Ihe Akaebe Nye Okwukwe Ha
AFỌ ahụ bụ́ 1995 ka e mere ememe mgbaafọ nke 50 maka ntọhapụ nke ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke Nazi. Gbaa Europe gburugburu, ndị ndị Nazi tara ahụhụ ji mgbakọta nke ìgwè ndị bara ụba wee cheta ihe omume a, bụ́ nke ndị isi Ọchịchị bịara n’Auschwitz, Bergen-Belsen, Buchenwald, Dachau, Ravensbrück, Sachsenhausen, na ogige ndị ọzọ. Otu echiche nke batara n’obi ugboro ugboro bụ, “Ya adịla mgbe anyị ga-echefu!”
N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova mere ihe ngosi na Europe n’oge ememe mgbaafọ ahụ. Ọchịchị Hitler akpọchiwo ọtụtụ n’ime Ndịàmà n’ihi ọjụjụ ha jụrụ ikele ekele Hitler ahụ na ịkwado mgbalị agha. Site na 1933 gaa n’ihu, a tụrụ ọtụtụ puku n’ime ha mkpọrọ, ọtụtụ nwụkwara n’ihi mmeso ndị ha natara.
Otú ọ dị, ahụmahụ ha abụghị ihe ọha mmadụ mazuru. Nke a akpalitewo okwu ahụ bụ “ndị tara ahụhụ e chefuru echefu nke akụkọ ihe mere eme.” Otu ìgwè Ndịàmà lanarịrịnụ kwupụtara ọchịchọ nke ichebe ihe ncheta nke ezinụlọ ha na ndị enyi ha bụ́ ndị a kpagburu, tụọ mkpọrọ, taa ahụhụ, ma ọ bụ gbuo na ime ka a mara ihe akaebe nke okwukwe na obi ike nke Bibelforscher ndị a, bụ́ aha e ji mara Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, hapụrụ.
Na September 29, 1994, Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Ihe Ncheta Oké Mgbukpọ nke United States, na Washington, D.C., nwere nnọkọ ọmụmụ ihe banyere Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ndị lanarịrị ogige ịta ahụhụ ahụ mere ememe njikọghachi abụọ dị ukwuu na France, na March 28, 1995, na Strasbourg, nakwa na Paris na March 30. Ọ bụ ihe na-akpali nnọọ akpali ịnụ ka ndị ikom na ndị inyom ndị a meworo agadi ugbu a, bụ́ ndị ka kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke mgbe 50 afọ gasịrị, kọrọ ahụmahụ ha. N’April 27, e mere otu ụdị nzukọ ahụ na nso nso Berlin, na Brandenburg, Germany, bụ́ ebe e gburu ọtụtụ Ndịàmà site n’ịbụ ndị e gbupụrụ isi. N’ụbọchị na-eso ya, ọtụtụ n’ime ndị lanarịrịnụ gara ememe nke Ọchịchị Brandenburg haziri, wee gaa leta ogige dịgasi iche iche.
Ihe Ngosi French Ahụ
N’oge njikọghachi ndị a, e mere otu ihe ngosi nke isiokwu ya bụ “Mémoire de Témoins” (Akaebe Onye Hụrụ Ihe Merenụ). Malite na May 1995 ruo April 1996, ọ gazuru 42 obodo ukwu dị na France na obodo ukwu dị iche iche dị na Belgium na ebe ndị a na-asụ French na Switzerland. Nke kasịnụ, ndị ikom na ndị inyom nọ n’ihe ngosi ahụ bụ Ndịàmà nke Jehova Chineke. Ma ha bụkwa ndị àmà nke nhụjuanya nke ha na ndị ọzọ diri n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ha bụ ihe àmà dị ndụ nke echiche nke ekweghị ibe nọrọ nke kpatara nhụjuanya na ọnwụ nke ọtụtụ nde mmadụ n’ihi agbụrụ na okpukpe ha. Ọzọkwa, akaebe nke Ndịàmà ahụ na-ekpughe otú ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst si họrọ mesaịa ụgha, bụ́ Hitler, karịa Jisọs Kraịst; ịkpọasị karịa ịhụnanya nke onye agbata obi; na ime ihe ike karịa udo.
Ndị mejupụtara ihe ngosi ahụ bụ 70 ìgwè nke ndị na-eme ihe ngosi, na-amalite n’usoro oge nke ihe omume dị iche iche—mmepe nke ogige ndị dị na Dachau na Oranienburg, na March 1933; Iwu Nuremberg ahụ iji “chebe ọbara Germany,” na September 1935; Anschluss, ma ọ bụ njikọ e jikọtara Austria na Germany, na March 1938; Kristallnacht (Abalị Crystal), na November nke otu afọ ahụ, nke a nọ n’ime ya wakpoo ọtụtụ puku ụlọ ahịa ndị Juu, e jidekwara ihe karịrị 30,000 mmadụ ma gbaara ha ụgbọ nwa mkpi; mmachibido iwu e ji nke nta nke nta machibido Ndịàmà Jehova; mwakpo nke Soviet Union, na June 1941; na ogbugbu nke ndị isi na-ezuchaghị okè, site na 1939 ruo 1941.
Ọtụtụ ìgwè na-eme ihe ngosi gosipụtara nkụzi a kụnyemiri n’uche ndị na-eto eto n’òtù Ndị Ntorobịa Hitler na ndọrọ dị na nnukwu mgbakọ ndị Nazi nwere na Nuremberg maka ọha na eze. Foto dị iche iche mere ka ọjụjụ Ndịàmà Jehova jụrụ ikwe onye ndú ahụ nkwa nkwado ha na ikele ekele Hitler ahụ bataghachi n’obi. Ìgwè ndị ọzọ gosiri otú Ndịàmà Jehova si bụrụ ndị a kọrọ akụkọ na-abụghị eziokwu megide na otú ha, malite na 1935, si kesaa magazin na traktị ndị na-ekpughe imebiga ihe oké nke Nazi.
Ahụmahụ Onwe Onye
Ihe dị ka 40 ìgwè nke ndị na-eme ihe ngosi kọrọ ahụmahụ nke ndị ikom na ndị inyom na-abụghị ndị a ma ama sitere Europe nile, bụ́ ndị a kpagburu ma ọbụna gbuo n’ihi okwukwe ha. Ndị lanarịrịnụ kwadoro ihe ngosi ahụ site n’ịbịa, ndị ọbịa gekwara ha ntị nke ọma. Ụmụntakịrị gosịrị oké mmasị ka Louis Arzt na-akọ akụkọ ya. N’ịbụ onye sitere na Mulhouse dị na France, a napụrụ ya ndị mụrụ ya wee kpọga ya Germany n’ihi ịjụ ikwu “Heil Hitler!” n’ụlọ akwụkwọ. “Otu onye agha SS tiri m ihe n’ihi ịjụ ikele Hitler. Ọ pịara m ọnụ ụtarị 30. Ụbọchị abụọ mgbe nke ahụ gasịrị o konyere m aka n’ubu ma gbalịa iji mmetụta m ghọgbuo m. ‘Chee echiche banyere nne gị. Ọ ga-enwe nnọọ obi ụtọ ịhụ gị. Nanị ihe ọ dị gị mkpa ime bụ ịsị “Heil Hitler!” i wee banyekwa n’ụgbọ okporo ígwè.’ Ọ bụ ihe siri ike nye obere nwa dị afọ 12,” ka ọ gbakwụnyere. Ahụmahụ Joseph Hisiger, bụ́ onye jiri bred o ketara n’otu izu gbanwere Bible site n’aka onye mkpọrọ ibe ya bụ onye Protestant, metụrụ ọtụtụ ndị n’ahụ.
Ajụjụ ọnụ e tinyere na vidio nke a gbara ndị bụbu ndị a gbaara ụgbọ nwa mkpi bụ akụkụ ọzọ nke ihe ngosi ahụ. A gbara ajụjụ ọnụ ụfọdụ n’ebe e nwere ogige ndị ahụ n’onwe ha—dị ka ihe atụ, n’Ebensee dị n’Austria nakwa na Buchenwald na Sachsenhausen dị na Germany. E tinyere ajụjụ ọnụ ndị ọzọ banyere akụkụ dị iche iche nke nke ndụ ogige ahụ ma ọ bụ ihe ncheta nke Ndịàmà a gbaara ụgbọ nwa mkpi mgbe ha bụ ụmụaka na tepu.
Nguzobe Ahụ
Ememe dị mkpirikpi mepere ngosi nke ihe ngosi nke ọ bụla, nke onye nnọchiteanya nke ndị bụbu ndị a gbaara ụgbọ nwa mkpi kọwara nnagide ime mmụọ nke Ndịàmà Jehova nagidere Ọchịchị Ndị Nazi. Ndị na-abụghị Ndịàmà a gbaara ụgbọ nwa mkpi, tinyekwara ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọchịchị, gụnyere otu onye bụbu minista gọọmenti France, jikwa obi ọma nakwere òkù a kpọrọ ha ikwu okwu.
Otu onye bụbu onye a gbaara ụgbọ nwa mkpi nke maara Ndịàmà Jehova na Buchenwald kwuru banyere ha: “Amaghị m ndị ọzọ a gbaara ụgbọ nwa mkpi, ma e wezụga ndị Juu, bụ́ ndị e mesoro n’ụzọ jọgburu onwe ya otú a: a kụrụ ha ihe, weda ha n’ala, kparịa ha, nye ọrụ ndị kasị dị ala. E wezụga okwukwe ha, ha agaraghị enwe ike ịnagide. Enwere m nkwanye ùgwù na nsọpụrụ kasị ukwuu maka ha.”
Mmeghachi Omume
Ihe karịrị 100,000 mmadụ letara ihe ngosi ahụ. N’ebe ụfọdụ, ọtụtụ narị mmadụ, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto, kwụrụ n’ahịrị iji banye n’ụlọ nzukọ ihe ngosi ahụ. Ọtụtụ ndị ọbịa ji okwu ole na ole kwupụta mmetụta ha n’akwụkwọ ndị ọbịa. Dị ka ihe atụ, otu onye na-eto eto dere, sị: “Aha m bụ Sabrina. Adị m afọ iri, m ga-achọkwa ịbụ onye na-adịghị atụ egwu dị ka Ruth, iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ.”a
Usoro mgbasa ozi kwukwara okwu banyere ihe ngosi ahụ. N’ozuzu ya, otu ma ọ bụ isiokwu abụọ pụtara n’akwụkwọ akụkọ ógbè n’obodo nke ọ bụla. Tụkwasị na nke ahụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi redio ndị dị n’ógbè ahụ kpọsara ihe ngosi ahụ ugboro ugboro, na-akpọsakwa ihe omume ndị na-egosi ajụjụ ọnụ a gbara ndị bụbu ndị a gbaara ụgbọ nwa mkpi. Ụlọ ọrụ telivishọn nke ógbè ahụ nyere akụkọ ndị dị mkpirikpi. Otu akụkọ e gosiri na telivishọn kwuru banyere ihe ngosi ahụ dị ka “akụkọ dị mfe ma dị egwu nke na-eleba anya n’ime obi nke ihe jọgburu onwe ya. ‘Akaebe Onye Hụrụ Ihe Merenụ’ nke na-akwanye ùgwù a na-apụghị ịnapụ anapụ.”
Nye ndị lanarịrịnụ, ememe mgbaafọ nke 50 maka ntọhapụ ahụ ga-adịgide n’obi ha ruo ogologo oge. Ọ bụ ezie na ịkpaliteghachi ihe ncheta ndị na-egbu mgbu n’obi adịghị adị mfe mgbe nile, site n’isoro ndị ọzọ kerịta ha na site n’iwepụta ihe ncheta ndị ahụ site n’ebe e chezọrọ ha, Ndịàmà ahụ nwere ike iwusiwanye okwukwe ndị ọzọ ike. Ha gụrụ ya n’ihe ùgwù ikere òkè n’ihe ngosipụta a na ịkachapụ ụfọdụ mbunobi na amaghị nke a na-akọ ka dịgidere mgbe 50 afọ gasịrị. Nke kasịnụ, ha nwetara afọ ojuju n’ịmara na akaebe ha na-ewetara Chineke ha, bụ́ Jehova nsọpụrụ, na-emekwa ka e jide n’aka na ndị ọzọ agaghị echefu mgbe ọ bụla ihe ha tachiiri obi dị ka Ndịàmà ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbaara Ruth Danner na ndị mụrụ ya ụgbọ nwa mkpi mgbe ọ dị afọ itoolu, a kpọchikwara ya n’ogige isii dị iche iche. Lee 1980 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 105.
[Foto dị na peeji nke 16]
Isiokwu ndị dị na “The Golden Age” katọrọ mmebiga ihe ókè nke Ọchịchị Ndị Nazi
[Foto dị na peeji nke 16]
Ihe dị ka 70 ìgwè ndị na-eme ihe ngosi kọrọ akụkọ mkpagbu nke Nazi kpagburu ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị ndị jụrụ ịgọnarị okwukwe ha
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova ọchịchị Hitler gbawooro ụgbọ nwa mkpi ma kpọchie kọrọ akụkọ ha