Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Ghọọ Enyi Chineke?
“IGUZOSI ike n’ihe.” “Nraranye onwe onye.” Ndị a bụ okwu ndị mmadụ na-ejikarị akọwa nrapara ha n’ebe ndị kasị bụrụ enyi ha nọ. Ị̀ maara na okwu ndị a pụkwara ịkọwa nrapara n’ebe Onye Okike Ukwu nke eluigwe na ala a dị ebube nọ—na Chineke onwe ya pụrụ ịbụ enyi gị? Ee, Bible na-ekwu banyere inwe nsọpụrụ Chineke, okwu ahụ metụtakwara ọ bụghị nanị nrubeisi kamakwa nrapara onwe onye n’ebe Chineke nọ, ịdị nso nke na-abịa site n’obi ekele.
Isiokwu ndị bu ụzọ n’usoro a egosiwo na ụdị nrapara ahụ ga-ekwe omume ma baa uru.a Ma olee nnọọ otú ị ga-esi nweta ụdị ọbụbụenyi onwe onye a gị na Chineke? Ọ bụghị ihe a mụkọtara gị na ya ma ọ bụ ihe ị na-eketa ozugbo a mụrụ gị site n’aka nne na nna na-atụ egwu Chineke. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe na-abịa nanị site n’ezi mgbalị. Pọl onyeozi gwara nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti ka ‘ọ na-anwa onwe ya ka o wee ruo nsọpụrụ Chineke.’ Ee, ọ ghaghị itinye ụdị mgbalị nke onye na-eme egwuregwu na-etinye n’ọzụzụ! (1 Timoti 4:7, 8, 10) Ị ghaghị imekwa otú ahụ ma ọ bụrụ na Chineke ga-aghọ enyi gị. Ma olee otú ị pụrụ isi malite inwe ọzụzụ n’akụkụ a?
Ihe Ọmụma Onwe Onye Banyere Chineke
Ebe ọ bụ na nsọpụrụ Chineke na-esite n’obi, ị ghaghị iji ihe ọmụma banyere Chineke mejupụta obi gị. N’ụzọ dị mwute ikwu, mgbe a jụrụ ihe karịrị ndị ntorobịa 500 sị “Ugboro ole ka ị na-agụ Bible nanị gị?” Pasent 87 kwuru “mgbe ụfọdụ,” “ọ na-esi ike,” ma ọ bụ “ọ dịghị ma ọlị.” O doro anya na ihe ka ukwuu ná ndị ntorobịa na-eche na ịgụ Bible adịghị akpali akpali ma na-agwụ ike. Ma ọ bụghị iwu na ọ ga-adị otú ahụ! Tụlee: Gịnị mere ndị ntorobịa ụfọdụ ji eburu ụdị ihe ndekọ egwuregwu nile n’isi ma ọ bụ na-amụta okwu ndị dị n’egwú ndị na-amasị ha? N’ihi na ha nwere mmasị n’ihe ndị ahụ. N’otu aka ahụ, ịmụ Bible na-aghọ ihe na-akpali mmasị ma i mikpuo onwe gị n’ime ya. (1 Timoti 4:15) Pita onyeozi gbara ume, sị: “Ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike.” (1 Pita 2:2) Ee, ị ghaghị inwe, ma ọ bụ zụlite, ụdị mmasị ahụ n’Akwụkwọ Nsọ. Nke a pụrụ iwe mgbalị, ma ụgwọ ọrụ ya kwesịrị ya.b
Otu ihe bụ, ịgụ na ịmụ Okwu Chineke na akwụkwọ ndị dabeere na Bible ga-ekpughe “ịdị ụtọ Jehova.” (Abụ Ọma 27:4) Otu onye Kraịst na-eto eto aha ya bụ Amber mere ya ihe mgbaru ọsọ ya ịgụcha Bible. Nke a were ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ. “Ejighị m n’aka na a ga-enwe ọtụtụ ihe ná ndụ m nke chọrọ oge na mgbalị dị ukwuu otú a ma na-eweta ọtụtụ ụgwọ ọrụ,” ka Amber kọwara. “Mgbe m na-agụ ya, ọ dị m ka Jehova ò kukwasịrị m n’apata ụkwụ ya dị ka nna ma na-ezi m ihe. Amụtara m ihe dị ukwuu banyere Jehova—ihe ndị dọtakwuru m nso n’ebe ọ nọ ma mee ka m chọọ ịtụ ya egwu ná ndụ m nile.”
Mgbe ị gụrụ Bible, ị na-amụta banyere ọtụtụ oge mgbe Chineke ji iguzosi ike n’ihe kwadoo ndị enyi ya. (Abụ Ọma 18:25; 27:10) Ị na-achọpụta na ụkpụrụ ya bụ nke kasị mma mgbe nile ma bụrụ maka ọdịmma anyị na-adịte anya. (Aịsaịa 48:17) Ịgụ banyere àgwà Chineke ndị na-enweghị atụ, dị ka ịhụnanya na amamihe ya, na-akpali gị ịchọ iṅomi ya. (Ndị Efesọs 5:1) Ma ka ihe ọmụma dị otú ahụ wee kpalie obi gị, ị ghaghịkwa ịtụgharị uche. Ka ị na-agụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka nke a na-agwa m banyere Jehova? Olee otú m pụrụ isi jiri nke a mee ihe n’iche echiche m na omume m? Olee otú nke a si egosi na Chineke bụ enyi kasị mma m pụrụ inwe?’
Ihe ọmụma ị na-enweta banyere Chineke site n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ọgbakọ ga-enyere gị aka ịbịakwu ya nso n’ụzọ ọzọ. Otu ilu ndị France na-ekwu, sị: “Nanị ndị bụ ezi ndị enyi bụ ndị echiche ha bụ otu.” Ma olee otú gị na Chineke pụrụ isi ‘nwee otu echiche’? Denise na-eto eto na-akọwa, sị: “Ka ị na-amụkwu ihe ma na-eme nnyocha n’otu isiokwu, otú a ka ị ga-achọpụtakwu echiche Jehova banyere ya. Ọ na-enye aka mgbe ị maara echiche ya banyere otu ihe.”
Àgwà Ziri Ezi Dị Mkpa
Chineke na-ahọrọ nanị ndị na-akwanyere ụkpụrụ omume ya ùgwù dị ka ndị enyi ya. “N’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị,” ka Ilu 3:32 na-ekwu. Onye ntorobịa nke na-agbalị ịbụ onye ziri ezi ‘ga-elezi anya ijegharị n’iwu Jehova.’ (2 Ndị Eze 10:31) Ruo n’ókè ha aṅaa ka àgwà nrubeisi dị otú ahụ ga-adọta mmadụ nso n’ebe Chineke nọ? Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, Anyị ga-abịakwutekwa ya, na-emekwa ebe obibi Anyị n’ebe ọ nọ.” (Jọn 14:21-24) Lee nkọwa na-ekpo obi ọkụ ọ bụ! Cheedị, ndị abụọ kasịnụ n’eluigwe na ala ịdị na-enye mmadụ nchebara echiche na nlekọta ha mgbe nile! Nke ahụ ga-emere gị ma ọ bụrụ na i lezie anya ijegharị n’iwu Jehova.
Izi ezi ọ̀ pụtara na ị ghaghị izu okè? Ọ dịghị ma ọlị! Ihie ụzọ n’ihi adịghị ike apụtaghị na ị gbahapụwo ‘okporo ụzọ nke iwu Chineke.’ (Abụ Ọma 119:35) Tụlee ihe Bible na-agwa anyị banyere Eze Devid. N’agbanyeghị ịbụ enyi na-eguzosi ike n’ihe nke Chineke, o mere mmehie ụfọdụ dị oké njọ n’ihi adịghị ike. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova kwuru na o jewo ije “n’izu okè nke obi, na izi ezi.” (1 Ndị Eze 9:4) Eze Devid gosiri nchegharị sitere n’obi mgbe nile maka mmehie ọ bụla o mere ma gbalịsie ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Abụ Ọma 51:1-4.
Ọ bụ ezie na Devid hụrụ Chineke n’anya, ọ maara otú ọ pụrụ isiru ike mgbe ụfọdụ ime ihe ziri ezi. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Chineke, sị: “Mee ka m zọọ ije n’eziokwu Gị.” Ee, ọ zụlitere ezi ụjọ, ma ọ bụ egwu, nke imejọ Chineke. N’ihi ya Devid pụrụ ikwu, sị: “Izu nzuzo Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya.” (Abụ Ọma 25:5, 14) Nke a abụghị egwu ọjọọ kama ọ bụ nsọpụrụ ofufe sitere n’obi maka Onye Okike na egwu dị mma nke imejọ ya. Egwu Chineke a bụ ebe ezi àgwà gbadoro ụkwụ. Iji maa atụ, tụlee ihe atụ nke onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Joshua.
Joshua natara otu akwụkwọ ozi site n’aka nwa akwụkwọ ibe ya na-ekwu na ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ ma chọọ iso ya nwee “mmekọrịta.” Joshua, ọ bụ ezie na o nwere mmasị n’ebe ọ nọ, ghọtara na iso onye na-ekweghị ekwe kpakọrịta pụrụ iduje n’omume rụrụ arụ ma nwee ike imebi ọbụbụenyi ya na Jehova. Ya mere ọ gwara ya hoo haa na ya achọghị ya! Mgbe o mesịrị gwa nne ya otú o si mee ihe banyere ọnọdụ ahụ, o tiri mkpu n’echeghị echiche, sị: “Oo, Joshua, ma eleghị anya ị kpasuru ya iwe!” Joshua zara, sị: “Ma, Mama. Ọ ga-akara m mma ịkpasu ya iwe karịa ịkpasu Jehova iwe.” Egwu Chineke ya, egwu nke imejọ Enyi ya nke eluigwe, kpaliri ya ịnọgide na-akpa ezi àgwà.
Chọọ Ezi Ndị Enyi
Otú ọ dị, otu onye ntorobịa aha ya bụ Lynn, nọgidere na-abanye ná nsogbu. Gịnị bụ nsogbu ya? Ọ na-agbaso ìgwè ọjọọ. (Ọpụpụ 23:2; 1 Ndị Kọrint 15:33) Gịnị bụ ngwọta ya? Ịchọta ndị enyi ọhụrụ! “Ọ bụrụ na i nwere ndị enyi hụrụ Jehova n’anya gburugburu gị,” ka Lynn kwubiri, “ọ na-enyere gị aka inwe akọ na uche na-arụ ọrụ na izere nsogbu. Mgbe ha kwupụtara ịkpọasị maka ihe ọjọọ, ọ na-eme ka i nwee ụdị mmetụta ahụ.”
N’ezie, ndị enyi ọjọọ ị họọrọ pụrụ ịbụ ihe mgbochi kasịnụ n’ebe isoro Chineke bụrụ enyi dị. Ann dị afọ 18 kwetara, sị: “Ndị enyi gị na-enwe mmetụta dị ukwuu. Ka oge na-aga ị ga-adị ka ha. Ha na-akpụzi gị iche echiche ka ha. Mkparịta ụka ha pụrụ ịbụkarị banyere mmekọahụ. Ọ pụrụ ime ka i nwee ọchịchọ ịmata ihe. Ị na-eche otú ọ ga-adị.” Ann mụtara nke a n’ụzọ dị njọ. Ọ na-ekwu, sị: “Amaara m na nke a bụ eziokwu. Etinyere m aka n’omume rụrụ arụ ma tụrụ ime mgbe m dị afọ 15.”
Ann mesịrị bịa ghọta ịbụ eziokwu nke okwu Bible bụ: “Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Ee, Ann chọrọ ịbụ—kpebisie ike ịbụ—enyi nke ụwa. Ma nke a dujere nanị n’ọtụtụ obi mgbu. Dị ka ihe ndabara ọma, Ann bịara ghọta onwe ya. O nwere oké mwute maka ụzọ ya ma chọọ enyemaka site n’aka ndị mụrụ ya na ndị okenye nọ n’ọgbakọ ya. Ọ chọtakwaara onwe ya ndị enyi ọhụrụ. (Abụ Ọma 111:1) Site n’itinye mgbalị dị ukwuu, Ann bụrụghachiiri enyi Chineke. Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịworo, ọ na-ekwu, sị: “Mmekọrịta mụ na Jehova chiri anya karị.”
Site n’ọmụmụ Bible onwe onye, ntụgharị uche, ezi àgwà, na mkpakọrịta ndị dị mma, gị onwe gị kwa pụrụ ịzụlite ọbụbụenyi chiri anya n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, ijigide ọbụbụenyi ahụ bụ ihe ọzọ. Olee otú ọ ga-esi kwe mee ime otú ahụ n’agbanyeghị ihe isi ike na adịghị ike onwe onye dị iche iche? Isiokwu na-abịa n’ihu n’usoro a ga-atụle okwu a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee mbipụta Teta! nke July 22 (Bekee) na December 8, 1995.
b Lee “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Mere A Ga-eji Agụ Bible?” ná mbipụta anyị nke January 8, 1987.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị enyi m hà ga-enyere m aka ịbụ enyi Chineke?