Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 1/1 p. 10-15
  • Iji Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Na-akpata Ọṅụ
  • Ọṅụ n’Ọrụ Jehova
  • Ọṅụ Jupụtara
  • Iji Ọṅụ Na-enwe Ntachi Obi
  • Ọṅụ nke Na-enye Nkwado
  • Ọṅụ Bụ Àgwà Chineke Na-eme Ka Anyị Nwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Bụrụnụ Ndị Jupụtara n’Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 1/1 p. 10-15

Iji Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi

“Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe: werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.”—ABỤ ỌMA 100:2.

1, 2. (a) Olee otú e si mee ka okwu banyere ịkpa ókè agbụrụ pụta ìhè na Berlin, Germany, ma olee otú mgbalị e mere iji guzobe “Ọchịchị Puku Afọ” ahụ si gaa? (b) Ihe dị iche dị aṅaa site n’ihe mere na 1936 ka a hụrụ n’ámá egwuregwu Olympia Stadium na July 1990, ọ̀ bụkwa na gịnị ka ọṅụ nke ìgwè ndị ahụ si mba dị iche iche gbanyere mkpọrọgwụ?

EBE ihe ahụ nọrọ mee bụ n’ámá egwuregwu Olympia Stadium, Berlin. Iri afọ ise na anọ tupu mgbe ahụ, ámá egwuregwu nke a mara mma ghọrọ ihe oké esemokwu mgbe a kọrọ na onye ọchịchị aka ike ndị Nazi, bụ́ Adolf Hitler kparịrị otu onye ojii bụ onye America, onye na-agba ọsọ, bụ́ onye nwetaworo ihe mgbata n’ọsọ medal ọlaedo anọ. Nke a bụ n’ezie oké ihe otiti nye nzọrọ ịkpa ókè agbụrụ ahụ Hitler na-azọrọ nke bụ na “ndị Aryan ka ibe ha mma”!a Ma ugbu a, na July 26, 1990, ndị ojii, ndị ọcha, ndị na-acha edo edo—ndị dị n’otu sitere na 64 ìgwè mba dị iche iche, 44,532 ná ngụkọta—zukọtara n’ebe a maka Mgbakọ Distrikti ‘Asụsụ Dị Ọcha’ nke Ndịàmà Jehova. Lee nnọọ ọṅụ jupụtara ebe nile n’ehihie Thursday ahụ! Mgbe e kwusịrị okwu baptism, 1,018 ndị a gaje ime baptism tiri mkpu, sị, “Ja!” ọzọkwa, “Ja!” n’imesi ike nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke, ime uche ya.

2 O were minit 19 ka Ndịàmà ọhụrụ ndị a kwụọ n’ahịrị wee si n’ámá egwuregwu ahụ wee pụọ, na-eje n’ebe ọdọ mmiri a ga-anọ mee ha baptism. N’ime oge ahụ dum, a nọ na-anụ oké ụda ịkụ aka n’ime ámá egwuregwu ahụ buru ibu. Ndị nwere mmeri n’Egwuregwu Olympic enwetabeghị ụdị ịkụ aka e ji na-anabata ọtụtụ narị mmadụ ndị a, ndị sitere n’ọtụtụ ìgwè mba dị iche iche, ndị na-egosipụta okwukwe nke na-emeri ụwa. (1 Jọn 5:3, 4) Ọṅụ ha gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’obi ike ha nwere na ọchịchị Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst gaje iweta otu puku afọ nke ngọzi dị ebube nye ihe a kpọrọ mmadụ n’isi nso.—Ndị Hibru 6:17, 18; Mkpughe 20:6; 21:4, 5.

3. Eziokwu dị aṅaa ka e mesiri ike site n’obi ike nke ndị bịara mgbakọ ahụ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

3 E nweghị ịkpọasị nke agbụrụ ma ọ bụ nke mba dị iche iche n’ebe a, n’ihi na ha nile na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha nke Okwu Chineke, wee si otú a na-emesi ike ịbụ eziokwu nke okwu Pita: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35; Zefanaịa 3:9.

4. N’okpuru ọnọdụ dịgasị aṅaa ka ihe ka ọtụtụ ná ndị bịara mgbakọ ahụ ghọrọ ndị kwere ekwe, oleekwa ụzọ e siworo zaa ekpere ha?

4 Akụkụ buru ibu nke ndị bịara mgbakọ a na Berlin ghọrọ ndị kwere ekwe n’ime ogologo afọ ndị ahụ nke mkpagbu, bụ oge ndị Nazi (1933-1945) nakwa oge ndị ọchịchị socialist nke sochiri ya na East Germany, bụ́ ebe a ka wepụrụ mmachibido iwu ahụ megidere Ndịàmà Jehova na March 14, 1990. Ya mere, ọtụtụ n’ime ha ‘ji ọṅụ nke mmụọ nsọ nara okwu ahụ nke ọma n’ime ọtụtụ mkpagbu.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6) Ugbu a, ha nweere onwe ha n’ụzọ dị ukwuu karị ijere Jehova ozi, e nweghịkwa ịkpa ókè ọ bụla dịịrị ọṅụ ha.—Tụlee Aịsaịa 51:11.

Ihe Ndị Na-akpata Ọṅụ

5. Olee ụzọ Israel si mee ememe nnapụta Jehova napụtara ha n’Osimiri Uhie ahụ?

5 Ntọhapụ nke ụmụnna anyị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, nakwa n’oge dị ugbu a n’akụkụ dị iche iche nke Africa na Esia, na-echetara anyị nnapụta dị iche iche ndị Jehova mere n’oge ndị gara aga. Anyị na-echeta oké ọrụ Jehova rụrụ n’Osimiri Uhie, na otú abụ ekele ndị Israel bụrụ si ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’okwu ndị ahụ bụ: “Ònye dị ka gị n’etiti chi nile, Jehova? Ònye dị ka gị, dị ebube n’ịdị nsọ? Onye a na-atụ egwu n’otuto nile, na-eme ihe ebube dị iche iche.” (Ọpụpụ 15:11) Taa, ọ̀ bụ na anyị anọgideghị na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ebube dị iche iche Jehova na-emere ndị ya? Anyị na-eme otú ahụ n’ezie!

6. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná mkpu ọṅụ Israel tiri na 537 T.O.A.?

6 Ọṅụ jubigara ókè n’afọ 537 T.O.A. mgbe e weghachiri Israel n’ala nke ya mgbe ọ nọsịrị ná ndọta n’agha na Babilọn. Ugbu a, mba nke Jehova pụrụ ịkpọsa, dị ka Aịsaịa buworo n’amụma, sị: “Lee, Chineke bụ nzọpụta m; m ga-atụkwasị ya obi, ghara ịtụ egwu: n’ihi na ike m na abụ ọma m ka Jaa Jehova bụ; o wee ghọọrọ m nzọpụta.” Lee nnọọ oké ọṅụ ọ bụ! Oleekwa ụzọ mba ahụ ga-esi gosipụta ọṅụ ahụ? Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha ya, meenụ ka a mara omume ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, hotanụ na e mewo ka aha ya dị elu. Bụkuonụ Jehova abụ ọma; n’ihi na ihe ọkaaka ka o meworo.” Ugbu a, ha pụrụ ‘ịkpọ mkpu ọṅụ’ n’ime ka ọrụ ya nile dị ike bụrụ ‘ihe a maara n’ụwa nile,’ dị nnọọ ka ndị ohu Jehova a tọhapụworo na-eme taa.—Aịsaịa 12:1-6.

Ọṅụ n’Ọrụ Jehova

7. Nnapụta dịgasị aṅaa kpatara ọṅụ na 1919?

7 N’oge anyị a, ndị ohu Jehova malitere iti mkpu ọṅụ mgbe ọ napụtara ha nnapụta dị ebube na 1919. Na March 26 nke afọ ahụ, a tọhapụrụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi site n’ụlọ mkpọrọ mba United States, ebe a tụbaworo ha ruo ọnwa itoolu n’ihi ebubo ụgha dị iche iche nke ịkpali ọgba aghara. Lee nnọọ oké ememe e mere n’ịnabataghachi ha na Betel nke dị na Brooklyn! Karịsịa, ndị nile so n’ihe fọdụrụ e tere mmanụ pụrụ ịṅụrị ọṅụ ugbu a n’ịbu ndị a tọhapụworo n’ụzọ ime mmụọ site na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ usoro okpukpe nke Setan mikpuworo ụwa dum n’ime ya.—Mkpughe 17:3-6; 18:2-5.

8. Ihe ịtụnanya dị aṅaa ka a mara ọkwa mwepụta ya ná mgbakọ Cedar Point ahụ na 1919, oleekwa ọkpụkpọ òkù ime ihe a kpọrọ n’ebe ahụ?

8 Oké ihe omume ndị ahụ mere na 1919 ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu ná mgbakọ ahụ ndị Chineke nwere na Cedar Point, Ohio, U.S.A., na September 1-8. N’ụbọchị nke ise nke mgbakọ ahụ, bụ́ “Ụbọchị Ndị Ọrụ Ibe Anyị,” onye isi oche Watch Tower Society, bụ́ J. F. Rutherford, gwara 6,000 mmadụ okwu n’isiokwu ahụ na-akpali akpali nke bụ “Ịkpọsa Alaeze ahụ.” Mgbe ọ tụlesịrị Mkpughe 15:2 na Aịsaịa 52:7, ọ gwara ndị na-ege ya ntị na a gaje ibipụta magazin ọhụrụ, bụ́ The Golden Age (nke a maara ugbu a dị ka Teta!), n’izu abụọ ọ bụla, karịsịa maka ikesa ya n’ubi. Ná mmechi, o kwuru, sị: “Ndị nile raara onwe ha kpam kpam nye Onyenwe anyị; ndị na-adịghị atụ egwu, ndị obi ha dị ọcha, ndị hụrụ Chineke na Onyenwe anyị Jisọs n’anya site n’uche ha dum, ike ha dum, mkpụrụ obi na ndụ ha dum, uche ha dum, ruo ókè ohere ya dapụtaara ha, na-aṅụrị ọṅụ n’ikere òkè n’ọrụ nke a. Rịọ Onyenwe anyị maka nduzi na ntụziaka ya ka o wee mee ka ị bụrụ ezi onye nnọchianya kwesịrị ntụkwasị obi, nke dịkwa irè. Mgbe ahụ, n’inwe abụ nke ọṅụ n’ime obi gị, gaa n’ihu ijere ya ozi.”

9, 10. Olee ụzọ Jehova siworo mee ka mbipụta nke magazin Ụlọ Nche na Teta! gaa n’ihu?

9 A nụwo “abụ nke ọṅụ” ahụ gburugburu ụwa! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ anyị ekerewo òkè n’ime ka ọnụ ọgụgụ magazin Teta! a na-ekesa mụbaa ruo ọnụ ọgụgụ ọ dị na ya ugbu a nke bụ 12,980,000 nke mbipụta ya ọ bụla na 64 asụsụ dị iche iche. Dị ka ngwá ọrụ dị ike n’iduru ndị nwere mmasị bịa n’eziokwu ahụ, Teta! na-eje ozi dị ka ihe enyemaka nye Ụlọ Nche. N’otu mba nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, otu nwanna nwanyị bụ onye ọsụ ụzọ, mgbe ọ na-arụ ọrụ n’ebe ndị ọ na-enyezu magazin nile nọ, o juru ya anya ịhụ na mgbe ọ bụla o wejere mbipụta kasị ọhụrụ nke magazin ndị ahụ, onye ahụ nwe ụlọ na-enye onyinye nke ego ha ka $7 (U.S.) iji kwadoo ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa dum—nke bụ n’ezie igosi ezi mmasị maka ọrụ Alaeze ahụ!

10 Ugbu a, mgbe ọ na-amalite afọ nke 112 nke mbipụta ya, magazin Ụlọ Nche nwere nkesa nke ọnụ ọgụgụ bụ 15,290,000 na 111 asụsụ dị iche iche, 59 n’ime mbipụta ndị a na-apụtakọkwa ọnụ gburugburu ụwa, na-enwe otu ihe ndị dị n’ime ha. Dị ka onye nlekọta ezinụlọ kwesịrị ntụkwasị obi, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nọgidere na-enye ndị na-agụ akwụkwọ nwere obi ekele “òkè nri [ime mmụọ] ha n’oge ya.” (Luk 12:42) N’ime 1990, Ndịàmà Jehova nyere akụkọ ozi nke itinye 2,968,309 ụtụ ndị ọhụrụ maka magazin abụọ ndị ahụ, bụ́ ịrị elu nke 22.7 pasenti karịa nke 1989.

Ọṅụ Jupụtara

11. (a) Ọkpụkpọ òkù dị aṅaa ka a kpọrọ ndị Chineke na Cedar Point na 1922? (b) Olee ụzọ e siworo gbasapụ iti mkpu ọṅụ ahụ?

11 Ọṅụ jupụtakwara ka ndị Chineke, ndị ruworo 10,000 n’ọnụ ọgụgụ ugbu a, zukọtara maka mgbakọ nke abụọ na Cedar Point, na September 1922, bụ́ mgbe e mere 361 mmadụ baptism. N’okwu ya nke isiokwu ya bụ “Alaeze Eluigwe Dị Nso,” bụ́ nke dabeere na Matiu 4:17, Nwanna Rutherford wulitere okwu ahụ ruo nkwubi okwu nke na-akpali akpali: “Ụwa aghaghị ịmata na Jehova bụ Chineke, na Jisọs Kraịst bụkwa Eze nke ndị eze nile na Onyenwenụ nke ndị nwenụ nile. Nke a bụ ụbọchị kachasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mgbasa ozi ya. Ya mere, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” Ndị tiwapụrụ mkpu ọṅụ nke a nụrụ ná mgbakọ ahụ agbasawo n’ọnụ ọgụgụ ruo na 1989 mgbe ihe karịrị 6,600,000 mmadụ zukọtara na 1,210 mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, ebe e mere 123,688 mmadụ baptism.

12. (a) N’ọṅụ dị aṅaa nke na-enweghị atụ ka ndị Chineke na-ekere òkè taa? (b) Olee ụzọ anyị si ele ozi anyị na-ejere Jehova anya n’iji ya tụnyere nrubeisi nye “ndị na-achị isi”?

12 Ndịàmà Jehova ji nnwere onwe ha kpọrọ ihe. Karịsịa ihe nile, ha na-aṅụrị ọṅụ ná mmezu nke oge a nke okwu Jisọs, bụ́: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịbụ ndị a tọhapụrụ pụọ n’ihe omimi na nkwenkwe nile na-enweghị isi nke okpukpe ụgha! Lee ọṅụ na-enweghị atụ ọ bụ ịmara Jehova na Ọkpara ya nakwa ịghọ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, na-enwe olileanya nke ndụ ebighị ebi! (Jọn 8:32; 17:3; 1 Ndị Kọrint 3:9-11) Ndị ohu Chineke na-enwekwa ekele mgbe “ndị na-achị isi” nke ụwa, bụ́ ndị ha na-ebi n’okpuru ha, sọpụụrụ nnwere onwe ha ịkpọsa olileanya dị ebube nke Alaeze Jehova n’okpuru Kraịst. Ha na-eji afọ ofufo ‘na-akwụghachi Siza ihe nke Siza,’ ebe ha nọkwa n’otu mgbe ahụ ‘na-akwụghachi Chineke ihe nke Chineke.’—Ndị Rom 13:1-7; Luk 20:25.

13. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova siworo gosipụta ọṅụ ha n’ịbụ ndị a tọhapụrụ site ná mkpagbu?

13 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị ọchịchị bụ mmadụ anwaa igbochi ha imezu ụgwọ nke a ha ji Chineke, Ndịàmà Jehova na-azaghachi dị ka ndị ozi ahụ zaghachiri: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karị mmadụ.” N’oge ahụ, mgbe ndị ọchịchị tọhapụsịrị ndị ozi ahụ, ha wee ‘laa, na-aṅụrị ọṅụ.’ Olee ụzọ ha si gosipụta ọṅụ ahụ? “Kwa ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha [“site n’ụlọ ruo n’ụlọ,” NW], ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:27-32, 41, 42) N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova nke oge a na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha nwetakwuru nnwere onwe iji gaa n’ihu n’ije ozi ha. N’ọtụtụ mba ebe Jehova meghewooro ha ụzọ, ha na-egosipụta ọṅụ dị omimi site n’ịgbara aha Jehova na Alaeze ya nke na-abịanụ nke dị n’aka Kraịst Jisọs àmà zuru ezu.—Tụlee Ọrụ 20:20, 21, 24; 23:11; 28:16, 23.

Iji Ọṅụ Na-enwe Ntachi Obi

14. Olee ụzọ ọṅụ nke a nke bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ si dị elu karịa nke ahụ akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara?

14 Gịnị bụ ọṅụ nke a dị omimi nke ezi ndị Kraịst na-enwe? Ọ dị omimi nke ukwuu, na-adịgidekwa adịgide karịa ọṅụ na-agabiga agabiga nke onye nwere mmeri n’Egwuregwu Olympic. Ọ bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, nke Chineke na-enye ndị ahụ “na-ekwenyere ya.” (Ọrụ 5:32) Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ Webster’s kọwara ọṅụ dị ka nke ‘gbanyere mkpọrọgwụ dị omimi karịa inwe ihe ụtọ, na-egbukepụ egbukepụ ma ọ bụ na-apụta ìhè karịa inwe obi ụtọ.’ Nye onye Kraịst, ọṅụ pụtara ihe dị omimi ọbụna karị. N’ịbụ nke gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’okwukwe anyị, ọ bụ àgwà siri ike, nke na-ewusi anyị ike. “Ọṅụ Jehova bụ ike unu.” (Nehemaịa 8:10) Ọṅụ nke Jehova, nke ndị Chineke na-ewulite, dị elu karịa mkpali ahụ na-adịghị omimi nke ndị mmadụ na-enweta site n’ihe ụtọ anụ ahụ nke ụwa.—Ndị Galetia 5:19-23.

15. (a) N’ahụmahụ nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, olee ụzọ e siworo jikọta inwe ntachi obi na ọṅụ? (b) Kpọtụ uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche ndị na-ekwe nkwa ndị na-emesi obi ike n’ihe banyere ịnọgide na-enwe ọṅụ.

15 Tụlee ihe banyere ụmụnna anyị ndị nọ na Ukraine. Mgbe ‘ndị na-achị isi’ nke ebe ahụ chụlara ọtụtụ puku n’ime ndị a na Siberia ná mmalite afọ ndị 1950, ha tara ahụhụ oké ihe isi ike dị iche iche. Mgbe e mesịrị, mgbe ọchịchị ahụ mere ka ha nwere onwe ha, ha nwere ekele, ma ọ bụghị ha nile lọghachiri n’ala nke aka ha. N’ihi gịnị? Ọrụ ndị ha rụrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ echetaworo ha ihe e dere na Jemes 1:2-4: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.” A chọrọ ịnọgide na-atachi obi n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ na-enye ọṅụ, leekwa nnọọ ihe ọṅụ ọ bụworo ná mgbakọ Ndịàmà Jehova nweworo n’oge na-adịghị anya gara aga na Poland ịnabata Ndịàmà ndị si n’ebe dị anya n’ọwụwa anyanwụ dị ka obodo nta ndị dị n’ụsọ oké osimiri Pacific. Inwe ntachi obi na ọṅụ arụkọwo ọrụ n’ịmịpụta mkpụrụ nke a. N’eziokwu, anyị nile ndị ji ọṅụ na-atachi obi n’ijere Jehova ozi pụrụ ikwu, sị: “Ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, m ga-etegharị egwu ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta m. Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, bụ ike m.”—Habakuk 3:18, 19; Matiu 5:11, 12.

16. Olee ụzọ ezi ihe nlereanya nke Jeremaịa na Job kwesịrị isi gbaa anyị ume n’ozi ubi anyị?

16 Ma, olee ụzọ anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ mgbe anyị na-agba àmà n’etiti ndị mmegide isi kpọrọ nkụ? Cheta na ndị amụma Chineke nọgidere na-enwe ọṅụ n’ọnọdụ ndị yiri nke ahụ. Jeremaịa kwuru n’oge ọ nọ n’okpuru ọnwụnwa, sị: “A chọpụtawo okwu gị, m wee rie ha, okwu gị wee ghọọrọ m ihe obi ụtọ na ọṅụ obi m: n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova, Chineke nke usuu nile nke ndị agha.” (Jeremaịa 15:16) Lee ihe ùgwù ọ bụ ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha Jehova na ịgba àmà nye aha ahụ! Anyị itinye uchu n’ọmụmụ ihe onwe onye na ikere òkè zuru ezu ná nzukọ ndị Kraịst na-ewulite anyị elu iji nọgide na-enwe ọṅụ n’eziokwu ahụ. Ọṅụ anyị ga-apụta ìhè n’otú anyị si eduzi onwe anyị n’ubi nakwa n’ihu ọchị nke Alaeze anyị. Ọbụna mgbe ọ nọ n’okpuru ọnwụnwa dị ilu, Job pụrụ ikwu banyere ndị iro ya, sị: “M chịa ha ọchị, ha adịghị ekwere; ha adịghị emekwa ka ìhè ihu m daa.” (Job 29:24) Dị ka Job onye kwesịrị ntụkwasị obi, ọ dịghị mkpa ka anyị malite inwe mwute mgbe ndị mmegide na-akwa anyị emo. Nọgide na-enwe ihu ọchị! Ọdịdị ihu anyị pụrụ igosipụta ọṅụ anyị, wee si otú a mee ka ndị mmadụ gee anyị ntị.

17. Olee ụzọ iji ọṅụ na-enwe ntachi obi pụrụ isi mịpụta mkpụrụ?

17 Ka anyị na-ejezu ozi n’ókèala anyị ugboro ugboro, ntachi obi na ọṅụ anyị pụrụ imetụ ndị nwere obi ezi omume n’ahụ wee gbaa ha ume ịtụle olileanya ahụ dị ebube nke anyị nwere. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ iduziri ha ọmụmụ Bible mgbe nile! Ka ha na-etinyekwa eziokwu ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa nke Okwu Chineke n’ime obi ha, lee nnọọ ụdị ọṅụ anyị na-enwe mgbe ha na-emesịa ghọọ ndị anyị na ha so na-ejere Jehova ozi! Mgbe ahụ, anyị na-enwe ike ikwu, dị ka Pọl onyeozi gwara ndị ọhụrụ kwere ekwe n’oge ya, sị: “N’ihi na gịnị bụ olileanya anyị, ma ọ bụ ọṅụ anyị, ma ọ bụ okpueze nke ịnya isi anyị? Ọ́ bụghịkwa unu onwe unu, n’ihu Onyenwe anyị Jisọs n’ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] ya? N’ihi na unu onwe unu bụ otuto anyị na ọṅụ anyị.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, 20) N’ezie, a na-enweta ọṅụ nke na-eju afọ n’iduru ndị ọhụrụ bịa n’eziokwu nke Okwu Chineke na inyere ha aka ịghọ Ndịàmà raara onwe ha nye, e mere baptism.

Ọṅụ nke Na-enye Nkwado

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa dị iche iche ndị a na-enweta n’oge a?

18 Ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, a na-enwe ọtụtụ ọnọdụ ndị pụrụ ịchọ inwe ntachi obi. Ahụ esighị ike, obi ịda mbà, na ihe isi ike akụ na ụba bụ nanị ole na ole. Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi jigide ọṅụ ya ka o wee nagide ọnwụnwa ndị dị otú ahụ? A pụrụ ime nke a site n’ịga n’Okwu Chineke iji nweta nkasi obi na nduzi. Ịgụ ma ọ bụ ige ntị n’ọgụgụ nke abụ ọma ndị ahụ pụrụ inye ume ọhụrụ dị ukwuu n’oge ọnwụnwa. Rịbakwa ama ndụmọdụ amamihe ahụ Devid nyere: ‘Tụkwasị Jehova ibu gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 55:22) Jehova bụ n’ezie “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.

19. Dị ka Devid na Pọl, obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe?

19 Nzukọ Jehova, site n’akwụkwọ dị iche iche ọ na-ebipụta nakwa ná ndị okenye ọgbakọ, dị njikere mgbe nile inyere anyị aka ịnagide ihe isi ike anyị nile, ebe anyị bụ ụmụ mmadụ ndị na-esighị ike. Devid nyesiri ndụmọdụ ike, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa ya obi, ya onwe ya ga-emekwa ya.” Ọ pụkwara ikwu, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” N’isonyere ọgbakọ ndị Kraịst, anyị ga-aghọta na “nzọpụta ndị ezi omume na-esi n’aka Jehova bịa: ọ bụ ebe ha siri ike na mgbe mkpa.” (Abụ Ọma 37:5, 25, 39) Ka anyị na-agbaso ndụmọdụ Pọl mgbe nile, bụ́: “N’ihi nke a ike agwụghị anyị n’obi; . . . ebe anyị na-adịghị ele ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya, n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.”—2 Ndị Kọrint 4:16-18.

20. Gịnị ka anyị ji anya nke okwukwe anyị na-ahụ, oleekwa ụzọ nke a si akpali anyị?

20 Anyị pụrụ iji anya nke okwukwe anyị hụ usoro ihe ọhụrụ nke Jehova nke dị nnọọ nso. Lee nnọọ ọṅụ na ngọzi ndị na-enweghị atụ ndị gaje ịdị n’ebe ahụ! (Abụ Ọma 37:34; 72:1, 7; 145:16) N’ịkwadebe maka oge ahụ dị ebube, ka anyị gbasoo okwu ahụ dị n’Abụ Ọma 100:2: “Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe: werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ihe banyere okwu ahụ bụ na “ndị Aryan ka ibe ha mma,” akwụkwọ akụkọ The New York Times nke February 17, 1940, hotara okwu otu onye isi okpukpe Katọlik nke Georgetown University kwuru, sị na “ya nụrụ ka Adolf Hitler kwuru na a ghaghị iguzobeghachi Alaeze Ukwu Rom ahụ Dị Nsọ, nke bụ alaeze ukwu ndị Germany.” Ma ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ William L. Shirer kọwara ihe si na nke ahụ pụta, sị: “Hitler turu ọnụ na Ọchịchị nke Atọ ahụ nke e guzobere na January 30, 1933, ga-anọru otu puku afọ, n’okwu ndị Nazi, a na-ezokarịkwa aka na ya dị ka ‘Ọchịchị Puku Afọ’ ahụ. Ọ nọruru afọ iri na abụọ na ọnwa anọ.”

Ná Ntụleghachi:

◻ Mmeri dị aṅaa nke e ji ọṅụ merie ịkpa ókè agbụrụ ka a na-ahụ taa?

◻ Gịnị kpaliri ndị Chineke nke oge ochie ịbụ abụ na iti mkpu ọṅụ?

◻ Olee ụzọ ezi ọṅụ siworo mụbaa n’oge a?

◻ Olee ụzọ inwe ntachi obi na ọṅụ si agakọ ọnụ?

◻ Gịnị ka anyị pụrụ iji kwadoo ọṅụ anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya