Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/1 p. 6-8
  • Okpukpe Ọ Bụla Ọ̀ Dị Nnọọ Mma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okpukpe Ọ Bụla Ọ̀ Dị Nnọọ Mma?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọdịiche nke Dị Mkpa
  • Mkpa Ọ Dị Ime Nhọrọ
  • Ụzọ A Ga-esi Họrọ Okpukpe nke Ziri Ezi
  • Eziokwu na Mkpụrụ
  • A Na-ekpe Ezi Okpukpe Taa
  • Otú Okpukpe Ụgha Si Emechu Chineke Ihu
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
    A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
  • Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/1 p. 6-8

Okpukpe Ọ Bụla Ọ̀ Dị Nnọọ Mma?

“Ihe na-achọ ime n’oge anyị a dị oké njọ. Okpukpe dị anyị mkpa, ma ọ dịghị ebe anyị na-achọta Chineke nke ga-ekwekọ na ya.”—Lucian Blaga, onye Rom na-ede abụ, bụkwa ọkà ihe ọmụma

“Okpukpe na ndị ndú okpukpe esowo, ma eleghị anya ha ga-anọgidekwa ruo ogologo oge na-eso, n’ihe ndị kasị bụrụ ndị iro nye ọganihu na nnwere onwe.”—Khristo Botev, Onye Bulgaria na-ede abụ

NHOTA okwu ndị dị n’akụkụ ebe a na-egosipụta ọnọdụ ihe isi ike ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na-achọta onwe ha n’ime ya. N’ime ime obi ha, ha na-ahụta mkpa okpukpe dị ha, ma Chineke dị omimi nke ndị ndú okpukpe na-akụziri ha banyere ya abụghị Chineke nke ha pụrụ ịghọta, hụkwa n’anya. Karịa nke ahụ, ha na-achọpụta na ndị ndú okpukpe na okpukpe ha dị iche iche emewo ihe dị ukwuu iji gbochie ọganihu na nnwere onwe nke ụmụ mmadụ. Ee, ọ bụ ezie na a na-amatawanye mkpa okpukpe dị, ndị nwere obi eziokwu agaghị anara okpukpe ọ bụla.

Ọdịiche nke Dị Mkpa

Okpukpe na-arụ ọrụ bụ isi n’ọdịdị na akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Akwụkwọ bụ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu banyere okpukpe “dị ka ihe dị adị n’ahụmahụ, omenala, na akụkọ ihe mere eme mmadụ,” kwuokwa, sị: “E nwere ihe àmà dị iche iche nke akparamagwa na ikwenyere okpukpe n’akụkụ nile nke ndụ mmadụ.” Ma akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ dịghị nke ọ bụla n’okpukpe ndị bụ isi dị n’ụwa nke bụworo ihe ngọzi nye ihe a kpọrọ mmadụ.

Onye nọ n’ọkwá ọchịchị dị elu n’India bụ Jawaharlal Nehru kwuru n’otu mgbe gara aga, sị: “Ọnọdụ nke ihe a kpọrọ okpukpe, ma ọ bụ okpukpe a haziri ahazi, n’India nakwa n’ebe ndị ọzọ, eyiwo anyị egwu nke ukwuu.” N’ịtụle agha ndị a lụworo na mpụ ndị e meworo n’aha okpukpe, ị̀ pụrụ iji obi eziokwu rụọ ya ụka?

N’ime narị afọ nke 18, onye France bụ ọkà ihe ọmụma, bụ́ Voltaire kwupụtara otu ọdịiche na-akpali mmasị. O dere, sị: “Ị na-asị na okpukpe akpatawo ọtụtụ ajọ ihe omume. Kama nke ahụ, i kwesịrị ikwu na ọ bụ nkwenkwe ụgha kpatara ha, bụ́ nkwenkwe ụgha nke na-achị achị n’ụwa anyị nke nọ ná mwute. Nkwenkwe ụgha bụ onye iro kasị njọ nye ofufe dị ọcha nke anyị ji Onye ahụ Kasị Elu dị ka ụgwọ.” Voltaire lụrụ ọgụ megide ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe nke oge ya, ma ọ nọgidesiri ike ná nkwenye o kwenyere na Chineke dị ka Onye Okike nke eluigwe na ala dum. Ọ hụrụ ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha.

Mkpa Ọ Dị Ime Nhọrọ

Ọ bụghị mmadụ nile kwenyeere Voltaire. Ụfọdụ na-ekwu na ezi ihe dị n’okpukpe dum; n’ihi ya, ha adịghị ahụta ezi mkpa ọ dị ịchọta nke bụ ezi okpukpe. Ndị dị otú ahụ kwesịrị ịnara ịdọ aka ná ntị ahụ Aịsaịa onye amụma nyere, onye dere, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị; ndị na-etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu!” (Aịsaịa 5:20) Okpukpe ụgha arụpụtaworo ihe a kpọrọ mmadụ ihe dị njọ. Ọ rụpụtawo ọchịchịrị ime mmụọ, o mewokwa ka ndị nwere obi eziokwu ghara inwe mmasị n’okpukpe.

Ya mere, nhọrọ a ga-eme abụghị n’etiti ịbụ onye na-ekweghị na Chineke dị na ikwere n’okpukpe ọ bụla. Ọ dịchaghị mfe otú ahụ. Ozugbo mmadụ matara mkpa Chineke dị, onye ahụ aghaghị ịchọta ezi okpukpe ahụ. Dị ka onye ọkà n’ime nnyocha, bụ́ Émile Poulat, si kwuo ya nke ọma n’akwụkwọ bụ Le Grand Atlas des Religions (Nnukwute Akwụkwọ Nkọwa nke Okpukpe Dị iche Iche): “Ihe ndị [okpukpe dị iche iche] na-akụzi, na-achọkwa n’aka ụmụ mmadụ dị iche iche nke ukwuu nke na ọ bụghị ihe kwere omume ikwenye na ha nile.” N’ikwenye na nke a, akwụkwọ ahụ dị n’asụsụ French bụ Encyclopædia Universalis (Akwụkwọ Ihe Ọmụma Ụwa Dum) na-asị: “Ọ bụrụ na narị afọ nke 21 alọghachitekwuru okpukpe, . . . ọ ga-adị mkpa ka mmadụ kpebie ma ihe ndị dị nsọ a na-eche ya n’ihu hà bụ eziokwu ka hà bụ ụgha.

Ụzọ A Ga-esi Họrọ Okpukpe nke Ziri Ezi

Gịnị ga-eduzi anyị n’ịhọrọ okpukpe nke ziri ezi? Akwụkwọ Encyclopædia Universalis ahụ kwuru ihe ziri ezi mgbe o mere ka ọ pụta ìhè, bụ́ ịdị mkpa nke eziokwu. Okpukpe nke na-akụzi okwu ụgha apụghị ịbụ nke bụ ezie. Onye amụma kasị ukwuu nke dịrị ndụ n’elu ala, kwuru, sị: “Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:24.

Onye amụma ahụ bụ Jisọs Kraịst, o kwukwara, sị: “Kpacharanụ anya banyere ndị okpukpe na-ezi ozizi ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi nke atụrụ ma n’ezie ha bụ agụ na-adọgbu adọgbu. Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha. . . . Ezi osisi ọ bụla na-amịpụta mkpụrụ ahụ dị mma, ma osisi rere ere na-amịpụta ajọ mkpụrụ.” (Matiu 7:15-17, Phillips) N’ịhụ ajọ mkpụrụ nke okpukpe “ndị bụ isi” dị n’ụwa mịpụtaworo, ọbụna nke ịrọ òtù na ìgwè nta dị iche iche ndị biliteworonụ mịpụtaworo, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na-amalite ile ha anya dị ka ‘osisi ndị rere ere,’ ndị na-adịtụdịghị nnọọ mma. Ma olee ụzọ ha pụrụ isi chọta ezi okpukpe ahụ?

N’eziokwu, ọ ga-abụ ihe na-ekweghị omume ịmụ ihe banyere ọtụtụ puku okpukpe ndị so na ndị na-esoghị na Krisendọm tupu mmadụ emee nhọrọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na—dị ka Jisọs kwuru—anyị ejiri eziokwu na mkpụrụ a mipụtara mee ihe dị ka ihe nnwale, ọ ga-ekwe omume ịmata nke bụ ezi okpukpe ahụ.

Eziokwu na Mkpụrụ

Jisọs hotara eziokwu. N’ihe banyere nke a, olee òtù ndị kwere ekwe ndị na-ajụ okwu ụgha nile nke okpukpe ndị e nwetara site n’akụkọ ifo mgbe ochie na nkà ihe ọmụma ndị Grik nke jupụtara n’ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị e nwere? Otu n’ime okwu ụgha ndị dị otú ahụ bụ ozizi ahụ nke bụ na mkpụrụ obi mmadụ nwere anwụghị anwụ n’ime ya.a Ozizi nke a amụpụtawo ozizi ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke nke ọkụ ala mmụọ.

Jisọs hotakwara mkpụrụ a mịpụtara. N’ihe banyere nke a, ị̀ maara okpukpe nke mịpụtaworo ezi ọbụbụ ụmụnna zuru ụwa ọnụ ebe e jiworo ịhụnanya na nghọta e nwerịtara n’etiti mmadụ na ibe ya merie ihe mgbochi nke agbụrụ, asụsụ, na nke mba dị iche iche? Ị̀ maara banyere otu òtù okpukpe zuru ụwa ọnụ nke ndị nọ na ya na-ekwe ka a kpagbuo ha kama ikwe ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ndị ndú okpukpe kpalie ha ịkpọ ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị asị na igbu ha n’aha nke ịhụ mba n’anya ma ọ bụ n’aha nke okpukpe? Okpukpe nke jụrụ okwu ụgha dị otú ahụ nke okpukpe, mịpụtakwa mkpụrụ ndị dị otú ahụ ga-enye ihe àmà siri ike nke ịbụ nke ahụ ziri ezi, ọ́ bụghị otú ahụ?

A Na-ekpe Ezi Okpukpe Taa

È nwere okpukpe dị otú ahụ? Ee, e nwere ya. Ma ị ghaghị ikweta na ọ bụghị otu n’ime okpukpe ndị bụ isi dị n’ụwa. Nke a ò kwesịrị ịbụrụ anyị ihe ijuanya? Ee e. N’Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama, Jisọs kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14.

N’ihi ya, olee ebe a pụrụ ịchọta ezi okpukpe? N’ịdị umeala n’obi na n’obi eziokwu nile, anyị aghaghị ikwu na Ndịàmà Jehova bụ òtù zuru ụwa ọnụ nke na-eje ije ‘n’okporo ụzọ nke a dị warara na mkpagide.’ N’eziokwu, okpukpe ndị bụ isi ji ịkwa emo na-akpọ Ndịàmà Jehova ịrọ òtù. Ma nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ndị okpukpe si n’ezi ofufe dapụ n’ime narị afọ mbụ O.A. kpọrọ ndị Kraịst oge gboo.—Ọrụ 24:1-14.

N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji nwee obi ike na ha nwere ezi okpukpe ahụ? Ee, ha mejupụtara òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke dị adị n’ihe karịrị 200 ala dị iche iche, nke na-emerikwa nkewa nile nke mba, agbụrụ, asụsụ, na ọnọdụ ndụ. Ha na-ajụkwa ikwenye n’ozizi nile—n’agbanyeghị otú ha si bụrụ nke ochie—ndị o doro anya na ha na-emegide ihe Bible kwuru. Ma olee ụzọ ha si banye n’ọnọdụ dị otú ahụ a na-achọsi ike? Gịnịkwa ka ikpe ezi okpukpe ahụ na-agụnye? A ga-atụle nke a na ajụjụ ndị ọzọ banyere okpukpe n’isiokwu abụọ na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ihe àmà e dere nke ọma banyere eziokwu ahụ nke bụ na nkwenkwe nke a malitere n’akụkọ ifo, lee akwụkwọ ahụ bụ Mankind’s Search for God, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji 52-57.

[Foto dị na peeji nke 7]

Agha Ntụte ndị ahụ bụ akụkụ nke ajọ mkpụrụ okpukpe ụgha mịpụtaworo

[Ebe e si Nweta Foto]

Bibliothèque Nationale, Paris

[Foto dị na peeji nke 8]

Ezi okpukpe na-amịpụta ezi mkpụrụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya