Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 10 p. 16-17
  • Ụzọ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jụ Okpukpe Ụgha!
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Olee Otú Ị Ga-esi Amata Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 10 p. 16-17

IHE ỌMỤMỤ NKE 10

Ụzọ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, ị ghaghị ịdị na-ekpe okpukpe nke Chineke kwadoro. Jisọs kwuru na “ndị na-akpọ isiala n’ezie” ga na-efe Chineke ofufe n’ụzọ kwekọrọ ‘n’eziokwu.’ (Jọn 4:23, 24) E nwere nanị otu ụzọ ziri ezi nke isi na-efe Chineke ofufe. (Ndị Efesọs 4:4-6) Ezi okpukpe na-eduga ná ndụ ebighị ebi, okpukpe ụgha na-edugakwa ná mbibi.—Matiu 7:13, 14.

Ebe ụmụ nwoke ụfọdụ na-ahụ otú otu onyeàmà Jehova bụ́ onye agbata obi ha si na-akpa àgwà ọma

Ị pụrụ ịmata ezi okpukpe site n’ikiri ndị na-ekpe ya. Ebe Jehova bụ ezi onye, ndị na-efe ya n’ezie aghaghị ịbụ ndị ezi mmadụ. Dị nnọọ ka ezigbo osisi oroma si amịpụta oroma dị mma, ezi okpukpe na-azụpụta ndị ọma.—Matiu 7:15-20.

Ndị enyi Jehova na-enwe nkwanye ùgwù dị omimi maka Bible. Ha maara na Bible sitere n’aka Chineke. Ha na-ekwe ka ihe ọ na-ekwu na-eduzi ndụ ha, dozie nsogbu ha ma nyere ha aka ịmụta banyere Chineke. (2 Timoti 3:16) Ha na-agbalị ime ihe ha na-akụzi.

Ndị enyi Jehova na-egosirịta ibe ha ịhụnanya. Jisọs gosiri ndị mmadụ ịhụnanya site n’ịkụziri ha banyere Chineke, site n’ịgwọ ndị na-arịa ọrịa. Ndị na-ekpe ezi okpukpe na-egosikwa ndị ọzọ ịhụnanya. Dị ka Jisọs, ha adịghị eleda ndị dara ogbenye ma ọ bụ ndị si n’agbụrụ ọzọ anya. Jisọs kwuru na ndị mmadụ ga-amata ndị na-eso ụzọ ya site n’ịhụnanya ha na-egosirịta ibe ha.—Jọn 13:35.

Ndị enyi Chineke na-asọpụrụ aha Chineke, bụ́ Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ịkpọ gị aha gị, onye ahụ ọ̀ ga-abụ ezigbo enyi gị? Ee e! Mgbe anyị nwere enyi, anyị na-akpọ ya aha ya ma na-akọrọ ndị ọzọ ọtụtụ ihe ọma banyere enyi anyị ahụ. Ya mere ndị chọrọ ịbụ ndị enyi Chineke kwesịrị ịdị na-akpọ ya aha ya ma na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya. Jehova chọrọ ka anyị na-eme nke ahụ.—Matiu 6:9; Ndị Rom 10:13, 14.

Dị ka Jisọs, ndị enyi Chineke na-akụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Ndị enyi Chineke na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma banyere Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

Ndịàmà Jehova na-agbalị ịbụ ndị enyi Chineke. Ha na-akwanyere Bible ùgwù ma nwee ịhụnanya n’etiti onwe ha. Ha na-ejikwa aha Chineke eme ihe ma na-asọpụrụ ya, na-akụzikwara ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Ndịàmà Jehova na-ekpe ezi okpukpe taa n’ụwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya