Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 5/8 p. 14-15
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Afọ 2000 Dịruru ná Mkpa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Afọ 2000 Dịruru ná Mkpa?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova, Onye Na-edebe Oge
  • “Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-abụ?”
  • Olee Mgbe Iri Narị Afọ nke Atọ Ga-amalite?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • 2000—Ọ̀ Bụ Afọ Pụrụ Iche?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Puku Afọ Nke Atọ—Ọ̀ Ga-emezu Olileanya Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Oge Ya Na-erubeghị Ka Ọ̀ Bụ Ihe Oge Ya Gafeworo?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 5/8 p. 14-15

Echiche nke Bible

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Afọ 2000 Dịruru ná Mkpa?

IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ adịtụghị ejikọ okpukpe n’ihe afọ 2000 ga-eweta ná mba Ebe Ọdịda Anyanwụ nakwa n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ndị Juu, ndị Alakụba, na ndị Hindu nwechara kalenda okpukpe nke ha nke na-adabaghị na ndị nke Ebe Ọdịda Anyanwụ. Maka akara ụbọchị okpukpe na nke ọdịnala, ndị China na-agbaso kalenda e ji ọnwa na-agụ. N’ihi ya, ọtụtụ ijeri ndị mmadụ taa, ikekwe ihe ka ọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa, ewereghị afọ 2000 dị ka nke pụrụ iche.a

Ka o sina dị, karịsịa ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ọtụtụ ndị ji ọchịchọ ịmata ihe na-echere mmalite na-eru nso nke narị afọ iri nke na-abịanụ dị ka ọ dị na kalenda nke Gregory. Nye ndị ụfọdụ ọ karịrị nanị ọchịchọ ịmata ihe. Ha na-ele afọ 2000 anya dị ka nke ga-amalite ọgbọ ọhụrụ, dị ka oge oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme. Ọtụtụ ndị na-asị na ha kwere na Bible na-ejikọ mmezu nke amụma dị iche iche na afọ 2000. Ụfọdụ na-atụ anya ngosipụta ime mmụọ dị ukwuu. Ndị ọzọ na-atụ egwu mbibi—ọgwụgwụ ụwa. Bible ọ̀ na-enye ihe ndabere ọ bụla maka atụmanya ndị a?

Jehova, Onye Na-edebe Oge

A kọwara Chineke nke Bible dị ka “Onye ochie.” (Daniel 7:9) Ọ na-achịkwa oge n’ụzọ zuru okè, dị ka ọ pụtara ìhè n’ịrụ ọrụ nke ọtụtụ n’ime ihe ndị o kere eke, site n’ịgba gburugburu nke mbara ụwa ruo ná ngagharị nke ụmụ irighiri ihe ndị dị nta karịa atọm. O nwere usoro ndokwa oge nke ya ọ na-agbasochi anya. “O debesịrị oge ha a kaworo aka na ókè nile nke ebe obibi ha,” ka Bible na-ekwu. (Ọrụ 17:26) Jehova bụ ezigbote Onye Na-edebe Oge.

N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Bible na-eleba anya kpọmkwem n’ọgụgụ oge. Ọ na-enye ihe ndekọ e jikọtara ọnụ nke na-enye ohere maka ngụkọ dị n’usoro laa azụ ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ngụkọ dị otú ahụ na-atụ aka na 4026 T.O.A dị ka afọ Chineke kere Adam. Ihe dị ka afọ 2,000 mgbe e mesịrị, a mụrụ Abraham. Puku afọ abụọ ọzọ agafeworị ka ọ na-erule oge a mụrụ Jisọs.

Ụfọdụ ndị na-amụ usoro ngụkọ oge Bible echepụtawo usoro mgbakọ ndị masịrị ha ndị na-atụ aka n’oge ụfọdụ kpọmkwem n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, n’iwere oge ndị sochiri ibe ha nke ihe dị ka afọ 2,000 nke kewara Adam, Abraham, na Jisọs dị ka ihe ndabere, ụfọdụ na-ebu amụma ihe omume na-eyi egwu ná ngwụsị nke ogologo oge ahụ dị afọ 2,000 kemgbe ọmụmụ Jisọs gasịrị. Nke a bụ nanị otu ihe atụ n’ime ọtụtụ usoro mgbakọ oge ndị e kwuru na ọ dabeere n’usoro ngụkọ oge Bible.

N’eziokwu, Bible na-ekwu banyere mgbe Jehova Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ site n’iwepụ ihe ọjọọ na iguzobe ụwa ọhụrụ. Amụma Bible na-ekwu banyere “mgbe nke ọgwụgwụ ihe nile,” “ọgwụgwụ oge a,” “mgbe ikpeazụ,” na “ụbọchị ahụ nke Chineke.” (Daniel 8:17; Matiu 24:3; 2 Timoti 3:1; 2 Pita 3:12) Otú ọ dị, “ọgwụgwụ ihe nile” ahụ e buru n’amụma na Bible enweghị ihe jikọrọ ya na afọ 2000 n’ụzọ ọ bụla. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’Akwụkwọ Nsọ nke na-eme ka ọgwụgwụ nke narị afọ iri nke abụọ dị mkpa n’ụzọ pụrụ iche dị ka a gbakọtara na kalenda Gregory.

“Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-abụ?”

Ndị ozi Jisọs gosiri oké mmasị n’usoro ndokwa oge Chineke mgbe ha jụrụ Jisọs, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ, NW] Gị na nke ọgwụgwụ oge a?” (Matiu 24:3) Ọtụtụ ndị taa na-enwekwa ọchịchọ yiri nke ahụ nke ịmata banyere ọdịnihu. Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị inwe oké mmasị n’amụma Bible ndị dị otú ahụ dị mkpa na oge mmezu ha. Otú ọ dị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịnakwere na ịkwanyere echiche Chineke ùgwù n’okwu ahụ.

Site n’aka Ọkpara ya, Jehova ekpughewo nzube ya, o nyewokwa azịza doro anya n’okwu a. Nwa oge tupu Jisọs arịgoro n’eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ banyere oge mmezu nkwa dị iche iche nke Chineke. Jisọs zara, sị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya.” (Ọrụ 1:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otu oge tupu mgbe ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.”—Matiu 24:36.

N’ụzọ doro anya, “ịma oge ma ọ bụ ụbọchị,” karịsịa mgbe a bịara ná mmezu amụma dị iche iche nke Bible n’ọdịnihu, adịghị n’ike nke mmadụ. Chineke ahọrọwo ịghara ikpughere anyị ihe ọmụma dị otú ahụ. (Matiu 24:22-44) Ànyị pụrụ n’ụzọ ọ bụla ịgbanwe nzube Chineke site n’ịghọta “ụbọchị na oge hour ahụ” n’onwe anyị, n’ụzọ megidere ọchịchọ ya? O doro anya na nke a agaghị ekwe omume. (Ọnụ Ọgụgụ 23:19; Ndị Rom 11:33, 34) Bible na-asị: “Ndụmọdụ Jehova na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 33:11) Ebe ọ bụ Chineke pụrụ ime ihe nile, ọ na-enwe ihe ịga nke ọma mgbe nile.—Aịsaịa 55:8-11.

N’agbanyeghị ikike Chineke nwere idebe “ịma oge ma ọ bụ ụbọchị . . . n’ike nke aka ya,” ọ ka na-amasị ọtụtụ ndị ịkọ nkọ. Ụfọdụ na-aghọ ndị ji aka ha mee onwe ha ndị na-ebu amụma ọdachi. N’ihi nke a Pọl onyeozi nyere ndị Tesalọnaịka ntụziaka doro anya banyere ihe ize ndụ dị n’ige ndị na-akọ nkọ banyere akara ụbọchị ntị. O dere, sị: “Anyị na-arịọ unu, . . . ka e wee ghara isite n’aka mmụọ, ma ọ bụ okwu, ma ọ bụ akwụkwọ ozi dị ka ò sitere n’aka anyị, mee ka unu mee mkpatụ pụọ n’uche unu ọsọ ọsọ, ma ọ bụ ka unu tụọ ụjọ, dị ka a ga-asị na ụbọchị Onyenwe anyị dị ugbu a: unu ekwela ka onye ọ bụla ghọgbuo unu n’ụzọ ọ bụla.”—2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-3.

Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na nzube Chineke maka ọdịnihu ga-emezurịrị n’oge ọ kara aka, kpọmkwem n’ụbọchị na hour ọ họpụtara. (Habakuk 2:3; 2 Pita 3:9, 10) Anyị kwenyekwara na ihe omume ndị a ga-ewere ọnọdụ n’ọdịnihu na-adịghị oké anya. (2 Timoti 3:1-5) Otú ọ dị, anyị adịghị akọ nkọ ma ọ bụ na-akwado nchepụta ndị na-aba ụba taa.b N’ezie, ma afọ 2000, ma afọ 2001, ma ọ bụ ọgwụgwụ oge ọ bụla ọzọ nke ụmụ mmadụ setịpụrụ enweghị ihe jikọrọ ya na usoro ndokwa oge nke Jehova.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ịkpọ okwu aha kpọmkwem, ihe a na-akpọ narị afọ iri nke atọ ga-amalite na January 1, 2001. Narị afọ iri nke mbụ malitere n’otu ebe, bụ́ n’afọ 1. Otú ọ dị, ọha na eze na-ejikọ okwu ahụ bụ́ “narị afọ iri nke atọ” na afọ 2000. Isiokwu a na-elekwasị anya n’atụmanya zuru ebe nile banyere afọ 2000.

b  Mbipụta Ụlọ Nche nke September 1, 1997, peji nke 21-22, kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova achọsiwo ike ịmara mgbe ụbọchị Jehova ga-ewere ọnọdụ. N’ịchọsi ihe ike ha, mgbe ụfọdụ ha anwawo ime atụmatụ mgbe ọ pụrụ ịbịa. Ma site n’ime otú ahụ, ha ahapụwo, dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs n’oge mbụ, ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Onyenwe ha nke na anyị ‘amataghị mgbe oge ahụ bụ.’ (Mak 13:32, 33) Ndị na-akwa emo akwawo ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasi obi emo n’ihi atụmanya ha oge ha na-erubeghị. (2 Pita 3:3, 4) Ka o sina dị, ụbọchị Jehova ga-abịa, ka Pita na-emesi ike, dị ka usoro ọgụgụ oge Ya si dị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya