Bụrụnụ Ndị Jupụtara n’Ọṅụ
“Ndị na-eso ụzọ Jisọs wee jupụta n’ọṅụ na mmụọ nsọ.”—ỌRỤ 13:52.
1. (a) Ụdị mkpụrụ dị aṅaa ka ọṅụ bụ? (b) N’ihi ndokwa dị aṅaa nke na-enye ọṅụ ka a ga-enye Chineke otuto?
ỌṄỤ! E depụtara àgwà ndị Kraịst nke a dị ka nke abụọ, nke sochiri nanị ịhụnanya ná nkọwa Pọl nyere maka mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22-25) Ọ̀ bụkwa gịnị na-akpọlite ọṅụ ahụ? Ọ bụ ozi ọma ahụ nke mmụọ ozi Chineke kpọsaara ndị ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi ihe karịrị 1,900 afọ gara aga, sị: “Lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị . . . nile: n’ihi na taa n’obodo Devid ka a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.” Ìgwè usuu ndị mmụọ ozi wee pụta ma sonyere mmụọ ozi ahụ n’iji ọṅụ na-eto Chineke, na-asị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.”—Luk 2:10-14.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka Chineke zite Ọkpara o buru ụzọ mụọ ka ọ bụrụ Onye Mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) N’ụzọ ndị ọzọ dị aṅaa ka Jisọs si mezuo nzube Chineke mgbe ọ nọ n’elu ala?
2 E gosipụtara mmasị Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ ná ndokwa o mere maka nzọpụta site n’aka Kraịst bụ Onyenwe anyị. Ọkpara nke a Chineke buru ụzọ mụọ bụ ngosipụta zuru okè nke ezi ihe ọmụma, a kọwakwara na o kwuru banyere Nna ya n’oge okike ihe, sị: “M wee ghọọ n’akụkụ ya onye na-arụsi ọrụ ike nke e jikwa n’aka, m wee na-ejupụta n’ihe ụtọ kwa ụbọchị, na-enwe ọṅụ n’ihu ya mgbe nile; na-enwe ọṅụ n’ala nke na-amịpụta ihe nke elu ụwa ya, ee, njupụta nke ihe ụtọ m dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.”—Ilu 8:30, 31, Rotherham.
3 Ya mere, o kwesịrị ekwesị ka Jehova zije Ọkpara ya nke a, onye nwetara ihe ụtọ dị ukwuu n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ịbụ Onye Mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. Oleekwa ụzọ nke a ga-esi wetara Chineke otuto? Ọ ga-emeghere ya ụzọ imezu nzube ya dị ebube nke iji ụmụ mmadụ ndị ezi omume, ndị na-ahụkwa udo n’anya, wee mejupụta ụwa. (Jenesis 1:28) Ọzọkwa, mgbe ọ nọ n’elu ala, Ọkpara nke a, bụ́ Jisọs, ga-egosi na mmadụ nke zuru okè pụrụ iguzosi ike n’irubere Jehova isi dị ka Eze Onyenwe ya n’okpuru ule ndị kasị sie ike, wee si otú a nye nkwado zuru ezu maka izi ezi nke Nna ya dị ka onye na-achị ihe ndị O kere eke. (Ndị Hibru 4:15; 5:8, 9) Ụzọ iguzosi ike n’ezi ihe nke Jisọs hapụkwara ihe nlereanya nye ezi ndị Kraịst nile ịgbasochi nzọụkwụ ya nile anya.—1 Pita 2:21.
4. Ntachi obi Jisọs rụpụtara oké ọṅụ dị aṅaa, oleekwa ụzọ nke a kwesịrị isi gbaa anyị ume?
4 Jisọs nwere ọṅụ na-enweghị atụ n’isi otú a mee uche Nna ya, nke ahụ bụkwa n’inwe olileanya nke ọṅụ dị ukwuu ọbụna karị, dị ka Pọl onyeozi gosiri ná Ndị Hibru 12:1, 2, sị: ‘Ka anyị jiri ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, ka anyị na-elekwasị Onye ndu na Onye mmezu nke okwukwe anyị, bụ́ Jisọs anya. N’ihi ọṅụ e debere ya n’ihu ọ nagidere osisi ịta ahụhụ, na-elelị ihere anya, ọ nọdụwokwa n’aka nri nke ocheeze nke Chineke.’ Olee ọṅụ dị nke a? Ọ bụ ọṅụ ahụ Jisọs nwere, ọ bụghị nanị n’ido aha Nna ya nsọ na ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’ọnwụ, kamakwa n’ịchị achị dị ka Eze na Onye isi nchụaja ka ọ nọ na-eweghachi ụmụ mmadụ na-erube isi bịa ná ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs.—Matiu 6:9; 20:28; Ndị Hibru 7:23-26.
5. Olee ndị bụ “ụmụnna” Jisọs, oleekwa ọṅụ pụrụ iche nke ha na-ekere òkè na ya?
5 Ee, Ọkpara Chineke anọwo mgbe nile na-enweta ọṅụ site n’ijere ihe a kpọrọ mmadụ ozi. Ọ bụwokwara ya ihe ọṅụ iso Nna ya jee ozi n’ịhọpụta òtù ụmụ mmadụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, bụ́ ndị ọ kpọrọ “ụmụnna” ya, ndị na-ebilite gaa n’eluigwe mgbe ha nwụsịrị. Ndị a na-abanye n’ọṅụ pụrụ iche nke ha na Jisọs. A na-ekwupụta na ha bụ ‘ndị nwere obi ụtọ na ndị dị nsọ,’ ha ‘ga-abụkwa ndị nchụaja nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya bụrụ eze [otu puku afọ].’—Ndị Hibru 2:11; Mkpughe 14:1, 4; 20:6.
6. (a) Ọkpụkpọ òkù dị aṅaa ka Eze ahụ ji ọṅụ na-akpọ “atụrụ ọzọ” ya? (b) Ihe ùgwù dịgasị aṅaa ka ọtụtụ n’ime atụrụ ndị a na-enweta taa?
6 N’ịga n’ihu, oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ” ndị Eze ahụ na-achị achị na-ekewa gaa n’aka nri ya nke nkwado, na-anata ọkpụkpọ òkù ya, bụ́: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” (Jọn 10:16; Matiu 25:34) Lee nnọọ aha ihe ùgwù na-enye ọṅụ ọ bụ! Ọbụna ugbu a, ọtụtụ n’ime ndị a ndị ga-eketa ókèala dị n’elu ala nke Alaeze ahụ, na ndị ahụ e tere mmanụ na-anarakọ ọrụ ndị dị mkpa, dị nnọọ ka Jehova buru amụma, sị: “Ndị ala ọzọ ga-eguzo n’azụ ìgwè ewu na atụrụ unu, ụmụ ala ọzọ ga-abụkwa ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vine unu. Ma a ga-akpọ unu onwe unu ndị nchụaja nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi ka a ga-asị na unu bụ.” Ndị a nile na-esonyere onye amụma Chineke n’ikwu, sị: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwu ọṅụ n’ime Chineke m; n’ihi na ọ chịrịwo uwe nzọpụta yikwasị m.”—Aịsaịa 61:5, 6, 10.
7. N’ihi gịnị ka “ụbọchị” nke a nke dị kemgbe 1914 ji bụrụ nke pụrụ iche nke ukwuu?
7 Anyị na-ebi ugbu a n’ime ụbọchị pụrụ iche. Kemgbe 1914, ọ bụwo ụbọchị nke ọchịchị Kraịst dị ka Eze n’eluigwe, nke a kọwara n’Abụ Ọma 118:24, 25, sị: “Nke a bụ ụbọchị Jehova meworo; anyị ga-etegharị egwu ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ n’ime ya. Biko, Jehova, zọpụta, biko: Biko, Jehova, mee ka ihe na-agara anyị nke ọma, biko.” Ọ bụ ụbọchị nke ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe megide okpukpe Babilọn nile, wee jikọta nwanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ nke 144,000 ụmụnna ya na Eze eluigwe ha. Ndị Chineke nile ‘ga-aṅụrị ọṅụ, obi ga-atọkwa ha ụtọ nke ukwuu’ mgbe nke a mere. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ ka Eze Mesaịa ha na-alụ agha n’Amagedọn iji zọpụta mba ya nke na-eguzosi ike n’ihe banye n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya. (Mkpughe 19:1-7, 11-16) Jehova ọ̀ na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma ka ndị ya nọ na-akpọsa olileanya ọṅụ nke a? Akụkọ ozi na-esonụ ga-akọwa.
Mgbasa Zuru Ụwa Ọnụ
8. (a) Olee ụzọ ọṅụ nke mmụọ nsọ si pụta ìhè n’akụkọ ozi ahụ dị na peji 18 ruo 21 nke magazin nke a? (b) Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ dị n’akụkọ ozi ahụ?
8 Ndịàmà Jehova nke oge a ‘na-enwebiga olileanya ókè n’ike mmụọ nsọ.’ (Ndị Rom 15:13) A na-egosipụta nke a na chaatị ahụ dị na peji 18 ruo 21 nke magazin nke a, bụ́ ebe e depụtasịrị akụkọ ije ozi Alaeze zuru ụwa ọnụ maka 1990. Lee ka anyị si enwe ọṅụ ịhụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 4,017,213 ndị ozi na-arụsi ọrụ ike n’ubi! Nke a bụ ịba ụba nke 77 pasenti n’ime afọ iri gara aga, ka nchịkọta nke atụrụ ahụ na-aga n’ihu ngwa ngwa na 212 ala dị iche iche gburugburu ụwa. Mgbe afọ 15 gasịrị, ndị e mere baptism ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu a na-enwetụbeghị mbụ—301,518! E nwere ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptism ndị dị nnọọ elu n’ụzọ pụtara ìhè n’ọtụtụ mgbakọ, karịsịa ná ndị ahụ Ndịàmà si Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe bịara. E nwere ọtụtụ ndị na-eto eto n’etiti ndị a, na-egosipụta na ọ bụ okwu ụgha, bụ́ nzọrọ ahụ ndị ọchịchị socialist mere nke bụ na okpukpe ga-eso ndị agadi nwụchapụ.
9. (a) Ihe dị aṅaa nke na-enye ọṅụ ka ndị mụrụ ụmụ ịmalite inye ọzụzụ n’oge na-eweta? (b) Ahụmahụ dị aṅaa e nwere n’ógbè unu ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ na-akwado nke a?
9 Ọtụtụ ìgwè ndị na-eto eto na-aza òkù ahụ a kpọrọ n’Abụ Ọma 32:11: “Ṅụrịanụ ọṅụ na Jehova, tegharịakwanụ egwu ọṅụ, unu ndị ezi omume: tiekwanụ mkpu ọṅụ, unu nile ndị ziri ezi n’obi.” O yiri ka à ga-asị na ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-etinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ nke bụ ịzụ ụmụ ha ‘site na nwa ọhụrụ.’ (2 Timoti 3:15) A na-eji akwụkwọ na kaseti ndị e mepụtara maka ndị ahụ ka dị n’afọ ndụ dị nta na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi. Ka ụmụntakịrị ndị a na-abanye ụlọ akwụkwọ, n’oge na-adịghị anya ha na-agba ezi àmà, dị ka ihe atụ nke nwa agbọghọ onye Japan dị afọ asatọ, onye kọrọ, sị: “Mgbe anyị nọsịrị ezumike nke oge ọkọchị, ejekwuuru m onye nkụzi m ma jụọ ya, sị: ‘Ì jere leta ebe e liri nna gị n’oge ezumike ahụ?’ Ọ zaghachiri, sị: ‘Ee, nna m bụ nnọọ onye dị nwayọọ, ana m ejekwa eleta ili ya kwa afọ.’ Asịrị m ya: ‘Ọ bụrụ na ị mụọ Bible ma gbasoo nkụzi nile nke Chineke, ị ga-enwe ike ịhụ nna gị nke na-ahụ n’anya n’ime paradaịs elu ala.’ Mgbe ahụ m wee nye ya Akwukwọm nke Akukọ Bible. Ugbu a, onye nkụzi anyị na-agụrụ klasị ahụ dum otu akụkọ sitere n’akwụkwọ a n’oge a na-enye ohere maka nri ehihie kwa izu.”
10. Ezi nzube dị aṅaa ka akwụkwọ ahụ bụ Young People Ask mezuworo, gịnị bụkwa ihe atụ ụfọdụ?
10 Ndị na-eto eto ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu ejiriwo akwụkwọ ahụ bụ Questions Young People Ask—Answers That Work mee ihe n’ụzọ dị mma ma iji nwee ọmụmụ ihe onwe onye ma iji gbaara ndị na-eto eto ndị ọzọ àmà. Ndị nne na nna egosiwokwa ekele maka akwụkwọ nke a. Otu nwanna nwanyị na Switzerland, denyere aha ya dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, wee kpebie ije leta ndị nne na nna nke ndị ha na ụmụ ya na-ejekọ ụlọ akwụkwọ. Nke a meghere ohere maka ezi mkparịta ụka dị iche iche nke ya na ọtụtụ n’ime ndị ahụ mụrụ ụmụ, ọ hapụkwaara ha 20 akwụkwọ ukwu (nke ọtụtụ n’ime ha bụ akwụkwọ Young People Ask) na 27 magazin. Mgbe otu nwa agbọghọ na-eje akwụkwọ na Trinidad nyefere akwụkwọ nke a n’aka onye nkụzi ya n’ụlọ akwụkwọ, nne ya sochiri nke ahụ, na-ekesa 25 akwụkwọ ahụ n’etiti 36 mmadụ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Ọ gara n’ihu n’ọnwa na-esonụ ma na-elebakarị anya n’ebe ndị mụrụ ụmụ nọ, bụ́ ndị ọ maara n’onwe ya, wee tinye 92 akwụkwọ ndị ọzọ, malitekwa ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ọhụrụ. Na Korea, otu onye nkụzi nke na-ezi ihe na kọleji jiri akwụkwọ Young People Ask mee ihe n’ikwu okwu ndị dị mkpirikpi n’isiokwu ndị dị ka “M̀ Ga-esi Aṅaa Meziwanye Akara M Na-enweta n’Ule?” na “Olee Ụzọ Mụ na Onye Nkụzi M Ga-esi Na-adị ná Mma?” wee chee akwụkwọ ahụ n’ihu ha. Mgbe ụmụ akwụkwọ narasịworo 39 akwụkwọ, ụfọdụ n’ime ndị nne na nna malitere ime mkpesa. Ma onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ nyochara otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ, wee kwuo na ọ dị “ebube,” kwuokwa ka e wetara nwa ya nwanyị otu.
Mmụta Akwụkwọ nke Kasị Mma
11, 12. Olee ihe nkwado ụfọdụ e nwere maka eziokwu ahụ nke bụ na akwụkwọ ndị Watch Tower Society na-ebipụta na-enye ezi ọzụzụ mmụta akwụkwọ?
11 Ọtụtụ ndị na-enwekwa mmasị n’abamuru magazin anyị dị iche iche na-enwe n’ihe banyere mmụta akwụkwọ, dị ka ihe atụ, otu ụlọ akwụkwọ dị ná mba U.S. kwuru ka e weta 1,200 mkpụrụ nke mbipụta July 22, 1990, nke Teta! [Bekee] (nke kpughere ihe banyere ọgwụ ọjọọ bụ crack iri mmadụ ahụ) ka e jiri ya mee ihe na klasị ya dị iche iche. Karịsịa, ezi ihe nlereanya nke àgwà ụmụ Ndịàmà Jehova na-akpa n’ụlọ akwụkwọ nọgidere na-enwe ezi mmetụta n’ahụ ndị mmadụ. N’otu ime klasị a nọ na-eme oké mkpọtụ na Thailand, onye nkụzi kpọpụtara Racha onye gbara afọ 11 n’ihu klasị ahụ wee jaa ya mma n’ihi àgwà ya, na-asị: “Gịnị mere unu nile agaghị agbaso ihe nlereanya ya? O ji ihe ọmụmụ ya kpọrọ ihe, na-akpakwa ezi àgwà.” Mgbe ahụ onye nkụzi ahụ kwukwara, sị: “Ma eleghị anya unu aghaghị ibu ụzọ ghọgodi Ndịàmà Jehova dị ka Racha ka unu wee meziwanye akparamagwa unu.”—Tụlee Ilu 1:8; 23:22, 23.
12 Otu nwanna bụ nwa agbọghọ ná mba Dominican Republic dere, sị: “Mgbe m dị nanị afọ anọ, ana m akwado ịgụcha akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ ọta akara ndị okpukpe na-eduzi, bụ́ ebe m nọworo mụta otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. Dị ka onyinye, enyere m onye nọn, bụ́ onye nkụzi m akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala nke e dere ozi n’ime ya, sị: ‘Enwere m ekele nke ukwuu na ị kụziiri m otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. Ọ ga-amasịkwa m ma a sị na ị ga-aghọta okwukwe m, nweekwa otu olileanya ahụ m nwere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala nke a mgbe e mere ka ọ ghọọ paradaịs.’ N’ihi nke a, a chụpụrụ m n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe afọ itoolu gasịrị, mụ na onye nkụzi nke a zuteghachiri ọzọ. Ọ kọwara otú o si bụrụ na n’agbanyeghị mmegide dị ukwuu site n’aka onye ụkọchukwu ahụ, ọ gbalịrị gụọ akwụkwọ ahụ. Ọ kwapụrụ jee biri n’isi obodo ahụ, bụ́ ebe ọ nọ nwee ike iso otu Onyeàmà mụọ Bible. Mụ na ya na-aga imekọ baptism ná Mgbakọ Distrikti ‘Asụsụ Dị Ọcha’ ahụ.” Dị ka e buru n’amụma, a pụrụ inweta amamihe ọbụna site “n’ọnụ ụmụ ọhụrụ”!—Matiu 21:16; Abụ Ọma 8:1, 2.
13. Olee ụzọ ọtụtụ ndị na-eto eto si na-azaghachi na ndụmọdụ nke Solomọn, oleekwa ụzọ nke a si pụta ìhè n’akụkọ ozi ụwa dum ahụ?
13 Solomọn nyere ndụmọdụ ahụ na-agba ume, sị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ, jeekwa ije n’ụzọ nile nke obi gị.” (Eklisiastis 11:9) Ọ bụ ihe ọṅụ taa ịhụ ọtụtụ ụmụ Ndịàmà Jehova ka ha na-etinye okwu ndị a n’ọrụ, na-eji afọ ndụ mgbe ha dị n’agbata afọ iri na otu na iri na itoolu na-eme ihe ịkwadebe maka ndụ nke ijere Jehova ozi oge nile nakwa ịbanye n’ọrụ nke a kasị dị ebube mgbe ha gụchara akwụkwọ. Ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ anọgidewo na-amụbawanye n’ike n’ike, na-enwe 821,108 ndị nyere akụkọ ozi n’ime afọ ahụ. Tinyere 11,092 ụmụnna nwoke na ndị nwanyị ndị na-eje ozi na Betel, nke ahụ nọchiri anya 21 pasenti nke ngụkọta ndị nkwusa nile.
14. Òkè dị aṅaa ka ụmụnna anyị ndị nwanyị na-ekere, ịja mma dị aṅaa ka ha kwesịkwara inweta?
14 Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na n’ọtụtụ mba, dị ka na United States, ihe dị ka 75 pasenti nke ndị ọsụ ụzọ nile bụ ụmụnna nwanyị, bụ́ nke na-akwado okwu ahụ dị n’Abụ Ọma 68:11: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na-enye okwu: ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ bụ usuu bara ụba.” E kwesịrị ịja ụmụnna anyị ndị nwanyị mma n’ihi na ha na-arụ akụkụ ka ukwuu nke ọrụ a na-arụ n’ubi. Nkà izi ihe ha na ọmụmụ Bible ebe obibi dị iche iche na-edute ọtụtụ ndị n’ebe eziokwu ahụ dị, e kwesịkwara ịja ụmụnna anyị nwanyị ndị lụworo di mma, bụ́ ndị ji nguzosi ike n’ihe na-enye di ha nkwado, bụ́ ndị nwere ọtụtụ ibu ọrụ n’ọgbakọ.—Ilu 31:10-12; Ndị Efesọs 5:21-25, 33.
Nkụzi Bible Na-aga nke Ọma
15. (a) Olee ụzọ mba ụfọdụ ndị e depụtara n’akụkọ ozi ụwa dum ahụ siworo mee nnọọ nke ọma n’ọrụ iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? (b) Ahụmahụ dịgasị aṅaa ka ị pụrụ ịkọ, na-egosi otú ọmụmụ Bible pụrụ isi bụrụ ihe na-amịpụta mkpụrụ?
15 Ọrụ nkụzi Bible na-aga nnọọ nke ọma, ebe a na-eduzi ọmụmụ Bible gburugburu ụwa ná nkezi nke 3,624,091 ebe dị iche iche kwa ọnwa. Eziokwu Bible pụrụ ịgbanwe ọdịdị mmadụ dị iche iche, dị ka otu akụkọ nke si n’ala ahụ dị n’okpuru, bụ́ Australia, na-egosi. Ná mmalite January 1987, e si Australia chụlaa otu nwoke na New Zealand mgbe ọ nọsịrị 25 ọnwa n’ụlọ mkpọrọ maka izu ohi na ide akwụkwọ adịgboroja. Ọ bụwo onye mikpuru onwe ya n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, o rewokwa ya ere ruo ihe karịrị afọ 17. N’afọ na-eso ya, nwunye ya malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ka ihe ọmụma ọ na-enweta na-abawanyekwa ụba, ọ hụtara mgbanwe pụtara ìhè n’àgwà nwunye ya. O meziwanyere ihe dị ka onye bụ nwunye na onye bụ nne. Site n’agbamume nke nwunye ya, o so jee otu mgbakọ sekit na June 1989. O kwere ka a malite iduziri ya ọmụmụ Bible ebe obibi ugbu a, a malitekwara ịhụ oké mgbanwe dị iche iche n’ọdịdị ya na n’ụzọ ndụ ya. Mmadụ asaa nile nọ n’ezinụlọ ahụ malitere ije nzukọ dị iche iche. E mere ya baptism na January 1990 dị ka onye gbasoworo ezi ndụmọdụ Pọl nke dị ná Ndị Efesọs 4:17-24.
16. (a) Olee ụzọ akụkọ ozi Ememe Ncheta nke 1990 si bụrụ ihe na-enye ọṅụ? (b) Ịdị ngwa dị aṅaa ka e kwesịrị ịhụta, oleekwa mgbalị anyị kwesịrị ime iji nye aka?
16 Otu ihe pụtara ìhè n’akụkọ ozi nke afọ ahụ bụ ihe ndekọ nke 9,950,058 ndị bịara n’oge e mere Ememe Ncheta ahụ, bụ́ nke e mere na Tuesday, April 10, 1990. Ihe karịrị 70 n’ime 212 mba dị iche iche nyere akụkọ ozi nke ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ, ndị ji ihe karịrị okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa kasị elu ha nwere! Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị mmachibido, mba asaa dị n’Africa, ndị nwere ngụkọta ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 62,712 ndị nkwusa nyere akụkọ ozi nke 204,356 ndị bịara Ememe Ncheta. Ndị nkwusa dị 1,914 ndị nọ na Liberia nke esemokwu dọkasịworo nwere ọṅụ n’inwe 7,811 ndị bịara Ememe Ncheta ahụ. Haiti, nke nwere ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa kasị elu nke 6,427, nyere akụkọ ozo nke 36,551 ndịbịaranụ. Ndị nkwusa dị 886 n’agwaetiti ndị ahụ dịsasịrị adịsasị nke Micronesia nwere 3,958 ndị bịaranụ. Sri Lanka, nke nwere 1,298 ndị nkwusa nyere akụkọ nke 4,521, Zambia, nke nwekwara 73,729 ndị nkwusa, nwere 326,991 ndị bịara Ememe Ncheta, bụ́ nkezi nke otu onye n’ime 25 mmadụ ọ bụla ná ndị bi na Zambia. Akụkọ ozi ụwa dum na-ekpughekwa ọzọ na e nwere ọtụtụ nde ndị obi ha ziri ezi ndị na-eche ka a chịkọbata ha n’ime ogige atụrụ ahụ. Ma inwe obi ziri ezi abụghị nanị ihe a chọrọ. Ànyị pụrụ ịmụba, meziwanye ọdịdị nke ọrụ ọmụmụ Bible ebe obibi anyị, na-enyere ọtụtụ ndị karị ná ndị bịara Ememe Ncheta aka iwulite okwukwe siri ike? Anyị chọrọ ka ha ghọọ ndị na-esonyere anyị n’ịrụsi ọrụ ike, na-eto Jehova. Ọ ga-arụpụtara ha ndụ!—Abụ Ọma 148:12, 13; Jọn 17:3; 1 Jọn 2:15-17.
Mmejupụta nke Ọṅụ
17. Ihe nlereanya dịgasị aṅaa nke narị afọ mbụ kwesịrị inye aka n’ịgba mkpebi anyị ume ijigidesi ọṅụ anyị ike?
17 N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-eche anyị ihu, ka anyị kpebisie ike ijigidesi ọṅụ anyị ike. Ma eleghị anya ọ gaghị adị mkpa ka anyị nwee ahụmahụ siri ike dị ka nke Stifen, ma ihe nlereanya ya pụrụ iwusi anyị ike. N’okpuru ebubo ụgha, o nwere ike ijigide ọdịdị nke ọṅụ ya. Ndị iro ya ‘hụrụ na ihu ya dị ka ọ̀ bụ ihu mmụọ ozi.’ Chineke nọnyeere ya n’oge ihe isi ike ya. Ọ gbara àmà n’atụghị egwu, na-abụ onye “jupụtara ná mmụọ nsọ” ruokwa ọnwụ ọ nwụrụ n’ihi okwukwe ya. Ka Pọl na Banabas chigharịkwuuru ndị mba ọzọ n’ọrụ nkwusa ha, ndị a kwa ‘ṅụrịrị ọṅụ, nyekwa okwu Jehova otuto.’ Mkpagbu bilitekwara ọzọ. Ma o meghị ka ndị ahụ kweerenụ laa azụ. “Ndị na-eso ụzọ Jisọs wee jupụta n’ọṅụ na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 6:15; 7:55; 13:48-52) N’agbanyeghị ihe ndị iro anyị mere anyị, n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị anyị na-eche ihu ná ndụ kwa ụbọchị, anyị ekwesịghị ikwe ka a kụnyụọ ọṅụ nke mmụọ nsọ anyị mgbe ọ bụla. Pọl nyere ndụmọdụ, sị: “N’akụkụ olileanya unu, na-aṅụrịnụ ọṅụ; n’akụkụ mkpagbu unu, na-enwenụ ntachi obi; n’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike.”—Ndị Rom 12:12.
18. (a) Gịnị bụ Jerusalem Ọhụrụ ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ndị Chineke ga-eji soro ya ṅụrịa? (b) Olee ụzọ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-esi gọzie ihe a kpọrọ mmadụ?
18 Lee nnọọ ka olileanya ahụ si bụrụ ihe dị ebube! Nye ndị ya nile, Jehova kwuru, sị: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke mụ onwe m na-eke.” Kraịst, bụ́ Onyenwe anyị, tinyere “Jerusalem Ọhụrụ” ahụ (nke bụ ugbu a isi obodo nke nzukọ eluigwe nke Chineke, bụ́ “Jerusalem nke dị n’elu”) na òtù ụmụ mmadụ nke ụwa ọhụrụ ndị nọ n’elu ala ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ọṅụ dị ukwuu. (Ndị Galetia 4:26) Mbilite n’ọnwụ nke ụmụ mmadụ ndị nwụrụ anwụ, mbuli nke ndị nile na-erube isi gaa ná ndụ ebighị ebi n’izu okè nke mmadụ, mgbe ebighị ebi nke ịdị ndụ bara uru n’ahụ ike n’ime paradaịs elu ala—lee nnọọ olileanya dị ebube na ihe na-akpali ọṅụ nke a bụ! Dị ka Jehova n’onwe ya na-enweta ‘ọṅụ na Jerusalem, na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ndị ya,’ otú ahụ ka onye amụma ya si gaa n’ihu ịkpọ ndị Chineke òkù, sị: “Soronụ Jerusalem ṅụrịa, tegharịakwanụ egwu ọṅụ n’ihi ya, unu ndị nile na-ahụ ya n’anya: ka obi tọọ unu ụtọ n’ebe ọ nọ site n’obi ụtọ.” (Aịsaịa 65:17-19; 66:10; Mkpughe 14:1; 20:12, 13; 21:2-4) Ka anyị nọgide mgbe nile na-abụ ndị jupụtara n’ọṅụ na mmụọ nsọ ka anyị na-agbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi, bụ́: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—Ndị Filipaị 4:4.
N’ịchịkọta Ọṅụ Anyị:
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa nke iji ọṅụ na-atachi obi ka Jisọs hapụụrụ anyị?
◻ N’ihi gịnị ka ìgwè abụọ nke ndị raara onwe ha nye kwesịrị iji nwee ọṅụ?
◻ Olee ụzọ ma ụmụntakịrị ma ndị okenye si na-aṅụrị ọṅụ n’eziokwu ahụ taa?
◻ N’ịtụleghachi akụkọ ozi 1990 ahụ, azịza dị aṅaa ka a na-enye ugbu a n’ekpere ahụ bụ, “Biko, Jehova, mee ka ihe na-agara anyị nke ọma, biko”?
◻ Òle mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka a ga-eji nweta mmejupụta nke ọṅụ?
[Chaatị dị na peeji nke 18-21]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1990 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto dị na peeji nke 16]
Mmụọ ozi Jehova mara ọkwa ọmụmụ nke Kraịst bụ Onyenwe anyị dị ka “ozi ọma nke oké ọṅụ”