Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/1 p. 3-4
  • 2000—Ọ̀ Bụ Afọ Pụrụ Iche?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2000—Ọ̀ Bụ Afọ Pụrụ Iche?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Mgbe Iri Narị Afọ nke Atọ Ga-amalite?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Afọ 2000 Dịruru ná Mkpa?
    Teta!—1998
  • Puku Afọ Nke Atọ—Ọ̀ Ga-emezu Olileanya Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Oge Ya Na-erubeghị Ka Ọ̀ Bụ Ihe Oge Ya Gafeworo?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/1 p. 3-4

2000—Ọ̀ Bụ Afọ Pụrụ Iche?

Ọ̀ DỊ ihe ọ bụla pụrụ iche banyere afọ 2000? N’ozuzu, ndị bi n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ na-ele ya anya dị ka afọ mbụ n’iri narị afọ nke atọ. A na-eme nkwadebe dị ukwuu iji mee ememe maka ya. A na-etinye nnukwute klọọkụ electronic dị iche iche iji gụọ sekọnd ọ bụla na-agafenụ ruo mgbe narị afọ iri ọhụrụ ahụ ga-amalite. A na-eme nhazi inwe ememe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ maka Chi Ga-efote Afọ Ọhụrụ ahụ. A na-ere t-shirt ndị e dekwasịrị okwu ndị na-egosi ngwụsị nke narị afọ iri n’ụlọ ahịa ndị dị n’ime ime obodo nakwa n’ebe azụmahịa ndị dị n’obodo ukwu.

Chọọchị dị iche iche, ndị ukwu na ndị nta, ga-esonye n’ememe ahụ ga-ewe otu afọ. Ná mmalite afọ ọzọ, a na-atụ anya na Popu John Paul nke Abụọ ga-aga Israel ịga duo ndị Roman Katọlik n’ihe a kpọworo “ememe jubile nke Chọọchị Roman Katọlik maka narị afọ iri ọhụrụ ahụ.” A na-eme atụmatụ na ihe nọ n’agbata ndị njem nleta dị nde abụọ na ọkara na nde isii, malite ná ndị ji okpukpe kpọrọ ihe ruo ná ndị chọrọ nanị ịhụ ihe ga-emenụ, na-eme atụmatụ ịga Israel n’afọ ọzọ.

N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị buru ibu otú a ji na-eme atụmatụ ịga Israel? N’ikwuchitere popu, Roger Cardinal Etchegaray, bụ́ onye ọnụ na-eru n’okwu na Vatican, kwuru, sị: “Afọ 2000 bụ ememe ncheta Kraịst na ndụ ya n’ala a. Ya mere ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na Popu ga-abịa ebe a.” Olee ihe jikọtara Kraịst na afọ 2000? E weere ya n’ebe nile na afọ 2000 bụ kpọmkwem mgbe o zuru afọ 2,000 a mụrụ Kraịst. Ma ọ̀ bụnụ ya? Anyị ga-ahụ.

Afọ 2000 dị ndị so n’òtù okpukpe ụfọdụ mkpa ọbụna karị. Ha kwenyesiri ike na n’ime afọ na-abịanụ ma ọ bụ ihe yiri ya, na Jisọs ga-alọghachi n’Ugwu Olive, a lụọkwa agha Amagedọn ahụ e kwuru maka ya n’akwụkwọ Mkpughe, na ndagwurugwu Megido. (Mkpughe 16:14-16) N’ịtụ anya ihe omume ndị a, ọtụtụ narị ndị bi na United States na-ere ebe obibi ha na ihe ka ukwuu n’ihe onwunwe ha ma na-akwaga Israel. Maka abamuru nke ndị ọ bụla na-apụghị ịhapụ ebe obibi ha, otu onye United States a ma ama na-ekwusa ozi ọma ekwewo nkwa, dị ka a kọrọ, ịkpọsa nlọghachi Jisọs na telivishọn—n’àgwà zuru ezu!

N’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, a na-emesiwanye atụmatụ ike iji dozie ụzọ maka iri narị afọ nke atọ ahụ. Otú ọ dị, ndị bi n’ala ndị ọzọ na-agara onwe ha ihe dịịrị ha. Ndị a—ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị bi n’ụwa—ekweghị na Jisọs onye Nazaret bụ ya bụ Mesaịa ahụ. Ha anakwerechaghịkwa usoro ịgụ oge bụ́ B.C.-A.D.a Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Alakụba na-eji kalenda nke ha eme ihe, bụ́ nke na-egosi na afọ na-abịanụ ga-abụ 1420—ọ bụghị 2000. Ndị Alakụba na-agụ afọ malite n’oge onye amụma bụ́ Muḥammad si Mecca gbaga Medina. N’ozuzu, ndị mmadụ nọ n’ụwa nile na-eji ihe dị ka kalenda 40 dị iche iche eme ihe.

Afọ 2000 ò kwesịrị inwe ihe ọ pụtara nye ndị Kraịst? January 1, 2000, ọ̀ bụ n’ezie ụbọchị pụrụ iche? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’usoro ịgụ oge nke B.C.-A.D., a na-ewere ihe ndị mere tupu oge ahụ e kwenyere kemgbe ụwa na ọ bụ mgbe a mụrụ Jisọs, dị ka ihe ndị mere n’afọ “B.C.” (tupu Kraịst); a na-akpọ ndị mere mgbe ọ gasịrị ihe ndị mere n’afọ “A.D.” (Anno Domini—“n’ime afọ nke Onyenwe anyị.”) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkà mmụta ma nke a na-akọ na-enwe mmasị karị iji nkọwa ndị na-abụghị nke okpukpe bụ́ “T.O.A.” (tupu Oge Anyị) na “O.A.” (nke Oge Anyị) eme ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya