Ihe Oge Ya Na-erubeghị Ka Ọ̀ Bụ Ihe Oge Ya Gafeworo?
A NA-EKWU ọtụtụ ihe ugbu a banyere mmalite nke narị afọ nke 21 na narị afọ iri nke atọ ka ọmụmụ Jisọs Kraịst gasịrị. Magazin Newsweek kwuru na “narị afọ nke 20, bụ́ nke malitere dị ka Narị Afọ nke Agha Zuru Ebe Nile ma mesịa ghọọ Ọgbọ Bọmbụ Atọm, yiri ka ọ na-agwụsị dị ka Ọgbọ Ntụrụndụ.” Ná mbipụta ya nke January 22, 1997, ọ kọrọ, sị: “E werechaworị họtel ndị dị gburugburu ụwa” maka ememe n’Abalị Ga-efote Afọ Ọhụrụ, bụ́ December 31, 1999.
Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ekwu na a na-eme ememe ndị ahụ mgbe oge ha na-erubeghị. Ha na-akọwa na n’adịghị ka ihe ọtụtụ ndị kweere, narị afọ nke 21 na narị afọ iri ọhụrụ ahụ agaghị amalite na January 1, 2000, kama na January 1, 2001. Ebe ọ bụ na e nweghị afọ bụ 0, narị afọ mbụ malitere n’afọ 1 ruo 100, narị afọ nke abụọ malitere n’afọ 101 ruo 200, si otú a gawa. N’ihi ya a na-arụ ụka na narị afọ nke 20, bụ́ nke malitere na January 1, 1901, na narị afọ iri nke abụọ, bụ́ nke malitere na January 1, 1001, agaghị agwụsị ruo December 31, 2000.
E nwere ihe ọzọ a ga-atụle. Kalenda anyị kewasịrị oge na-adabere na tupu ma ọ bụ mgbe ọmụmụ Kraịst gasịrị. Ndị ọkà mmụta na-amata ugbu a na a mụrụ Jisọs tupu oge ahụ e cheburu, si otú a na-eme ka ebe a gbakwasịrị ụkwụ na-agụ oge bụrụ nke na-ezighị ezi. E nwere echiche dịgasị iche banyere mgbe a mụrụ Jisọs, ma usoro ngụkọ oge Bible na-arụ aka n’afọ 2. T.O.A. N’ịdabere ná ngụkọ ahụ, narị afọ iri nke atọ ka ọmụmụ Kraịst gasịrị malitere n’ezie n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ a! A pụrụ inwetakwu ihe ọmụma ná mbipụta Teta! (Bekee) nke May 22, 1997, na peji nke 28, na nke December 22, 1975 (Bekee), na peji nke 27.a
Ka o sina dị, ọ bụ ihe amamihe izere iji ịgba isi akwara na-ekwu na narị afọ nke 21 na narị afọ iri ọhụrụ ahụ ga-amalite n’ime nanị izu ole na ole na-abịanụ. Otú o sina dị, n’ihi echiche ọtụtụ ndị nwere, Teta! na-eche na o kwesịrị ugbu a ka a tụlee isiokwu bụ́ “Narị Afọ nke 20—Afọ Ndị E Nwere Oké Mgbanwe na Ha.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Leekwa mbipụta Ụlọ Nche nke November 1, 1999.