Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/15 p. 15-20
  • Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Eji “Obi Ụtọ” Efe Ofufe
  • Mgbe Ọṅụ Na-adịghị
  • Ichere n’Ọṅụ
  • Ọṅụ n’Agbanyeghị Mkpagbu
  • “Werenụ Ọṅụ Fee Jehova Ofufe”
  • Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Unu
  • Ọṅụ Bụ Àgwà Chineke Na-eme Ka Anyị Nwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Iji Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Onye Ezi Omume Ga-aṅụrị Ọṅụ n’Ime Jehova”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/15 p. 15-20

Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi

“Ọbụbụ ọnụ nile ndị a ga-abịakwasị gị . . . n’ihi na i feghị Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe n’ọṅụ, na n’obi ụtọ.”—DEUTERỌNỌMI 28:45-47.

1. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na ndị na-efe Jehova na-enwe ọṅụ, ebe ọ bụla ha nọ na-efe ya?

NDỊ ohu Jehova na-enwe ọṅụ, ma ha na-eme uche ya n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ụwa. Ndị mmụọ ozi bụ́ “kpakpando ụtụtụ” tiri mkpu n’ọṅụ mgbe a tọrọ ntọala ụwa, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọtụtụ miriad nke mmụọ ozi eluigwe ‘na-eme okwu Chineke’ n’ọṅụ. (Job 38:4-7; Abụ Ọma 103:20) Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya bụ “onye ọkà” nwere ọṅụ n’eluigwe ma nwee obi ụtọ n’ime uche Chineke dị ka nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst n’elu ụwa. Ọzọkwa, “n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW], na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ilu 8:30, 31; Ndị Hibru 10:5-10; 12:2.

2. Gịnị kpebiri ma ndị Israel hà nwere ngọzi ma ọ bụ ọbụbụ ọnụ?

2 Ndị Israel nwere ọṅụ mgbe ha mere ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ha enupụrụ ya isi? A dọrọ ha aka ná ntị, sị: “[Ọbụbụ ọnụ] ga-adịkwasịkwa gị ịbụ ihe ịrịba ama na ịbụ ihe ebube, dịkwasịkwa mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi: n’ihi na i feghị Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe n’ọṅụ, na n’obi ụtọ, n’ihi ịba ụba nke ihe nile: ị ga-efekwa ndị iro gị, ndị Jehova ga-ezì megide gị, n’agụụ, na n’akpịrị ịkpọ nkụ, na n’ịgba ọtọ, na n’ụkọ ihe nile: ọ ga-etinyekwa yoke ígwè n’olu gị, ruo mgbe ọ ga-ekpochapụ gị.” (Deuterọnọmi 28:45-47) Ngọzi na ọbụbụ ọnụ mere ka o doo anya ndị bụ ohu Jehova na ndị na-abụghị. Ụdị ọbụbụ ọnụ ndị ahụ gosikwara na a pụghị iji ụkpụrụ na nzube Chineke emere ihe egwuregwu, a pụghịkwa ilelị ha anya. N’ihi na ndị Israel jụrụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova nke mbibi na ndọrọ n’agha, Jerusalem ghọọrọ “mba nile nke ụwa ihe nkọcha.” (Jeremaịa 26:6) Ya mere ka anyị rubere Chineke isi ma nweta ihu ọma ya. Ọṅụ bụ otu n’ime ọtụtụ ngọzi Chineke ndị onye na-asọpụrụ Chineke na-enweta.

Otú E Si Eji “Obi Ụtọ” Efe Ofufe

3. Gịnị bụ obi ihe atụ?

3 Ndị Israel ga-efe Jehova ofufe “n’ọṅụ, na n’obi ụtọ.” Otú ahụ ka ndị ohu Chineke nke oge a na-aghaghị ime. Ịṅụrị ọṅụ bụ “inwe obi ụtọ; ijupụta n’ọṅụ.” Ọ bụ ezie na a kpọtụrụ obi nkịtị aha n’Akwụkwọ Nsọ, ọ dịghị eche echiche ma ọ bụ tụgharịa uche n’ụzọ nkịtị. (Ọpụpụ 28:30) Ọrụ ya bụ́ isi bụ inupụta ọbara nke na-ebugara mkpụrụ ndụ nile nke anụ ahụ nri. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ndị kasịnụ, Bible na-atụ aka n’obi ihe atụ, bụ́ ihe karịrị isi iyi nke ịhụnanya, mkpali, na ọgụgụ isi. A sịrị na ọ na-anọchite anya “akụkụ bụ isi n’ozuzu ya, ime ime, wee na-anọchite mmadụ ime dị ka nke na-egosipụta onwe ya n’ọrụ ya nile, n’ọchịchọ ya, ịhụnanya, mmetụta uche, mkpali, nzube, echiche ya, nghọta, nchepụta, amamihe ya, ihe ọmụma, nkà, nkwenkwe ya na ntụgharị uche ya, ike ncheta ya na mmata ihe ya.” (Journal of the Society of Biblical Literature and Exegesis, 1882, peji nke 67) Obi ihe atụ anyị gụnyere mmetụta anyị dị iche iche, tinyere ọṅụ.—Jọn 16:22.

4. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ife Jehova Chineke ofufe n’ọṅụ nke obi?

4 Gịnị pụrụ inyere anyị aka ife Jehova ofufe n’ọṅụ nke obi? Ile ngọzi na ihe ùgwù ndị Chineke na-enye anya n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ obi ekele na-enye aka. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ iji ọṅụ tụgharịa uche n’ihe ùgwù anyị nke ijere ezi Chineke “ozi dị nsọ.” (Luk 1:74, NW) E nwere ihe ùgwù e jikọtara ya na nke ahụ nke ịza aha Jehova dị ka Ndịàmà ya. (Aịsaịa 43:10-12) Na nke a anyị pụrụ ịgbakwụnye ọṅụ nke ịmara na site n’ịgbaso Okwu Chineke anyị na-eme ya obi ụtọ. Leekwa aha ọṅụ dị n’igbukepụ ìhè ime mmụọ ma si otú ahụ na-enyere ọtụtụ ndị aka ịpụta n’ọchịchịrị!—Matiu 5:14-16; tụlee 1 Pita 2:9.

5. Gịnị bụ isi iyi nke ọṅụ Chineke?

5 Ma, ife Jehova ofufe n’ọṅụ nke obi abụghị nanị ihe banyere iche ezi echiche. Ọ bara uru izi ezi n’otú e si ele ihe anya. Ma ọṅụ Chineke abụghị ihe anyị na-emepụta site ná nzụlite omume. Ọ bụ mkpụrụ nke mmụọ Jehova. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ọ bụrụ na anyị enweghị ụdị ọṅụ ahụ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime mgbanwe iji zere iche echiche ma ọ bụ ime omume n’ụzọ ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke pụrụ iwute mmụọ Chineke. (Ndị Efesọs 4:30) Otú ọ dị, dị ka ndị raara onwe ha nye Jehova, ka anyị ghara ịtụ egwu na ụkọ nke ọṅụ sitere n’ala ala obi n’oge ụfọdụ bụ ihe àmà nke enweghị nnwapụta nke Chineke. Anyị bụ ndị na-ezughị okè ma na-enweta ihe mgbu, mwute, na ọbụna ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ, ma Jehova na-aghọta anyị. (Abụ Ọma 103:10-14) Ya mere ka anyị kpee ekpere maka mmụọ nsọ ya, na-echeta na mkpụrụ ya nke ọṅụ bụ ihe Chineke na-enye. Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ga-aza ụdị ekpere ndị ahụ, ọ ga-enyekwara anyị aka ife ya ofufe n’ọṅụ nke obi.—Luk 11:13.

Mgbe Ọṅụ Na-adịghị

6. Ọ bụrụ na ọṅụ adịghị n’ofufe anyị na-efe Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

6 Ọ bụrụ na ọṅụ adịghị n’ofufe anyị, anyị pụrụ imesịa melata aka n’ife Jehova ma ọ bụ ọbụna gosi ekwesịghị ntụkwasị obi nye ya. Ya mere, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya iji obi umeala na ekpere tụlee ebumnobi anyị ma mee mgbanwe ndị dị mkpa. Iji nweta ọṅụ Chineke na-enye, anyị aghaghị ife Jehova site n’ịhụnanya nakwa n’obi, mkpụrụ obi, na uche anyị dum. (Matiu 22:37) Anyị agaghị efe ofufe n’àgwà ịsọ mpi, n’ihi na Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị dị ndụ site na Mmụọ Nsọ, ka anyị na-agazikwa site na Mmụọ Nsọ. Ka anyị ghara ịghọ ndị na-achọ otuto efu, na-achọrịta ibe anyị okwu, na-akpọrịta ibe anyị asị.” (Ndị Galetia 5:25, 26) Anyị agaghị enwe ezi ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị na-efe ofufe n’ihi na anyị chọrọ imekarị ndị ọzọ ma ọ bụ na-achọ otuto.

7. Olee otú anyị pụrụ isi tụteghachi ọṅụ nke obi anyị?

7 Ọṅụ dị n’imezu nraranye anyị nye Jehova. Mgbe anyị raara onwe anyị ọhụrụ nye Chineke, anyị malitere ndụ nke onye Kraịst n’ịnụ ọkụ n’obi. Anyị mụrụ Akwụkwọ Nsọ ma kere òkè ná nzukọ dị iche iche mgbe nile. (Ndị Hibru 10:24, 25) O nyere anyị ọṅụ ikere òkè n’ozi. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ọṅụ anyị adalatawo? Ọmụmụ Bible, ịga nzukọ, ikere òkè n’ozi—n’ezie, ikere òkè n’ụzọ zuru ezu n’akụkụ nile nke Iso Ụzọ Kraịst—kwesịrị inye ndụ anyị mgbasi ike ime mmụọ ma tụteghachi ma ịhụnanya anyị nwere na mbụ ma ọṅụ nke obi anyị mbụ. (Mkpughe 2:4) Mgbe ahụ anyị agaghị adị ka ndị ụfọdụ na-enwekebeghị ọṅụ ma mgbe mgbe nwee mkpa nke enyemaka ime mmụọ. Ndị okenye nwere obi ụtọ inye aka, ma anyị aghaghị imezu nraranye anyị nye Chineke n’otu n’otu. O nweghị onye ọzọ pụrụ imere anyị nke a. Ya mere ka anyị mee ya nzube anyị ịgbaso usoro ime ihe nke onye Kraịst dị mma iji mezuo nraranye anyị nye Jehova ma nwee ezi ọṅụ.

8. N’ihi gịnị ka akọ na uche dị ọcha jiri dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ọṅụ?

8 Ọ bụrụ na anyị ga-enwe ọṅụ nke bụ mkpụrụ nke mmụọ Chineke, akọ na uche dị ọcha dị anyị mkpa. Ruo ogologo oge Eze Devid nke Israel nwara izochi mmehie ya, o nweghị obi ụtọ. N’ezie, mmiri ndụ ya yiri ihe takọrọ atakọ, ọ pụkwara ịdawo ọrịa nkịtị. Lee aha ahụ efè o nwere mgbe nchegharị na nkwupụta mmehie weere ọnọdụ! (Abụ Ọma 32:1-5) Anyị apụghị inwe ọṅụ ma ọ bụru na anyị na-ezo ụfọdụ mmehie dị oké njọ. Nke ahụ pụrụ nnọọ ịkpatara anyị ibi ndụ jupụtara ná nsogbu. N’ezie, nke ahụ abụghị ụzọ e si enweta ọṅụ. Kama nkwupụta mmehie na nchegharị na-eweta ahụ efè na mweghachi nke mmụọ ọṅụ.—Ilu 28:13.

Ichere n’Ọṅụ

9, 10. (a) Nkwa dị aṅaa ka Abraham natara, ma olee otú a pụrụ isiworị tinye okwukwe na ọṅụ ya n’ule? (b) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe atụ nke Abraham, Aịsak, na Jekọb?

9 Ọ bụ otu ihe inwe ọṅụ mgbe anyị mụtara banyere nzube Chineke na mbụ ma bụrụ nnọọ ihe ọzọ ịnọgide na-enwe ọṅụ mgbe ọtụtụ afọ na-agafe. A pụrụ ime ihe atụ nke a n’ọnọdụ Abraham kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ọ nwasịrị ịchụ ọkpara ya bụ́ Aịsak n’àjà mgbe Chineke nyere iwu ya, otu mmụọ ozi ziri ozi a: “Eji m Onwe m ṅụọ iyi, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na n’ihi na i mewo ihe a, n’ihi na i gbochighịkwa nwa gị nwoke, onye i nwere nanị ya: na n’ịgọzi M ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri; mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá nke ndị iro ya; ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:15-18) N’ụzọ doro anya, Abraham nwere ọṅụ nke ukwuu ná nkwa nke a.

10 Abraham pụrụ ịtụworị anya na Aịsak ga-abụ “mkpụrụ” ahụ nke ngọzi ndị ahụ e kwere ná nkwa ga-esi abịa. Ma ngafe nke ọtụtụ afọ n’enweghị ihe ịtụnanya ọ bụla e mezuru site n’Aịsak pụrụ itinyeworị okwukwe na ọṅụ nke Abraham na ezinụlọ ya n’ule. Nnwapụta Chineke nwapụtara nkwa ahụ nye Aịsak ma mesịa nye nwa ya Jekọb mesiri ha obi ike na ọbịbịa nke Mkpụrụ ahụ ka dị n’ihu, nke a nyekwaara ha aka ijigide okwukwe na ọṅụ ha. Otú ọ dị, Abraham, Aịsak, na Jekọb nwụrụ n’ahụghị mmezu nke nkwa ndị Chineke kwere ha, ma ha abụghị ndị ohu Jehova na-enweghị ọṅụ. (Ndị Hibru 11:13) Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịnọgide na-efe Jehova n’okwukwe na ọṅụ ka anyị na-echere mmezu nke nkwa ya nile.

Ọṅụ n’Agbanyeghị Mkpagbu

11. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee ọṅụ n’agbanyeghị mkpagbu?

11 Dị ka ndị ohu Jehova, anyị pụrụ ife Jehova n’ọṅụ nke obi, ọ bụ ezie na anyị na-enweta mkpagbu. Jisọs kpọrọ ndị a na-akpagbu n’ihi ya ndị obi ụtọ, Pita onyeozi kwukwara, sị: “Ebe unu nwekọrọ ahụhụ nke Kraịst, na-aṅụrịnụ ọṅụ; ka unu wee werekwa obi na-atọ ụtọ nke ukwuu ṅụrịa n’ime mkpughe nke ebube Ya. Ọ bụrụ na a na-ata unu ụta n’aha Kraịst, ngọzi na-adịrị unu; n’ihi na Mmụọ nke ebube na Mmụọ nke Chineke na-anọgide n’ahụ unu.” (1 Pita 4:13, 14; Matiu 5:11, 12) Ọ bụru na ị na-atachiri mkpagbu na ahụhụ obi n’ihi ezi omume, i nwere mmụọ na nnwapụta Jehova, nke ahụ n’ezie na-akwalitekwa ọṅụ.

12. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee ike izute ule nke okwukwe n’ọṅụ? (b) Ihe mmụta bụ isi dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọnọdụ nke otu onye Livaị nọ n’ala ọzọ?

12 Anyị pụrụ ịnagide ule nke okwukwe n’ọṅụ n’ihi na Chineke bụ Ebe Mgbaba anyị. E mere ka nke a pụta ìhè n’Abụ Ọma 42 na 43. N’ihi ihe ụfọdụ, otu onye Livaị nọ n’ala ọzọ. Ọ chọsiri ike ife ofufe n’ụlọ nsọ Chineke nke na o nwere mmetụta dị ka nne ele akpịrị na-akpọ nkụ, nke na-achọ mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, nke ihe na-adịghị. O nwere ‘akpịrị ịkpọ nkụ,’ ma ọ bụ agụụ, maka Jehova nakwa maka ihe ùgwù nke ife Chineke ofufe n’ụlọ nsọ Ya. (Abụ Ọma 42:1, 2) Ahụmahụ onye a nọ n’ala ọzọ kwesịrị ịkpali anyị igosi obi ekele maka mkpakọrịta anyị na-eso ndị Jehova na-enwe. Ọ bụrụ na ụdị ọnọdụ dị ka ngechibido n’ihi mkpagbu egbochie anyị ruo nwa oge ịnọnyere ha, ka anyị cheta ọṅụ ndị gara aga anyị nwekọrọ ọnụ n’ije ozi dị nsọ ma kpee ekpere maka ntachi obi ka anyị “na-echere Chineke” iweghachi anyị gaa n’isoro ndị na-efe ya na-arụ ọrụ mgbe nile.—Abụ Ọma 42:4, 5, 11; 43:3-5.

“Werenụ Ọṅụ Fee Jehova Ofufe”

13. Olee otú Abụ Ọma 100:1, 2 siri gosi na ọṅụ aghaghị ịbụ akụkụ pụrụ iche nke ofufe anyị na-efe Chineke?

13 Ọṅụ aghaghị ịbụ akụkụ pụrụ iche nke ofufe anyị na-efe Chineke. E gosiri nke a n’abụ ekele bụ́ ebe ọbụ abụ ahụ bụrụ: “Tikusienụ Jehova mkpu ọṅụ ike, ụwa nile. Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe: werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu Ya.” (Abụ Ọma 100:1, 2) Jehova bụ “Chineke obi ụtọ,” ọ chọkwara ka ndị ohu ya nweta ọṅụ n’imezu nraranye ha nye ya. (1 Timoti 1:11, NW) Ndị nke mba nile kwesịrị itegharị egwú ọṅụ na Jehova, okwu nke otuto anyị kwesịkwara ịdị ike, dị ka ‘iti mkpu mmeri’ nke ndị agha nweworo mmeri. Ebe ife Chineke ofufe na-enye ume ọhụrụ, ịṅụrị ọṅụ kwesịrị iso ya. Ya mere, ọbụ abụ ahụ gbara ndị mmadụ ume ka ha were “iti mkpu ọṅụ” bịa n’ihu Chineke.

14, 15. Olee otú Abụ Ọma 100:3-5 si metụta ndị Jehova nwere ọṅụ taa?

14 Ọbụ abụ ahụ gbakwụnyere, sị: “Maranụ [ghọtanụ, kwetanụ] na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke: Ya onwe ya emewo anyị, ọ bụkwa Ya nwe anyị; anyị bụ ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.” (Abụ Ọma 100:3) Ebe Jehova bụ Onye Okike anyị, o nwe anyị dị ka onye ọzụzụ atụrụ nwe atụrụ ya. Chineke na-elekọta anyị nnọọ nke ọma nke na anyị ji obi ekele na-eto ya. (Abụ Ọma 23) Banyere Jehova, ọbụ abụ bụkwara, sị: “Werenụ ekele baa n’ọnụ ụzọ ámá Ya nile, werenụ otuto baa n’ogige Ya nile: keleenụ Ya, gọziekwanụ aha Ya. N’ihi na Jehova dị mma; ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị; ruo ọgbọ nile ka ikwesị ntụkwasị obi Ya dịkwa.”—Abụ Ọma 100:4, 5.

15 Taa, ndị nke mba nile na-enwe ọṅụ na-abanye n’ogige nke ụlọ nsọ Jehova iji nye ekele na otuto. Anyị na-eji ọṅụ agọzi aha Chineke site n’ikwu ihe ọma banyere Jehova mgbe nile, àgwà ya ndị dị ukwuu na-akpalikwa anyị ito ya. Ọ dị mma site n’ụkwụ ruo n’isi, ebere ịhụnanya ya ma ọ bụ nlekọta ọmịiko o nwere n’ebe ndị ohu ya nọ bụkwa nke a pụrụ ịdabere na ya mgbe nile, n’ihi na ọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. “Ruo ọgbọ nile,” Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi n’igosi ịhụnanya nye ndị na-eme uche ya. (Ndị Rom 8:38, 39) Mgbe ahụ, n’ezie, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji ‘were ọṅụ fee Jehova ofufe.’

Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Unu

16. N’olileanya na atụmanya ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst pụrụ ịṅụrị ọṅụ na ha?

16 Pọl dere, sị: “N’akụkụ olileanya unu, na-aṅụrịnụ ọṅụ.” (Ndị Rom 12:12) Ndị e tere mmanụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya dị ebube nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe nke Chineke meghepụụrụ ha site n’Ọkpara ya. (Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Filipaị 3:20, 21) Ndị Kraịst nwere olileanya nke ndụ agwụghị agwụ na Paradaịs n’elu ala nwekwara ebe ndabere maka ịṅụrị ọṅụ. (Luk 23:43) Ndị ohu Jehova nile na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’olileanya nke Alaeze, n’ihi na ma hà abụghị akụkụ nke gọọmenti eluigwe ahụ, ha ebiri ndụ n’elu ala ebe ọ na-achị. Lee aha ngọzi ọṅụ nke ahụ bụ!—Matiu 6:9, 10; Ndị Rom 8:18-21.

17, 18. (a) Gịnị ka e buru amụma ya n’Aịsaịa 25:6-8? (b) Olee otú e si na-emezu amụma a nke Aịsaịa ugbu a, oleekwa banyere mmezu ya n’ọdịnihu?

17 Aịsaịa bukwara amụma banyere ọdịnihu na-enye ọṅụ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. O dere, sị: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma. Ọzọ, n’ugwu a ka Ọ ga-eloda ihu ihe mfụchi ahụ e ji afụchi ndị nile dị iche iche, na ihe mkpuchi ahụ e ji ekpuchi mba nile. O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile; ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.”—Aịsaịa 25:6-8.

18 Oké oriri ime mmụọ anyị na-ekere òkè na ya taa dị ka ndị na-efe Jehova ofufe bụ nnọọ ihe oriri ọṅụ dị ukwuu. N’ezie, ọṅụ anyị na-ejupụta ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Chineke n’olileanya nke ihe oriri dị ukwuu nke ihe nkịtị ndị dị mma o kweworo ná nkwa maka ụwa ọhụrụ ahụ. (2 Pita 3:13) Ná ndabere nke àjà Jisọs, Jehova ga-ewepụ “ihe mkpuchi ahụ” na-afụchi ihe a kpọrọ mmadụ n’ihi mmehie Adam. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ ịhụ ka e wepụrụ mmehie na ọnwụ! Lee aha obi ụtọ ọ ga-abụ ịnabataghachi ndị anyị hụrụ n’anya e si n’ọnwụ kpọlite, ịrịba ama na anya mmiri apụwo n’anya, na ibi n’elu ala bụ́ paradaịs, ebe a na-agaghị akọcha ndị Jehova kama ha ga-enyeworị Chineke azịza ọ ga-aza onye ụta ukwu ahụ, Setan Ekwensu!—Ilu 27:11.

19. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’olileanya ndị Jehova setịpụwooro anyị dị ka Ndịàmà ya?

19 Ọ̀ bụ na ọ dịghị eme ka i jupụta n’ọṅụ na ekele ịmara ihe Jehova ga-emere ndị ohu ya? N’ezie, ụdị olileanya ndị ahụ dị ebube na-etinye ihe n’ọṅụ anyị! Ọzọ, olileanya anyị a gọziri agọzi na-eme ka anyị legara Chineke anyị nke obi ụtọ, na-ahụ n’anya, na-emesapụ aka anya n’echiche yiri ndị a: “Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị: Nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.” (Aịsaịa 25:9) N’iburu olileanya anyị magburu onwe ya n’uche n’ụzọ miri emi, ka anyị tinyesie mgbalị anyị nile ike n’ife Jehova ofufe n’ọṅụ nke obi.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi fee Jehova ofufe “n’obi ụtọ”?

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọṅụ adịghị n’ofufe anyị na-efe Chineke?

◻ N’ihi gịnị ka ndị Jehova pụrụ iji nwee ọṅụ n’agbanyeghị mkpagbu?

◻ Ihe ndị dị aṅaa ka anyị nwere iji ṅụrịa ọṅụ n’olileanya anyị?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ikere òkè n’akụkụ nile nke ndụ onye Kraịst ga-amụba ọṅụ anyị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya