Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 9/15 p. 12-13
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 OLEE OTÚ E SI AMA ONYE ỊBA JI?
  • 2 GỊNỊ NA-AKPATA ỊBA?
  • 3 GỊNỊ GA-ENYERE GỊ AKA IGBOCHI ỊBA?
  • Ịlaghachi n’Ihe Ndị Bụ Isi n’Ọgụ A Na-alụso Ịba
    Teta!—1997
  • Chebe Onwe Gị Pụọ na Nje!
    Teta!—1999
  • Ọrịa Na-efe Efe na Narị Afọ nke 20
    Teta!—1997
  • Ahụ Ọkụ Ejula—Ọgwụgwụ Ya Ọ̀ Dị Nso?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 9/15 p. 12-13

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na n’afọ 2013, ihe karịrị otu narị nde mmadụ na nde iri itoolu na nde asatọ rịara ịba, ihe dịkwa ka narị puku mmadụ ise na puku iri asatọ na puku anọ n’ime ha anwụọkwa. Ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ahụ nwụrụnụ bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise. Ịba na-akpa ike dị egwu n’ihe dị ka otu narị obodo n’ụwa, nke na o nwere ike igbu ihe dị ka ijeri mmadụ atọ na narị nde mmadụ abụọ.

1 OLEE OTÚ E SI AMA ONYE ỊBA JI?

Ịba jide mmadụ, ahụ́ ọkụ ga na-ere ya, oyi ga na-ama ya, ọsụsọ ana-agbakwa ya. Isi ga na-awa ya, ahụ́ ana-egbukwa ya mgbu. O nwekwara ike ịna-agbọ agbọ. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị a nwere ike ịna-eme ha metụ, ha akwụsị. Ihe dị ka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ gafee, ha amalitekwa. Ọ bụ ụdị ịba ji onye ahụ ma ọ bụ ụbọchị ole ịba ahụ nọrọla ya n’ahụ́ nwere ike ime ka ọ na-eme ya otú ahụ.

2 GỊNỊ NA-AKPATA ỊBA?

Ihe e sere iji gosi otú nje na-akpata ịba si ejezu mmadụ ahụ́
  1. O nwere ụdị anwụnta na-atanye mmadụ nje na-akpata ịba n’ahụ́.

  2. Nje ndị ahụ ga-agazi n’imeju onye ahụ nọrọ mụbawa.

  3. Ha ga-esi ebe ahụ gawa n’ọbara onye ahụ, nọrọkwa ebe ahụ na-amụba.

  4. Ha ga-ejizi nwayọọ nwayọọ banye n’ọbara niile dị onye ahụ n’ahụ́.

  5. Ọ bụ otú a ka nje ndị ahụ ga-esi jezuo onye ahụ ahụ́. Mgbe ahụ nje ndị ahụ na-amụba ka ihe ndị na-egosi na ịba ji onye ahụ ga na-eme ya.

3 GỊNỊ GA-ENYERE GỊ AKA IGBOCHI ỊBA?

Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na i bi n’ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba:

  • Zụta net anwụnta. O kwesịrị ịbụ

    • nke ndị rụrụ ya gbara ọgwụ anwụnta.

    • nke na-adọkaghị adọka.

    • nke ga-ekpuchi ebe mmadụ dina.

  • Na-agba ọgwụ anwụnta n’ụlọ gị.

  • I nwere ike ịrụnye net n’ọnụ ụzọ gị nakwa na windo gị. I nwekwara ike ịgbanye fan ma ọ bụ ntụoyi n’ihi na ha agaghị ekwe anwụnta besa ebe ọ bụla.

  • Na-eyi ákwà ga-ekpuchi ahụ́ gị nke ọma.

  • Ebila ọhịa nso, ekwekwala ka mmiri dọrọ otu ebe n’akụkụ ụlọ gị n’ihi na ha abụọ na-amụ anwụnta.

  • Ọ bụrụ na ịba abịa gị, gwọọ ya ozugbo.

Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba:

Otú anwụnta si ebunye mmadụ ịba

Mmadụ nwere ike ịrịawa ịba ma anwụnta bú nje na-akpata ịba taa ya. Ọ bụrụkwa na anwụnta na-ebughị nje ahụ ataa onye ịba dị n’ahụ́, o nwere ike ịtara nje ahụ. Anwụnta ahụ tazie onye ọzọ, o nwere ike ịtanye ya ịba n’ahụ́

  • Jụọ ase tupu gị agawa. Ụdị nje na-akpata ịba n’otu ebe nwere ike ịdị iche na nke na-akpata ya n’ebe ọzọ. Ihe a nwere ike ime ka mmadụ nweta ọgwụ ga-aka arụ ọrụ n’ebe ahụ ọ na-aga. Ọ ga-adịkwa mma ka ị hụ dọkịta ka ọ gwa gị ihe ụfọdụ gbasara ahụ́ gị ị ga-akpachapụrụ anya tupu gị agawa.

  • I ruo ebe ahụ, mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a gbasara ihe ndị bi n’ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba kwesịrị ịna-eme.

  • Ọ bụrụ na ịba abịa gị, gaa ụlọ ọgwụ n’egbughị oge. Buru n’obi na mgbe ị ga-amalite hụwa ihe ndị na-egosi na ị na-arịa ịba nwere ike ịbụ n’agbata otu izu na otu ọnwa.

IHE NDỊ ỌZỌ I NWERE IKE IME

  1. Na-eme ihe ọ bụla gọọmenti ma ọ bụ ndị obodo kwuru ga-enye aka igbochi ịba.

  2. Na-azụ ọgwụ naanị n’ebe a na-ere ndị nke ezigbo ya. Ọ bụrụ na mmadụ aṅụọ ọgwụ na-adịghị mma ma ọ bụ nke na-abụghị ezigbo ya, ọ ga-eme ka ịba ahụ ka njọ ma ọ bụ gbuo onye ahụ.

  3. Wepụ ihe ọ bụla nwere ike ịna-amụ anwụnta n’akụkụ ụlọ unu.

Ọ bụrụ na i bi n’ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba ma ọ bụkwanụ na ị gara ebe ahụ, gaa ụlọ ọgwụ ma nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mewe gị:

  • Ahụ́ ọkụ

  • Oké ọsụsọ

  • Oyi ọmụma

  • Isi ọwụwa

  • Ahụ́ mgbu

  • Ike ọgwụgwụ

  • Afọ ọrụrụ

  • Ịgbọ agbọ

  • Otoro

Ọ bụrụ na mmadụ agwọghị ịba n’oge, ọbara nwere ike ịkọ ya n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ ya anwụọ. Onye ọ bụla ịba ji kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ n’egbughị oge ọ bụla tupu ya aka njọ, karịchaa ụmụaka na ụmụ nwaanyị dị ime.a

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru ebe a, gụọ Teta! Nọvemba 2011, peeji nke 24-25, na Teta! Nọvemba 2009, peeji nke 26-29. Ha abụọ dịcha na Bekee.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ ỊMA

Elekere e sere na map Afrịka

Kwa ụbọchị, ịba na-egbu ọtụtụ ụmụaka n’Afrịka

  • Ndị ịba na-akacha akpa aka ọjọọ bụ ụmụaka na ụmụ nwaanyị dị ime.

  • Kwa ụbọchị, ịba na-egbu ọtụtụ ụmụaka n’Afrịka.

  • Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ebute ịba n’ọbara a mịnyere ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya