Olee Ebe Ha Si Bịa?
“GỊNỊ ka anyị na-akpọ onwe anyị tupu Columbus abịa? . . . N’ebo nke ọ bụla, ọbụna taa, mgbe ị sụgharịrị okwu ndị anyị ji mere aha anyị, n’amaghị ihe ebo nke ọ bụla na-akpọ, ọ na-abụ mgbe nile ihe a sụgharịrị ịbụ n’ụzọ bụ isi otu ihe ahụ. N’asụsụ anyị [Narrangansett] ọ bụ ndị Ninuog, ma ọ bụ ndị [bi na Navajo, Diné], bụ́ ụmụ mmadụ. Nke ahụ bụ ihe anyị kpọrọ onwe anyị. Ya mere mgbe ndị [Europe] na-achị mba ọzọ rutere n’ebe a, anyị matara ndị anyị bụ, ma anyị amaghị ndị ha bụ. N’ihi ya anyị kpọrọ ha Awaunageesuck, ma ọ bụ ndị a na-amaghị ndị ha bụ, n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị ọbịa, ọ bụ ha bụ ndị anyị na-amaghị ndị ha bụ, ma anyị matara onwe anyị. Ọ bụkwa anyị bụ ụmụ mmadụ.”—Tall Oak, agbụrụ Narragansett.
E nwere ọtụtụ nchepụta echiche banyere mmalite nke Ndị Amaala America.a Joseph Smith, onye guzobere okpukpe Mormon, bụ otu n’ime ọtụtụ ndị, gụnyere Quaker William Penn, onye kwetara na ndị India bụ ndị Hibru, ụmụ ụmụ ndị ahụ a na-akpọkarị ebo iri ahụ furu efu nke Israel. Nkọwa nke ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta ụmụ mmadụ nakweere taa bụ na ma ọ̀ bụ site n’àkwà mmiri elu ala ma ọ bụ site n’ụgbọ epeepe, ebo ndị sitere Esia kwagara n’ebe bụ Alaska, Canada, na United States ugbu a. Ọbụna ule DNA yiri ka ọ na-akwado echiche a.
Ndị Amaala America —Mmalite na Nkwenkwe Ha
Ndị editọ Ndị Amaala America bụ́ Tom Hill (Seneca) na Richard Hill, Sr., (Tuscarora) na-ede n’akwụkwọ ha bụ́ Creation’s Journey—Native American Identity and Belief, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị amaala kwenyere site n’oge gboo na e kere ha site n’ala n’onwe ya, site ná mmiri, ma ọ bụ site na kpakpando. N’aka nke ọzọ, ndị ọkà mmụta ihe ochie ndị e gwutere n’ala nwere nchepụta echiche banyere otu oké àkwà mmiri elu ala nke gabigara Bering Strait, bụ́ nke ndị Esia si n’elu ya kwafeta na kọntinent ndị dị n’America; nchepụta echiche ahụ na-ekwusi ike na ndị Esia ndị a bụ ndị nna ochie nke ndị amaala Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.” O yiri ka ụfọdụ Ndị Amaala America na-enwe obi abụọ ná nchepụta echiche ndị ọcha n’ihe banyere Bering Strait. Ha na-ahọrọ ikwenye akụkọ mgbe ochie na akụkọ dị iche iche nke ha. Ha na-ewere onwe ha dị ka ndị mbụ biri n’ala ahụ kama ịbụ ndị nchọpụta si Esia kwafeta.
N’akwụkwọ ya bụ́ An Indian Winter, Russell Freedman na-akọwa, sị: “Dị ka nkweta Mandan [ebo nke dị n’akụkụ ebe mgbago nke Osimiri Missouri] si dị, Nwoke Mbụ bụ mmụọ dị ike, onye bụ chi. Onyenwe Ndụ, onye kere ihe nile, ekeworị ya na mgbe dị anya gara aga, ka ọ rụọ ọrụ dị ka onye ogbugbo n’agbata ụmụ mmadụ efu na ọtụtụ chi ma ọ bụ mmụọ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ bi n’eluigwe na ala.” Nkwenkwe Mandan gụnyere ọbụna akụkọ mgbe ochie banyere otu iju mmiri. “N’otu oge, mgbe otu oké iju mmiri kpuchiri ụwa, Nwoke Mbụ zọpụtara ndị mmadụ site n’ịkụziri ha ka ha wuo otu ụlọ elu nchebe, ma ọ bụ ‘ụgbọ,’ nke ga-ese n’elu mmiri nke iju mmiri ahụ. N’iji sọpụrụ ya, obodo nta ọ bụla na Mandan nwere obere ihe oyiyi nke ụlọ elu ahụ a kọrọ n’akụkọ—osisi cedar e gwunyere n’ala nke dị amaụkwụ ise n’ịdị elu, nke ogige e ji plank gbaa gburugburu.”
Ndị Mandan nwekwara ihe nnọchianya okpukpe “pole toro ogologo nke e ji àbụ́bà na ajị́ anụ kechie ma tụkwasị ya isi jọrọ njọ ile anya nke e ji osisi tụọ, bụ́ nke e tere ágbá ojii.” Ònye ka nke a pụrụ ịnọchi anya ya? “Ihe oyiyi a nọchiri anya Ochkih-Haddä, otu mmụọ ọjọọ nke nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma ghara ịdị ike dị ka Onyenwe Ndụ ma ọ bụ Nwoke Mbụ.” Nye Ndị India nke Ala Dị Larịị, “ikwere n’ụwa nke ndị bụ mmụọ bụ akụkụ a na-adịghị agbagha agbagha nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. . . . A pụghị iru ná mkpebi ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ, a pụghịkwa ịmalite ọrụ ọ bụla, n’ebughị ụzọ chọọ enyemaka na nkwado nke ndị dị nsọ, bụ́ ndị na-achịkwa ihe omume ụmụ mmadụ.”
N’akwụkwọ ya bụ́ The Mythology of North America, John Bierhorst na-akọwa, sị: “Tupu e nwee ógbè dị iche iche, e kwuru na Osage wagharịrị site n’otu ebe gaa ebe ọzọ n’ọnọdụ a matara dị ka ganítha (enweghị iwu ma ọ bụ ụkpụrụ). Echiche e nwere n’ọha bụ na n’ụbọchị mbụ ndị ahụ, ụfọdụ ndị ọkà n’iche echiche a kpọrọ Obere Ndị Agadi . . . chepụtara echiche na otu ikike okike nke na-adịghị ekwu okwu na-ejupụta igwe na ụwa, na-emekwa ka kpakpando, ọnwa, na anyanwụ na-aga n’usoro zuru okè. Ha kpọrọ ya Wakónda (ike dị ịtụnanya) ma ọ bụ Eáwawonaka (onye na-eme ka anyị dịrị).” Ndị Zuni, ndị Sioux, na ndị Lakota n’Ebe Ọdịda Anyanwụ nwekwara otu ụdị echiche ahụ. Ndị Winnebago nwekwara akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke okike nke na-agụnye “Onye Mere Ụwa.” Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ọ chọrọ ka ìhè dị, ìhè ewee dị. . . . Mgbe ahụ o wee chee echiche ọzọ ma chọọ ka e nwee ụwa, ụwa a ewee pụtakwa.”
Nye onye mmụta Bible, ọ bụ ihe kasị na-akpali mmasị ịhụ myirịta ụfọdụ dị n’etiti nkwenkwe Ndị Amaala America na ozizi ndị e dere na Bible, karịsịa n’ihe banyere Mmụọ Ukwu ahụ, “onye na-eme ka anyị dịrị,” bụ nke yiri ihe aha Chineke, bụ́ Jehova pụtara, “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Myirịta ndị ọzọ na-agụnye Iju Mmiri ahụ na mmụọ ọjọọ ahụ a matara n’ime Bible dị ka Setan.—Jenesis 1:1-5; 6:17; Mkpughe 12:9.
Ịghọta Nkà Ihe Ọmụma nke Ndị Amaala America
Ndị Amaala America na-ede akwụkwọ bụ́ Tom Hill na Richard Hill na-akọwa onyinye ise ha na-ekwu na Ndị Amaala America natara site n’aka ndị nna ochie ha. “Onyinye mbụ . . . bụ nkekọ dị omimi anyị nwere n’ebe ala dị.” N’ihi akụkọ ihe mere eme ha tupu na kemgbe ọbịbịa ndị Europe, ònye pụrụ ịgbagha nke ahụ? Ala ha, nke Ndị Amaala America na-ewerekarị dị ka ebe dị nsọ, ka e leziri nnọọ anya weghara n’ike, n’aghụghọ, ma ọ bụ ná nkwekọrịta ndị a na-emezughị.
“Onyinye nke abụọ bụ ike na mmụọ nke ụmụ anụmanụ na ndị nke anyị na-ekerịta.” E gosiwo nkwanye ùgwù Ndị Amaala America nwere maka anụmanụ n’ọtụtụ ụzọ. Ha chụrụ nta nanị maka ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Ọ bụghị ndị amaala bụ ndị ọ fọrọ nke nta ka ha kpochapụ atụ (bison), kama ọ bụ ndị ọcha, na agụụ ọbara na anyaukwu ha nke elepụghị anya n’ihu.
“Nke atọ bụ ike nke ndị bụ mmụọ, bụ́ ndị ikwu anyị dị ndụ, bụkwa ndị na-esite n’ihe oyiyi ha ndị anyị mere na-agwa anyị okwu.” Nke a bụ isiokwu nke ọtụtụ okpukpe gburugburu ụwa nwekọrọ ọnụ—nlanarị nke mmụọ ma ọ bụ mkpụrụ obi mgbe a nwụsịrị.b
“Nke anọ bụ nghọta nke ndị anyị bụ, bụ́ nke a na-eji ọdịnala ebo anyị na-egosipụta ma na-eme ka ọ dịgide.” A pụrụ ịrịba nke a ama taa n’ememe ebo dị iche iche, bụ́ ebe ndị mmadụ na-agbakọta iji tụlee ihe ndị metụtara ebo ha, ma ọ bụ ná nzukọ ọha mmadụ, ebe ite egwú na egwú ebo na-ewere ọnọdụ. Ákwà ndị India, ụda ịgbà a na-akụ akụ, ite egwú, na njikọghachi nke ezinụlọ na ógbè—ha nile na-egosi ọdịnala nke ebo.
“Onyinye ikpeazụ bụ ikike imepụta ihe—a na-eme ka nkwenkwe anyị bụrụ ezie site n’ịgbanwe ihe ndị sitere n’okike gaa n’ihe a na-efe ofufe na ihe e ji eme ọnụ.” Ma ọ̀ bụ ịkpa nkata, ịkpa ákwà, ịtụ ihe na ite ihe e ji ụrọ kpụọ ágbá, imepụta ihe e ji nkume dị oké ọnụ ahịa eme na ihe ịchọ mma dị iche iche, ma ọ bụ ọrụ mmepụta ihe ọ bụla ọzọ, a na-ejikọta ya na ọdịnala na ọdịbendị ha nke oge gboo.
E nwere ọtụtụ ebo nke na ọ ga-achọ ọtụtụ akwụkwọ iji kọwaa nkwenkwe ọdịnala na ihe omume ha nile. Ihe bụ mmasị anyị ugbu a bụ, Mmetụta dị aṅaa ka nnubata nke ọtụtụ nde ndị Europe, nke ọtụtụ n’ime ha sịrị na ha bụ ndị Kraịst, nwere n’ahụ Ndị Amaala America?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a O doro anya na okwu bụ́ “Ndị Amaala America” na-agụnye ebo ndị ahụ bi na Canada. Ọtụtụ kwetara na ndị nkwagharị mbụ sitere Esia mere njem gafee ugwu ebe ọdịda anyanwụ Canada mgbe ha si na ndịda na-abanye n’ihu igwe na-ekpo ọkụ karị.
b Bible adịghị enye nkwado maka ikwere ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ma ọ bụ mmụọ na-alanarị ọnwụ. (Lee Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4, 20.) Maka ihe ọmụma zukwuru ezu n’isiokwu a, lee akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, peji nke 52-57, 75, na ndepụta ntụaka ya n’okpuru “Immortal soul, belief in” (Mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, ikwere na ya). Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara akwụkwọ a.