Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 10 ajụjụ 1-4
  • Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Ị Ga-esi Amata Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Banyere Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 10 ajụjụ 1-4

ISI NKE 10

Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?

1. Ọ̀ bụ naanị otu ezigbo okpukpe ka e nwere taa?

Ebe Jizọs na-akụzi ihe

“Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha.”​—MATIU 7:15.

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na e nwere naanị otu ezigbo okpukpe. Ọ kpọrọ ya ụzọ na-eduba ná ndụ. Ọ sị na ndị na-achọta ya dị ole na ole. (Matiu 7:14) Ọ bụ naanị ndị na-efe Chineke otú Baịbụl kwuru ka Chineke na-anabata ofufe ha. Ndị niile na-efe ya otú ọ chọrọ nọ n’otu okpukpe.​—Gụọ Jọn 4:23, 24; 14:6; Ndị Efesọs 4:4, 5.

Lee vidio bụ́ Chineke Ọ̀ Na-anabata Otú Ọ Bụla Ndị Mmadụ Si Efe Ya?

2. Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara Ndị Kraịst adịgboroja?

Ebe ụkọchukwu na-ekwu okwu Chukwu. Ebe ụkọchukwu ahụ na-agọzi ndị agha.

“Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke, ma ha na-agọnahụ ya site n’ọrụ ha.”​—TAỊTỌS 1:16.

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o kwuru na a ga-enwe ndị amụma ụgha, ndị ga-akụzi ihe na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Ị na-ele ha anya, gị echee na ha bụ ezigbo ndị na-efe Chineke. Ha na-asịkwa na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. Ma, i leruo ha anya, ị ga-ama na ha bụ Ndị Kraịst adịgboroja. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ bụ naanị n’ezigbo okpukpe ka ị ga-enweta ezigbo Ndị Kraịst, ndị na-akpakwa àgwà ka Ndị Kraịst.​—Gụọ Matiu 7:13-23.

3. Olee otú ị ga-esi amata ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ?

Legodị ihe ise e ji ama ha:

  • Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eji Baịbụl egwu egwu. Ha na-agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ihe mere ezigbo Ndị Kraịst ji dị iche ná Ndị Kraịst adịgboroja bụ na ha anaghị eso ihe ụmụ mmadụ kwuru. (Matiu 15:7-9) Ha abụghị soro okwu ọnụ m esola omume m.​—Gụọ Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17.

  • Ebe nwanna nwoke na-ekwu okwu ihu ọha. Ebe nwanna ahụ na-ezi ozi ọma, na-enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, na-enyekwara ndị agadi aka.

    Ezigbo Ndị Kraịst na-akwanyere aha Chineke ùgwù. Jizọs kwanyeere aha Chineke ùgwù, meekwa ka ndị mmadụ mara ya. O mere ka ha mara onye Chineke bụ, kụziekwara ha ka ha na-ekpe ekpere ka e doo aha ya nsọ. (Matiu 6:9) N’ebe i bi, olee okpukpe na-akụziri ndị mmadụ na aha Chineke bụ Jehova?​—Gụọ Jọn 17:26; Ndị Rom 10:13, 14.

  • Ezigbo Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Chineke zitere Jizọs ka o kwusaa ozi ọma Alaeze ya. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha. Jizọs ziri ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke ruo ụbọchị ọ nwụrụ. (Luk 4:43; 8:1; 23:42, 43) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ bịara izi gị ozi ọma, ya amalite ịkọrọ gị ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ, olee okpukpe obi gị ga-agwa gị na ọ na-ekpe?​—Gụọ Matiu 24:14.

  • Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eso eme ihe ndị e ji mara ụwa ọjọọ a. Ha anaghị eso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’ọgba aghara ndị a na-enwe n’ụwa. (Jọn 17:16; 18:36) Ha anaghịkwa eso ndị mmadụ eme omume ọjọọ dị iche iche ha na-eme.​—Gụọ Jems 4:4.

  • Ezigbo Ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya. Okwu Chineke akụzierela ha na o nweghị agbụrụ ha kwesịrị ịkpọ asị. Ha anaghị akwado agha ndị a na-alụ ná mba dị iche iche n’agbanyeghị na okpukpe ụgha na-eme otú ahụ. (Maịka 4:1-3) Kama ịga agha, ezigbo Ndị Kraịst na-eji oge ha na ihe ha nwere enyere ndị ọzọ aka. Ha anaghịkwa achọ naanị ọdịmma onwe ha.​—Gụọ Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 4:20..

4. Ole ndị ka ị ga-asị na ọ bụ ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ?

Ole ndị ka ihe niile ha na-akụzi na-esi n’Okwu Chineke? Oleekwa ndị na-akwanyere aha Chineke ùgwù ma na-akọrọ ndị mmadụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile? Olee okpukpe hụrụ ibe ha n’anya, nke na-anaghịkwa aga agha?​—Gụọ 1 Jọn 3:10-12.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya