Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 11 p. 18-19
  • Jụ Okpukpe Ụgha!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jụ Okpukpe Ụgha!
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Okpukpe Ụgha Si Emechu Chineke Ihu
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
    A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 11 p. 18-19

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Jụ Okpukpe Ụgha!

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya achọghị ka i jeere Chineke ozi. Ha chọrọ ime ka mmadụ nile wezụga onwe ha n’ebe Chineke nọ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ha omume. Olee ụzọ ha si anwa ime nke a? Otu ụzọ bụ site n’okpukpe ụgha. (2 Ndị Kọrint 11:13-15) Okpukpe bụ nke ụgha ma ọ bụrụ na ọ dịghị akụzi eziokwu nke sitere na Bible. Okpukpe ụgha yiri ego adịgboroja—ọ pụrụ iyi ezigbo ego, ma ọ baghị uru. Ọ pụrụ ịkpatara gị ọtụtụ nsogbu.

Ebe di na nwunye na-ekpe ekpere na chọọchị

Okwu ụgha nke okpukpe adịghị mgbe ọ ga-amasị Jehova, bụ́ Chineke nke eziokwu. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, e nwere otu òtù okpukpe nke chọrọ igbu ya. Ha chere na ụzọ ha si efe ofufe bụ ụzọ ziri ezi. Ha kwuru, sị: “Otu nna ka anyị nwere, bụ́ Chineke.” Jisọs ò kwetara? Ee e! Ọ sịrị ha: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ ekwensu.” (Jọn 8:41, 44) Taa ọtụtụ ndị na-eche na ha na-efe Chineke ofufe, ma n’ezie ha na-ejere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ozi!—1 Ndị Kọrint 10:20.

Dị nnọọ ka osisi na-abaghị n’ihe na-amịpụta ajọ mkpụrụ, okpukpe ụgha na-azụpụta ndị na-eme ihe ọjọọ. Ụwa jupụtara ná nsogbu n’ihi ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme. E nwere omume rụrụ arụ, ịlụ ọgụ, izu ohi, mmegbu, igbu ọchụ, na idina mmadụ n’ike. Ọtụtụ bụ́ ndị na-eme ihe ọjọọ ndị a nwere okpukpe ha na-ekpe, ma okpukpe ha adịghị akpali ha ime ezi ihe. Ha apụghị ịbụ ndị enyi Chineke ọ gwụla ma ha kwụsịrị ime ihe ọjọọ.—Matiu 7:17, 18.

Okpukpe ụgha na-akụziri ndị mmadụ ikpegara ihe oyiyi ekpere. Chineke kwuru ka a ghara ikpegara ihe oyiyi ekpere. Ezi uche dị na nke a. Ọ̀ ga-amasị gị ma ọ bụrụ na mmadụ adịghị ekwunyere gị okwu ma na-ekwunyere nanị foto gị okwu? Onye ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ enyi gị n’ezie? Ee e, ọ pụghị ịbụ. Jehova chọrọ ka ndị mmadụ na-ekwunyere ya okwu, ọ bụghị ihe a pịrị apị ma ọ bụ foto, nke na-adịghị ndụ.—Ọpụpụ 20:4, 5.

Ebe ndị soja bú égbè

Okpukpe ụgha na-akụzi na igbu mmadụ ma a na-alụ agha adịghị njọ. Jisọs kwuru na ndị enyi Chineke ga-ahụ onwe ha n’anya. Anyị adịghị egbu ndị anyị hụrụ n’anya. (Jọn 13:35) Ọ bụ ihe ọjọọ ọbụna anyị igbu ndị ọjọọ. Mgbe ndị iro Jisọs bịara ijide ya, o kweghị ka ndị na-eso ụzọ ya lụọ ọgụ iji chebe ya.—Matiu 26:51, 52.

Okpukpe ụgha na-akụzi na ndị ajọ omume ga-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ma, Bible na-akụzi na mmehie na-eduga n’ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Jehova bụ Chineke ịhụnanya. Chineke na-ahụ n’anya ọ̀ ga-ata ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ dịghị ma ọlị! N’ime Paradaịs, a ga-enwe nanị otu okpukpe, otu nke Jehova kwadoro. (Mkpughe 15:4) A ga-ekpochapụ okpukpe nile dabeere n’ụgha Setan.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya