Akụkọ Alaeze nke 37
Ozi A Ga-ezisa n’Ụwa Nile
A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
▪ Gịnị bụ okpukpe ụgha?
▪ Olee otú a ga-esi bibie ya?
▪ Olee otú nke ahụ ga-esi metụta gị?
Gịnị Bụ Okpukpe Ụgha?
Mpụ ndị a na-eme n’aha okpukpe ọ̀ na-ewe gị iwe? Ọ̀ na-agbakasị gị ahụ́ ịhụ ebe ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke na-eso alụ agha, na-eyi ọha egwu, ma ọ bụ na-arụrụ aka? Gịnị mere o ji yie ka ọ̀ bụ okpukpe na-akpata ọtụtụ nsogbu ndị a na-enwe taa?
Ụta adịghịrị okpukpe nile, kama ọ bụ okpukpe ụgha ka a ga-ata ụta. Otu onye a ma ama nke a na-asọpụrụ n’ụwa nile, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru na ọ bụ okpukpe ụgha na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, dị nnọọ ka ‘osisi rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru.’ (Matiu 7:15-17) Mkpụrụ dị aṅaa ka okpukpe ụgha na-amị?
◼ OKPUKPE ỤGHA NA-ETINYE AKA N’AGHA NAKWA NA NDỌRỌ NDỌRỌ ỌCHỊCHỊ: Akwụkwọ akụkọ bụ́ Asiaweek na-ekwu, sị: “Iji mezuo nzube nke onwe ha, ndị ọchịchị nọ ma n’Eshia ma n’ebe ndị ọzọ, bụ́ ndị inweta ike na-atọgbu atọgbu, na-aranye ndị mmadụ n’ịgbachitere okpukpe ha.” N’ihi ya, akwụkwọ akụkọ ahụ dọrọ aka ná ntị, sị: “O yiri ka ụwa ọ̀ ga-amalite ịgba aghara.” Otu ụkọchukwu a ma ama na United States kwuru, sị: “E kwesịrị igbu ndị na-eyi ọha egwu ma a chọọ ka ha kwụsị igbu ndị mmadụ.” Gịnị ka ọ na-atụ aro ya? “Gbusịsịa ha nile n’aha Onyenwe anyị.” Bible kwuru ihe dị iche na nke ahụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo, sị: ‘Ahụrụ m Chineke n’anya,’ ma na-akpọkwa nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha.” (1 Jọn 4:20) Ọbụna Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya.” (Matiu 5:44) Okpukpe ole ka ị ma, bụ́ ndị ndị òtù ha na-anaghị eso alụ agha?
◼ OKPUKPE ỤGHA NA-EZI OZIZI ỤGHA: Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ọ dị ihe a na-adịghị ahụ anya nke dị n’ime mmadụ, bụ́ nke na-adịgide ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị. Ọtụtụ n’ime okpukpe ndị ahụ na-ezi ozizi dị otú a iji rigbuo ndị òtù ha, ha na-anakwa ha ego iji kpeere ndị ha nwụrụ anwụ ekpere. Otú ọ dị, Bible na-akụzi ihe dị iche. ‘Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.’ (Ezikiel 18:4) “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Jizọs kụziri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Nke a agaraghị adị mkpa ma a sị na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. (Jọn 11:11-25) Okpukpe gị ọ̀ na-akụzi na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ?
◼ OKPUKPE ỤGHA NA-ANABATA MMEKỌAHỤ RỤRỤ ARỤ: Ná mba ndị mepere emepe, chọọchị ụfọdụ na-echi ndị nwoke na-edina nwoke ibe ha na ndị nwanyị na-edina nwanyị ibe ha ụkọchukwu. Ha na-agbalịkwa ime ka gọọmenti kwadoo nwoke ịlụ nwoke ibe ya na nwanyị ịlụ nwanyị ibe ya. Ọbụna chọọchị ndị na-akatọ omume rụrụ arụ na-anabata ndị ụkọchukwu dinara ụmụaka. Ma, gịnị ka Bible na-akụzi? Ọ na-ekwu hoo haa, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ̀ dị okpukpe ndị ị ma na-anabata mmekọahụ rụrụ arụ?
N’ọdịnihu, gịnị ga-eme okpukpe ndị na-amị mkpụrụ rere ure? Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “A na-egbutu osisi ọ bụla na-adịghị amị ezi mkpụrụ ma tụba ya n’ime ọkụ.” (Matiu 7:19) Ee, a ga-egbutu okpukpe ụgha ma bibie ya! Ma olee otú nke a ga-esi mee, oleekwa mgbe ọ ga-eme? Ọhụụ e dekọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, isi 17 na nke 18, zara ajụjụ ahụ.
Olee otú a ga-esi bibie okpukpe ụgha?
Jirigodị uche gị hụ ebe ihe dị otú a na-eme. Otu nwanyị akwụna nọkwasịrị n’elu anụ ọhịa dị egwu. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. (Mkpughe 17:1-4) Ònye ka nwanyị akwụna ahụ na-anọchi anya ya? Ọ na-achịkwa “ndị eze nke ụwa.” O yi uwe na-acha odo odo, na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ọ bakwara ọgaranya nke ukwuu. Ọzọkwa, o ji mgbaasị ọ na-eme ‘na-eduhie mba nile.’ (Mkpughe 17:18; 18:12, 13, 23) Bible na-enyere anyị aka ịhụ na nwanyị akwụna a bụ òtù okpukpe zuru ụwa ọnụ. Ọ bụghị otu okpukpe nanị ka ọ na-anọchi anya ya, kama ọ na-anọchi anya okpukpe nile na-amịpụta mkpụrụ rere ure.
Anụ ọhịa ahụ, nke nwanyị akwụna ahụ nọkwasịrị n’elu ya, na-anọchi anya mba ndị na-achị ụwa.a (Mkpughe 17:10-13) Okpukpe ụgha na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa a nke na-anọchi anya ndị ọchịchị, ma na-agbalị ikpebiri ya ihe ọ ga-eme nakwa ebe ọ ga-aga.
Ma, n’oge na-adịghị anya, ihe dị ịtụnanya ga-eme. “Mpi iri ahụ ị hụkwara, na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị ma mee ka ọ laa n’iyi na ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erichapụkwa uru ahụ́ ya ma kpọọ ya ọkụ kpam kpam.” (Mkpughe 17:16) Na mberede, mba ndị na-achị ụwa ga-awakpo okpukpe ụgha ma bibie ya kpam kpam! Gịnị ga-akpali ha ime nke a? Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-aza, sị: “Chineke tinyere ya n’obi ha imezu echiche ya.” (Mkpughe 17:17) Ee, Chineke ga-ajụ okpukpe ụgha ajụjụ maka ihe ọjọọ nile o mekọjuru n’aha ya. Iji kpee ikpe ziri ezi, ọ ga-esite n’aka ndị ọchịchị ha na ya na-akwa iko bibie ya.
Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee ma ọ bụrụ na ị chọghị ka ihe a ga-adakwasị okpukpe ụgha dakwasị gị? Onye ozi Chineke na-agba ume, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta.” (Mkpughe 18:4) N’ezie, ugbu a bụ oge isi n’okpukpe ụgha pụta! Ma, ọ̀ pụtara na ị ga-akwụsị ikwere na Chineke? Ee e, olileanya adịghịrị ndị na-ekweghị na Chineke. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) Nanị ebe ị pụrụ ịgbaba bụ n’ezi okpukpe. Olee otú ị pụrụ isi mata ezi okpukpe?
Otú a ga-esi mata ezi okpukpe
Olee mkpụrụ ọma ezi okpukpe kwesịrị ịmị?—Matiu 7:17.
◼ EZI OKPUKPE NA-EGOSIPỤTA ỊHỤNANYA: Ndị na-efe ezi ofufe “abụghị akụkụ nke ụwa,” ha adịghị ekwe ka agbụrụ ma ọ bụ ọdịbendị kewaa ha. Ha na-enwe ‘ịhụnanya n’etiti onwe ha.’ (Jọn 13:35; 17:16; Ọrụ 10:34, 35) Kama igbu ibe ha, ha na-adị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.—1 Jọn 3:16.
◼ EZI OKPUKPE NA-ATỤKWASỊ OKWU CHINEKE OBI: Kama ịkụzi “ọdịnala” na “ihe mmadụ nyere n’iwu dị ka ozizi,” ihe ezi okpukpe na-akụzi na-adabere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Matiu 15:6-9) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie.”—2 Timoti 3:16.
◼ EZI OKPUKPE NA-EME KA EZINỤLỌ SIE IKE MA NA-AGBA NDỊ MMADỤ UME ỊDỊ NA-AKPA ÀGWÀ ỌMA: Ezi okpukpe na-akụziri ndị bụ́ di ka ha ‘na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha,’ na-enyere ndị bụ́ nwunye aka ịdị ‘na-akwanyere di ha ùgwù n’ụzọ miri emi,’ na-akụzikwara ụmụaka ka ha ‘na-erubere ndị mụrụ ha isi.’ (Ndị Efesọs 5:28, 33; 6:1) Ọzọkwa, ndị e nyere ike ịdị na-edu ndú kwesịrị ịdị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya site n’omume ha.—1 Timoti 3:1-10.
Ọ̀ dị okpukpe na-eme ihe ndị a e kwuru? Akwụkwọ bụ́ Holocaust Politics, nke e bipụtara n’afọ 2001, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-eme ihe Ndịàmà Jehova na-ekwusa ma na-agbaso omume ha, a gaara egbochi mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu, a gaghịkwa na-enwe mgbukpọ nke agbụrụ n’ụwa ọzọ.”
N’ezie, na narị ala abụọ na iri ala atọ na ise, Ndịàmà Jehova adịghị ekwusa nanị ụkpụrụ omume ọma dị n’ime Bible, kama ha na-etinyekwa ya n’ọrụ ná ndụ ha. Anyị na-agba gị ume ka ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka ịmata ihe Chineke chọrọ n’aka gị ka i wee nwee ike ife ya n’ụzọ ọ na-anakwere. I kwesịrị ime ihe ugbu a. Egbula oge. A ga-ebibi okpukpe ụgha n’oge na-adịghị anya!—Zefanaịa 2:2, 3.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu banyere ozi dabeere na Bible, nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa, kpọtụrụ ha n’ógbè gị.
□ Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akwụkwọ a a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta ma zite ya n’adres ahụ e dere na ya.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere isiokwu a, lee akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
“Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Okpukpe ụgha na-achịkwa “ndị eze nke ụwa”