Mụta Ihe N’okwu Chineke
Olee Otú Ị Ga-esi Amata Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.
1. Ọ̀ bụ naanị otu ezigbo okpukpe ka e nwere?
Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na e nwere naanị otu ezigbo okpukpe. Ọ dị ka ụzọ nke na-eduga ná ndụ. Jizọs kwuru banyere ụzọ ahụ, sị: ‘Ndị na-achọta ya dị ole na ole.’ (Matiu 7:14) Ọ bụ naanị ndị na-efe Chineke otú Baịbụl kwuru ka Chineke na-anabata ofufe ha. Ndị niile na-efe Chineke otú ọ chọrọ nọ n’otu okpukpe.—Gụọ Jọn 4:23, 24; 14:6; Ndị Efesọs 4:4, 5.
2. Gịnị mere chọọchị dị iche iche ji ekwu na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst?
Ndị amụma ụgha webatara ozizi ụgha n’etiti ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ha jikwa amụma ụgha ha na-achọ uru nke onwe ha. Dị ka Jizọs buru n’amụma, ndị amụma ụgha na-eme ka hà bụ “atụrụ” Jizọs, ma ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji. (Matiu 7:13-15, 21, 23) Ọ bụ mgbe ndịozi Jizọs nwụchara ka a bịara nwee Ndị Kraịst adịgboroja.—Gụọ Ọrụ 20:29, 30.
3. Olee ihe ụfọdụ ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ kwesịrị ịna-eme?
Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eji Okwu Chineke bụ́ Baịbụl egwuri egwu. Ha na-agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ihe mere ezi okpukpe ji dị iche n’okpukpe ụgha bụ na ọ naghị eso ihe ụmụ mmadụ kwuru. (Matiu 15:7-9) Ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe anaghị ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.—Gụọ Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17.
Ezigbo Ndị Kraịst na-asọpụrụ aha Chineke, bụ́ Jehova. Jizọs mere ka ndị mmadụ mata aha Chineke. O mere ka ha mara onye Chineke bụ, kụziekwara ha ka ha na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ. (Matiu 6:9) N’ebe i bi, olee okpukpe na-akụziri ndị mmadụ ihe bụ́ aha Chineke?—Gụọ Jọn 17:26; Ndị Rom 10:13, 14.
4. Olee otú ị ga-esi amata ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ?
Ezigbo Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Chineke zitere Jizọs ka o kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha. Jizọs ziri ndị mmadụ ozi ọma Alaeze ahụ ruo ụbọchị ọ nwụrụ. (Luk 4:43; 8:1; 23:42, 43) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na mmadụ bịara izi gị ozi ọma, ya amalite ịkọrọ gị banyere Alaeze Chineke, olee okpukpe ị ga-eche na ọ na-ekpe?—Gụọ Matiu 10:7; 24:14.
Ndị na-eso ụzọ Kraịst esoghị n’ụwa ọjọọ a. Ha anaghị eso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọgba aghara ndị a na-enwe n’ụwa. (Jọn 17:16) Ha anaghịkwa eso ndị mmadụ eme omume ọjọọ dị iche iche ha na-eme.—Gụọ Jems 1:27; 4:4.
5. Olee isi ihe e ji amata ezigbo Ndị Kraịst?
Ezigbo Ndị Kraịst nwere ịhụnanya pụrụ iche n’ebe ibe ha nọ. Okwu Chineke akụzierela ha na o nweghị agbụrụ ha kwesịrị ịkpọ asị. N’agbanyeghị na okpukpe ụgha na-akwado agha ndị a na-alụ ná mba dị iche iche n’ụwa, ezigbo Ndị Kraịst anaghị eme otú ahụ. (Maịka 4:1-4) Kama ịga agha, ha na-eji oge ha na ihe ndị ha nwere enyere ndị ọzọ aka, ha anaghịkwa achọ naanị ọdịmma onwe ha.—Gụọ Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 4:20, 21.
Ole ndị ka ihe niile ha na-akụzi na-esi n’Okwu Chineke? Oleekwa ndị na-akụziri ndị mmadụ ihe bụ́ aha Chineke, ma na-akọrọ ha na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile? Olee okpukpe hụrụ ndị ọzọ n’anya, nke na-anaghịkwa aga agha? Ihe ndị na-eme eme gosiri na ọ bụ Ndịàmà Jehova.—1 Jọn 3:10-12.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ GỊnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 15 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 16]
“Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke, ma ha na-agọnahụ ya site n’ọrụ ha.”—Taịtọs 1:16