Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/15 p. 3-4
  • Inwe Ọṅụ n’Ime Ụwa nke Ọṅụ Na-adịghị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inwe Ọṅụ n’Ime Ụwa nke Ọṅụ Na-adịghị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nkume Dị n’Ime Apịtị”
  • Ndị Ji Obi Ike Eguzosi Ike n’Ezi Ihe Emerie Mkpagbu Ndị Nazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Akaebe Nye Okwukwe Ha
    Teta!—1996
  • Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Iji Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/15 p. 3-4

Inwe Ọṅụ n’Ime Ụwa nke Ọṅụ Na-adịghị

“N’ỌNỌDỤ ya kasị njọ, nke a abụrụwo narị afọ nke Setan,” ka otu uche akwụkwọ akụkọ dị na The New York Times nke January 26, 1995, ji malite. “Ọ dịbeghị ọgbọ ọ bụla bu ụzọ ebe ndị mmadụ gosiworo nnọọ oké ọchịchọ, na agụụ, maka igbu ọtụtụ nde ndị ọzọ n’ihi agbụrụ, okpukpe ma ọ bụ ọkwá.”

Ememe ịgba afọ 50 nke ntọhapụ ndị aka ha dị ọcha a tụrụ mkpọrọ n’ogige ọnwụ ndị Nazi kpaliri ide uche akwụkwọ akụkọ dị iche iche dị ka nke dị n’elu. Otú ọ dị, ụdị igbu mmadụ jọgburu onwe ya ndị dị otú ahụ ka na-ewere ọnọdụ n’ụfọdụ akụkụ nke Africa na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe.

Mgbukpọ, mkpochapụ agbụrụ, igbu mmadụ n’ihi ebo—ihe ọ bụla a na-akpọ ha—na-eweta oké iru újú. Ma, n’etiti oké ime ihe ike dị otú ahụ a na-enwe oké olu nke ọṅụ. Dị ka ihe atụ, ka anyị lee Germany n’afọ ndị 1930.

Ka ọ na-erule April nke 1935, Hitler na ndị òtù Nazi ya machibidoro Ndịàmà Jehova iwu ịrụ ọrụ gọọmenti ọ bụla. E jidekwara Ndịàmà, tụọ ha mkpọrọ, ma ziga ha n’ogige ịta ahụhụ n’ihi na ha jigidere nnọpụiche ndị Kraịst ha. (Jọn 17:16) Ná ngwụsị August nke 1936, e jidere ọtụtụ ìgwè Ndịàmà Jehova. E zigara ọtụtụ puku n’ime ha ogige ịta ahụhụ, ebe ihe ka ọtụtụ n’ime ha nọgidere ruo 1945 ma ọ bụrụ na ha dị ndụ. Otú ọ dị, olee otú Ndịàmà si meghachi omume ná mmeso obi ịta mmiri nke a e mesoro ha n’ogige ndị ahụ? N’agbanyeghị otú o yiruru ihe ịtụnanya, ha nwere ike ịnọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ọnọdụ enweghị ọṅụ gbara ha gburugburu.

“Nkume Dị n’Ime Apịtị”

Onye Britain na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Christine King gbara otu nwanyị onye Katọlik ajụjụ ọnụ, bụ́ onye nọrọ n’ime ogige ndị ahụ. “O jiri okwu m na-echezọbeghị mgbe ọ bụla mee ihe,” ka Dr. King kwuru. “O kwuru okwu n’ụzọ sara mbara banyere ihe ụjọ nke ndụ, ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha o biri n’ime ya. Ọ sịkwara na ya maara Ndịàmà, Ndịàmà ahụ bụkwa nkume dị n’ime apịtị. Ebe siri ike n’ime apịtị ndị ahụ nile na-achị achị. Ọ sịrị na ọ bụ nanị ha bụ ndị na-agbụpụghị ọnụ mmiri mgbe ndị nche ahụ gafere. Ọ bụ nanị ha bụ ndị na-ejighị ịkpọasị mesoo ihe a nile kama site n’ịhụnanya na olileanya nakwa mmetụta nke na e nwere nzube.”

Gịnị mere ka Ndịàmà Jehova nwee ike ịbụ ‘nkume ndị dị n’ime apịtị’? Okwukwe na-adịghị ada ada n’ebe Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ. Ya mere, mgbalị nile nke Hitler mere abịanyụghị ịhụnanya na ọṅụ ndị Kraịst ha.

Gee ntị ka mmadụ abụọ lanarịrị ogige ndị ahụ cheta iri afọ ise mgbe ha merisịrị ule a nke okwukwe. Otu na-asị: “M na-ejupụta n’ọṅụ n’ịmara na enwere m ihe ùgwù pụrụ iche nke igosi ịhụnanya m na ekele m nye Jehova n’okpuru ọnọdụ ndị kasị njọ. Ọ dịghị onye manyere m ime nke a! N’ụzọ dị iche, ndị nwara ịmanye anyị bụ ndị iro anyị bụ́ ndị ji iyi egwu nwaa ime ka anyị rubere Hitler isi karịa Chineke—ma ha kụrụ afọ n’ala! Ọ bụghị nanị na obi dị m ụtọ ugbu a kama, n’ihi ezi akọ na uche, obi dị m ụtọ ọbụna mgbe m nọ n’ime ụlọ mkpọrọ.”—Maria Hombach, 94 afọ.

Onyeàmà ọzọ na-asị: “Eji m ekele na ọṅụ na-echeta ụbọchị ndị m nọ n’ụlọ mkpọrọ. Afọ ndị ahụ a nọrọ n’okpuru Hitler n’ime ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ tara akpụ ma jupụta n’ule. Ma agaraghị m achọ ka ha kwaa m, n’ihi na ha ziri m ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam.”—Johannes Neubacher, 91 afọ.

“Ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam”—nke ahụ bụ ihe kpatara ọṅụ nke Ndịàmà Jehova nwere. Otú a, ha na-enwe ọṅụ, ọ bụ ezie na ụwa nke ọṅụ na-adịghị gbara ha gburugburu. Ọṅụ ha pụtara ìhè ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” ndị e nwere n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya. Ka anyị tụleghachi mgbakọta ndị a na-enye ọṅụ ná mkpirikpi.

[Foto dị na peeji nke 4]

Maria Hombach

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya