Echiche nke Bible
Ì Kwesịrị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Egwu?
WELITE isiokwu banyere ndị nwụrụ anwụ, ọtụtụ ndị ga-akwụsịkwa ikwu okwu gaa n’ihu banyere ya. Otú ọ dị, ụfọdụ abụghị nanị na ha adịghị enwe ahụ iru ala n’isiokwu ahụ; egwu na-ejide ha. Ya mere ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe ịchọta n’ọdịbendị ndị dị n’ụwa nile, omenala na ememe ndị metụtara ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu. Dị ka ihe atụ, ka anyị lee anya n’omenala ndị dị ná mba Africa ndị dị ná ndịda Sahara.
Otu nwanyị n’otu obodo ukwu dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na-echeta nke ọma ihe mere mgbe otu onye òtù ezinụlọ ya nwụsịrị. Ọ na-akọ, sị: “Otu onye ikwu na-akwadebere onye ahụ nwụrụ anwụ otu efere nri mgbe nile ma debe ya nke ọma n’ime ụlọ ihi ụra ya. Mgbe ọ na-anọghị ya, m na-aga rie nri ahụ. Mgbe onye ikwu ahụ lọghachiri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu! O kwetara na onye ahụ nwụrụ anwụ anarawo ihe ọma ndị ahụ. Nke a gagidere n’ihu ruo mgbe m dara ọrịa. Agụụ adịghị agụkwa m, enweghịkwa m ike iri nri ọ bụla. Nke a mere ka ahụ ghara iru m ala! Ọtụtụ n’ime ndị ikwu m kwubiri na ọ bụ onye ikwu anyị nwụrụ anwụ kpatara nrịanrịa m. Ọ ghaghị ịbụ na ọ na-eweso otu onye n’ime ezinụlọ anyị iwe, ka ha chere.”
N’otu obodo ukwu ahụ, ọ bụrụ na ezinụlọ nwere ejima, otu wee nwụọ, ọ dịghị onye kwesịrị ikwu okwu banyere onye ahụ nwụrụ anwụ n’ụlọ. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ banyere ejima ahụ nke nwụrụ anwụ, ezinụlọ ahụ na-azaghachikarị, sị: “Ọ pụrụ ịga zụta nnu.” Ha kwenyesiri ike na a ga-ewepụ ndụ nke ejima nke dị ndụ ma ọ bụrụ na e kwuo eziokwu.
Ọzọ, see onyinyo ọnọdụ a: Otu nwoke nke lụrụ ụmụ nwanyị atọ anwụwo. Ụbọchị sochiri ụbọchị olili ozu, a kwaara ndị nwunye ya ákwà ọcha pụrụ iche. N’otu mgbe ahụkwa, e wuru otu ebe pụrụ iche nke e ji osisi na akịrịka wuo n’akụkụ ụlọ ha, bụ́ ebe ụmụ nwanyị ndị a ga-asa ahụ ma yiri ákwà ọcha ahụ. Ọ dịghị onye ga-aba n’ebe ahụ ma e wezụga ha na otu nwanyị nke a họpụtara inyere ha aka. Ozugbo ha na-esi n’ụlọ ịsa ahụ a pụrụ iche pụta, a na-ekpuchi ihu ụmụ nwanyị ndị ahụ. Ụmụ nwanyị ahụ na-eyikwa sebe, ihe olu e ji eriri mee maka “nchebe.” A na-eme ememe ịsa ahụ a na Friday na Monday ọ bụla ruo ụbọchị 100. N’oge a, ha apụghị ịnara ihe ọ bụla kpọmkwem site n’aka nwoke. Ọ bụrụ na nwoke achọọ inye ha ihe, ọ ghaghị ibu ụzọ debe ya n’ala ma ọ bụ n’elu table. Mgbe ahụ nwanyị ahụ ga-ewere ya. Ọ dịghị onye a na-ekwe ka ọ nọrọ ọdụ ma ọ bụ hie ụra n’àkwà ụmụ nwanyị ndị a. Mgbe ọ bụla ha na-ahapụ ụlọ, nke ọ bụla n’ime ha aghaghị iwere otu osisi pụrụ iche. Ha na-eche na iji osisi a ga-egbochi di ha nwụrụ anwụ ịwakwasị ha. Ọ bụrụ na a gbasoghị ntụziaka ndị a dị n’elu, ha na-eche na di ha nwụrụ anwụ pụrụ iwe iwe ma merụọ ha ahụ.
Ahụmahụ dị otú ahụ bụ ihe a na-ahụkarị n’akụkụ ahụ nke ụwa. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị n’Africa ka e nwere ụdị omenala ndị a.
Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Egwu Juru Ebe Nile
Otu akwụkwọ ihe ọmụma, bụ́ Encarta, na-ekwu ihe na-esonụ banyere otú ọtụtụ ndị si ele ndị nna ochie ha nwụrụ anwụ anya: “A na-ekweta na ndị ikwu nwụrụ anwụ . . . aghọwo ndị mmụọ dị ike ma ọ bụ, mgbe ụfọdụ, eruwo n’ọkwá nke ndị bụ chi. [Echiche a] na-adabere ná nkweta nke na ndị nna ochie bụ ndị òtù siri ike nke ọha mmadụ, ka nwere mmasị n’ihe omume nke ndị ikwu ha dị ndụ. E nwewo ọtụtụ ihe ndekọ ya n’ọtụtụ ọha mmadụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa . . . , na Polynesia na Melanesia (Dobu na Manus), n’etiti ọtụtụ ndị Indo-Europe (ndị Scandinavia oge gboo na ndị Germany), na karịsịa na China na Japan. N’ozuzu ya, a na-ekweta na ndị nna ochie na-akpa ike dị ukwuu, na-enwe ikike pụrụ iche ịgbanwe usoro ihe omume ma ọ bụ ịchịkwa ọdịmma nke ndị ikwu ha dị ndụ. Nchebe nke ezinụlọ bụ otu n’ime nchegbu ha bụ isi. A na-ele ha anya dị ka ndị ngabita n’etiti chi kasị elu, ma ọ bụ ndị bụ chi, na ndị mmadụ, nweekwa ike isoro ndị dị ndụ kwurịta okwu site ná nrọ na site n’ịkpa ike n’ime onye ahụ. Àgwà e nwere n’ebe ha dị bụ nke ngwakọta nke egwu na nsọpụrụ ofufe. Ọ bụrụ na e leghara ha anya, ndị nna ochie pụrụ ịkpata ọrịa na ọdachi ndị ọzọ. Njụrụ obi, arịrịọ, ekpere, na àjà bụ ụzọ dị iche iche nke ndị dị ndụ pụrụ isi soro ndị nna ochie ha kwurịta okwu.”
N’eziokwu, ego ezinụlọ na-akpata pụrụ ịgwụ n’ihi egwu nke ndị nwụrụ anwụ. Ọtụtụ mgbe, ndị kwetasiri ike na e kwesịrị ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu na-ekwukarị ka e mee oké ememe ndị chọrọ nri na mmanya, anụmanụ ndị dị ndụ maka iji chụọ àjà, na ákwà ndị dị oké ọnụ ahịa.
Ma ndị ikwu nwụrụ anwụ ma ọ bụ ndị nne na nna ochie hà nọ n’ezie n’ọnọdụ nke na-achọ ka a tụọ ha egwu ma nye ha nsọpụrụ ofufe? Gịnị ka Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwu?
Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Imerụ Gị Ahụ?
Ọ pụrụ ịmasị gị ịmata na Bible na-ekweta na nkweta ndị dị otú ahụ dị. N’akwụkwọ Deuterọnọmi, a kpọtụrụ omume ndị metụtara ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu aha. Ọ na-ekwu, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị onye . . . dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe. N’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Deuterọnọmi 18:10-12.
Rịba ama na Jehova Chineke katọrọ ememe ndị dị otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha dabeere n’ụgha. Ụgha mbụ banyere ndị nwụrụ anwụ bụ na mkpụrụ obi ha na-adị ndụ gaa n’ihu. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ The Straight Path kwuru nke a banyere ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ: “Ọnwụ abụghị ihe ọzọ karịa ọpụpụ nke mkpụrụ obi. . . . Ili bụ ebe nchekwa maka anụ ahụ nanị, ọ bụghị mkpụrụ obi.”
Bible adịghị ekwenye. Gụọ Ezikiel 18:4 n’onwe gị: “Lee, mkpụrụ obi nile bụ nke m; dị ka mkpụrụ obi nke nna, otú ahụkwa ka mkpụrụ obi nke nwa bụ nke m: mkpụrụ obi nke na-emehie, ọ ga-anwụ.” (King James Version) Ọzọkwa, e kwupụtara ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ doro anya n’Okwu Chineke n’Eklisiastis 9:5: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” Nke a na-akọwa ihe mere nri a hapụụrụ onye nwụrụ anwụ ji anọgide n’efere, ọ gwụla ma onye dị ndụ riri ya.
Otú ọ dị, Bible adịghị ahapụ anyị n’enweghị olileanya maka ndị nọ n’ili. Ha pụrụ ịdị ndụ ọzọ! Bible na-ekwu okwu banyere “mbilite n’ọnwụ.” (Jọn 5:28, 29; 11:25; Ọrụ 24:15) Nke a ga-ewere ọnọdụ n’oge nke Chineke. Ka ọ dị ugbu a, ndị nwụrụ anwụ nọ n’ili n’amaghị ihe, ‘na-ehi ụra,’ ruo mgbe oge Chineke ga-eru ka ha ‘teta.’—Jọn 11:11-14; Abụ Ọma 13:3.
Ndị mmadụ n’ozuzu ha na-atụ egwu ihe a na-amaghị ama. Ezi ihe ọmụma pụrụ ime ka mmadụ nwere onwe ya pụọ na nkwenkwe ụgha na-enweghị isi. Bible na-enye anyị eziokwu banyere ọnọdụ nke ndị nọ n’ili. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, i kwesịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu!—Jọn 8:32.