Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 13-15
  • Òdùdù—Ọ̀ Bụ Ọnụ A Bụrụ Africa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Òdùdù—Ọ̀ Bụ Ọnụ A Bụrụ Africa?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọ Na-eri Bụ Ọbara
  • Ọ Na-egbu Ụmụ Anụmanụ
  • Ọ Na-egbu Mmadụ
  • Okwu E Kwuru Iji Kwuchitere Ya
  • Otú Ijiji A Na-akpọ Fruit Fly Si Efe Ngwa Ngwa
    È Kere Ya Eke?
  • Ọrịa Ụmụ Ahụhụ Na-ekesa—Nsogbu Na-arịwanye Elu
    Teta!—2003
  • Chebe Onwe Gị Pụọ na Nje!
    Teta!—1999
  • Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 6/8 p. 13-15

Òdùdù—Ọ̀ Bụ Ọnụ A Bụrụ Africa?

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA

ANYỊ kwagara n’otu ime ime obodo dị n’Ọdịda Anyanwụ Africa n’oge na-adịbeghị anya. Oké ọhịa nke ebe okpomọkụ gbara anyị gburugburu. N’otu ehihie nwunye m bara n’ọnụ ụlọ nta wee tie mkpu, sị: “Òdùdù enyi dị n’ebe a!”

Ijiji ahụ fepụrụ n’ọnụ ụlọ nta ahụ wee feba n’ọnụ ụlọ ịsa ahụ. Eweere m otu mkpọ ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ, mechibido ụzọ n’azụ m wee na-achụso ya. Ọ dịghị ebe a hụrụ òdùdù ahụ. Na mberede o fefere n’ihu m. Ọ na-ebuso m agha! N’ịgbatịpụ aka, anwara m ịkụtu ya n’ala, ma emelighị m ya. O fegara na window. Ụgbụ window gbochiri ya ifepụ. Òdùdù ahụ beere na ya.

Atụgidere m aka m n’ebe ọ nọ wee gbaa ijiji ahụ ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ịgbagide ọgwụ otú ahụ ga-egbu nnọọ ụdị ahụhụ ọ bụla ozugbo. Ọ bụghị ahụhụ nke a. O fepụrụ wee nọgide na-efegharị n’ime ọnụ ụlọ ịsa ahụ ahụ.

Ihe nke a siri ike! Obi siri m ike na ọgwụ ahụ e ji egbu ụmụ ahụhụ ga-arụ ọrụ ya, na ijiji ahụ ga-ada n’ala ụlọ n’oge na-adịghị anya. Ma ọ daghị. Mgbe ọzọ o beere, agbara m ya nke ugboro abụọ. O feliri ọzọ.

Olee ụdị ọkpọka ahụhụ nke a bụ? Ugboro abụọ ọzọ a gbara ya kpọmkwem mesiri gbuo ya.

Ekpuuru m enyo anya m wee leruo ihe e kere eke ahụ anya nke ọma. O buru ibu karịa ijiji, ọ bụ ezie na o burughị ibu ka òdùdù enyi. Nku ya abụọ gafere azụ ya, na-enye ya ọdịdị dị mfe n’ile anya karịa nke ijiji nkịtị. Proboscis ogologo yiri agịga gbatịpụrụ n’akụkụ ebe ọnụ ya.

Akpọrọ m nwunye m, sị: “Nke a abụghị òdùdù enyi. Ọ bụ òdùdù.”

Nzute ahụ mere ka m ghọta ihe isi ike nke ịnwa ikpochapụ ahụhụ ahụ n’ebe obibi ya bụ́ Africa nke dị 11.7 nde square kilomita, bụ́ ókèala karịrị United States n’ịdị ukwuu. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-achọ igbukpọ ya? A na-ebo ya ebubo atọ. Ebubo nke mbụ:

Ihe Ọ Na-eri Bụ Ọbara

E nwere ụdị 22 òdùdù dị iche iche. Ha nile na-ebi ná mba Africa ndị dị gburugburu Sahara. Ha nile, ma oké ma nne, na-aṅụju afọ n’ọbara ihe ndị dị ndụ nwere ọkpụkpụ azụ, na-amịkọrọ ọbara ruru okpukpu atọ nke ịdị arọ ha n’otu ọtịta.

Ha na-aṅụ ọbara nke ụdị anụmanụ dị iche iche na-ata ahịhịa—ma ndị sitere n’Africa ma ndị na-esiteghị. Ha na-atakwa ndị mmadụ. Ọtịta ya bụ ndụdụ dị omimi, nke na-amịrị ọbara, dị nkọ ma na-afụ ụfụ. Ọ na-akọ ọkọ, na-afụkwa ụfụ n’otu mgbe ahụ. Ọ na-akpata akpụ.

Òdùdù nwere nkà n’ọrụ ha. Ha adịghị atụfu oge n’ifegharị n’isi gị. Ha pụrụ ife n’ahụ mmadụ dị ka mkpụrụ mgbọ ma n’ụzọ ụfọdụ kwụsị ma bere n’ihu n’ụzọ dị nnọọ nro nke na a dịghị enwe mmetụta ha. Ha pụrụ ịdị ka ndị ohi; mgbe ụfọdụ ị dịghị ama na ha ezuruwo ọbara ruo mgbe ha lasịrị—mgbe nanị ihe fọọrọ gị ime bụ ịma otú ọ taruru gị.

Ha na-agakarị n’ebe ákwà na-ekpuchighị ahụ. (Ọ dị ka hà nwere mmasị n’azụ olu m!) Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ha na-ahọrọ ịrịgo n’ụkwụ traụza ma ọ bụ n’aka uwe tupu ha amalite ịmịrị ọbara. Ma ọ bụ ọ bụrụ na ha achọọ, ha pụrụ isi n’elu uwe taa onye ahụ—nke ahụ abụghị nsogbu nye ahụhụ nke pụrụ ịkpọpu akpụkpọ anụ ahụ siri ike nke anụ ọhịa rhino.

Ndị mmadụ na-ekwu na òdùdù abụghị nanị na ọ dị gara gara kamakwa na ọ dị aghụghọ. N’otu oge, mgbe m nwara iji ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ gbuo otu, o febara n’ebe m na-ekowe uwe m wee zoo n’ime ákwà m ji egwu mmiri. Mgbe m yiiri ákwà ahụ n’ụbọchị abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ tara m ugboro abụọ! N’oge ọzọ, otu òdùdù zoro n’ime pọọsụ nwunye m. O ji pọọsụ ahụ gaa ọfịs, mgbe o tinyere aka n’ime ya, òdùdù ahụ tara ya n’aka. Mgbe ahụ òdùdù ahụ fegharịrị n’ime ụlọ ahụ, na-akpata ahụ erughị ala n’etiti ndị na-arụ n’ọfịs ahụ. Onye ọ bụla kwụsịrị ọrụ iji nwaa itigbu ya.

Ya mere ebubo mbụ a na-ebo òdùdù bụ na ọ bụ ọmị ọbara nke na-ata arụ na-afụ ụfụ. Ebubo nke abụọ:

Ọ Na-egbu Ụmụ Anụmanụ

Ụdị òdùdù ụfọdụ na-ebufe otu ọrịa nke nje a na-akpọ trypanosome na-akpata. Mgbe òdùdù na-amịrị ọbara nke anụmanụ bu ọrịa ahụ, ọ na-elo ọbara nwere nje ndị ahụ. Ndị a na-etolite wee mụbaa n’ime ahụhụ ahụ. Mgbe ahụhụ ahụ tara anụmanụ ọzọ, nje ọrịa na-esite n’ahụhụ ahụ banye n’oruru ọbara nke anụmanụ ahụ.

Ọrịa ahụ bụ trypanosomiasis. A na-akpọ ụdị nke na-ewere ọnọdụ n’ime ụmụ anụmanụ nagana. Nje nagana na-etolite n’ime oruru ọbara nke ọtụtụ anụmanụ sitere n’Africa, karịsịa mgbada, atụ, ezì ọhịa, duiker, reedbuck, na warthog. Nje ndị ahụ adịghị egbu ụmụ anụmanụ ndị a.

Ma nje ndị ahụ na-ebibi anụ ụlọ ndị na-esiteghị n’Africa—camel, nkịta, ịnyịnya ibu, ewu, ịnyịnya, oké ehi, ezì, na atụrụ. Dị ka magazin bụ́ National Geographic si kwuo, nagana na-egbu nde ehi atọ kwa afọ.

Ndị na-akpa ehi, dị ka ndị Masai nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, amụtawo otú e si ezere ógbè ndị òdùdù bara oké ụba, ma oké ọkọchị na ụkọ ahịhịa ndụ na-eme ka nke a bụrụ ihe na-ekweghị omume mgbe ụfọdụ. N’oge oké ọkọchị nke mere na nso nso a, ahụhụ ahụ gburu otu anụmanụ kwa ụbọchị n’ime 600 ehi nke ezinụlọ anọ ndị chịkọtara ehi ha n’otu ebe. Lesalon, bụ́ okenye ezinụlọ n’ime ha, kwuru, sị: “Anyị bụ́ ndị Masai nwere obi ike. Anyị na-ama ọdụm ube ma chebiri atụ na-ebuso anyị agha. Anyị na-eti agwọ mamba ojii osisi ma na-ebuso enyi iwe ji agha. Ma gịnị banyere orkimbai [òdùdù]? Anyị enweghị enyemaka.”

E nwere ọgwụ ndị e ji agwọ nagana, ma ụfọdụ ndị ọchịchị na-enye ikike iji ha eme ihe nanị n’okpuru nlekọta nke ndị na-agwọ ụmụ anụmanụ. E nwere ezi ihe kpatara nke ahụ, ebe ọ bụ na inye ọ̀tụ̀tụ̀ na-ezughị ezu abụghị nanị na ọ na-etinye ụmụ anụmanụ n’ihe ize ndụ, kama ọ na-akpata nje ndị na-eguzogide ọgwụ. Ọ pụrụ isiri onye na-akpa ehi nke nọ n’ime ọhịa ike ịchọta onye na-agwọ ụmụ anụmanụ n’oge ka ọ gwọọ ụmụ anụmanụ ya na-anwụ anwụ.

A nwapụtawo ebubo abụọ mbụ e boro òdùdù gabiga mgbagha—ihe ọ na-eri bụ ọbara, na-agbasakwa ọrịa na-egbu ụmụ anụmanụ. Ma e nwere ọzọ. Ebubo nke atọ:

Ọ Na-egbu Mmadụ

Ụmụ mmadụ adịghị ebute ọrịa nagana trypanosome. Ma òdùdù na-ebufe ụdị trypanosome ọzọ site na mmadụ gaa na mmadụ. A na-akpọ ụdị trypanosomiasis nke a ọrịa ụratụrụ. Echela na onye nwere ọrịa ụratụrụ na-ehi nanị oké ụra. Ọrịa ahụ abụghị nke ụra obi ụtọ. Ọ na-eji mmetụta nke enweghị ezi ahụ ike, ike ọgwụgwụ, na obere ahụ ọkụ amalite. Mgbe nke ahụ gasịrị, iro ụra ruo ogologo oge, oké ahụ ọkụ, nkwonkwo igbu mgbu, ọzịza nke uru ahụ, na imeju zara aza na àpà afọ na-esochi ya. N’ọnọdụ ndị ikpeazụ, ka nje ndị a na-abami n’ime usoro akwara bụ isi, onye ọrịa ahụ na-enwe mbibi nke ụbụrụ, akwụkwụ, amaghị onwe onye, na ọnwụ.

Ná mmalite nke narị afọ a, ntiwapụ nke ọrịa ụratụrụ wakporo kọntinent Africa. N’agbata 1902 na 1905, ọrịa ahụ gburu ihe dị ka 30,000 mmadụ na nso nso Ọdọ Mmiri Victoria. N’iri afọ ndị sochirinụ, ọrịa ahụ gbasara banye Cameroon, Ghana, na Nigeria. N’ọtụtụ obodo nta, otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị mmadụ butere ọrịa ahụ, na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ndị mmadụ kwapụ site n’ọtụtụ ndagwurugwu osimiri. Òtù na-agagharị agagharị gwọrọ ọtụtụ narị puku ndị mmadụ. Ọ bụ nanị ná ngwụsị nke afọ ndị 1930 ka ihe otiti ahụ kwụsịrị.

Taa ọrịa ahụ na-ejide ihe dị ka 25,000 mmadụ kwa afọ. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo, ihe karịrị 50 nde mmadụ na 36 mba ndị dị gburugburu Sahara nọ n’ihe ize ndụ nke ibute ọrịa ahụ. Ọ bụ ezie na ọrịa ụratụrụ na-egbu egbu ma ọ bụrụ na a gwọghị ya, ọgwụ e ji agwọ ya dị. N’oge na-adịbeghị anya e mepụtara otu ọgwụ ọhụrụ a kpọrọ eflornithine iji gwọọ ọrịa ahụ—nke mbụ n’ụdị ọgwụ ahụ n’ime 40 afọ.

Ụmụ mmadụ ebuwo agha dịtere anya megide òdùdù na ọrịa ọ na-ebugharị. Na 1907, Winston Churchill dere banyere otu mkpọsa iji kpochapụ òdùdù: “A na-akpachi otu ụgbụ anya gburugburu ya n’enweghị ịkwa ụta ọ bụla.” N’ileghachi anya azụ, ọ pụtara ìhè na ‘ụgbụ a kpachiri anya’ nke Churchill nwere oghere ndị buru ibu na ya. Akwụkwọ bụ́ Foundations of Parasitology na-ekwu, sị: “Ruo ugbu a, 80 afọ nke ikpochapụ òdùdù enwewo mmetụta dị nta ná mgbasa nke òdùdù.”

Okwu E Kwuru Iji Kwuchitere Ya

Onye America na-ede uri bụ́ Ogden Nash dere, sị: “Chineke n’amamihe Ya mere ahụhụ ahụ, ma chefuzie ịgwa anyị ihe mere o ji kee ya.” Ọ bụ eziokwu na Jehova Chineke bụ Onye Okike nke ihe nile, ọ bụghị nnọọ eziokwu na ọ na-echefu ihe. Ọtụtụ ihe ka ọ na-ahapụrụ anyị ka anyị chọpụta n’onwe anyị. Mgbe ahụ gịnị banyere òdùdù? Ò nwere ihe a ga-ekwu iji kwuchitere ihe a o doro anya na ọ dị njọ?

Ma eleghị anya mgbachite kasịnụ e nwetụworo bụ na ọrụ ya n’ibibi ehi arụwo ọrụ iji chebe anụ ọhịa ndị dị n’ọhịa Africa. Ógbè sara mbara n’Africa yiri ala ahịhịa nke ebe ọdịda anyanwụ United States—ala ahụ n’onwe ya nwere ikike ịkwado anụ ụlọ. Ma n’ihi òdùdù, trypanosome na-adịghị egbu anụmanụ ndị bi n’ọhịa na-ata ahịhịa, na-egbu anụ ụlọ.

Ọtụtụ kwetara na a sị na ọ bụghị òdùdù, a gaara ejiworị ìgwè ehi dochie anya ìgwè anụmanụ ndị dị n’ọhịa Africa. “Ana m akwalite òdùdù,” ka Willie van Niekerk kwuru, bụ́ onye ndugharị n’otu ogige anụ ọhịa dị na Botswana. “E kpochapụ òdùdù, ehi ga-ejupụtakwa ebe nile, ọ bụkwa ehi na-ebibisi Africa, na-akwasasị kọntinent ahụ ịghọ otu nnukwute ala tọgbọ na nkịtị.” Ọ gbakwụnyere: “Ahụhụ ahụ aghaghị ịnọgide.”

N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile kwenyere nke ahụ. Ihe ịrụ ụka ahụ adịghị eme ka nwoke na-ahụ ụmụ ya ma ọ bụ ehi ya na-arịa trypanosomiasis kwenye. Ọ dịghịkwa eme ka ndị na-ekwu na ehi dị Africa mkpa iji zụọ onwe ya kwenye.

Otú o sina dị, obi abụọ adịghị ya na a ka nwere ọtụtụ ihe ịmụ banyere ihe òdùdù na-arụzu n’okike. Ọ bụ ezie na ebubo ndị e boro ya siri ike, ikekwe ọ dị oké ngwa ikpebi ikpe.

N’ikwu okwu banyere ijiji, otu ka febara nnọọ n’ime ụlọ. Chetụdị ka m jide n’aka na ọ bụghị òdùdù.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 13]

Òdùdù: ©Martin Dohrn, The National Audubon Society Collection/PR

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya