E Mere Mgbakọ Romania n’Agbanyeghị Mmegide
E DOKWARA ime Mgbakọ Mba Nile nke “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke Ndịàmà Jehova na Bucharest, Romania, site na July 19 ruo 21, 1996. Ndị bịara dị ihe dị ka 40,000, gụnyere ọtụtụ puku si ná mba ndị ọzọ, mere atụmatụ ileta isi obodo Europe a mara mma nke nde mmadụ abụọ. E tinyewo akwụkwọ iji Ámá Egwuregwu Mba ahụ, nke pụrụ ịba mmadụ 60,000, mee ihe maka ihe omume ahụ. Ma mgbe ahụ, na June 24, ndị isi Romania e nyere ihe ọmụma na-ezighị ezi jụrụ inye ikike ime mgbakọ ahụ.
Ndịàmà Jehova gbalịsiri ike ịhụ na e wepụrụ iwu ịkagbu mgbakọ ha, ma o nweghị isi. Ya mere, e megharịrị ndokwa ndị e mere ka ọtụtụ puku ndị si mba ofesi a kpọrọ òkù ịbịa site n’ọtụtụ mba dị na Europe, Ebe Ugwu America, na Japan nwee ike ịga mgbakọ na Budapest, Hungary, site na July 12 ruo 14. Mgbanwe ndị ahụ e mere mgbe ọ fọrọ nke nta ka oge gabiga kpatara oké mmefu, ihe isi ike, na nkụda aka nye ọtụtụ ndị.
Ma gịnị ka a pụrụ idokwa maka ndị bi na Romania ga-abịa? A kpọtụụrụ ndị isi nọ n’obodo ukwu Cluj-Napoca na Brasov, o mesịkwara kwe omume ime mgbakọ n’ebe ahụ, site na July 19 ruo 21. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị Romania enweghị ike ijeru Cluj-Napoca ma ọ bụ Brasov. N’ihi ya, e mere mgbakọ abụọ ọzọ na September 13 ruo 15, otu na Baia-Mare, nke ọzọkwa na Bucharest.
Gịnị mere e ji kagbuo mgbakọ mbụ ahụ na Bucharest? Gịnịkwa kpaliri ụfọdụ ndị isi imesị gbanwee echiche ha, nke mere na e mere mgbakọ na Romania, gụnyere otu na Bucharest?
Onye Kpatara Mmegide Ahụ?
Mgbe a na-eme mgbakọ mba nile ahụ na Budapest, akwụkwọ akụkọ Hungary bụ́ Színes Vasárnap kwuru banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Bucharest bụ ebe ha meburu atụmatụ ime nzukọ mgbaafọ mba nile ha, ma n’ihi mmegide sitere n’aka ndị Kraịst Orthodox, ndị isi Romania enyeghị Ndịàmà Jehova ikike ime otú ahụ.” Na ọ bụ chọọchị kpatara mmegide ahụ ghọrọ ihe a maara ebe nile. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ Albany, New York, U.S.A., bụ́ Times Union, kọrọ, sị: “Nna Ochie Teoctist nke ndị Orthodox dọrọ ndị Orthodox kwere ekwe aka ná ntị ịnọ na nche megide ihe ọ kpọrọ nkwenkwe ‘ịjụ okwukwe’ nke Ndịàmà Jehova.”
Akụkọ ndị ahụ a kọrọ banyere ndị ụkọchukwu imegide mgbakọ ahụ hà bụ eziokwu? Na June, n’ebe nile n’obodo ukwu ahụ—n’ihe owuwu ndị chọọchị, ná mgbidi na n’akụkụ ụlọ dị iche iche, na n’ụzọ okpuru ala—ndị bi na Bucharest bidoro ịhụ akwụkwọ mmapawa, ndị katọrọ Ndịàmà Jehova. Otu nke isiokwu ya bụ́ “NYE NDỊ ROMANIA NILE!” jụrụ, sị: “Ndị Romania hà chọrọ mgbakọ mba nile ndị Jehova ugbu a . . . July 19-21? Ndị Kraịst—ka anyị guzogide mgbakọ Setan a!”
Ọzọ, nke nwere isiakụkọ bụ́ “Rịba IHE IZE NDỤ NDỊ JEHOVA Ama!” kwusiri ike, sị: “Ndịàmà Jehova na-alụso Iso Ụzọ Kraịst ọgụ . . . Ha na-achọ ikewa ndị anyị na ịkpata esemokwu okpukpe. . . . UNU NILE BỤ NDỊ ROMANIA, lụọnu ọgụ megide mgbakọ a!”
“ÒKÙ IME IHE” bụ isiakụkọ akwụkwọ mmapawa ọzọ. “Òtù Ụmụnna Orthodox nke Romania . . . na-akpọku ndị Orthodox nile kwere ekwe ịbịa nzukọ ime mkpesa, nke a ga-enwe na Sunday, June 30.” Akwụkwọ mmapawa ahụ kwubiri, sị: “Anyị ga-agwa ndị ọchịchị ka ha kagbuo mgbakọ a. BỊANỤ KA ANYỊ WEE CHEBE OKPUKPE NDỊ NNA OCHIE ANYỊ. Ka Chineke nyere anyị aka!”
Ọbụna ndị ụkọchukwu bipụtara ma kesaa traktị zọọrọ na Ndịàmà Jehova bụ “òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ìgwè ndị kọmụnist.” Ma nke a bụkwa ụgha chara acha, ikekwe ihe ka ọtụtụ ná ndị Romania makwaara nke ọma na ọ bụ. Ha maara na ọchịchị Kọmụnist kpagburu ma tụọ Ndịàmà Jehova mkpọrọ mgbe mgbe n’afọ ndị gaworo aga.
Otú O Si Metụta Àgwà
Olu ndị si ma n’ime Romania ma n’èzí biliri ozugbo imegide mwakpo ahụ ndị chọọchị kpaliri, ndị isi ọchịchị pụkwara ịhụ na inye Ndịàmà ihe ùgwù e nyere ndị ọzọ bụ nanị ihe ziri ezi. Flagrant, bụ́ akwụkwọ akụkọ Bucharest, buru amụma, sị: “Ahụhụ, ibu iro, na iwe na-aga n’ihu megide mgbakọ mba nile mbụ a ga-enwe mmetụta na-adịghị otú e chere ya. Kama ịtụgharị ndị mmadụ pụọ n’ebe Ndịàmà nọ, omume ahụ ga-akpali mmasị, ọchịchọ ịmata ihe, ikwe ibe nọrọ, na ọmịiko ha.”
Lee ka amụma a si bụrụ eziokwu! Ọtụtụ ndị òtù Chọọchị Orthodox dere akwụkwọ ma ọ bụ kpọ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bucharest na fon ma gosipụta iwe n’omume ndị ụkọchukwu ha. Ndị ma nke a na-akọ maara na Ndịàmà Jehova abụghị ma ọlị ihe Chọọchị Orthodox dị na Romania gosiri ha ịbụ.
Marius Milla, n’ide ihe n’akwụkwọ akụkọ Romania bụ́ Timishoara, nke July 6, 1996, kwuru, sị: “Ekwetasiri m ike na 99 pasent nke ndị ji olu ike bo ndị Jehova ebubo enweghị mmasị zuru ezu ịgwa ha okwu ma ọ bụ ịga otu n’ime nzukọ ha.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ ga-abụ ihe na-ewuli elu nke ukwuu karị ma ọ bụrụ na anyị, bụ́ ndị Orthodox kwere ekwe, ga-enwe nchegbu ka ukwuu banyere ntụhie dị n’anya anyị ma hapụrụ Chineke ikpe ikpe ka mma banyere irighiri ahịhịa dị n’anya ndị agbata obi anyị.”—Matiu 7:3-5.
Mgbe ahụ Maazị Milla hotara okwu ọkàiwu Gameliel narị afọ mbụ a ma ama gwara ndị ndú okpukpe na-emegide ụmụazụ Jisọs, sị: “Wepụnụ aka n’ahụ mmadụ ndị a, hapụkwanụ ha: n’ihi na ọ bụrụ na izu a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-akwatu ya n’ala: ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị apụ ịkwatu ha n’ala; ka a ghara ịhụ unu dị ka ndị na-alụkwa ọgụ megide Chineke ma eleghị anya.” (Ọrụ 5:38, 39) Ná nchịkọta, Milla dere, sị: “Àgwà anyị megidere ọchịchị onye kwuo uche ya, Bible megidere ya, o megidekwara ọdịmma ọha na eze.”
N’oge na-adịghị anya, nkatọ maka nkagbu a kagburu mgbakọ ahụ bidoro ịbịa site n’akụkụ Europe ndị ọzọ na site na United States. Kọmitii Helsinki nke Romania zipụrụ mgbasa ozi nke katọrọ “nguzo ihu ọha Nna Ochie Teoctist, onye nnọchianya nke Chọọchị Orthodox nke Romania, weere megide ‘Ndịàmà Jehova.’”
Ọ dabara na nwunye president United States, bụ́ Hillary Clinton, jere ileta Romania n’oge ahụ. Onye nnọchianya mba United States na Romania, bụ́ Alfred Moses, kọwara ihe mere Oriakụ Clinton ji ghara ịbanye na Chọọchị Kretzulescu nke narị afọ nke 18 dị ka o meburu atụmatụ ya: “Nnwere onwe ikpe okpukpe bụ ụkpụrụ nke Ụkpụrụ Iwu United States of America, tinyekwara Ụkpụrụ Iwu Romania, kwadoro. Inwe n’ụlọ chọọchị akwụkwọ mmapawa ndị na-egosipụta ekweghị ibe nọrọ n’ụzọ okpukpe ekwekọghị ná mmụọ nke ụbara ọchịchị onye kwuo uche ya na ná nzube Oriakụ Clinton ji bịa ileta Romania.”
Ihe Àmà nke Nkwado Chineke
Ndịàmà Jehova emewo ọtụtụ mgbakọ n’obodo Cluj-Napoca n’oge ndị gara aga, ndị isi nọ n’ebe ahụ nabatakwara ha ọzọ mgbe a jụrụ na ha agaghị eji Ámá Egwuregwu Mba dị na Bucharest mee ihe. Ma ọ bụ mgbe ọ fọdụrụ nanị otu izu tupu mgbakọ ahụ amalite ka a bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta iji ámá egwuregwu dị na Cluj-Napoca mee ihe. “Olee otú o si kwe omume ịhazi mgbakọ buru ibu otú ahụ ná mkpirikpi oge dị otú ahụ?” ka otu onye nta akụkọ chọrọ ịmara.
“Anyị bụ nzukọ dị n’otu,” ka a gwara ya. “Ime mgbakọ amarawo anyị ahụ. Ma n’elu ihe nile, Jehova Chineke anyị na-akwado anyị.”
N’eziokwu, ọ bụ site n’enyemaka na nkwado Jehova ka a rụzuru ihe dị ukwuu ná mkpirikpi oge dị otú ahụ. Cheedị ihe karịrị mmadụ 20,000 izukọta ruo ụbọchị atọ ná mkpirikpi oge dị otú ahụ e mere ka ha mata! Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara dị 22,004, e mekwara 799 baptism. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Adevărul de Cluj kọrọ ka e mesịrị mgbakọ ahụ, sị: “Mmetụta ndị a gosipụtara bụ na ha na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe nile, na ha na-ejikwa obi ha dum eme ihe nile. Ịdị n’otu ha na-adọrọ mmasị . . . Ha gosipụtara omume ihe nlereanya n’ụzọ ha si duzie onwe ha, ha dịkwa ọcha n’ụzọ pụrụ iche.”
Ihe mere na Brasov na-adọrọ mmasị karịsịa, ebe ọ bụ na e nyere nkwado ime mgbakọ ahụ nanị ụbọchị ole na ole tupu mgbakọ ahụ amalite! N’agbanyeghị nke ahụ, e nwetara ụlọ dị 7,500 n’ebe obibi ndị mmadụ. Mgbe otu Onyeàmà gwara ndị agbata obi ya okwu, ha nyere 30 ndị bịaranụ ụlọ. Otu ọgbakọ nke Ndịàmà na Brasov kwere ka 500 ndị bịaranụ nọrọ na nke ha. E nyere ụfọdụ ndị bịaranụ ụlọ n’ụlọikwuu ndị dị nso n’ala mgbakọ ahụ; mgbe mmiri zokwara, ndị nwere àgwà ile ọbịa n’ebe obibi dị nso gbadatara ma kpọrọ ha gaa n’ebe obibi ndị nke ha.—Tụlee Ọrụ 28:2.
E gbochiri ọrụ Ndịàmà Jehova na Bulgaria bụ́ ebe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị Orthodox, nke ya na Romania nwere ókèala n’ebe ndịda. Mgbe bọs ndị bu Ndịàmà si Bulgaria na-eje Bucharest, dị ka o doro anya ụfọdụ ndị ọrụ na-ahụ maka ihe ndị si mba ọzọ amatalarị banyere mgbanwe n’ebe ndị a ga-eme mgbakọ ahụ. Na Brasov ngụkọta nke 1,056 ndị Bulgaria ji obi ụtọ nụ usoro ihe omume ahụ nile n’asụsụ nke aka ha. Ná ngụkọta, 12,862 bịara mgbakọ Brasov ahụ, e mekwara 832—nke 66 n’ime ha bụ ndị Bulgaria—baptism.
Na September o kwere mee ịhazi mgbakọ ndị obere na Baia-Mare na Bucharest maka ndị na-enweghị ike ije Cluj-Napoca na Brasov. E nwere ngụkọta nke 5,340 ndị bịara mgbakọ abụọ ndị a gbakwụnyere, e mekwara 48 baptism. N’ihi ya ná mgbakọ “Ndị Ozi nke Udo Chineke” ndị e mere n’oge okpomọkụ gara aga na Romania, ngụkọta nke 40,206 bịara, e mekwara 1,679 baptism. N’ezie, ngọzi Jehova dị n’ahụ ndị na-agbalị ijere ya ozi na Romania!
Onye nnọchiteanya nke Ndịàmà Jehova na Bucharest kwuru, sị: “N’izu atọ, anyị nwetara mkpọsa hà ka nke ọtụtụ afọ nke ịgba àmà gburugburu mba a. Ihe Chọọchị Orthodox nke Romania chere na ọ ga-egbochi anyị mesịrị n’ezie bụrụ maka ịga n’ihu nke ozi ọma.”
[Foto dị na peeji nke 14]
Bucharest bụ obodo ọgbara ọhụrụ, mara mma
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Akwụkwọ mmapawa ndị katọrọ Ndịàmà Jehova
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị a ga-eme baptism na Bucharest
[Foto dị na peeji nke 16]
Na Brasov, ebe e nyere nkwado ime mgbakọ ahụ nanị ụbọchị ole na ole tupu oge eruo
[Foto dị na peeji nke 16]
Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 22,004 ná mgbakọ ahụ e mere na Cluj-Napoca