Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 4/8 p. 26-29
  • Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Ncheta Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Ncheta Gị
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Icheta Aha Ndị Mmadụ
  • Otú E Si Ebu Ndepụta n’Isi
  • Icheta Ihe Ị Na-agụ
  • I Nwere Ike Ime Ka Ụbụrụ Gị Na-echetakwu Ihe!
    Teta!—2009
  • Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Icheta Ihe Gị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Otú E Si Azụlite Mmasị Maka Ịmụ Ihe
    Teta!—2004
  • Ndị E Kere Ịmụta Ihe Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 4/8 p. 26-29

Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Ncheta Gị

“Enwere m ikike ncheta dị oké njọ.” Ọ̀ dịwo mgbe i kwuru nke ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, atụbọla. Aro ole na ole dị mfe na mgbalị dị nta pụrụ imeziwanye ihe n’ụzọ na-eju anya. Eledala ụbụrụ gị anya. Ikike ndị o nwere bụ ihe ijuanya.

OLEE otú ụbụrụ si arụzu ọrụ ya ndị dị ịtụnanya? N’afọ ndị na-adịbeghị anya e nyochawo ụbụrụ dị ka a na-emebeghị na mbụ. Ọ bụ ezie na nghọta na-arị elu, anyị ka matara ihe dị nnọọ nta banyere ụzọ ụbụrụ si arụzu ihe ndị ọ na-arụ.

Otú anyị si amụta ma na-echeta ihe ọmụma edoghị anya, ma ndị na-eme nnyocha na-agbalị ikpughe ihe omimi a. A na-eme atụmatụ na ihe dị ka ijeri 10 ruo 100 ijeri mkpụrụ ndụ akwara na neuron, dị n’ụbụrụ so na-arụ ọrụ n’ịmụta na icheta ihe. Ma e nwere ma ọ dịkarịa ala okpukpu puku iri nke njikọ ndị ahụ n’agbata neuron dị iche iche. Otu nkweta bụ na ka a na-emesiwanye njikọ ndị ahụ, ma ọ bụ synapse, ike site n’iji ha eme ihe, mmụta ihe na-ewere ọnọdụ.

Ka anyị na-emekwu okenye, ikike iche echiche pụrụ ịdalata; mmeghachi omume anyị pụrụ ibelata. Mkpụrụ ndụ ụbụrụ adịghị eme onwe ha ka ha dịghachi ọhụrụ, o dokwara anya na ndị meworo okenye na-anọgide na-atụfu ụfọdụ. Ma ruo n’ókè anyị ji ụbụrụ anyị na-eme ihe, anyị pụrụ ichekwa ikike echiche anyị ruo ogologo oge karị.

Otú anyị si eche echiche na-emetụta ụbụrụ. Ụzọ ile ihe anya nwere nchekwube, nke na-enwe ọṅụ na-eme ka ụzọ ụbụrụ si arụ ọrụ ka mma n’afọ ndụ ọ bụla. Nrụgide ụfọdụ pụrụ ịba uru, ma nrụgide jọrọ njọ ma gabiga ókè na-egbochi ụbụrụ ịrụ ọrụ nke ọma. Mmega ahụ pụrụ inye aka iwepụ nrụgide nke uche.

Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ ihe na-agba ume, anyị ka pụrụ ichefu ihe ndị dị mkpa, n’agbanyeghị afọ ndụ anyị. Ànyị pụrụ imeziwanye ihe? Otu ebe ọtụtụ mmadụ nwere ihe isi ike bụ n’icheta aha ndị anyị na-ezute.

Icheta Aha Ndị Mmadụ

Aro ole na ole ndị dị mfe pụrụ inyere gị aka n’ụzọ dị ukwuu icheta aha dị iche iche n’ụzọ ka mma. Inwe mmasị n’ebe onye ahụ nọ na-enye aka. Aha mmadụ dị ya mkpa. Ọtụtụ mgbe anyị apụghị icheta aha ahụ n’ihi na anyị anụghị ya nke ọma ná mmalite. Ya mere mgbe mmadụ na-akọwa onwe ya, nụrụ aha ahụ nke ọma. Gwa onye ahụ ka o kwughachi ya ma ọ bụrụ na o kwere omume ma ọ bụ ọbụna sụpee ya. Jiri ya mee ihe ọtụtụ ugboro ná mkparịta ụka unu. Mgbe ị na-asị ka e mesịa, kpọọ onye ahụ n’aha. Ọ ga-eju gị anya otú isi ihe ole na ole ndị a ga-esi nye aka.

Aro ọzọ nke pụrụ imekwu ka ikike gị n’icheta aha ka mma bụ ijikọta aha onye ahụ n’ihe ị pụrụ ise onyinyo ya n’uche gị. Ọ bụrụ na ị pụrụ itinye ihe omume n’onyinyo ahụ, ọ ga-aka nnọọ mma.

Dị ka ihe atụ, otu onye nwere ihe isi ike n’icheta aha mbụ nke onye ọ na-amachaghị nke ọma, bụ́ Ugwu. N’ihi ya mgbe ọ hụrụ onye a, o chere echiche banyere okwu bụ́ “ugwu”: ya bụ, “ebe dị elu.” O sere onyinyo ugwu n’uche ya. Ọ na-adị irè mgbe nile; aha bụ́ Ugwu batara ya n’uche ozugbo.

Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ aha enweghị ihe ha pụtara nye gị, n’ihi ya ọ ga-adị gị mkpa iji okwu yiri aha ahụ dochie anya ya. Ọ dịghị ihe o mere ma ọ bụrụ na ihe nnọchianya gị adabaghị kpọmkwem n’ụda nke aha ahụ. Ikike ncheta gị ga-enwe ike icheta aha ahụ n’ụzọ ka mma site ná njikọ ahụ. Mgbe i mepụtara okwu na onyinyo nke gị, mmetụta ya na-esi ike nke ukwuu karị.

I kwesịrị ịmụgharị nke a nke ọma ruo oge ụfọdụ, ma ọ dị irè n’ezie. Harry Lorayne na-akọwa usoro nke a n’akwụkwọ ya bụ́ How to Develop a Super-Power Memory (Ụzọ Isi Wulite Ikike Ncheta Magburu Onwe Ya), o jiriwokwa ya mee ihe n’ihu ọha ọtụtụ mgbe. Ọ na-asị: “E nwewo ọtụtụ mgbe m zuteworo otu narị mmadụ ruo narị mmadụ abụọ n’ime minit iri na ise ma ọ bụ ihe na-erughị otú ahụ, n’echefughị otu aha!”

Otú E Si Ebu Ndepụta n’Isi

Olee otú ị pụrụ isi meziwanye ikike gị nke icheta ndepụta ndị na-eyighị ibe ha? A na-akpọ otu ụzọ dị mfe usoro njikọ. Otú a ka o si arụ ọrụ: Ị na-eji anya nke uche ese onyinyo maka ihe nke ọ bụla dị ná ndepụta ahụ, mgbe ahụ jikọọ onyinyo maka ihe mbụ n’onyinyo maka ihe nke abụọ, mgbe ahụ mee otu ihe ahụ maka nke abụọ na nke atọ, na ndị ọzọ.

Dị ka ihe atụ, ị ghaghị ịzụrụ ihe ise ná nnukwu ụlọ ahịa: mmiri ara ehi, bredị, bọlb eletrik, yabasị, na ice cream. Malite site n’ijikọta mmiri ara ehi na bredị. Were ya na ị na-agbapụta mmiri ara ehi n’ogbe bredị. Ọ bụ ezie na onyinyo ahụ pụrụ nnọọ ịbụ ihe na-atọ ọchị, ọ ga-eme ka ihe ndị ahụ bamie n’uche gị. Ọzọ, gbalịa itinye ihe omume n’ihe ahụ i ji anya nke uche gị na-ahụ bụ́ nke metụtara mgbapụta ị na-agbapụta mmiri ara ehi ahụ.

Mgbe i jikọtasịrị mmiri ara ehi ahụ na bredị, gaa n’ihe na-esochi, bọlb eletrik. Ị pụrụ ijikọta ogbe bredị ahụ na bọlb eletrik site n’ise onyinyo na ị na-agbalị itinye ogbe bredị ahụ n’oghere a na-akwụnye bọlb eletrik. Mgbe ahụ jikọta bọlb eletrik ahụ na yabasị site n’iji anya nke uche na-ahụ ka ị na-abacha nnukwu bọlb eletrik ma na-ebe ákwá ka ị na-eme ya. N’ezie, ọ ka mma ma ọ bụrụ na i mee njikọ ahụ n’onwe gị. Ị̀ pụrụ imepụta njikọ n’agbata ihe abụọ ikpeazụ, bụ́ yabasị na ice cream? Eleghị anya ị pụrụ iwere ya na ị na-aracha ice cream e ji yabasị mee!

Lee ma ị̀ pụrụ icheta ndepụta ahụ. Mgbe ahụ jiri ndepụta nke gị nwalee ikike ncheta gị. Depụta ọtụtụ ihe dị ka ị chọrọ. Cheta, iji mee ka njikọ ndị ahụ bụrụ ihe a pụrụ icheta karị, ị pụrụ ime ka ọ tọọ ọchị ma ọ bụ yie ọbụna ihe na-enweghị isi ma ọ bụ ihe na-adabaghị adaba. Gbalịa itinye ihe omume n’onyinyo ahụ, ma jiri otu ihe dochie anya ibe ya.

Ụfọdụ pụrụ ịjụ, na-ekwu na usoro a na-ewe oge karịa nanị ibu ndepụta ahụ n’isi. Otú ọ dị, ọ na-ewe oge ịkọwa usoro a karịa iji ya mee ihe. Ozugbo ị mụgharịtụrụ ya, ị ga-eme njikọ dị iche iche ngwa ngwa, ikike ncheta gị kwa, tinyere ịdị ngwa gị n’ịmụta ihe, ga-aka mma nke ukwuu karịa ma ị gbalịa ịmụ ihe n’ejighị otu usoro. Mgbe a gwara mmadụ 15 ka ha cheta ndepụta nke ihe 15 n’ejighị otu usoro mee ihe, ihe ha nwetara ná nkezi bụ 8.5. N’iji usoro nke ijikọta ihe a na-ahụ anya ná ndepụta ọzọ eme ihe, otu ìgwè ahụ nwere nkezi bụ́ 14.3. N’ezie, ọ bụrụ na i cheta iwere ndepụta e dere ede nke ihe ndị a mgbe ị na-aga ahịa, nke ahụ ga-enye gị akara bụ́ 15—100 pasent!

Icheta Ihe Ị Na-agụ

N’ọgbọ a nke ihe ọmụma bara oké ụba, ebe ọzọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị nwere mkpa bụ n’ịmụ ihe n’ụzọ dị irè. Ọmụmụ ihe dị mkpa n’ụlọ akwụkwọ, n’achụmnta ego, maka ọganihu onwe onye, na n’ịkwadebe maka ikwu okwu ihu ọha. Ọzọkwa, onye Kraịst aghaghị iwepụta oge maka ọmụmụ Bible onwe onye.—Jọn 17:3.

‘Ma ọ na-esiri m ike icheta ihe m mụworo,’ ka ị pụrụ ikwu. Gịnị ka a pụrụ ime? Ịmụta inweta abamuru kasị ukwuu n’oge ọmụmụ ihe gị pụrụ inyere gị aka icheta ihe ị na-agụ. Ndị a bụ aro ụfọdụ.

Mgbe ị na-amụ ihe, nhazi onwe onye dị mkpa. Nwee akwụkwọ, ihe e ji ede ihe, na mpempe akwụkwọ n’ebe aka ga-eru ha ngwa ngwa. Gbalịa ịmụ ihe n’ebe dị mma, nke ihe ndọpụ uche na-adịchaghị ma nwee ìhè kwesịrị ekwesị. Gbanyụọ redio na telivishọn.

Nwee oge a kara aka maka ọmụmụ ihe. Nye ụfọdụ ndị, ịmụ ihe ruo mkpirikpi oge kwa ụbọchị pụrụ ịdị irè karịa iji oge buru ibu mụọ ihe n’akwụsịghị akwụsị. Ọ dị mma ka i kewaa oge gị gaa ná nkebi ná nkebi. Kama ịmụ ihe n’akwụsịghị akwụsị ruo hour abụọ, ọ pụrụ ịka mma ikewa oge ahụ ná nkebi ndị dị malite na 25 minit ruo 40 n’ogologo, na-enwe nkwụsịtụ nke minit ole na ole n’agbata ha. Nchọpụta egosiwo na nke a na-atụnye ụtụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke icheta ihe.

Kpebie ihe ndị ị ga-achọ ịtụlezu n’ime oge ọmụmụ ihe gị. Nke a na-enye aka ịtụkwasị uche n’ihe. Tupu ị malite ịgụ otu akwụkwọ, buru ụzọ jiri minit ole na ole nyochaa ya. Lee anya n’aha ya. Nyochaa ihe ndị dị n’ime ya, bụ́ nke na-achịkọta ihe dị n’akwụkwọ ahụ. Mgbe ahụ gụọ okwu mbuụzọ ma ọ bụ okwu mmalite. A pụrụ ikwu ebumnobi na echiche onye dere akwụkwọ ahụ n’ebe a.

Tupu ị malite ịgụ otu isiakwụkwọ, buru ụzọ nyochaa ya. Lee anya n’isiokwu nta, ihe osise, chaatị, nchịkọta, na paragraf mmeghe na ndị nke mmechi. Nyobatụ anya n’ahịrịokwu mbụ nke paragraf nke ọ bụla. Echiche ndị bụ isi na-adịkarị n’ahịrịokwu ndị a bu ụzọ. Ghọta ihe ọ na-ekwu n’ozuzu ya. Jụọ onwe gị ajụjụ: ‘Gịnị ka onye dere ya bu n’obi ịkọwapụta? Gịnị ka m pụrụ ịmụta n’isiokwu a? Gịnị bụgasị arụmụka ndị bụ isi?’

Ịtụkwasị uche n’ihe dị mkpa. I kwesịrị itinyemi uche gị n’ụzọ zuru ezu. Nzube ya bụ ime ka oge ọmụmụ ihe gị na-akpalị akpali dị ka o kwere mee. Kpalie ịnụ ọkụ n’obi site n’ịtụle akụkụ ihe ọmụma ahụ ndị a pụrụ itinye n’ọrụ. Jiri anya nke uche na-ahụ ihe. Jiri ikike mmetụta mee ihe site n’ime ka a ga-asị na ị na-anụ ísìsì, edetụ ihe ire, ma na-emetụ ihe aka ma ọ bụrụ na nke ahụ kwekọrọ n’ihe mmụta ahụ.

Ozugbo ị ghọtara isi ihe nke ihe mmụta ahụ, ị dị njikere idetu ihe. Idetu ihe n’ụzọ dị irè pụrụ ime ka ị na-aghọta ihe ngwa ngwa, na-echetakwa ihe ọmụma ahụ. Ọ dịghị mkpa na ihe ndepụta ga-abụ ahịrịokwu dum kama ha kwesịrị ịbụ okwu ndị bụ isi ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị pụrụ inyere gị aka icheta echiche ndị bụ isi.

Ịghọta ihe ọmụma apụtachaghị na ị ga-enwe ike icheta ha nile n’ọdịnihu. Eziokwu bụ na n’ime 24 hour nke ịmụ ihe, a pụrụ ichefu ihe ruru 80 pasent nke ihe ọmụma ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo nwa oge. Nke ahụ na-ada ụda ka ihe na-akụda mmụọ, ma a pụrụ inwetaghachi ụfọdụ ma ọ bụ ihe ka ukwuu n’ime 80 pasent ahụ site n’ịtụleghachi ihe mmụta ahụ. Mgbe oge ọmụmụ ihe nke ọ bụla gasịrị, mee ntụleghachi ruo minit ole na ole. Ọ bụrụ na o kwere mee, mee ntụleghachi ọzọ mgbe otu ụbọchị gasịrị, mgbe otu izu gasịkwara, na mgbe otu ọnwa gasịkwara. Itinye isi ihe ndị a n’ọrụ pụrụ inyere gị aka n’inweta abamuru kasị mma site n’oge ọmụmụ ihe gị dị oké ọnụ ahịa na icheta ihe ị gụworo.

Ya mere eledala ụbụrụ gị anya. A pụrụ imeziwanye ikike gị nke icheta ihe. Otu ọkà mmụta sayensị kwuru okwu banyere ụbụrụ dị ka “ihe kasị dị mgbagwoju anya anyị nwetụworo n’eluigwe na ala anyị.” Ọ bụ ihe akaebe nye amamihe na ike dị ịtụnanya nke Onye Okike ya, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 139:14.

[Ihe Osise dị na peeji nke 29]

Iji cheta ndepụta, jiri usoro njikọta mee ihe: Jiri anya nke uche see onyinyo maka ihe nke ọ bụla. Mgbe ahụ jikọta onyinyo mbụ na nke abụọ, na ndị ọzọ

Ndepụta e ji azụ ihe:

1. Mmiri ara ehi E jikọta nke 1 na nke 2

2. Bredị E jikọta nke 2 na nke 3

3. Bọlb eletrik E jikọta nke 3 na nke 4

4. Yabasị E jikọta nke 4 na nke 5

5. “Ice cream”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya