Chebe Onwe Gị Pụọ na Nje!
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA HONDURAS
AGBỌ na-enu gị mgbe i tetara n’ụra. Ike na-agwụ gị ngwa ngwa karị. Afọ gị zatụrụ aza. Hà bụ mgbaàmà afọ ime? O nwere ike. Ma ọ bụrụ na i bi n’ebe ma ọ bụ n’akụkụ ebe okpomọkụ nke ụwa, ihe na-enye nsogbu ahụ pụrụ nnọọ ịbụ ụdị nje na-anọ n’eriri afọ. Gịnị bụ nje na-anọ n’eriri afọ, oleekwa otú ị pụrụ isi mara ma i bu ihe ndị a a na-achọghị?
N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, nje bụ ihe dị ndụ na-erite uru n’ahụ ihe bu ya. Ụdị nje abụọ na-anọ n’eriri afọ bụ ndị a na-akpọ protozoan, nke gụnyere amoeba, na okpo. Ókè ha na-emebiru ihe n’ahụ onye bu ha na-adabere n’ụdị na nje ole o bu nakwa n’afọ ole onye bu ha dị na otú ahụ siruru ya n’ike.
Dị ka ihe atụ, mkpụrụmkpụ nke nne pụrụ iyi ihe dị ka àkwá 200,000 n’otu ụbọchị. Otú ọ dị, àkwá ndị ahụ aghaghị ịnọ n’ime ala wee kaa. Ọnụ ọgụgụ mkpụrụmkpụ mmadụ bu na-adabere n’ọnụ ọgụgụ àkwá kara aka ma ọ bụ mkpụrụmkpụ ka si n’àkwá pụta o ritere. Ọtụtụ ndị na-ebu mkpụrụmkpụ ole na ole n’amaghịdị na ha bu ha. Ma ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke mkpụrụmkpụ pụrụ ịkpata ajọ nsụchi nke eriri afọ.
Mgbaàmà ụfọdụ a na-enwekarị n’ihi nje ndị na-adị n’eriri afọ bụ afọ mgbu, agbọ onunu, enweghị ọchịchọ iri nri, afọ ọzịza, ike ọgwụgwụ, na nri agbarighị n’afọ, otoro, ma ọ bụ afọ okuko. Ịta ahụ, ehighị ụra nke ọma, ọkọ, imi nsụchi, na ahụ ọkụ pụkwara ịbụ mgbaàmà nke nje. Otú ọ dị, ihe ndị a pụrụ ịbụ mgbaàmà nke ọrịa dị iche iche. Ma a pụrụ ịchọpụta nje site n’inyocha nsị̀ ọtụtụ oge.
Ọ dị mkpa ime nchọpụta ziri ezi banyere ọrịa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ bu mkpụrụmkpụ na ụdị nje ndị ọzọ, o kwesịrị iburu ụzọ ṅụọ ọgwụ mkpụrụmkpụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ụfọdụ ọgwụ anaghị egbu okpo ma ha pụrụ nanị ịkpasu ha, ha na-abanyezi n’akụkụ ahụ ndị ọzọ ma mebie ha nke ukwuu.
Mgbochi Ka Ọgwụgwọ Mma
Ọ bụ ezie na ịṅụ ọgwụ adịwo irè n’igbu nje, ọ ka mma izere ibutedị ya ebute. Ya mere olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ na nje?
Ịdị ọcha bụ ihe nchebe kasị mma. E kwesịghị ịhapụ nsị̀ n’ekpochighị ya ekpochi. Ụlọ mposi kwesịrị ịdịpụ adịpụ otú kwesịrị ekwesị site n’ebe a na-ekute mmiri. E kwesịghị iji nsị̀ mmadụ mere fatịlaịza. Ịdị ọcha otú kwesịrị ekwesị dịkwa oké mkpa. Ọzọkwa, ekwela ka ụmụaka tinye unyí n’ọnụ ha. Ọ bụrụ na a chọpụta na otu nwatakịrị bu nje, ọ ga-adị mma ịhụ na e lere ndị òtù ezinụlọ nile ahụ.
E kwesịkwara ịkpachara anya banyere ịzụta na isi nri. Gbalịa ịdị na-azụ ihe ndị a kọrọ n’ebe e ji idebe ihe ọcha mara. E kwesịrị isi anụ ka o gheruo n’ime ya. Ya adịla mgbe ị ga-ata anụ ndụ. E kwesịrị ibu ụzọ saa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri a na-esighị esi nke ọma. Otú ọ dị, kpachara anya ka ị ghara iji mmiri ahụ saa ihe ọzọ, n’ihi na ọ pụrụ ịbụ na nje dị n’ime ya.
E kwesịrị isi mmiri ọṅụṅụ ka ọ gbọọ nke ọma. Mgbe mmiri ahụ jụsịrị oyi, a pụrụ ime ka ikuku banye ya. Ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị e ji aza mmiri n’ụlọ apụghị ịzapụsị nje nile. Ịdị ọcha nke mmiri a na-ere na karama na-adabere n’otú ihe ụlọ ọrụ na-emepụta ya mere hà iji hụ na ọ dị ọcha.
Ime njem ma ọ bụ iri nri n’èzí ga-achọkwu ịkpachara anya. Ihe ọṅụṅụ ndị na-adị na karama na ndị na-adị na katọn anaghị adịkarị ize ndụ ma ọ bụrụ na e tinyeghị ha ice. Ebe ọ bụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi friza anaghị egbu nje ụfọdụ, otú mmiri dịruru n’ọcha ka ice ya ga-adị. I kwesịrị ịkpachara anya maka iri nri ndị na-ere nri mbugharị na-ere. Akwụoro ma ọ bụ watermelon e berisịrị eberisị pụrụ ịdị mma n’anya, ma a na-emekarị ka o yie ka e bewara ya ọhụrụ site n’ifesa ya mmiri—mmiri nke nje pụrụ ịdị na ya. Kpachara anya, ma atụla oké ụjọ nke na ị pụkwaghị ịnụ ụtọ njem gị. Site n’ime ihe ụfọdụ ezi uche dị na ha, e nwere ọtụtụ ihe ị pụrụ ime iji chebe onwe gị pụọ na nje.
[Foto dị na peeji nke 18]
Ịdị ọcha bụ ihe nchebe kasị mma
[Foto dị na peeji nke 19]
Otú mmiri dịruru n’ọcha ka ice ya ga-adị
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
“Amoeba” na okpo bụ ụdị nje abụọ e nwere
[Ebe E Si Nweta Foto]
DPDx, bụ́ Ógbè Dị na Kọmputa Maka Nkà Mmụta Nje nke Ụlọ Ọrụ CDC