Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha
“Sinụ n’etiti ha pụta, . . . ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”—2 NDỊ KỌRINT 6:17.
1. Mgbanwerịta dị aṅaa ka Setan nwara ka ya na Jisọs mee, olee ihe abụọ okwukwe o kwere nkwa nke a na-akụziri anyị?
“IHE ndị a nile ka m ga-enye gị, ọ bụrụ na ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m.” Ọ bụ ezie na e kwere nkwa nke a n’ọtụtụ puku afọ gara aga mgbe okpukpe ụgha malitesịworo, ọ na-enye isi ihe dị mkpa n’ịghọta onye na-akwado okpukpe ụgha na ihe nzube ya bụ. N’oge ọgwụgwụ nke afọ 29 O.A., Ekwensu kwere Jisọs nkwa inye ya alaeze nile nke ụwa nanị ma ọ daa kpọọ isiala nye ya. Ihe nke a merenụ na-agwa anyị ihe abụọ: na alaeze nile nke ụwa nke a dị n’aka Setan inye, na nzube kasị elu nke okpukpe ụgha bụ ife Ekwensu ofufe.—Matiu 4:8, 9.
2. Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu Jisọs dị na Matiu 4:10?
2 Site ná nzaghachi o nyere, ọ bụghị nanị na Jisọs jụrụ okpukpe ụgha, kama o gosikwara ihe ezi okpukpe metụtara. O kwuru, sị: “Laba, Setan: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) Ya mere, nzube nke ezi okpukpe bụ ife otu ezi Chineke ahụ, bụ Jehova. O metụtara okwukwe na nrubeisi, ime ihe Jehova chọrọ.
Mmalite nke Okpukpe Ụgha
3. (a) Ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka okpukpe ụgha malitere n’elu ụwa? (b) Olee ihe omume mbụ e mere ndekọ ya nke okpukpe ekweghị ibe ya nọrọ, oleekwa ụzọ mkpagbu nke okpukpe siworo nọgide na-aga n’ihu kemgbe ahụ?
3 Okpukpe ụgha malitere n’elu ala mgbe mmadụ ndị mbụ ahụ nupụụrụ Chineke isi, nakwerekwa atụmatụ Agwọ ahụ tụụrụ ha ka ha na-ekpebiri onwe ha “ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:5) Mgbe ha mere nke ahụ, ha jụrụ ịbụ ọkaaka ezi omume nke Jehova, gbakụtakwa ofufe nke kwesịrị ekwesị azụ, bụ́ ezi okpukpe ahụ. Ha bụ mmadụ mbụ ndị “weere eziokwu nke Chineke gbanwere ụgha ha, ha wee sọpụrụ na-ekpekwara ihe e kere eke kama Onye kere eke.” (Ndị Rom 1:25) Ihe e kere eke nke ha họọrọ n’amaghị ama inye ofufe adịghị onye ọ bụla ọzọ ọ bụ ma e wezụga Setan, bụ́ Ekwensu, bụ́ “agwọ ochie ahụ.” (Mkpughe 12:9) Diọkpara ha, bụ́ Ken, jụrụ ịgbaso ndụmọdụ Jehova ji obi ọma nye, wee si otú a nupụ isi megide ịbụ ọkaaka Ya. N’ịma ama ma ọ bụ n’amaghị ama, Ken ghọrọ “nwa nke ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan, bụrụkwa onye na-efe Ekwensu ofufe. O gburu nwanne ya nke ọ tọrọ, bụ́ Ebel, onye na-efe ezi ofufe ahụ, bụ́ ezi okpukpe ahụ. (1 Jọn 3:12, Revised English Bible; Jenesis 4:3-8; Ndị Hibru 11:4) Ọbara Ebel bụ ọbara mbụ a wụfuru n’ihi ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe. Ọ dị mwute ikwu na okpukpe ụgha agawo n’ihu n’ịwụfu ọbara na-emeghị ajọ ihe kpọmkwem ruo ụbọchị anyị a.—Lee Matiu 23:29-35; 24:3, 9.
4. N’ihe banyere Noa, akụkụ akwụkwọ nsọ dịgasị aṅaa na-eme ihe atụ nke otú ezi okpukpe dị?
4 Tupu Iju Mmiri ahụ, Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ gbakụta ezi okpukpe ahụ azụ. Otú ọ dị, Noa “hụtara amara n’ihu Jehova.” N’ihi gịnị? N’ihi na ya “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, o fere ezi ofufe. Ezi okpukpe abụghị ihe omume ma ọ bụ mmeghachi ihe efu kama ọ bụ ụzọ ịdị ndụ. O metụtara itinye okwukwe na Jehova, jirikwa nrubeisi na-ejere ya ozi, ‘soro ya na-eje ije.’ Noa mere nke a.—Jenesis 6:8, 9, 22; 7:1; Ndị Hibru 11:6, 7.
5. (a) Gịnị ka Ekwensu nwara iguzobe mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? (b) Olee ụzọ Jehova si mebie atụmatụ Ekwensu, gịnịkwa si na ya pụta?
5 N’oge na-adịghị anya mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ihe àmà gosiri na Ekwensu jiri Nimrọd mee ihe, bụ́ nwoke nke a ma ama n’ihi ‘mmegide ọ na-emegide Jehova,’ ná mgbalị nke ijikọ ihe nile a kpọrọ mmadụ ọnụ n’otu ụdị nke ife ofufe nke ga-abụkwa iji megide Jehova. (Jenesis 10:8, 9; 11:2-4) Ọ gaara abụworị otu okpukpe ụgha dị n’otu, ofufe Ekwensu e jikọrọ ọnụ, bụ́ nke ebe bụ isi ọ dị bụ n’obodo ahụ na ụlọ elu ahụ nke ndị na-efe ya ofufe wuru. Jehova mebiri atụmatụ nke a site n’ịghagbu “otu asụsụ” ihe nile a kpọrọ mmadụ na-asụ n’oge ahụ. (Jenesis 11:5-9) N’ihi ya, e mesịrị kpọọ obodo ahụ Bebel, e mesịakwa, Babilọn, aha abụọ ahụ pụtakwara “Ọgba Aghara.” Nghagbu asụsụ nke a kpatara mgbasa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ala dum.
6. (a) Echiche okpukpe dịgasị aṅaa ka a kụnyere n’obi ndị na-efe Setan tupu a chụsasịa ha? (b) N’ihi gịnị ka okpukpe ndị dị gburugburu ụwa na-eji enwe nkwenkwe ndị yirịtara ibe ha? (ch) Nzube dị aṅaa nke Setan ka Babilọn mezuru, gịnịkwa ka obodo oge ochie ahụ ghọrọ ihe atụ ya?
6 Otú ọ dị, o yiri ka ọ̀ bụ na n’ihe ndabere nke akụkọ ifo na okpukpe, na tupu mgbasa nke a Jehova gbasara ihe a kpọrọ mmadụ, Setan akụnyewo n’ime uche ndị na-efe ya ofufe ihe ụfọdụ ndị bụ isi nke okpukpe ụgha. Nke a gụnyere echiche okpukpe nke mkpụrụ obi ịdịgide ndụ mgbe a nwụsịrị, ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu, na ịdị adị nke ala mmụọ nke na-ere ọkụ, ya na ofufe nke ọtụtụ chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche, nke e jikọtara ụfọdụ n’ime ha gaa ná njikọ atọ dị iche iche. Òtù dị iche iche ndị nwere asụsụ nke ha buuru nkwenkwe ndị dị otú a gazuo gburugburu ụwa. Mgbe oge na-agafe, echiche ndị a bụ isi nwere mgbanwe dị iche iche. Ma n’ozuzu ya, ha mejupụtara ihe bụ isi dị n’okpukpe ụgha n’akụkụ nile nke ụwa. Ọ bụ ezie na e mebiri mgbalị ya iguzobe otu okpukpe ụgha e jikọrọ ọnụ nke nwere isi obodo ụwa dum ya na Babilọn, Setan nakweere ụdị dị iche iche nke ofufe ụgha, bụ́ nke nwetara mkpali ha site na Babilọn, ndị a hazikwara iji dọrọ ofufe pụọ n’ebe Jehova nọ bịa n’ebe ya onwe ya nọ. Babilọn nọgidere ruo ọtụtụ narị afọ na-abụ ebe a ma ama maka ikpere arụsị, ime majik, ịgba afa na ịgụ kpakpando—ndị a nile bụchakwa akụkụ dị iche iche nke okpukpe ụgha. Ọ bụghị ihe ijuanya na akwụkwọ Mkpughe mere ihe atụ nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dị ka nwanyị na-akwa iko nke ruru unyi, onye aha ya bụ Babilọn Ukwu ahụ.—Mkpughe 17:1-5.
Ezi Okpukpe
7. N’ihi gịnị ka nghagbu ahụ a ghagburu asụsụ na-ejighị metụta ezi okpukpe ahụ? (b) Ònye ka e mesịrị mara dị ka ‘nna nke ndị nile nwere okwukwe,’ ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
7 N’eziokwu, ezi okpukpe nọgidere n’enweghị mmetụta ọ bụla site ná nghagbu Jehova ghagburu ụzọ nkwurịta okwu nke ihe a kpọrọ mmadụ na Bebel. Ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi ndị dị ka Ebel, Ịnọk, Noa, nwunye Noa, ụmụ Noa ndị ikom na ndị nwunye ụmụ ya anọwo na-efe ezi ofufe tupu Iju Mmiri ahụ. Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, e chebere ezi ofufe n’usoro ọmụmụ nke nwa Noa, bụ́ Shem. Abraham, bụ́ onye sitere n’usoro ọmụmụ Shem, kpere ezi okpukpe ahụ, mesịakwa bụrụ onye a maara dị ka “nna nke ndị nile kwere [“nwere okwukwe,” NW].” (Ndị Rom 4:11) O ji ọrụ kwadoo okwukwe ya. (Jemes 2:21-23) Okpukpe ya bụ ụzọ ịdị ndụ.
8. (a) Olee ụzọ okpukpe ụgha si chee ezi okpukpe ahụ ihu n’ime narị afo nke 16 T.O.A., gịnịkwa si na ya pụta? (b) Ndokwa ọhụrụ dị aṅaa ka Jehova guzobere n’ihe banyere ezi ofufe ya?
8 A nọgidere na-efe ezi ofufe n’ahịrị nke ndị sitere n’usoro ọmụmụ Abraham—Aịsak, Jekọb, (ma ọ bụ, Israel), na ụmụ ndị ikom 12 nke Jekọb, ndị ebo 12 nke Israel sitere na ha. N’ọgwụgwụ nke narị afọ nke 16 T.O.A., ndị sitere n’usoro ọmụmụ Abraham site n’Aịsak nọ na-agbalịsi ike ichebe okpukpe ahụ dị ọcha na gburugburu ebe ha na-enweghị ntụsara ahụ, bụkwa nke ndị na-ekpere arụsị—Ijipt—ebe e wedaworo ha ala gaa n’ịbụ ohu. Jehova jiri ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Mosis, onye sitere n’ebo Livaị, mee ihe ịnapụta ndị na-efe Ya ofufe site na yoke nke Ijipt, bụ́ ala nke mikpuru emikpu n’okpukpe ụgha. Site na Mosis, Jehova sooro Israel banye n’ọgbụgba ndụ, na-eme ka ha bụrụ ndị Ya ọ họpụtara. N’oge ahụ, Jehova mere ka e detuo ụkpụrụ ofufe ya edetuo, na-edebe ya ruo nwa mgbe n’ime usoro a kpaara ókè nke ịchụ àjà dị iche iche nke usoro ndị nchụaja na-elekọta, nweekwa ebe nsọ a na-ahụ anya, nke bu ụzọ bụrụ ụlọ ikwuu ahụ a na-ebugharị ebugharị, mesịakwa bụrụ ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem.
9. (a) Olee ụzọ a na-esi efe ezi ofufe tupu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ? (b) Olee ụzọ Jisọs si gosi na akụkụ ndị a na-ahụ anya nke Iwu ahụ abụghị ihe na-adịgide adịgide?
9 Otú ọ dị, e kwesịrị ịrịba ama na e bughị n’uche ka ihe ndị a a na-ahụ anya ghọọ akụkụ na-adịgide adịgide nke ezi okpukpe. Iwu ahụ bụ “onyinyo nke ihe gaje ịbịa.” (Ndị Kọlọsi 2:17; Ndị Hibru 9:8-10; 10:1) Tupu Iwu Mosis ahụ, n’oge ndị nna ochie ahụ, ihe àmà gosiri na ndị isi ezinụlọ nọchitere anya ezinụlọ ha dị iche iche n’ịchụ àjà n’elu ebe ịchụ àjà dị iche iche ndị ha wuru. (Jenesis 12:8; 26:25; 35:2, 3; Job 1:5) Ma e nweghị usoro ndị nchụaja a haziri ahazi ma ọ bụ usoro ọchụchụ àjà, nke nwere usoro ihe omume na mmeghachi ihe omume dị iche iche. N’ịga n’ihu, Jisọs n’onwe ya gosipụtara ndịru nwa oge nke usoro ofufe ahụ e deturu edetu nke ebe bụ isi o nwere bụ Jerusalem mgbe ọ gwara otu nwanyị onye Sameria, sị: “Oge hour na-abịa, mgbe unu na-agaghị akpọ isiala nye Nna m, ma ọ bụ n’ugwu a [Geraịzim, ebe otu ụlọ nsọ ndị Sameria dịbu], ma ọ bụ na Jerusalem. . . . Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:21-23) Jisọs gosiri na a ghaghị ikpe ezi okpukpe, ọ bụghị site n’ihe ndị a na-ahụ anya, kama n’ime mmụọ na eziokwu.
Ịnọ ná Ndọta n’Agha na Babilọn
10. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka a dọrọ ndị ya n’agha laa Babilọn? (b) N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka Jehova si napụta ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi na 537 T.O.A., gịnị bụkwa nzube bụ isi nke nlọghachi ha lọghachitere na Juda?
10 Eri oge nnupụisi ahụ n’Iden, a nọgidewo na-enwe ọbụbụiro n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha. Mgbe ụfọdụ, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, okpukpe ụgha, nke Babilọn nọchiworo anya ya eri oge Nimrọd, adọrọwo ndị na-efe ezi ofufe n’agha. Tupu Jehova ekwere ka a dọrọ ndị ya n’agha laa Babilọn n’afọ 617 T.O.A na 607 T.O.A., ha abụrụwo ndị okpukpe ụgha nke Babilọn rikpuru. (Jeremaịa 2:13-23; 15:2; 20:6; Ezikiel 12:10, 11) N’afọ 537 T.O.A., ihe fọdụrụ nke kwesịrị ntụkwasị obi lọghachiri na Juda. (Aịsaịa 10:21) Ha zara ọkpụkpọ òkù amụma ahụ bụ: “Sinụ na Babilọn pụọ.” (Aịsaịa 48:20) Nke a agajeghị ịbụ nnapụta nkịtị nke anụ ahụ. Ọ bụkwa nnapụta ime mmụọ site na gburugburu ebe e nwere okpukpe ụgha nke ikpere arụsị, bụ́ nke na-adịghị ọcha. Otú a, e nyere ihe ahụ fọdụrụ nke kwesịrị ntụkwasị obi iwu, sị: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ: sinụ n’etiti ya pụọ: dịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova.” (Aịsaịa 52:11) Nzube bụ isi ha ji lọghachite na Juda bụ iguzobeghachi ofufe dị ọcha, bụ́ ezi okpukpe ahụ.
11. Tụkwasị ná mweghachi nke ofufe dị ọcha na Juda, ihe ndị dị aṅaa metụtara okpukpe weere ọnọdụ n’ime narị afọ nke isii T.O.A.?
11 N’ụzọ na-akpali mmasị, otu narị afọ nke isii T.O.A. ahụ hụkwara akụkụ ndị ọhụrụ nke okpukpe ụgha n’ime Babilọn Ukwu ahụ. Ọ bụ n’oge ahụ ka a mụpụtara okpukpe Buddha, okpukpe Confucius, okpukpe Zoroaster, na okpukpe Jain, ka a hapụgodị nkà ihe ọmụma ndị Grik nke na-achọ inye ihe nile nkọwa nke mmadụ, bụ́ nke mesịrị nwee mmetụta dị ukwuu n’ebe chọọchị dị iche iche nke Krisendọm dị. Ya mere, ka a nọ na-eguzobeghachi okpukpe dị ọcha na Juda, onye isi ndị iro Chineke nọ na-ewepụta ọtụtụ okpukpe ụgha ndị ọzọ.
12. Nnapụta dị aṅaa site ná ndọta n’agha nke Babilọn weere ọnọdụ n’ime narị afọ mbụ O.A., ịdọ aka ná ntị dịkwa aṅaa ka Pọl nyere?
12 Ka ọ na-erule mgbe Jisọs bịara n’Israel, ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nọ na-ekpe ụdị dị iche iche nke okpukpe ndị Juu, bụ́ ụdị usoro okpukpe nke nabataworo ọtụtụ echiche okpukpe ndị sitere na Babilọn. O jikọtawo onwe ya na Babilọn Ukwu ahụ. Kraịst katọrọ ya, napụtakwa ndị na-eso ụzọ ya site ná ndọta n’agha nke Babilọn. (Matiu, isi 23; Luk 4:18) Ebe okpukpe ụgha na nkà ihe ọmụma ndị Grik jupụtara ebe nile n’ógbè ndị ahụ o kwusara ozi ọma na ha, Pọl onyeozi hotara amụma Aịsaịa ma kọwaa ya dị ka nke metụtara ndị Kraịst, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka ha gbanarị mmetụta na-adịghị ọcha nke Babilọn Ukwu ahụ. O dere, sị: “Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị [nke Babilọn] na-ekwekọ? N’ihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ; dị ka Chineke kwuru, sị, M ga-ebi n’ime [“n’etiti,” NW] ha, na-ejegharịkwa n’ime [“n’etiti,” NW] ha; m ga-abụkwa Chineke nke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m. N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzookwanụ iche, ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”—2 Ndị Kọrint 6:16, 17.
Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha n’Oge Ọgwụgwụ
13. Gịnị ka e gosiri n’ozi ndị ahụ Kraịst zijeere ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor, gịnị sikwa na ya pụta?
13 Ozi ndị ahụ Kraịst zijeere ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor site ná Mkpughe ahụ e nyere Jọn onyeozi gosiri n’ụzọ doro anya na ka ọ na-eru ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ O.A., ihe omume na akparamagwa okpukpe Babilọn anọwo na-egbebata n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. (Mkpughe, isi 2 na 3) Ndapụ n’ezi ofufe ahụ nwere ihe ịga nke ọma karịsịa malite na narị afọ nke abụọ ruo narị afọ nke ise O.A., na-arụpụta mbilite nke ụdị rụrụ arụ nke na-abụghị ezie nke okpukpe ndị Kraịst dị ọcha. E webatara ozizi Babilọn ndị dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, hell nke na-ere ọkụ, na Atọ n’Ime Otu n’ime ozizi nke Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ. Chọọchị Katọlik, Orthodox, na mgbe e mesịrị, chọọchị Protestant, nabatachara ozizi ụgha ndị a, wee si otú a ghọọ akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha Ekwensu.
14, 15. (a) Gịnị ka ihe atụ Jisọs banyere ọka na átá ahụ gosiri? (b) Gịnị weere ọnọdụ n’oge ọgwụgwụ nke narị afọ nke 19, oleekwa ọganihu ezi ndị Kraịst nweworo n’ihe banyere ozizi ma rule 1914?
14 Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla e kpochapụrụ ezi okpukpe kpam kpam. A nọwo mgbe nile na-enwe ndị hụrụ eziokwu n’anya n’ime ọtụtụ narị afọ nile, ụfọdụ ndị ji ndụ ha kwụọ ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova na Okwu ya bụ Bible. Ma dị ka ihe atụ Jisọs banyere ọka na átá na-egosi, a ga-ekewapụ ọka ihe atụ ahụ ma ọ bụ ụmụ e tere mmanụ nke Alaeze ahụ, site n’átá ahụ, ma ọ bụ ụmụ nke ajọ onye ahụ, ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe nke a.’ (Matiu 13:24-30, 36-43) Ka oge ọgwụgwụ ahụ—bụ́ oge mgbe nkewa nke a ga-ewere ọnọdụ—na-abịa nso, ndị ji obi eziokwu na-amụ Bible n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke 19 malitere ịtọhapụ onwe ha site n’agbụ nke okpukpe ụgha.
15 Ka ọ na-erule 1914, ndị Kraịst ndị a, ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova, azụlitewo okwukwe siri ike n’ihe mgbapụta ahụ. Ha matara na ọnụnọ Kraịst aghaghị ịbụ nke a na-adịghị ahụ anya. Ha ghọtara na 1914 ga-aka akara ọgwụgwụ nke “oge ndị Jentaịl.” (Luk 21:24, King James Version) Ha ghọtakwara nke ọma ihe mkpụrụ obi na mbilite n’ọnwụ pụtara. E nyekwara ha nghọta n’ihe banyere oké njehie nke ozizi chọọchị dị iche iche n’ihe banyere ọkụ ala mmụọ na Atọ n’Ime Otu. Ha mụtara, malitekwa iji aha Chineke na-eme ihe, ghọtakwa ezighị ezi nke ozizi evolushọn na ime mgbaasị.
16. Ọkpụkpọ òkù dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ zara na 1919?
16 E nwewo mmalite dị mma n’iwepụchasị agbụ nile nke okpukpe ụgha. Na 1919 kwa, Babilọn Ukwu ahụ kwụsịrị inwe ike ọ bụla n’ebe ndị Chineke nọ. Dị nnọọ ka a napụtara ihe fọdụrụ ná ndị Juu site na Babilọn n’afọ 537 T.O.A., otú ahụ ka ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi n’etiti ndị Kraịst e tere mmanụ zara òkù ahụ ‘isi n’etiti ya [Babilọn Ukwu ahụ] pụta.’—Aịsaịa 52:11.
17. (a) Gịnị weere ọnọdụ site na 1922 gaa n’ihu, mkpa dịkwa aṅaa pụtara ìhè n’etiti ndị Chineke? (b) Ọnọdụ dị aṅaa nke gabigara ókè ka e weere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ji kwe nghọta?
17 Site na 1922 gaa n’ihu, e bipụtara eziokwu Bible ndị na-enwe mmetụta dị ike, kesaakwa ha n’ihu ọha, na-ekpughe okpukpe ụgha nke Babilọn, karịsịa chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. A hụrụ mkpa ọ dị ime ka ọ gbanye mkpọrọgwụ n’uche ndị Chineke e meworo ka ha dị ọcha, na nkewapụ site n’ụdị nile nke okpukpe ụgha aghaghị ịbụ nke e mere n’ụzọ zuru ezu. Otú a, ruo ọtụtụ afọ, e zeere ọbụna iji okwu ahụ bụ “okpukpe” eme ihe mgbe a na-ekwu okwu banyere ofufe dị ọcha. E ji okwu ndị dị ka “Okpukpe Bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ” gagharịa n’okporo ámá nke obodo ukwu dị iche iche. Akwụkwọ ndị dị ka Government (1928) na “The Truth Shall Make You Free” (1943) mere ka ọ pụta ìhè, bụ́ ọdịiche dị n’etiti “Iso Ụzọ Kraịst” na “okpukpe.” A pụrụ ịghọta ihe mere e ji were ọnọdụ nke a gabigara ókè, ebe ọ bụ na ọ dị mkpa ime nkewapụ pụtara ìhè site n’usoro okpukpe gazuru ebe dum nke Babilọn Ukwu ahụ.
Ezi Okpukpe na Okpukpe Ụgha
18. Nghọta ọhụrụ dị aṅaa banyere okwu ahụ bụ “okpukpe” ka e nyere na 1951, oleekwa ụzọ e si kọwaa nke a n’akwụkwọ 1975 Yearbook?
18 E mesịa, na 1951, oge kwesịrị ekwesị ruru ka Jehova nye ndị ya nghọta doro nnọọ anya nke ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha. Akwụkwọ 1975 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-akọ, sị: “Na 1951, ndị na-akwado ezi ofufe mụtara otu ihe dị mkpa banyere okwu ahụ bụ ‘okpukpe.’ Ụfọdụ n’ime ha ka pụrụ icheta 1938 mgbe, n’oge ụfọdụ, ha na-ebugharị ihe odide ahụ na-akpali iche echiche nke isiokwu ya bụ ‘Okpukpe bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ.’ Dị ka ha si ele ihe anya n’oge ahụ, ‘okpukpe’ nile bụ nke megidere Iso Ụzọ Kraịst, nke sitere n’aka Ekwensu. Ma Ụlọ Nche (Bekee) nke March 15, 1951, kwadoro iji okwu nkọwa nke bụ ‘ezi’ na ‘ụgha’ na-eme ihe banyere okpukpe. N’ịga n’ihu, akwụkwọ ahụ na-akpali mmasị, bụ́ What Has Religion Done for Mankind? (nke e bipụtara na 1951, wepụtakwa ya n’oge Mgbakọ ‘Ofufe Dị Ọcha’ e mere na Wembley Stadium, London England) kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na e lee ya anya dị ka a na-esi eji ya eme ihe, “okpukpe” ná nkọwa ya kasị dịrị mfe, pụtara ụzọ ife ofufe, ụdị ife ofufe, n’elebaghị anya ma ọ bụ ezi ofufe ma ọ bụ ofufe ụgha. Nke a kwekọrọ n’ihe okwu Hibru dịịrị ya pụtara, bụ́ ’a·boh·dáh, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ije ozi”, n’agbanyeghị onye a na-ejere ozi ahụ.’ Mgbe nke a gasịrị, okwu ndị ahụ bụ ‘okpukpe ụgha’ na ‘ezi okpukpe’ ghọrọ ihe a na-anụkarị n’etiti Ndịàmà Jehova.”—Peji 225.
19, 20. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị ewute ndị na-efe ezi ofufe bụ́ ojiji e ji okwu ahụ bụ “okpukpe” na-eme ihe banyere ofufe dị ọcha? (b) Gịnị ka nghọta ọhụrụ nke a mere ka ndị Jehova nwee ike ime?
19 Ná nzaghachi nye ajụjụ otu onye na-agụ akwụkwọ anyị jụrụ, mbipụta August 15, 1951, nke Ụlọ Nche (Bekee) kwuru, sị: “Onye ọ bụla ekwesịghị iwe iwe n’ihi ojiji e ji okwu ahụ bụ ‘okpukpe’ eme ihe. Ojiji anyị ji ya na-eme ihe adịghị etinye anyị n’otu ọkwá ahụ nke okpukpe ụgha ndị na-agbaso omenala nọ na ya, dịkwa ka ọkpụkpọ anyị kpọrọ onwe anyị ndị Kraịst na-etinyeghị anyị n’otu ọnọdụ ahụ nke ndị Kraịst ụgha nke Krisendọm nọ.”
20 N’abụghị mmebi okwukwe ha ma ọlị, nghọta ọhụrụ nke a nke okwu ahụ bụ “okpukpe” nyeere ndị Jehova aka ime ka ọ sawanye mbara, bụ́ ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
Iji Nwalee Nghọta Anyị
◻ Òle mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka okpukpe ụgha si malite n’elu ụwa?
◻ Gịnị ka Setan nwara iguzobe mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, oleekwa ụzọ e si mebie atụmatụ ya?
◻ Gịnị ka Babilọn ghọrọ ihe atụ ya?
◻ Nnapụta dịgasị aṅaa weere ọnọdụ na 537 T.O.A., n’ime narị afọ mbụ O.A., nakwa na 1919?
◻ Nghọta ọhụrụ dị aṅaa nke okwu ahụ bụ “okpukpe” ka e nyere na 1951, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji bụrụ mgbe ahụ ka e nyere ya?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]
Ozizi ụgha ndị e kwenyere na ha gburugburu ụwa nwere mmalite ha na Babilọn:
◻ Atọ n’Ime Otu, ma ọ bụ njikọ chi atọ dị iche iche
◻ Mkpụrụ obi mmadụ na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị
◻ Ime mgbaasị—iso “ndị nwụrụ anwụ” ekwurịta okwu
◻ Iji ihe oyiyi dị iche iche eme ihe n’ofufe
◻ Iji anwansi emedo ndị mmụọ ọjọọ obi
◻ Ọchịchị nke òtù ndị ụkọchukwu dị ike