Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 6/1 p. 3-4
  • Puku Afọ Nke Atọ—Ọ̀ Ga-emezu Olileanya Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Puku Afọ Nke Atọ—Ọ̀ Ga-emezu Olileanya Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Mgbe Iri Narị Afọ nke Atọ Ga-amalite?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • 2000—Ọ̀ Bụ Afọ Pụrụ Iche?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Oge Ya Na-erubeghị Ka Ọ̀ Bụ Ihe Oge Ya Gafeworo?
    Teta!—1999
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Afọ 2000 Dịruru ná Mkpa?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 6/1 p. 3-4

Puku Afọ Nke Atọ—Ọ̀ Ga-emezu Olileanya Gị?

ỌGỤGỤ oge ikpeazụ ahụ amalitewo. Otu klọkụ nke dị n’ihu ụlọ nzukọ ọdịnala nke Beaubourg dị na Paris, France, na-egosi sekọndị ole fọdụrụnụ. Ọ ga-anọgide gụrụ oge na-agbada ruo etiti abalị nke December 31, 1999. N’oge ahụ, otu ihe ga-eme, bụ́ nke a hụworo nanị otu ugbo n’ime Oge Anyị a: mkpọbata nke puku afọ ọhụrụ, bụ́ puku afọ nke atọ.

Onye na-eme nnyocha ihe banyere ọha mmadụ bụ Bernward Joerges, onye Berlin, Germany, tụrụ aro kwuo, sị, “N’otu ụzọ, afọ 2000 bụ ‘ihe omume a kasị na-atụ anya ya’ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.” N’ihi gịnị ka e ji na-atụ anya ya n’ụzọ dị otú ahụ? E kwuwerị, afọ 2000 bụ nanị otu afọ dị n’usoro ọgụgụ oge. Ọzọkwa, ọ bụ nanị ndị na-agbaso usoro kalenda nke Ọdịda Anyanwụ ụwa matara afọ ahụ n’ụzọ dị otú ahụ. Dị ka kalenda nke ndị Alakụba sị dị, afọ 2000 O.A. dabara n’afọ ndị Alakụba bụ 1420; dị ka kalenda nke ndị Juu si dị, ọ bụ 5760 A.M.

Ma n’otu ajụjụ ọnụ akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị na Sweden, bụ́ Dagens Nyheter jụrụ ya, Professor Joerges kọwara, sị: “N’ihi mba dị iche iche ịchị mba ndị ọzọ, usoro ọgụgụ oge Gregory nke anyị na-eji eme ihe, bụ́ nke malitere mgbe ahụ e chere na a mụrụ Kraịst, agbanyewo mkpọrọgwụ n’akụkụ dị ukwuu nke ụwa.” Otú a, afọ 2000 ga-abụ akara oge zuru ụwa ọnụ nye akụkụ dị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Professor Joerges kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-ekwe ka ihe omume nke a metụta akụkọ ndụ nke onwe ha nakwa ihe ọ bụla ọzọ.”

Ma, ọtụtụ ndị bu ihe ndị ọzọ n’uche karịa nanị ịka akara oge. Joerges kwuru, sị, “Nnukwu atụmatụ na usoro ihe omume dị iche iche iji ‘kaa akara,’ meekwa ka ihe omume nke a bụrụ ememe gbara ọkpụrụkpụ amaliteworị n’akụkụ nile nke ndụ na n’usoro nile nke ọha mmadụ.” O kwukwara na “gburugburu ụwa dum, ndị nnukwu mmadụ ndị na-eme atụmatụ dị iche iche na ‘ndị ọkà n’ime ihe ngosi’ anọwo na-echepụta, na-ahazikwa oké ihe omume dị iche iche.” Ndị ọzọ na-akọ ihe pụrụ ime n’ọdịnihu na-ekwu na anyị ga-enwe nnupụta nke ọtụtụ akwụkwọ dị iche iche banyere puku afọ nke gara aga. Usoro mgbasa ozi nile ga-enwe oké mkpali n’ihi mmalite nke puku afọ ọhụrụ ahụ. Otu ụlọ ọrụ TV dị na West Germany na-eme atụmatụ igosi mwapụta anyanwụ gburugburu ụwa ruo ogologo oge di 24 awa.”

O dokwara anya na ndị mgbasa akụkọ ga-eme oké mkpọtụ banyere nwa ikpeazụ a mụrụ na 1999 na nke mbụ a mụrụ n’afọ 2000. Ndị ntá akụkọ ga-enwe oké mmasị ịchọta mmadụ ole na ole fọdụrụnụ, bụ́ ndị a mụrụ n’ime narị afọ nke iri na itoolu iji jụta ụdị mmetụta ha na-enwe ịbụ ndị dịworo ndụ n’ime narị afọ atọ dị iche iche na puku afọ abụọ dị iche iche! ọbụna na ụfọdụ ndị na-eche na oké mkpali a ga-enwe banyere puku afọ nke a ga-akpali oké ọgba aghara n’etiti ụmụ mmadụ. Dị ka otu akụkọ ọdịnihu na-eyi egwu si kwuo, ozugbo ọ kụrụ etiti abalị n’Anyasị Ga-abọ Afọ Ọhụrụ ahụ, ọtụtụ ndị ga-egbu onwe ha.

N’agbanyeghị ihe ndị ahụ doro anya na ha bụ imebiga ihe ókè, o kwere nghọta na ihe omume ahụ ga-akpali oké mmasị. Nye ọtụtụ ndị bi n’ime ụwa anyị nke nsogbu na-anyịgbu, a na-ele puku afọ ọhụrụ ahụ anya dị ka isi iyi nke olileanya, bụ ụzọ na-eduba n’ọdịnihu ka mma. Ụfọdụ ndị na-atụ anya na ọkà mmụta sayensị na nkà na ụzụ ga-emepụta ọdịnihu ebe anyị ga-eri nri nke ọma karị, dịkwa ogologo ndụ karị, na-arụ ọrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ di ala karị, na-anọkwa n’ụlọ karị; ebe ígwè ọrụ robot ga na-arụrụ anyị ọrụ ndị na-agwụ ike; ebe a ga-eji usoro ngwakọta fusion a chịkwara achịkwa mee ka mmiri ghọọ ihe na-enye ike eletrik. Ha nwere olileanya nke ọdịnihu ebe a ga-enwe usoro TV holograph, telifonu ndị na-egosi foto ndị na-ekwu okwu na ha, ígwè fax ndị na-ebipụta ihe n’àgwà dị iche iche, na ígwè telifonu ndị na-asụgharị okwu a na-ekwu na ya ozugbo ahụ. Ha na-arọ nrọ banyere ije wagharịa n’Ọnwa, Mars, ma ọ bụ mbara ala ndị ọzọ di na mbara igwe, na-egwupụta akụ dị na ha.

Ma ọ bụghị mmadụ nile nwere olileanya ọma dị otú ahụ. Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha na-eche na puku afọ ọhụrụ ahụ ga-ewebata oge mgbe a ga-enwe ntiwapụ ụba mmadụ n’elu ụwa n’ụzọ a na-apụghị ịchịkwata achịkwata, mgbe gburugburu ebe obibi ga-eretọsịkwa. Mmetọ nke ikuku na mmiri ga-eme ka gburugburu elu ala dum bụrụ ụlọ e kwuchigidere ekwuchigide nke nwere oké okpomọkụ. Ebe dị iche iche e nwere oké mkpụkọba ice ga-agbaze, oké osimiri dị iche iche ga-ejubigakwa ókè, na-erikpu ala ebe na-emepụta nri, ebe ndị mmadụ bijukwara, ma na-eme ka ọtụtụ nde eka nke ala ubi ghọọ ọzara. Ha na-elepụ anya wee hụ ndakpọ akụ na ụba zuru ụwa ọnụ, eguzosighị ike nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ga-eme ka gọọmenti na usoro ọha mmadụ dị iche iche mee mkpatụ, oké mmụba nke imempụ, nke kasịkwa njọ, oké nrechapụ n’agha nuklia nke ga-ekpochapụ ndụ mmadụ nile.

Ndị na-akọ ihe pụrụ ime n’ọdịnihu nwere ọtụtụ ihe ha na-akọ, ma ha enweghị ihe dị ukwuu ha ji n’aka kpọmkwem na ọ ga-eme mgbe a bịara n’ihe banyere puku afọ nke na-abịanụ. E nwere nnọọ ọtụtụ ihe a na-apụghị ịhụta ihe ọdịnihu ha ga-abụ nke na ọ ga-esi ike ịkọ n’ụzọ ziri ezi ihe ọdịnihu ga-abụ. Otu onyeọkà n’ịkọ ihe ọdịnihu ga-abụ ji nke a tụnyere iti okwe chess, na-asị: “Tupu m tipụ okwe, ana m elepụ anya ruo ókè o kwere m mee n’ugbo ole m pụrụ iti okwe n’ihu. Ma mgbe onye mụ na ya na-eti okwe tiri nke ya, m na-amalitekwa n’isi.”

Ọ bụ nanị oge ga-egosi ihe afọ 2000 ga-eweta. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ọdịnihu gị aghaghị ịbụ ihe a na-ejighị n’aka. Bible na-enye ihe àmà zuru ezu nke na-egosi na anyị nọ nso mmalite nke otu puku afọ dị mkpa nke ukwuu karị nke ahụ ga-amalite n’ihe na-erukwaghị afọ iri. Puku Afọ nke a na-abịanụ ga-agabiga ihe nile ụmụ mmadụ tụrụ anya ha! Gịnị kpọmkwem ka nke a pụtara? Gịnị ka ọ ga-apụta? Anyị na-akpọ gị òkù ka ị gụọ isiokwu anyị na-esonụ wee mụta ihe Bible nwere ikwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya