Akụkọ Alaeze nke 36
Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?
Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Ọ̀ Bụ Mmalite nke Ọgbọ Ọhụrụ?
NARỊ afọ nke 20 gwụsịrị n’etiti abalị December 31, 1999.a Ọ bụ narị afọ nke e nwere ọtụtụ oké ọgba aghara na ya. E nwekwara mmalite nke nkà na ụzụ ọhụrụ dị iche iche na ya, ọganihu na nkà mmụta ọgwụ ndị dị ịrịba ama, njubiga ókè nke ihe ọmụma, na akụ̀ na ụba ụwa nke na-eto n’ike n’ike. Ya mere ọtụtụ ndị anabatawo narị afọ iri ọhụrụ a dị ka mgbe a ga-enwe olileanya na mgbanwe. Agha, ịda ogbenye, mmetọ nke gburugburu ebe obibi, na ọrịa, hà ga-akwụsị na ya ma eleghị anya?
Ọtụtụ mmadụ na-eche otú ahụ. Ma olee otú o si yie ka narị afọ iri ọhụrụ a ọ̀ ga-eweta mgbanwe ndị ga-abara gị uru—mgbanwe ndị ga-eme ka ndụ gị na ezinụlọ gị nwee nchebe? Tụlee otú nanị ole na ole n’ime nsogbu ndị anyị na-eche ihu bururu n’ibu.
Mmetọ
Mba ndị nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ mmepụta ihe “na-emebi gburugburu ebe obibi n’ụwa nile ma na-akpata mmetọ zuru ụwa ọnụ, na-emeghasịkwa usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha.” Ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme ugbu a adịrị gawa, “gburugburu ebe obibi anyị ga-adakpọ n’ụzọ dị ukwuu.”—“Global Environment Outlook—2000,” Ihe Omume Mba Ndị Dị n’Òtù Maka Gburugburu Ebe Obibi.
Ọrịa
“Mgbe ọ na-erule afọ 2020, a na-atụ anya na ọrịa ndị na-adịghị efe efe ga-akpata ọnwụ nke mmadụ asaa n’ime mmadụ iri ọ bụla nwụrụnụ n’ebe ndị na-emepe emepe, ma e jiri ya tụnyere ihe na-erughị ọkara ya taa.”—“The Global Burden of Disease,” Harvard University Press, 1996.
Ndị ọkachamara ụfọdụ na-ekwu na “mgbe ọ na-erule 2010, ọnụ ọgụgụ ndị [ga-adị ndụ] ná mba 23 bụ́ ebe ọrịa [AIDS] kasị akpa ike ga-eji nde mmadụ 66 dị ala karị.”—“Confronting AIDS: Evidence From the Developing World,” bụ́ akụkọ sitere n’aka Òtù Ndị Europe na Ụlọ Akụ̀ Ụwa.
Ịda Ogbenye
“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ 1.3 na-adabere n’ihe na-erughị otu dollar n’ụbọchị, ihe fọkwara nke nta ka o ruo 1 ijeri mmadụ apụghị iri ihe ndị bụ́ isi ahụ ha chọrọ.”—“Human Development Report 1999,” Atụmatụ Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu.
Agha
“Ihe ike a na-eme [n’ọtụtụ ala] pụrụ iru ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. N’ịbụ nke [nkewa] agbụrụ, ebo, na okpukpe na-akpata, . . . ime ihe ike dị otú ahụ ga-emejupụta . . . ụdị ọgụ a ga na-alụkarị n’afọ iri abụọ na ise gaje ịbịa . . . , na-egbu ọtụtụ narị puku mmadụ kwa afọ.”—“New World Coming: American Security in the 21st Century,” Òtù Ọrụ United States Maka Nchebe Mba/Narị Afọ nke 21.
Ya mere oké ngosi na obi ụtọ e nwere n’ihi narị afọ iri ọhụrụ na-ekpuchi eziokwu ahụ bụ́ na mmetọ, ọrịa, ịda ogbenye, na agha na-akawanye njọ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ihe na-akpata nsogbu ndị a bụ anyaukwu, enweghị ntụkwasị obi, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị—àgwà ndị a na-apụghị ikpochapụ nanị site ná nnyocha sayensị, nkà na ụzụ, ma ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Narị Afọ Iri Nke Ga-agọzi Ihe A Kpọrọ Mmadụ
Otu onye edemede oge ochie kwuru otu mgbe, sị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọ bụghị nanị na mmadụ enweghị ike nke ịchị ụwa, o rughịkwara ya. Ọ bụ nanị Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, ka o ruuru, ọ makwaara ụzọ isi gwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Ndị Rom 11:33–36; Mkpughe 4:11.
Ma olee mgbe? N’ụzọ dị aṅaa? E nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi na anyị nọ nso ọgwụgwụ nke “mgbe ikpeazụ” nso. Biko sapee Bible gị ma gụọ 2 Timoti 3:1-5. Ọ na-akọwa n’ụzọ doro anya àgwà ndị mmadụ ga-enwe ‘n’oge ndị a dị oké egwu.’ Matiu 24:3-14 na Luk 21:10, 11 na-akọwakwa “mgbe ikpeazụ.” Ebe ndị ahụ na-ekwu banyere ihe ndị a na-ahụ anya meworo eri 1914, dị ka agha zuru ụwa ọnụ, ọrịa na-efe efe, na ụnwụ zuru ebe nile.
N’oge na-adịghị anya “mgbe ikpeazụ” ga-agwụsị. Daniel 2:44 na-ekwu, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze [ụwa] ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere e buru amụma na Chineke ga-eguzobe Alaeze, ma ọ bụ gọọmenti, ga-achị ụwa. Dị ka Mkpughe 20:4 si kwuo, gọọmenti a ga-achị otu puku afọ—narị afọ iri! Tụlee nnọọ ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ọnọdụ ndụ ga-esi ka mma nye ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ime Narị Afọ Iri a dị ebube:
Akụ̀ na Ụba. “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Ahụ Ike. “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24; 35:5, 6.
Gburugburu Ebe Obibi. Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya. “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.”—Aịsaịa 11:9.
Ọtụtụ nde mmadụ nwere okwukwe ná nkwa ndị a nke Bible, n’ihi ya kwa ha enwewo nchekwube na echiche ziri ezi banyere ọdịnihu. N’ihi ya, ha pụrụ ịnagide nrụgide na nsogbu nke ndụ karị. Olee otú Bible pụrụ isi ghọọ ihe na-eduzi ndụ gị?
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ!
Sayensị na nkà na ụzụ pụrụ ịdọrọ mmasị n’ụzọ dị ukwuu mgbe ụfọdụ! N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ọmụma ụmụ mmadụ emebeghị ka ndụ dị nchebe ma bụrụ nke na-ewetara ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ mmadu obi ụtọ. A kọwara ihe ọmụma nanị ya pụrụ ime nke a na Bible na Jọn 17:3, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”
Ihe ọmụma dị otú ahụ dị n’ime Bible. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-ekwupụta na ha kwenyesiri ike n’akwụkwọ ahụ dị nsọ, ọ bụ mmadụ ole na ole nyochatụworo ya n’onwe ha. Gịnị banyere gị? N’ikwu eziokwu, ịgụ Bible na-achọ mgbalị dị ukwuu. Ma o kwesịrị ya. Bible bụ nanị akwụkwọ “si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16.
Oleezi otú ị pụrụ isi malite ịmara Bible? Gịnị ma ị nabata enyemaka nke Ndịàmà Jehova? Ha na-enye ọtụtụ nde mmadụ ntụziaka n’ụlọ nke aka ha, n’anaghị ha ego maka ya. Iji nyere gị aka na nke a, ha na-eji akwụkwọ dị iche iche dabeere na Bible eme ihe, dị ka broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ọ na-aza ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị ị pụrụ inwe banyere Bible n’ụzọ doro anya, dị ka: Ònye bụ Chineke? Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa? Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee otú Bible pụrụ isi mee ka ndụ ezinụlọ gị ka mma?
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka otu n’ime Ndịàmà Jehova bịa na nke gị, biko dejupụta mpempe akwụkwọ a a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị n’ala. Obi ga-adị ha ụtọ inyekwu g̣ị ihe ọmụma banyere Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ dị ebube nke Alaeze Chineke!
□ Aga m achọ inweta broshuọ ahụ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’ebe a, anyị na-ezo aka n’echiche ọtụtụ ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ nwere banyere narị afọ iri ọhụrụ. Ma e nyochasịwa ya, narị afọ iri ọhụrụ ga-amalite na January 1, 2001.