Ndị India America Na Bible
KEMGBE ndị Europe wakporo Kọntinent ndị dị n’America, ọtụtụ anwawo ịkụziri ndị India America Bible.
Kemgbe narị afọ nke 17, a sụgharịwo Bible zuru ezu gaa n’asụsụ isii nke ndị India America nke Ebe Ugwu. Nke mbụ bụ Bible John Eliot, nke e biri na 1663 maka ndị India America nke Massachusett dịdebere Boston na Roxbury, dị na Massachusetts. Mgbe ọ na-ede ihe n’akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of North American Indians, Harvey Markowitz na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na ugbu a ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-enwe obi abụọ banyere ezi nzube nke ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ na-achị mba ọzọ ji banye ná nkwekọrịta [ya bụ́, “‘imepe anya’ ‘ndị ime ọhịa’ nke Ụwa Ọhụrụ ahụ”], ịdị ukwuu nrara Eliot raara onwe ya nye na-apụta ìhè n’afọ iri na ise ahụ ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ iji mụta asụsụ ndị Massachusett na ichepụta ụkpụrụ ide ya iji sụgharịa Bible. Eliot lere ọrụ a siri ike anya dị ka ‘ọrụ dị nsọ, nke a ga-ewere dị ka ihe kwesịrị ka a tụọ ya egwu, leziere anya, ma sọpụrụ.’”
Ọ bụ ezie na a sụgharịrị akụkụ dị iche iche nke Bible gaa n’asụsụ ndị ọzọ nke ndị India America, o were narị afọ abụọ tupu e bipụta Bible ọzọ zuru ezu, nke Òtù Bible nke Britain na Mba Ofesi bipụtara n’asụsụ Cree nke Ebe Ọdịda Anyanwụ (1862). N’oge na-adịghị anya e nwetara nsụgharị ndị ọzọ: asụsụ ndị Inuit nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Arctic (1871); Dakota, ma ọ bụ Sioux nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ (1880); na Gwich’in, bụ́ asụsụ nke ndị America bi nso n’ógbè arctic (1898).
Bible zuru ezu kasị ọhụrụ e nwere bụ nsụgharị nke Navajo, nke e bipụtara na 1985 ka afọ 41 nke nkwadebe na mgbakọ aka nke òtù Bible abụọ gasịrị. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik dị ugbu a ma ọ dịkarịa ala n’asụsụ 46 nke ndị India America.
Ònye Buteworo Ụzọ?
Markowitz na-ekwu, sị: “Ọ pụtara ìhè . . . na ọrụ ịsụgharị Bible abụwo n’ụzọ dị ukwuu ọrụ ndị Protestant rụrụ.” Otu onye edemede ahụ gara n’ihu na-ekwu na tupu e nwee Kansụl Vatican nke Abụọ (1962), Chọọchị Katọlik “ekweghị ka e kesaara ndị nkịtị Bible, na-ekwere na ndị nkịtị anataghị ọzụzụ kwesịrị ekwesị . . . ga-eme ka ha nye ihe odide Bible nkọwa ziri ezi.”
Òtù Bible dịgasị iche iche ji ọrụ nsụgharị ugbu a ma ọ dịkarịa ala gaa n’asụsụ 20 nke ndị India America nke Ebe Ugwu America, gụnyere Cheyenne, Havasupai, Micmac, na Zuni. A na-arụ ọrụ ná nsụgharị ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik maka ndị Navajo. A na-arụ ọrụ ná nsụgharị ndị ọzọ maka ndị India America nke Ebe Etiti na Ebe Ndịda America.
Ndịàmà Jehova esoghị n’òtù dị iche iche nke Protestant. Otú ọ dị, ha na-arụsi ọrụ ike n’etiti ndị India America nile, n’ihi ya kwa, ọtụtụ ndị India America na-anabata eziokwu Bible banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” nke ndị ezi omume ga-ebi n’ime ha. (2 Pita 3:13) Ndịàmà na-eji Bible ndị e nwere ugbu a n’asụsụ dị iche iche nke kọntinent ndị dị n’America eme ihe. Ha na-ejikwa akwụkwọ e ji amụ Bible ndị Watch Tower Society sụgharịrị gaa n’ọtụtụ asụsụ nke ndị India America eme ihe, gụnyere Aymara, Cree, Dakota, Guarani, Inuktitut, Iroquois, Navajo, Quechua, na asụsụ itoolu ndị ọzọ.—Lee Teta! nke September 8, 1996.
[Foto dị na peeji nke 30]
“Jehova” dị na Bible Navajo n’Abụ Ọma 68:4