Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 7/8 p. 7-8
  • Ibibi Mgbidi Iji Wuo Àkwà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibibi Mgbidi Iji Wuo Àkwà
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịrịta Iche Ọdịbendị n’Etiti Ndịàmà Jehova
  • Mgbidi Ndị Na-egbochi Nkwurịta Okwu
    Teta!—1996
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Anyị Bi n’Obodo Ọzọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ị̀ Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọdịbendị Obodo na Ụkpụrụ Ndị Kraịst Hà Kwekọrọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 7/8 p. 7-8

Ibibi Mgbidi Iji Wuo Àkwà

Ọ BỤGHỊ anyị họọrọ ezinụlọ ma ọ bụ mba nke a mụrụ anyị n’ime ya, ọ bụghịkwa anyị kpebiri ọdịbendị nke ga-akpụzi echiche anyị. Anyị enweghị ikike n’ebe ihe ndị dị otú ahụ dị. Anyị nile nọ n’okpuru oge na ọnọdụ. Ma anyị pụrụ ịchịkwa otú anyị si ele ndị ọzọ anya na otú anyị si emeso ha omume.

Bible na-akọwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ. Tụlee ụkpụrụ ole na ole ndị ga-enyere anyị aka iwu àkwà nke nkwurịta okwu nye ndị pụrụ isite n’ọnọdụ nzụlite dị iche na nke anyị.

‘Chineke Onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya sitere n’aka otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile.’ (Ọrụ 17:24, 26) Anyị nile bụ ndị òtù nke otu ezinụlọ mmadụ, sikwa otú a nwee ọtụtụ ihe anyị nwekọrọ ọnụ. Ịchọ ihe ndị anyị nwekọrọ ọnụ na-eme ka nkwurịta okwu dị mfe karị. Anyị nile chọrọ ezi ndị enyi, ọ dịkwa anyị mkpa inwe echiche nke ndị a hụrụ n’anya na ndị a na-akwanyere ùgwù. Onye ọ bụla na-agbalị izere ihe mgbu nke ahụ na nke mmetụta uche. Ndị nke ọdịbendị nile na-enwe mmasị n’egwú na nkà, na-akọ akụkọ na-akpa ọchị, na-ekweta n’igosi ibe ha omume ọma, na-achọkwa ụzọ isi nwee obi ụtọ.

“Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.” (Ndị Filipaị 2:3) Nke a apụtaghị na anyị kwesịrị ịgụ ndị ọzọ ná ndị ka anyị mma n’ihe nile. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịghọta na n’akụkụ ụfọdụ nke ndụ, ndị ọzọ ka anyị mma. Anyị ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na anyị ma ọ bụ ọdịbendị anyị nọ n’ọkwá mbụ n’ihe nile dị mma.

“Ya mere otú a, otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Nanị ibute ụzọ n’imeso ndị ọzọ omume enyi na inyere ha aka, n’agbanyeghị nzụlite ọdịbendị ha, pụrụ ime ihe dị ukwuu n’imeri enweghị nkwurịta okwu.

“Unu matara nke a, ụmụnna m ndị m hụrụ n’anya. Ma ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” (Jemes 1:19) Ndị maara ka e si enwe nkwurịta okwu aghaghị ime ihe karịrị nanị ikwu okwu; ha aghaghị ịbụ ndị ji ọmịiko ege ntị.

“Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” (Ilu 20:5) Mụrụ anya ịghọta mmetụta na okwu ndị dị n’okpuru akparamàgwà a na-ahụ anya nke mmadụ. Mata ndị mmadụ nke ọma.

“Unu nile n’otu n’otu elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.” (Ndị Filipaị 2:4) Nwee ọmịiko site n’ile ihe anya site n’ụzọ onye nke ọzọ si ele ihe anya. Achọla ọdịmma onwe onye nanị.

Ndịrịta Iche Ọdịbendị n’Etiti Ndịàmà Jehova

A na-ahụ na ụkpụrụ ndị a na-arụ ọrụ n’ezie n’ịdị n’otu pụtara ìhè nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike na 232 ala nke ụwa. Ha bụ “ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” ndị kpebisiworo ike ikwekọ ná nduzi ịhụnanya Jehova n’ihe nile.—Mkpughe 7:9; 1 Ndị Kọrint 10:31-33.

Ndịàmà n’otu n’otu adịghị eleda ọdịbendị ndị ọzọ anya. Ndị ghọrọ Ndịàmà adịghịkwa ajụ ọdịbendị nke a zụlitere ha n’ime ya, ọ gwụla ma ya na ụkpụrụ ndị dị na Bible ekwekọghị. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ha na-eme mgbanwe ná ndụ ha. Ha na-aghọta na e nwere ihe ndị kwesịrị ịja mma n’ọdịbendị ọ bụla nakwa ọbụna na a na-emeziwanye ndị a n’ahụ ndị na-agbaso ezi ofufe.

Ha na-agbalị ile mbara ụwa anyị anya otú Chineke na-aghaghị isi na-ele ya anya—na-egbukepụ egbukepụ, na-acha anụnụ anụnụ ma maa mma—na-agba gburugburu n’ime oghere. Ọ bụ mbara ụwa nke nwere ọdịbendị na ndị mmadụ dị ịtụnanya. Ndịàmà Jehova na-elepụ anya n’ihu maka oge mgbe ndị nile nọ n’elu ụwa ga-anụ ụtọ ndụ dị ka ezinụlọ dị n’otu n’ezie.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndịàmà Jehova amụtawo otú e si etikpọsị ihe mgbochi dị iche iche nke ọdịbendị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya