Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 3/8 p. 24-25
  • Ò Kwesịrị Ka Ụmụaka Họrọ Okpukpe nke Ha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ò Kwesịrị Ka Ụmụaka Họrọ Okpukpe nke Ha?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nhọrọ Ahụ
  • Ibu Ọrụ Nne na Nna
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ụmụ Gị Hà Ga-efe Jehova Ma Ha Tolite?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 3/8 p. 24-25

Echiche nke Bible

Ò Kwesịrị Ka Ụmụaka Họrọ Okpukpe nke Ha?

SITE n’oge a mụrụ nwata ruokwa n’oge uto ya, ndị nne na nna na-emere nwa ha nhọrọ. N’otu oge ahụ, nne ma ọ bụ nna maara ihe maara mgbe a ga-eme mgbanwe, na-atụle mgbe ọ bụla o kwere omume ihe nwa ahụ ga-enwe mmasị na ya karị.

Ma, ọ̀tụ̀tụ̀ nnwere onwe ime nhọrọ a ga-enye nwata pụrụ ịbụrụ ndị nne na nna ihe ịma aka. Ọ bụ eziokwu na ụmụaka pụrụ ime nhọrọ ndị ziri ezi ma rite uru site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe, ọ bụkwa eziokwu na ha pụrụ ime nhọrọ ndị na-ezighị ezi, nke pụrụ ịrụpụta ọdachi.—2 Ndị Eze 2:23-25; Ndị Efesọs 6:1-3.

Dị ka ihe atụ, ụmụaka ga-ahọrọkarị nri ratụ ratụ karịa nri na-edozi ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na oge ha ka bụ nwata, ha enweghị ike ime mkpebi ndị dị mma n’onwe ha. Ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ndị nne na nna ịgbachi ụmụaka ha nkịtị n’okwu ahụ, na-ele anya na ha ga-emesịa họrọ nri na-edozi ahụ? Ee e. Kama, ndị nne na nna aghaghị imere ụmụ ha nhọrọ na-eburu ọdịmma na-adịte anya nke ụmụaka ha n’obi.

Ya mere, n’ụzọ kwesịrị ekwesị ndị nne na nna na-emere ụmụaka ha nhọrọ n’ihe banyere nri, uwe, ejiji, na omume ọma. Ma gịnị banyere okpukpe? Ndị nne na nna hà kwesịrị imekwu nhọrọ nke ahụ?

Nhọrọ Ahụ

Ụfọdụ ga-arụ ụka na ndị nne na nna ekwesịghị ịmanye ụmụaka ha ịnakwere nkweta okpukpe ha. N’ezie, ihe karịrị afọ 160 gara aga, ụfọdụ ndị sịrị na ha nwere nkwenkwe ndị Kraịst kwalitere echiche ahụ bụ́ na “e kwesịghị ịkụziri ụmụaka okpukpe ka e wee ghara ime ka ha tụkwasị uche ha n’otu okpukpe kpọmkwem, kama e kwesịrị ịhapụ ha n’onwe ha ruo mgbe ha nwere ike ime nhọrọ, ma họrọ ime otú ahụ.”

Otú ọ dị, echiche a ekwekọghị n’echiche Bible. Bible na-emesi ike mkpa ọ dị ịkụbanye nkwenkwe okpukpe n’ime ụmụaka site n’ọmụmụ. Ilu 22:6 na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”

Okwu Hibru a sụgharịrị “nwata” na-agụnye afọ ndụ site n’oge nwa ọhụrụ ruo oge uto. Banyere ịdị mkpa nke mmụta n’oge a ka bụ nwata, Dr. Joseph M. Hunt, nke Mahadum Illinois, U.S.A., kwuru, sị: “Ọ bụ n’ime afọ anọ ma ọ bụ ise mbụ nke ndụ ka ntolite nwata na-akasị adị ngwa, nakwa nke a pụrụ ịgbanwe karịsịa. . . . Ikekwe a na-azụlite 20 pasent nke ikike [ya] ndị bụ isi tupu ọ gbaa otu afọ, ikekwe ọkara tupu o ruo afọ anọ.” Nke a nanị na-emesi ike ndụmọdụ Bible e nyere n’ike mmụọ nsọ na ọ dị mkpa ka ndị nne na nna nye nduzi amamihe dị na ya n’oge ná ndụ nwata, na-azụlite ya n’ụzọ Chineke.—Deuterọnọmi 11:18-21.

N’ụzọ pụtara ìhè, Akwụkwọ Nsọ na-atụzi nne na nna na-atụ egwu Chineke ịkụnye n’ime ụmụaka ha ịhụnanya maka Jehova. Deuterọnọmi 6:5-7 na-asị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ngwaa Hibru a sụgharịrị “izi” nwere echiche nke ịmụcha ngwá ọrụ, dị ka n’elu ọmụ. A pụghị iji ichi ya n’elu ya ugboro ole na ole rụzuo ya kama a ghaghị iji ịdị uchu mee ya, ọtụtụ ugboro. The New English Bible sụgharịrị ngwaa Hibru ahụ ịbụ “meghachi.” N’ụzọ doro anya, “izi” na-enye echiche nke ịhapụ mmetụta na-adịgide adịgide.—Tụlee Ilu 27:17.

N’ihi ya, nne na nna bụ́ ezi ndị Kraịst kwesịrị iji ibu ọrụ ha kpọrọ ihe iji kụnye nkweta okpukpe ha n’ime ụmụaka ha. Ha apụghị ịgbahapụ ibu ọrụ nke a n’ụzọ ziri ezi site n’ikwere ka ụmụaka ha meere onwe ha nhọrọ. Nke a ga-agụnye ịkpọrọ “ụmụntakịrị” ha na-aga nzukọ. N’ebe ahụ ndị nne na nna pụrụ ịnọnye n’akụkụ ha ma nyere ha aka ịghọta abamuru ime mmụọ nke ezinụlọ dị n’otu pụrụ inweta site n’ịṅa ntị ná nkwurịta okwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ ma na-ekere òkè na ha.—Deuterọnọmi 31:12, 13; Aịsaịa 48:17-19; 2 Timoti 1:5; 3:15.

Ibu Ọrụ Nne na Nna

Nanị ịgwa nwata ka o rie otu ihe n’ihi na ọ na-edozi ahụ apụtaghị na nwata ahụ ga-enweta ọṅụ na ya. N’ihi ya, nne nke maara ihe maara ụzọ isi mee ka nri ndị a dị mkpa na-adọrọ adọrọ ruo n’ókè o kwere omume iji wee tọọ nwa ahụ ụtọ. N’ezie, ọ na-akwadokwa ihe oriri n’ụzọ kwekọrọ n’ikike ahụ nwata ahụ ịgbari ya.

N’ụzọ yiri nke ahụ, na mbụ nwata pụrụ ịjụ ịnara ntụziaka okpukpe, nne ma ọ bụ nna pụkwara ịchọpụta na ịgbalị iso ya tụgharịa uche n’okwu ahụ adịghị arụpụta ihe. Otú ọ dị, ntụzi sitere na Bible doro anya—ndị nne na nna aghaghị ime ike ha nile iji zụọ ụmụaka ha site na nwa ọhụrụ. Ya mere, ndị nne na nna maara ihe na-eme ka ntụziaka okpukpe na-adọrọ adọrọ site n’ikwu ya n’ụzọ ga-atọ nwata ahụ ụtọ, na-eburu n’uche ikike ya ịnabata ya.

Ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-amata nke ọma ibu ọrụ nke inye ụmụaka ha ihe ndị dị mkpa ná ndụ, n’ọnọdụ kakwa ukwuu ọ dịghị onye na-amata mkpa nwata karịa ndị nne na nna. N’ikwekọ na nke a, Bible na-atụkwasị ibu ọrụ bụ isi nke inye ihe n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ ime mmụọ n’ubu nke ndị nne na nna—nna karịsịa. (Ndị Efesọs 6:4) N’ihi ya, ndị nne na nna agaghị ezere ibu ọrụ ha site n’ịchọ ibufere onye ọzọ ibu ọrụ ahụ. Ọ bụ ezie na ha pụrụ irite uru site n’enyemaka e nyere, nke a ga-atụkwasị ihe, ọ bụghị idochi mmụta okpukpe sitere n’aka ndị nne na nna.—1 Timoti 5:8.

N’oge ụfọdụ ná ndụ, onye ọ bụla na-ekpebi nkwenkwe okpukpe ndị ọ ga-edebe, ma ọ bụrụ na e nwere. Ọ bụrụ na ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst enwee echiche ibu ọrụ onwe onye maka inye ụmụaka ha ntụziaka okpukpe site n’oge a ka bụ nwa ọhụrụ, ọ bụrụkwa na ha ejiri oge a zie ha ịtụgharị uche n’ihe ndabere nke ụkpụrụ ndị dị mma, o yikarịrị nnọọ ka nhọrọ ụmụaka ahụ ga-emesịa mee ná ndụ ga-abụ nke ziri ezi.—2 Ihe Emere 34:1, 2; Ilu 2:1-9.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya