Ikiri ụwa
Ịkwadebe Maka Afọ 2000
“Afọ 2000 pụrụ ịkpata ọgba aghara n’ọrụ nkà na ụzụ, ma Òtù Bọọdụ Gọọmenti Etiti Na-ahụ Maka Idebe Ihe nke [United States] chọrọ ijide n’aka na n’agbanyeghị ihe merenụ, ndị America ga-enwe ike ịzụta ihe ndị e ji esi nrị na narị afọ iri ọhụrụ ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal, na-ekwu. “Ụlọ akụ̀ Etiti atụwo ọda ijeri $50 ọzọ itikọta ha n’ego e ji na-eme ihe, a dịghị ama ama ndị tinyere ego n’ụlọ akụ̀ adọkọrọchaa ego ha n’ụlọ akụ̀ na n’ígwè ndị na-agụnye mmadụ ego n’onwe ha.” E kwesịrị ibipụtasị ego ndị ahụ ka ọ na-erule ngwụsị September 1999. Kọmputa ndị meworo ochie karị bụ́ ndị na-eji nanị 0 abụọ dị n’azụ akara afọ eme ihe pụrụ ịghọta afọ 2000 dị ka 1900. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-atụ egwu na ụfọdụ kọmputa agaghị adịkwa mma n’ihi arụzighị ọrụ a, bụ́ nke a maara dị ka Y2K. A pụrụ idozi nsogbu a site n’idegharị usoro kọmputa ndị ahụ ji arụ ọrụ bụ́ nke na-eri oge ma metụta ọtụtụ ihe, ma ọ bụ nanị na nso nso a ka ọtụtu ụlọ akụ̀ na ụlọ ọrụ malitere ndegharị dị otú ahụ na kọmputa ha. “Òtù okpukpe ndị na-agbasa oziọma bụ́ ndị na-ele ọgwụgwụ nke narị afọ iri a anya dị ka ihe iriba ama nke ihe ọjọọ Bible buru amụma ya” na nke “ndakpọ pụrụ iru ọha mmadụ ahụ” “na-emekwu ka nchegbu ọha na eze na-enwe banyere ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba ọ pụrụ ịkpata ka njọ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.
Ọrịa Oru Ụra Alọghachi
Na 1974, Angola kọrọ na mmadụ atọ rịara ọrịa oru ụra. Na nso nso a, Òtù Ahụ Ike Ụwa kwuru na ọ dịkarịa ala, ọnụ ọgụgụ ndị rịara ya n’ebe ahụ dị 300,000. Ọtụtụ puku, ikekwe ọtụtụ nde ọzọ, pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Òdùdù ịta mmadụ na-akpata ọrịa oru ụra. Mgbe ọ mịrịsịịrị ọbara onye bu nje, òdùdù ahụ na-efega ibufe ya onye ọzọ ọ ga-ata. Ọ pụrụ ibufe ya ndị na-arụ ọrụ n’ugbo ma ọ bụ ndị na-asa ákwà na mmiri—na, ọbụna karịsịa, ụmụaka ndị nne ha kwọ n’azụ. Ihe mbụ ga-eme onye o bufere ya bụ isi ọwụwa, ahụ ọkụ, na ịgbọ agbọ. N’enweghị ike ihi ụra n’abalị, ha na-erokarị ụra n’ehihie. Nje ahụ na-awakpo usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ na akwara, ọ na-emesịkwa wakpoo ụbụrụ, na-akpata isi ezughị okè, mmadụ amaghị onwe ya, na ọnwụ. Ịkpaghasị usoro o ji ebufe ya na ịgwọ ndị o bufere ya dị oké ọnụ ma sie ike—ihe dị ka $90 maka otu ugboro e nyere ọgwụgwọ, bụ́ “nke dị oké ọnụ n’Angola,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London na-ekwu.
Ịnọgide Na-enwe Ahụ Ike
“Ọ dịghị mkpa na ị ga-emega ahụ gabiga ókè iji meziwanye ahụ ike gị,” ka akwụkwọ bụ́ The Physical Activity Guide na-ekwu, bụ́ nke Òtù Ahụ Ike Canada wepụtara na nso nso a. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star, “ị pụrụ imeziwanye ahụ ike gị na obi gị site n’imega ahụ n’ụzọ na-agabigaghị ókè ruo minit 10 ma na-eme ya otú ahụ ruo mgbe i meruru ya otu awa kwa ụbọchị.” Olee ụfọdụ mmega ahụ ndị a tụrụ aro ha? Ha gụnyere ịga ije, ịrịgo stepụ, ịrụ ọrụ n’ubi, na ịgbatị onwe onye. Ọrụ ụlọ ndị dị ka ịza ụlọ ma ọ bụ ihicha ụlọ bakwara uru, ha na-emekwa ka mmadụ dị gara gara. Akwụkwọ ahụ na-atụ aro na ‘ị pụrụ iru ihe mgbaru ọsọ nke imeru ya minit 60 kwa ụbọchị site n’ime ka mmega ahụ soro n’ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị.’ Dr. Francine Lemire, bụ́ onyeisi oche nke Kọleji Ndị Dibịa Bekee nke Ezinụlọ nke Canada, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị dịghị emega ahụ, ihe ọmụmụ na-egosi na ihe ize ndụ ọ na-enwe n’ahụ ike gị pụrụ ịha ka nke ise sịga na-enwe.”
Ihe Ize Ndụ nke Kọmputa n’Ime Ụgbọelu
“Ndị ọkachamara kwere na otu ụbọchị ụmụ obere ígwè electronic (PED) dị ka kọmputa elu apata ụkwụ, fon a na-ebugharị ebugharị, ngwá egwú CD ma ọ bụ kọmputa e ji egwuri egwu ga-akpata ọdachi hà ka nke bọmbụ ndị na-eyi ọha egwu na-akpata n’ụgbọelu,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke Sydney, Australia, na-ekwu. “Otu akụkọ e nwetara ọhụrụ na-akọ banyere ugboro 50 ụgbọelu na-ebu ndị mmadụ nwere nsogbu pụrụ ịkpata ọdachi ka ọ na-efe n’elu n’ihi na ndị o bu ji ngwá electronic ha na-eme ihe.” Otu ihe atụ e nyere bụ nke otu ụgbọelu na-achọ ịda n’ọdụ ụgbọelu dị na Melbourne, Australia. Ụgbọelu ahụ, nke onye na-anya ya hapụrụ ka o jiri aka ya daa, feere gawa n’aka ekpe na mberede, na-aga nkọ nkọ ruo ọ̀tụ̀tụ̀ degree 30. Ma ọ dịghị onye metụrụ ihe ndị e ji anya ya aka. Nnyocha e mere gosiri na otu onye nọ n’ahịrị oche nke atọ ji kọmputa apata ụkwụ ya na-eme ihe, n’agbanyeghị ntụziaka doro anya nke onye na-anya ụgbọelu ahụ nyere ka a gbanyụọ ngwá electronic nile. Ngwá ndị dị otú ahụ emewo ka ụgbọelu lakwuo elu, kpọdo isi n’ala, hapụ ebe ọ na-aga, ọbụnakwa ghara inwecha ikuku n’ime ya mgbe ọ na-efe n’elu. Ngwá ndị ụgbọelu na-eji achọtara onwe ya ụzọ pụrụ inweta ozi electronic si ná ngwá electronic PED, ọ pụkwara imetụta ha. Ndị nọ n’ihu ụgbọelu kasị akpata nsogbu ahụ, n’ihi na ha nọ kpọmkwem n’elu ebe ngwá electronic ụgbọelu ahụ na-adị.
Usoro Ọhụrụ nke Ịwa Ahụ Iji Bupụta Nwa
“Usoro ọhụrụ nke ịwa ahụ iji bupụta nwa pụrụ ime ka a na-amụ nwa ngwa ngwa karị na ka ọ bụrụ nke na-adịghị egbu mgbu karị,” ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Augsburger Allgemeine na-akọ. “N’ime ya n’usoro nke Misgav-Ladach chọpụtara, dọkịta ahụ na-awa ahụ na-eji aka dọlaa abụba, ihe kpuchiri afọ, na uru ahụ nke nwanyị na-amụ nwa azụ, kama iji mma e ji awa ahụ bepụ ha dị ka a na-eme ruo ugbu a.” Ebe ọ bụ na ihe a na-ebepụ dị ole na ole, ọbara anaghị agbafusị nke ukwuu, nanị akpụkpọ ahụ na uru ahụ atọ ka a ga-adụchikwa mgbe e mesịrị, n’adịghị ka asaa a ga-adụchi ma a waa ahụ n’ụdị ahụ a ma ama. Ọzọkwa, usoro a anaghị egbucha oge, ọ naghị enwecha ihe ize ndụ nke ibute ọrịa, ọ na-achọ ọgwụ ole na ole na-akwụsị ahụ mgbu karị, ndị inyom pụkwara ịhapụ ụlọ ọgwụ mgbe ụbọchị atọ ruo ise gasịrị. A gụrụ usoro ahụ aha ụlọ ọgwụ dị n’Israel nke buru ụzọ nwalee ya.
Ọ Dịghị Enwe Mmetụta A Chọrọ
Ụgbọala ndị na-agba n’obodo ukwu na-akpakarị ndidi ndị na-anya ụgbọala aka ọjọọ. Otu nnyocha nke onye ọkà akparamàgwà mmadụ nọ na Mahadum La Sapienza, dị na Rom mere, ekpughewo na ka ụgbọala na-amụba, otú ahụ ka okwu ndị rere ure a na-ekwu banyere ihe ndị metụtara okpukpe na-amụbakwa. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Corriere della Sera si kwuo, ọ bụ nsogbu ụgbọala ndị na-agba n’ụzọ awara awara ndị dị n’ime obodo kpaliri “pasent 54 nke okwu ndị rere ure na akparamàgwà ndị na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka okpukpe.” Otú ọ dị, mgbe ọtụtụ ụgbọala na-agba n’obodo ukwu, “ịchọ ịta ihe oyiyi nke ndị nsọ na Meri a kpụrụ akpụ ụta” na-apụtakwu ìhè. “N’ụbọchị ndị a, ọ bụ ụgbọala ndị na-agba n’ụzọ na-akpata pasent 78 nke okwu ndị rere ure, bụ́ ndị a na-akpọkarị ọnụ ọjọọ, n’ọtụtụ obodo ukwu,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ ụgbọala na-agba n’ụzọ akpatakwuwo nsogbu na Rom n’ihi ọrụ ihe owuwu a na-arụ iji kwadebe maka afọ 2000, bụ́ nke a kpọsaworo dị ka afọ Jubile nke ndị Katọlik bụ́ mgbe ha ga-eme ọpịpịa. “O yiri ihe na-emegide onwe ya ma ọ bụ eziokwu,” ka onye na-ahụ maka ndị nkịtị Na-ekiri Jubile na-ekwu, “na n’ime Rom mmetụta mbụ Jubile ga-enwe pụrụ ịbụ mmụba nke okwu rere ure, kama ịbụ mmụba nke ọpịpịa.”
Tardigrade Siri Ike
A na-eche na tardigrade, bụ́ anụmanụ na-erughị ọkara milimita n’ogologo, bụ anụmanụ kasị sie ike n’ụwa, ka magazin bụ́ New Scientist na-ekwu. A na-akpọkarị ya anụ bear mmiri n’ihi na ọ na-agba kpụrụkpụrụ ma e jiri ígwè microscope lee ya, o nwere ụkwụ asatọ ma dị ka a ga-asị na o yi ihe agha ígwè ma e lee ya anya. Ọ pụrụ ịnagide ọ̀tụ̀tụ̀ oyi dị -270°C ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị 151°C, ụzarị X ray ma ọ bụ ebe ikuku na-adịghị, na ikike nnugharị nke ji okpukpu isii karịa nke dị n’ala oké osimiri kasị omimi. A pụrụ ịhụ ya n’ọwa mmiri ndị dị n’elu ụlọ na n’ime mgbawa ndị dị n’okwute e ji rụọ ụzọ. A tụtewo ụfọdụ n’ime ihe e kere eke ndị a mgbe ha tọgbọsịrị n’emegharịghị ahụ ruo ihe karịrị 100 afọ n’ebe e debere moss kpọrọ nkụ n’ụlọ ndebe ihe mgbe ochie. Gịnị na-eme ka o kwe omume? Ọ bụ ọnọdụ ịkwụsịtụ ịdị ndụ mgbe “ọ tara ahụ ruo pasent 50 ma ọ bụ karịa, tinyere mgbe ọ fọrọ nke nta ka mmiri gharakwa ịdị ya n’ahụ,” ka Prọfesọ Kunihiro Seki, nke Mahadum Kanagawa, dị na Japan, na-ekwu.
Ịkpọrọ Ndị Njem Egwú Ọdịnala
Ugbu a ndị njem na-ege egwú ọdịnala nke ndị na-arọ egwú dị ka Strauss, Vivaldi, Chopin, Tchaikovsky, Mozart, Bach, Bizet, Schubert, na Brahms rọrọ ka ha na-echere ụgbọ okporo ígwè n’ebe 18 n’ime ebe ndị ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị n’okpuru ala na Rio de Janeiro. N’ụzọ dị otú a, ndị ọrụ ụgbọ okporo ígwè okpuru ala na-ele anya “ime ka ndị njem nọrọ jụụ mgbe ha kwụsịtụrụ n’ụzọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ O Globo na-ekwu. Mgbe a họpụtara egwú ndị a chọrọ, “a họọrọ egwú ndị ga-eme ndị njem obi ụtọ ma ghara ime ka ha chee na ebe ahụ ha guzo na-echere ụgbọ okporo ígwè bụ ụlọ egwú.” “A nabatara ya karịa ka a tụrụ anya ya,” ka Luiz Mário Miranda, bụ́ onyeisi azụmahia nke ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè okpuru ala nke Rio de Janeiro, kwuru.
Ụta Dịịrị Mmadụ Nile
“Ụmụ mmadụ ebibiwo ihe karịrị pasent 30 nke ihe ndị e kere eke kemgbe 1970, tinyekwara oké mbibi nke oké ọhịa, nke mmiri dị ọcha na nke ihe ndị dị na mmiri bụ́ ndị na-akwado ndụ,” ka otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian Weekly na-ekwu. Isiokwu ahụ, bụ́ nke dabeere n’otu akụkọ na-adịbeghị anya nke sitere n’aka òtù atọ ọ na-echegbu, tinyere Òtù Ego Ụwa Maka Ihe Ndị E Kere Eke (WWF), na-ekwu na ọ bụ ezie na mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ abụwo ndị a ma ama kasị eji ihe ndị sitere n’okike eme ihe, ugbu a mba ndị na-emepe emepe “na-emebi ihe ndị sitere n’okike ha nwere n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu.” Otu onye ọrụ nke òtù WWF na-ekwu, sị: “Anyị maara na ọ dị njọ, ma anyị aghọtaghị ókè ọ dịruru njọ ruokwa mgbe anyị chịkọtara akụkọ a.” Ọ bụ ezie na akụkọ ahụ na-ata gọọmenti ụta n’ihi na ha akwụsịghị omume ahụ, ọ na-ekwu na “ụta dịịrị onye ọ bụla maka ileghara ihe ndị dị n’ụwa anya,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.