Akwụkwọ bụ Theological Dictionary of the New Testament nyekwuru nkọwa, na-asị: “E nwere ihe ịrụ ụka banyere mmalite nke okwu ahụ; . . . ọ na-amasị ndị ọkà mmụta nke oge a ijikọ ya na therap- (‘ije ozi’). . . . A pụkwara ịhụta ọdịiche dị n’ihe ọ pụtara. Echiche dị mma dị na ya bụ ‘ịnụ ọkụ n’obi nke okpukpe’ . . . , ‘ofufe nke Chineke,’ ‘okpukpe.’ . . . Ma e nwekwara echiche nke na-adịghị mma dị na ya, ya bụ, ‘imebiga ihe ókè n’ikpe okpukpe,’ ‘ofufe na-ezighị ezi.’” Otú a, a pụrụ iji okwu ahụ bụ “okpukpe” ma ọ bụ “ụzọ ife ofufe,” ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, sụgharịa okwu ahụ bụ thre·skeiʹa.

3. Olee ụzọ Pọl onyeozi si jiri okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “ụzọ ife ofufe” mee ihe, okwu dị aṅaa nke na-akpali mmasị ka e kwuru banyere nsụgharị nke Ndị Kọlọsi 2:18?

3 Okwu a pụtara nanị ugbo anọ n’ime Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Pọl onyeozi jiri ya mee ihe ugbo abụọ izo aka n’okpukpe ụgha. N’Ọrụ Ndị Ozi 26:5, e dekọrọ na o kwuru na tupu ọ ghọọ onye Kraịst, “adị m ndụ dị ka onye Farisii dị ka ịrọ òtù ahụ si dị nke na-edebezu iwu karị n’ụzọ ikpere Chineke [“okpukpe,” Phillips] anyị.” N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka onye ọ bụla mee ihe ọ na-achọ n’ịpụnara unu ihe unu na-agbata n’ọsọ, site n’obi dị umeala [“nke na-abụghị ezie,” NW] na ikpere ndị mmụọ ozi.” (Ndị Kọlọsi 2:18) O yiri ka ofufe dị otú ahụ nke ndị mmụọ ozi jupụtara ebe nile na Frijia n’oge ndị ahụ, ma, ọ bụ otu ụdị nke okpukpe ụgha.a N’ụzọ na-akpali mmasị, ebe ụfọdụ nsụgharị Bible dị iche iche sụgharịrị thre·skeiʹa dị ka “okpukpe,” ná Ndị Kọlọsi 2:18 ihe ka ọtụtụ n’ime ha jiri okwu ahụ bụ “ofufe” mee ihe. Nsụgharị New World Translation nọgidere na-asụgharị thre·skeiʹa dị ka “ụzọ ife ofufe,” otu nkọwa ala ala peji dị na Reference Bible hotakwara n’ebe ọ bụla e mere otú ahụ na e jiri nsụgharị ọzọ ahụ bụ “okpukpe” mee ihe ná nsụgharị Latin dị iche iche.

“Nke Dị Ọcha nke A Na-emerụghịkwa Emerụ” n’Ụzọ Chineke Si Ele Ihe Anya

4, 5. (a) Dị ka Jemes si kwuo, ọ̀ bụ ọnọdụ onye n’ihe banyere okpukpe bụ ihe kasị mkpa? (b) Gịnị pụrụ ime ka ụzọ mmadụ si efe ofufe bụrụ ihe efu, gịnịkwa ka okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “ihe efu” pụtara?

4 Ebe abụọ ndị ọzọ okwu ahụ bụ thre·skeiʹa pụtara bụ n’akwụkwọ ozi ahụ Jemes dere, onye so n’òtù na-achị isi nke ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ahụ. O dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya bụ onye na-ekpere Chineke [“na ya bụ ‘onye ji okpukpe kpọrọ ihe,’” Phillips], mgbe ọ dịghị akwa ire nke ya ngá, kama ọ na-aghọ obi ya aghụghọ, okpukpe Chineke [“okpukpe,” Phillips] nke onye a bụ ihe efu. Okpukpe Chineke [“okpukpe,” Phillips] nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:26, 27.

5 Ee, ịgbaso ọnọdụ Jehova n’ihe banyere okpukpe dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta nnwapụta ya, lanarịkwa banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke o kweworo nkwa ya. (2 Pita 3:13) Jemes gosiri na mmadụ pụrụ ile onwe ya anya dị ka onye ji okpukpe kpọrọ ihe n’ezie, ma ụzọ ife ofufe ya pụrụ ịbụ ihe efu. Okwu Grik nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ihe efu” pụtakwara “nke na-adịghị arụpụta ihe ọ bụla, ihe tọgbọrọ n’efu, ihe na-adịghị amịpụta mkpụrụ, ihe na-abaghị n’ihe, ihe na-adịghị ike, ihe eziokwu na-adịghị na ya.” Ọ pụrụ ịdị otú a ma ọ bụrụ na mmadụ nke na-ekwu na ya bụ onye Kraịst akwaghị ire ya ngá wee jiri ya na-eto Chineke, na-ewulikwa ndị Kraịst ibe ya elu. Ọ ga-abụ onye “na-aghọ obi ya aghụghọ,” ọ dịghịkwa ekpe “okpukpe nke dị ọcha nke bụkwa ezie n’anya Chineke.” (Phillips) Ọ bụ ụzọ Jehova si ele ihe anya bụ ihe dị mkpa.

6. (a) Gịnị bụ isi ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ Jemes dere? (b) Ihe dị aṅaa nke a chọrọ maka ofufe dị ọcha ka Jemes mesiri ike, gịnịkwa ka Òtù Na-achị Isi nke oge a kwuworo n’ihe banyere nke a?

6 Jemes edepụtaghị ihe nile Jehova na-achọ n’ihe banyere ofufe dị ọcha. N’ụzọ kwekọrọ n’isiokwu nke akwụkwọ ozi ya, nke bụ okwukwe nke a nwapụtara site n’ọrụ na mkpa ọ dị mmadụ inwere onwe ya pụọ n’ọbụbụenyi nke ụwa Setan, o mere ka nanị ihe abụọ a chọrọ pụta ìhè. Otu bụ “ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha.” Nke a metụtara ezi ịhụnanya ndị Kraịst. Jehova anọwo mgbe nile na-egosi nchegbu o ji ịhụnanya na-echegbu onwe ya maka ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ. (Deuterọnọmi 10:17, 18; Malakaị 3:5) Otu n’ime ihe mbụ òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ nke ọgbakọ ndị Kraịst mere bụ maka ndị inyom di ha nwụrụ bụ ndị Kraịst. (Ọrụ 6:1-6) Pọl onyeozi nyere ntụziaka sara mbara maka inye ndị agadi nwanyị bụ ndị inyom di ha nwụrụ, ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, nlekọta ịhụnanya, bụ́ ndị gosipụtaworo onwe ha ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ, ndị na-enweghịkwa ezinụlọ ọ bụla ga-enyere ha aka. (1 Timoti 5:3-16) Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova n’oge a enyewokwa ntụziaka kapịrị ọnụ maka “Ilekọta Ndị Ogbenye,” na-ekwu, sị: “Ezi ofufe gụnyere ilekọta ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-eguzosikwa ike n’ihe, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nọ ná mkpa nke enyemaka ihe ndị e ji ebi ndụ. (Lee akwụkwọ ahụ bụ Organized to Accomplish Our Ministry, peji 122-123.) Òtù ndị okenye dị iche iche ma ọ bụ ndị Kraịst n’otu n’otu, ndị na-ejighị nke a kpọrọ ihe na-elefuru anya otu akụkụ dị mkpa nke ụzọ ife ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ụzọ Chineke bụ Nna anyị si ele ihe anya.

“N’Enweghị Ntụpọ Site n’Ụwa”

7, 8. (a) Olee ihe nke abụọ Jemes kpọtụrụ aha, bụ́ nke a chọrọ n’aka ezi okpukpe? (b) Ndị ndú okpukpe na ndị ụkọchukwu hà na-emezu ihe nke a a chọrọ ha n’aka? (ch) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere Ndịàmà Jehova?

7 Ihe nke abụọ a chọrọ n’aka ezi okpukpe nke Jemes hotara bụ “idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” Jisọs kwuru, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a”; n’ikwekọ na nke a, ezi ndị na-eso ụzọ ya ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 15:19; 18:36) À pụrụ ikwu nke a banyere ndị ndú okpukpe na ndị ụkọchukwu nke ọtụtụ n’ime okpukpe ndị dị n’ụwa nke a? Ha na-akwado òtù United Nations. Ọtụtụ n’ime ndị ndú ha nakweere ọkpụkpọ òkù ahụ popu kpọrọ ha izukọta n’Assisi, Itali, n’October 1986 iji kpekọọ ekpere maka ihe ịga nke ọma nke “Afọ Udo nke Mba Nile” ahụ nke òtù UN mere atụmatụ ya. Otú ọ dị, mgbalị ha nile bụ n’efu, n’iburu n’uche ọtụtụ nde mmadụ ndị e gburu n’agha ndị a lụrụ n’afọ ahụ na n’afọ ndị gafeworo eri mgbe ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị ndú okpukpe na-eso ndị nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-achị achị na-akpakọrịta, ma jiri aghụghọ soro ndị nọ n’òtù ndị na-emegide emegide na-eme nkwekọrịta nzuzo, ka ọ ga-abụ na onye ọ bụla na-achị achị ga-ele ha anya dị ka “ndị enyi.”—Jemes 4:4.

8 Ndịàmà Jehova emeworo onwe ha aha dị ka ndị Kraịst ndị na-anọpụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na n’esemokwu nile nke ụwa nke a. Ha na-anọgide n’ọnọdụ nke a na kọntinenti nile nakwa ná mba nile, dị ka akụkọ ndị mgbasa ozi dị iche iche na ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke oge a na-agba àmà ya n’akụkụ nile nke ụwa. Ha bụ n’ezie ndị nọ “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” Nke ha bụ “okpukpe nke dị ọcha nke bụkwa ezie n’anya Chineke.”—Jemes 1:27, Phillips.

Akara Ndị Ọzọ nke Ezi Okpukpe

9. Gịnị bụ ihe nke atọ a chọrọ n’aka ezi okpukpe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Ọ bụrụ na okpukpe bụ “nsọpụrụ [a] na-enye ike karịrị nke mmadụ nke a matara dị ka onye okike na onye ọchịchị nke eluigwe na ala dum,” o doro anya na ezi okpukpe ahụ aghaghị iwere ofufe nye nanị otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. O kwesịghị ịgwagbu nghọta ụmụ mmadụ nwere banyere Chineke site n’ịkụzi echiche ndị na-ekpere arụsị ndị dị ka nke chi bụ atọ n’ime otu, nke onye bụ Nna n’ime ya so ndị abụọ ọzọ nọ n’Atọ n’Ime Otu dị omimi na-ekerịta ọbụbụ ọ bụ onye pụrụ ime ihe nile, ịdị ebube ya, na ịdịru ebighị ebi ya. (Deuterọnọmi 6:4; 1 Ndị Kọrint 8:6) Ọ ghaghịkwa ime ka a mara aha Chineke nke na-enweghị atụ, bụ́ Jehova, nyekwa aha ahụ nsọpụrụ, n’ezie bụrụkwa nke a kpọkwasịrị aha Chineke dị ka ndị a haziri ahazi. (Abụ Ọma 83:18; Ọrụ 15:14) N’ihe banyere nke a, ndị na-ekpe ya aghaghị ịgbaso ihe nlereanya nke Kraịst Jisọs. (Jọn 17:6) Òle ndị taa na-emezu ihe nke a a chọrọ ha n’aka ma e wezụga ndị Kraịst bụ Ndịàmà Jehova?

10. Ka okpukpe wee kwe nkwa nlanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, gịnị ka ọ na-aghaghị ime, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

10 Pita onyeozi kwuru, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa [Jisọs Kraịst] n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.” (Ọrụ 4:8-12) N’ihi ya, ezi okpukpe nke na-ekwe nkwa nlanarị banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke aghaghị ịkpali okwukwe n’ebe Kraịst na uru àjà mgbapụta ahụ dị. (Jọn 3:16, 36; 17:3; Ndị Efesọs 1:7) Karịsịa, ọ ghaghị inyere ndị na-efe ezi ofufe aka ido onwe ha n’okpuru Kraịst dị ka Eze na-achị achị na Onye Isi Nchụaja e tere mmanụ nke Jehova.—Abụ Ọma 2:6-8; Ndị Filipaị 2:9-11; Ndị Hibru 4:14, 15.

11. Gịnị ka ezi okpukpe na-aghaghị ịdabere na ya, gịnịkwa bụ ọnọdụ Ndịàmà Jehova n’ihe banyere nke a?

11 Okpukpe dị ọcha aghaghị ịdabere ná nzube e kpughere ekpughe nke otu ezi Chineke ahụ, ọ bụghịkwa n’omenala na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ chepụtara. Anyị agaraghị ama ihe ọ bụla banyere Jehova na nzube ya nile dị ebube, anyị agaraghịkwa ama ihe ọ bụla banyere Jisọs na àjà mgbapụta ahụ, ma e wezụga Bible. Ndịàmà Jehova na-akụnye n’ime ụmụ mmadụ obi ike a na-apụghị ịkwagharị akwagharị n’ebe Bible dị. Ha na-anwapụtakwa site ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị na ha kwenyere n’okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, . . . ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

Ezi Okpukpe Ahụ —Ụzọ Ịdị Ndụ

12. Tụkwasị n’okwukwe, gịnị dị mkpa ka ofufe wee bụrụ nke bụ ezie, ọ̀ bụkwa n’akụkụ dịgasị aṅaa ka ezi okpukpe bụ ụzọ ịdị ndụ?

12 Jisọs kwuru, sị: “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) N’ihi ya, ezi okpukpe ma ọ bụ ụzọ ife ofufe ahụ, abụghị usoro mmeghachi ihe omume efu, ngosipụta elu ahụ nke nsọpụrụ Chineke. Ofufe dị ọcha bụ ihe ime mmụọ, nke dabeere n’okwukwe. (Ndị Hibru 11:6) Otú ọ dị, a ghaghị iji ọrụ kwadoo okwukwe ahụ. (Jemes 2:17) Ezi okpukpe na-ajụ ihe ọgbara ọhụrụ ndị na-amasị ọha mmadụ. Ọ na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ nile nke Bible n’ihe banyere ịdị ọcha nke omume, na ikwu okwu dị ọcha. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Efesọs 5:3-5) Ndị na-ekpe ya na-eji obi eziokwu na-agbalị ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke ná ndụ ezinụlọ ha, n’ọrụ ego ha na-arụ, n’ụlọ akwụkwọ, na ọbụna ná ntụrụ ndụ ha. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ndịàmà Jehova na-anwa ịghara ichefu mgbe ọ bụla ndụmọdụ Pọl onyeozi, bụ́: “Ya mere ma ùnu na-eri ihe, ma ùnu na-aṅụ ihe, ma ùnu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.” (1 Ndị Kọrint 10:31) Okpukpe ha abụghị iji mezuo iwu; ọ bụ ụzọ ịdị ndụ.

13. Gịnị ka ezi ofufe gụnyere, n’ihi gịnịkwa ka a pụrụ iji kwuo na Ndịàmà Jehova bụ n’ezie ndị ji okpukpe kpọrọ ihe?

13 N’eziokwu, ezi okpukpe ahụ metụtara ọrụ ime mmụọ dị iche iche. Ndị a gụnyere ikpe ekpere onwe onye na dị ka ezinụlọ, ịmụchi Okwu Chineke na ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible anya, na ije nzukọ dị iche iche nke ezi ọgbakọ ndị Kraịst. A na-eji abụ dị iche iche e ji eto Jehova na ekpere na-emeghe, na-emechikwa nzukọ ndị ahụ. (Matiu 26:30; Ndị Efesọs 5:19) A na-enyocha isiokwu ndị na-ewuli elu n’ime mmụọ site n’okwu ihu ọha dị iche iche na ntụle ajụjụ na azịza dị iche iche ndị dabeere n’akwụkwọ ndị e biri ebi, ndị onye ọ bụla pụrụ inweta. A na-anọkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e debere ọcha, ma ghara ịchọbiga ha mma ókè, na-enwe nzukọ ndị ahụ, bụ́ ndị a na-eji eme nanị ihe ndị metụtara okpukpe: nzukọ ndị a na-enwe mgbe nile, agbamakwụkwọ, ihe omume ndị metụtara ọnwụ mmadụ. Ndịàmà Jehova na-akwanyere Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na Ụlọ Mgbakọ ndị buru ibu karị ùgwù dị ka ebe ndị a raara nye ofufe Jehova. N’adịghị ka ọtụtụ chọọchị nke Krisendọm, Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche abụghị ebe nzukọ ntụrụ ndụ ọha na eze.

14. Gịnị ka ofufe pụtara nye ndị na-asụ asụsụ Hibru, oleekwa ọrụ na-eme ka Ndịàmà Jehova dịrị iche taa?

14 Anyị ebuworị ụzọ hụta na ndị ọkà mmụta na-ejikọ okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “ụzọ ife ofufe” ma ọ bụ “okpukpe” na ngwaa ahụ bụ “ije ozi.” Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na okwu Hibru ya na ya bụ otu ihe, bụ́ ‛avo·dhahʹ, bụ nke a pụrụ ịsụgharị ịbụ “ije ozi” ma ọ bụ “ofufe.” (Tụlee nkọwa ala ala peji dị n’Ọpụpụ 3:12 na 10:26, NW.) Nye ndị Hibru, ofufe pụtara ije ozi. Ọ bụkwa nke a ka ọ pụtara nye ndị na-efe ezi ofufe taa. Otu akara dị mkpa nke pụrụ iche nke ezi okpukpe ahụ bụ na ndị na-agbaso ya na-ekere òkè n’ozi Chineke nke ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze . . . n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14; Ọrụ 1:8; 5:42) Olee okpukpe a maara gburugburu ụwa maka àmà ihu ọha ọ na-agbara Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere?

Ike Ziri Ezi nke Na-eme Ka A Dị n’Otu

15. Gịnị bụ otu ihe pụrụ iche nke na-aka ezi okpukpe akara?

15 Okpukpe ụgha na-akpata nkewa. Ọ kpatawo, ọ ka nọkwa na-akpata, ịkpọasị na mwụfu ọbara. N’ụzọ megidere nke ahụ, ezi okpukpe na-eme ka a dịrị n’otu. Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ịhụnanya nke na-eme ka Ndịàmà Jehova dịrị n’otu dị elu karịa ịkpa ókè nile nke mba, nke ọnọdụ mmadụ nọ na ya ná ndụ, nke ọnọdụ akụ na ụba, na nke agbụrụ, bụ́ ndị na-ekewasị ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ. Ndịàmà ahụ “na-eguzosi ike n’otu mmụọ nsọ, na-ewerekwa otu mkpụrụ obi lụkọọrọ okwukwe nke ozi ọma ahụ ọgụ sie ike.”—Ndị Filipaị 1:27.

16. (a) “Ozi ọma” dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-ekwusa? (b) Amụma dịgasị aṅaa ka a na-emezu n’isi ndị Jehova, oleekwa ngọzi ndị sochiworonụ?

16 “Ozi ọma” ahụ nke ha na-ekwusa bụ na n’oge na-adịghị anya, a gaje imezu nzube Chineke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. A gaje ime ihe ọ na-achọ ‘dị ka e si eme ya n’eluigwe, otú ahụkwa n’ụwa.’ (Matiu 6:10) A gaje ido aha Jehova dị ebube nsọ, elu ala ga-aghọkwa paradaịs, ebe ndị na-efe ezi ofufe ga-enwe ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) N’ụzọ nkịtị, ọtụtụ nde mmadụ ná mba nile so Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta, na-ekwu, ná mmezu nke amụma Bible ahụ, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Jehova na-agọzi ndị ya. N’ezie, “onye dịkarịsịrị nta” aghọwo “mba nwere ume,” bụ́ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu n’ụzọ zuru ezu n’akụkụ nile—n’echiche, n’ọrụ, n’ofufe. (Aịsaịa 60:22) Nke a bụ ihe okpukpe ụgha na-enwebeghị ike imezu.

Mmeri nke Ezi Okpukpe

17. Gịnị na-echere Babilọn Ukwu ahụ n’ihu, oleekwa ụzọ a ga-esi weta nke a?

17 Okwu Chineke ebuwo amụma banyere mbibi nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke e nyere aha ihe atụ ahụ bụ “Babilọn Ukwu ahụ.” Bible jikwa ihe atụ nke mpì nke otu anụ ọhịa mee ihe nnọchianya nke “ndị eze,” ma ọ bụ ndị ọchịchị, nke ụwa. Ọ na-agwa anyị na Chineke ga-etinye n’ime obi ndị ọchịchị ndị a nzube nke ịkwatu nzukọ Setan bụ Ekwensu ahụ nke yiri nwanyị na-akwa iko, bibiekwa ya kpam kpam.—Lee Mkpughe 17:1, 2, 5, 6, 12, 13, 15-18.b

18. Olee ihe dị mkpa Bible kwuru nke ga-akpata mbibi Babilọn Ukwu ahụ, oleekwa mgbe okpukpe ụgha malitere n’ụzọ ọjọọ nke a?

18 N’ihi gịnị ka Babilọn Ukwu ahụ ji kwesị inweta mbibi? Bible na-aza, sị: “N’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 18:24) N’igosi na ikpe ọmụma ọbara nke a okpukpe ụgha nwere malitere laa azụ ọbụna tupu nguzobe nke Babilọn, Jisọs katọrọ ndị ndú okpukpe nke okpukpe ndị Juu, bụ́ nke rapagideworo onwe ya n’ebe Babilọn Ukwu ahụ dị, mgbe o kwuru, sị: “Unu agwọ, ụmụ ajụala, olee otú unu ga-esi gbanarị ikpe nke Gehena? . . . Ọbara ndị ezi omume nile a wụsiworo n’elu ụwa [ga-adịkwasị] unu, site n’ọbara Ebel onye ezi omume.” (Matiu 23:33-35, NW) Ee, okpukpe ụgha, nke malitere n’elu ụwa n’oge nnupụisi ahụ e mere n’Iden, aghaghị ịza ajụjụ maka ajọ ikpe ọmụma ọbara o nwere.

19, 20. (a) Gịnị ka ndị na-efe ezi ofufe ga-eme mgbe e mezusịrị ihe e kpere n’ikpe n’ahụ Babilọn Ukwu ahụ? (b) Gịnị ga-ewere ọnọdụ n’oge ahụ, oleekwa olileanya ga-eghere oghe nye ndị nile na-efe ezi ofufe?

19 Mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ, ndị na-efe ezi ofufe n’elu ala ga-ejikọta olu ha na olu ndị òtù abụ ahụ nọ n’eluigwe, bụ́ ndị ji olu dara ụda na-abụ abụ, sị: “Haleluya; . . . n’ihi na o kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe . . . , ọ bọkwara ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu ya n’isi ya. . . . Anwụrụ ọkụ ya na-arịgo elu ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Mkpughe 19:1-3.

20 Mgbe ahụ, a ga-ebibi akụkụ ndị ọzọ mejupụtara nzukọ a na-ahụ anya nke Setan. (Mkpughe 19:17-21) Mgbe nke a gasịrị, a ga-atụba Setan, bụ́ onye guzobere okpukpe ụgha nile, na ndị mmụọ ọjọọ ya nile n’ime abyss. Ha agaghị enwerekwa onwe ha ịkpagbu ndị na-efe Jehova ezi ofufe ọzọ. (Mkpughe 20:1-3) Okpukpe dị ọcha ga-enweworị mmeri megide okpukpe ụgha. Ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-agbaso ịdọ aka ná ntị Chineke ịgbapụ ugbu a site na Babilọn Ukwu ahụ ga-enwe ohere nke ịlanarị ma banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. N’ebe ahụ, ha ga-enwe ike ikpe ezi okpukpe, ma na-ejere Jehova ozi, na-efekwa ya ofufe ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa nke ofufe ndị mmụọ ozi nke e hotara ná Ndị Kọlọsi 2:18, lee Ụlọ Nche, July 15, 1985, peji 12-13.

b Maka nkọwa zuru ezu banyere amụma nke a, lee akwụkwọ ahụ bụ Revelation—Its Grand Climax At Hand! nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, isi 33-36.

Nwalee Ike Ncheta Ihe Gị

◻ Ọnọdụ ònye n’ihe banyere okpukpe bụ ihe kasị mkpa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

◻ Olee ihe abụọ a chọrọ n’aka ezi okpukpe ndị Jemes mesiri ike?

◻ Olee ihe ndị ọzọ a chọrọ n’aka ofufe dị ọcha?

◻ “Ozi ọma” dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-ekwusa?

◻ Olee ụzọ ezi okpukpe ga-esi nwee mmeri megide okpukpe ụgha?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị ndú okpukpe zukọtara n’Assisi, Itali, n’October 1986

[Foto dị na peeji nke 19]

Ezi okpukpe gụnyere izukọta ọnụ maka ofufe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya