Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 3/8 p. 18-20
  • Ahụ Ọkụ Ejula—Ọgwụgwụ Ya Ọ̀ Dị Nso?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụ Ọkụ Ejula—Ọgwụgwụ Ya Ọ̀ Dị Nso?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Usoro Ndụ Nje Ahụ
  • Ngwọta na Nsogbu
  • Olee Olileanya E Nwere Maka Ọdịnihu?
  • Mgbe Ahụ́ Ọkụ Jidere Nwa Gị
    Teta!—2003
  • Chebe Onwe Gị Pụọ na Nje!
    Teta!—1999
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba
    Teta!—2015
  • Ọrịa Na-efe Efe na Narị Afọ nke 20
    Teta!—1997
Teta!—1997
g97 3/8 p. 18-20

Ahụ Ọkụ Ejula—Ọgwụgwụ Ya Ọ̀ Dị Nso?

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA

N’AGBANYEGHỊ oké ọganihu ndị e nwere na nkà ọgwụ na sayensị, ihe a kpọrọ mmadụ enweghị ike ịgwọta ọtụtụ n’ime nsogbu ya ndị dịteworo anya. Nke a abụwo eziokwu banyere mgbalị ndị e mere ibelata ahụ ọkụ ejula.

Dị ka o yiri, e nwere ihe nile dị mkpa iji mee ya. Ndị dọkịta ghọtara usoro ndụ nke nje na-akpata ya. A na-achọpụta ọrịa ahụ n’ụzọ dị mfe. E nwere ọgwụ ndị dị irè iji gwọọ ya. Ọ dị ndị ndú gọọmenti ọkụ n’obi ịkwado mgbalị ndị a na-eme iji gbochie ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọgwụgwụ nke ọrịa a na-eti ọtụtụ nde mmadụ nọ n’Africa, Esia, Caribbean, Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, na Ndịda America ihe otiti adịghị nso.

Ahụ ọkụ ejula (nke a na-akpọkwa ọrịa bilharziasis ma ọ bụ schistosomiasis) etiwo mmadụ ihe otiti kemgbe ọtụtụ narị afọ iri. Àkwá ndị ghọworo nzu bụ́ ndị a chọtara n’ozu a gbasiri agbasi nke ndị Ijipt na-enye ihe àmà na ndị Ijipt rịara ọrịa a n’oge nke ndị fero. Narị afọ iri atọ n’ihu, otu ọrịa ahụ anọgidewo na-eti Ijipt ihe otiti, na-anapụ ọtụtụ nde ndị bi ná mba ahụ ahụ ike. N’ime obodo ụfọdụ dị ná ngwụsị nke Osimiri Naịl, 9 n’ime mmadụ 10 ọ bụla ebutewo ọrịa a.

Ijipt bụ nanị otu n’ime mba 74 ma ọ bụ karị ebe a na-arịa ahụ ọkụ ejula. N’ụwa nile, dị ka ihe ndekọ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) na-egosi, nde mmadụ 200 bu ọrịa ahụ. N’ime nde 20 ndị ọ na-arịa n’alaghị ala, ihe dị ka 200,000 na-anwụ kwa afọ. N’ime ọrịa nje nile nke ebe ndị na-ekpo ọkụ, a na-ekwu na ahụ ọkụ ejula bụ nke abụọ ma ịba gasịa n’ihe banyere mmadụ ole ọ na-arịa na mbibi ọha na eze na nke akụ̀ na ụba ọ na-akpata.

Usoro Ndụ Nje Ahụ

Ịghọta ahụ ọkụ ejula, na isi otú a mata otú a pụrụ isi gbochie ma gwọọ ya, pụtara ịghọta nje na-akpata ya. Otu isi ihe dị mkpa bụ: Iji dịrị ndụ ma na-amụba site n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ, nje a chọrọ ebe abụọ ọ ga-ebi, ihe okike abụọ dị ndụ ndị ọ pụrụ ịnọ n’ime ha na-eri ihe ma too. Otu bụ anụ na-enye nwa ara, dị ka mmadụ; nke ọzọ bụ ejula na-ebi ná mmiri na-abụghị mmiri nnu.

Nke a bụ ihe na-emenụ. Mgbe onye bu nje ahụ nyụnyere mamịrị ma ọ bụ nsị n’ime mmiri dọrọ otu ebe, ọdọ mmiri, iyi, ma ọ bụ osimiri, ọ na-anyụpụ àkwá nje ahụ—ikekwe ihe ruru otu nde àkwá n’otu ụbọchị. Àkwá ndị a dị ntakịrị nke ukwuu nke na a pụghị ịhụ ha n’ejighị ígwè microscope. Mgbe àkwá ahụ banyere na mmiri, ha na-abụ, na-atọhapụ nje ahụ. Nje ahụ na-eji ụmụ obere ajị dị ha n’ahụ gwuru mmiri gaa n’ejula na-ebi na mmiri na-abụghị mmiri nnu, bụ́ nke ha na-abanye n’ime ya. N’ime ejula ahụ, ha na-amụba n’ime izu anọ ruo asaa na-esonụ.

Mgbe ha si n’ejula ahụ pụọ, ha nwere nanị hour 48 iji chọta ma banye n’ime mmadụ ma ọ bụ anụ ọzọ na-enye nwa ara. Ma ọ bụghị ya, ha ga-anwụ. Mgbe o ruru n’ebe onye ahụ bịaworo n’ime mmiri nọ, nje ahụ na-akpọpu akpụkpọ ahụ ya ma banye n’ime ọbara ya. Nke a pụrụ ịkọtụ onye ahụ ọkọ, ọ bụ ezie na ọ dịghị enwekarị ihe àmà na-egosi na ọ dịwo ihe wabanyere n’ahụ ya. N’ime ọbara, nje ahụ na-aga n’akwara akpa mamịrị ma ọ bụ nke eriri afọ ndị na-ebu ọbara, dabere n’ụdị nje ọ bụ. N’ime izu ole na ole nje ndị ahụ na-aghọ okè ma ọ bụ nne okpo tozuru okè nke ruru ihe dị ka milimita 25 n’ogologo. Mgbe oké na nne gbasịrị onwe ha, nke nne na-amalite ịnyụnye àkwá n’ime ọbara nke onye bu ya, si otú ahụ na-emezu usoro ahụ.

Ihe dị ka ọkara n’ime àkwá ndị ahụ na-esi na nsị (n’ahụ ọkụ ejula nke eriri afọ) ma ọ bụ na mamịrị (n’ahụ ọkụ ejula nke akpa mamịrị) apụ n’ahụ. Ihe fọdụrụ n’ime àkwá ahụ na-anọgide n’ime ahụ ma na-emebi akụkụ ahụ ndị dị mkpa. Ka ọrịa ahụ na-aga n’ihu, onye ọ na-arịa pụrụ ịmalite inwe ahụ ọkụ, afọ ọzịza, na ọbara ọgbụgba n’ime ahụ. Ka oge na-aga ọrịa ahụ pụrụ iduje n’ọrịa cancer akpa mamịrị ma ọ bụ arụghị ọrụ nke imeju ma ọ bụ nke akụrụ. Ụfọdụ ndị ọ na-arịa na-aghọ ndị na-apụghị ịtụnye ma ọ bụ ịtụta ime ma ọ bụ nwee ahụ mkpọnwụ. Ndị ọzọ na-anwụ.

Ngwọta na Nsogbu

Iji gbochie mgbasa nke ọrịa ahụ, a pụrụ ime ihe anọ ma ọ dịkarịa ala. Ọ bụrụ na e mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị a n’ụzọ zuru ụwa ọnụ, a ga-ekpochapụ ọrịa ahụ.

Nzọụkwụ mbụ bụ ikpochapụ ejula ahụ n’ebe ndị e si enweta mmiri. Ejula dị mkpa ná ntolite nke nje ahụ. Ma ejula adịghị, ahụ ọkụ ejula agaghị adị.

Mgbalị bụ isi a na-eme abụrụwo imepụta nsí pụrụ igbu ejula ma ọ gaghị emetọ gburugburu ebe obibi. N’afọ ndị 1960 na 1970, mgbalị ndị e mere ikpochapụ ejula gbuchapụrụ ihe nile dị ndụ dị n’ime mbara osimiri. E mewo mgbalị n’Ụlọ Ọrụ Ime Nnyocha nke Theodor Bilharz n’Ijipt ịchọpụta molluscicide (ihe na-egbu ejula) nke na-adịghị emerụ ihe ndị ọzọ dị ndụ ahụ. Dr. Aly Zein El Abdeen, bụ́ onye isi ụlọ ọrụ ahụ, na-ekwu banyere ụdị ihe ahụ, sị: “A ga-atụbanye ya n’ime mmiri, nke e ji eme ihe maka ihe ọkụkụ, nke ndị mmadụ na anụmanụ na-aṅụ, ebe azụ̀ na-ebikwa, ya mere anyị aghaghị ijide nnọọ n’aka na o metụtaghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a.”

Nzọụkwụ nke abụọ bụ igbu nje ahụ n’ahụ ụmụ mmadụ. Ruo n’etiti afọ ndi 1970, ọgwụgwọ gụnyere ọgwụ ndị kpatara ọtụtụ mmetụta na nsogbu ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ọgwụgwọ na-achọkarị usoro ịgba ntụtụ na-afụ ụfụ. Ụfọdụ mere mkpesa na ọgwụgwọ ahụ ka ọrịa ahụ njọ! Kemgbe ahụ, e mepụtawo ọgwụ ndị ọhụrụ, dị ka praziquantel, ndị na-agwọ ahụ ọkụ ejula, a pụkwara ịṅụ ndị a aṅụ.

Ọ bụ ezie na ọgwụ ndị a adịwo irè n’ebe ndị e ji ha mee ihe n’Africa na Ndịda America, nsogbu bụ isi nye ọtụtụ mba abụrụwo ọnụ ahịa ya. Òtù WHO kwara arịrị na 1991, sị: “Mba ndị o metụtara enweghị ike ịga n’ihu n’usoro ihe omume sara mbara nke igbochi [ahụ ọkụ ejula] n’ihi ọnụ ahịa dị elu nke inye ọgwụgwọ; ọnụ ahịa ego mba ọzọ nke ọgwụ ahụ n’onwe ya na-agafekarị atụmatụ mmefu ego nke ihe ka ukwuu na ministri ahụ ike Africa n’isi otu onye.”

Ọbụna n’ebe ndị a na-enye onye ọrịa ọgwụ ahụ n’efu, ọtụtụ ndị adịghị eje maka ọgwụgwọ. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ọrịa ahụ dị ala, ya mere ndị ụfọdụ adịghị ewere ya dị ka oké nsogbu. Ihe ọzọ kpatara ya bụ na ndị mmadụ adịghị amata mgbe nile ihe mgbaàmà ọrịa ahụ. N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, inwe ọbara n’ime mamịrị (mgbaàmà mbụ nke ọrịa ahụ) bụ ihe a na-ahụkarị nke na a na-ewere ya dị ka akụkụ dị otú o kwesịrị nke itoru ogo mmadụ.

Nzọụkwụ nke atọ bụ ekweghị ka àkwá ahụ banye n’ime mmiri. Ọ bụrụ na e wuru ụlọ mposi iji gbochie mmetọ nke iyi na ọdọ mmiri ndị e nwere n’ógbè, ọ bụrụkwa na mmadụ nile jiri ha na-eme ihe, a pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke ibute ahụ ọkụ ejula.

Ihe ọmụmụ zuru ụwa ọnụ na-egosi mbelata dị ukwuu n’ọrịa ahụ mgbe e tinyesịrị usoro mmiri okporo ígwè na ụlọ mposi, ma ndokwa ndị a emeghị ka e jide mgbochi ya n’aka. “Ọ na-ewe nanị otu onye ịnyụnye nsị n’ọwa mmiri iji mee ka usoro ahụ gaa n’ihu,” ka ọkà mmụta sayensị bụ́ Alan Fenwick kwuru, bụ́ onye nyochaworo ahụ ọkụ ejula ruo ihe karịrị afọ 20. E nwekwara ihe ize ndụ nke nsị ma ọ bụ mamịrị ọrịa ahụ dị na ya isi n’okporo ígwè ndị na-ebupụ mmiri ọjọọ gbawara agbawa hipụ banye n’ime ebe e si enweta mmiri.

Nzọụkwụ nke anọ bụ igbochi ndị mmadụ ịbanye n’ime mmiri nje ahụ dị na ya. Nke a kwa adịchaghị mfe dị ka o yiri. N’ọtụtụ ala, a na-eji ọdọ mmiri, iyi, na osimiri e si ekute mmiri ọṅụṅụ asa ahụ, agba ihe ọkụkụ, nakwa asa ákwà. Ndị ọkụ azụ̀ na-abanye n’ime mmiri kwa ụbọchị. N’oké okpomọkụ nke ebe ndị na-ekpo ọkụ kwa, nye ụmụaka ebe ọ bụla mmiri butụrụ ibu pụrụ ịbụ ebe igwu mmiri na-adọrọ adọrọ.

Olee Olileanya E Nwere Maka Ọdịnihu?

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị mmadụ na òtù ndị nwere obi eziokwu na-arụsi ọrụ ike ịlụso ahụ ọkụ ejula ọgụ nakwa na e nwewo ọganihu dị ukwuu. Ndị na-eme nnyocha ọbụna na-arụ ọrụ imepụta ọgwụ mgbochi ọrịa iji gbochie ya.

Ka o sina dị, olileanya e nwere ikpochapụ ọrịa ahụ yiri ka ọ dị ntakịrị. Dr. M. Larivière na-ekwu n’akwụkwọ ahụ ike French bụ́ La Revue du Praticien, sị: “N’agbanyeghị ihe ịga nke ọma ndị e nweworo . . . , ọrịa ahụ apụbeghị n’anya ma ọlị.” Ọ bụ ezie na ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ inweta mgbochi na ọgwụgwọ, e nwere ike a gaghị enweta ngwọta zuru ebe nile maka nsogbu ahụ ọkụ ejula ruo mgbe ụwa ọhụrụ Chineke bịara. Bible na-ekwe nkwa na n’ebe ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.

[Foto dị na peeji nke 19]

Mgbe ha banyere na mmiri e metọrọ emetọ, ụmụ mmadụ pụrụ ibute nje na-akpata ahụ ọkụ ejula

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya