Ịzụlite Mmasị nke Akụkọ Alaeze nke 36 Kpalitere
1 Ì kesachaala Akụkọ Alaeze nke 36 e kenyere gị? Ọ na-ajụ ajụjụ bịara n’oge ya nke mmadụ nile ga-atụgharị uche na ya: “Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-ewetara Gị?” Ka afọ 2000 na-eru nso, e nwegasịrị atụmanya dị iche iche banyere ihe narị afọ iri ọhụrụ ga-eweta. Akụkọ Alaeze nke 36 na-atụle ụfọdụ n’ime atụmanya ndị ahụ ma na-echetara anyị na ọnọdụ ụwa adịghị enye ihe ndabere maka inwe nchekwube. Nanị narị afọ iri nke ga-eweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-achọ bụ Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst Jisọs. Obi ike anyị nwere n’ịdị adị nke Alaeze ya akpaliwo anyị ikenye onye ọ bụla anyị nwere ike Akụkọ Alaeze nke 36.
2 Nzaghachi n’Ebe Akụkọ Alaeze Dị: Nkesa ndị ọzọ e kesara Akụkọ Alaeze tupu ugbu a abụworo anyị ihe mkpali ọma n’ọrụ anyị. Banyere Akụkọ Alaeze nke 35, alaka Canada dere, sị: “Ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ nọ n’ubi ji ịnụ ọkụ n’obi kwado mkpọsa a pụrụ iche, e nwetakwara ọtụtụ ahụmahụ na-agba ume.” Obi abụọ adịghị ya na i gosiwo ịnụ ọkụ n’obi yiri nke ahụ maka nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36.
3 E mere ndokwa ka mkpọsa nke Akụkọ Alaeze nke a na-eme ugbu a jedebe na November 17, 2000. À rụzuwo ókèala nile e kenyere ọgbakọ unu? Ọ bụrụ na a rụzubeghị ha, ndị okenye pụrụ ikwu ka unu nọgide na-eme mkpọsa ahụ ruo ná ngwụsị November.
4 Ka ọ dịgodị, gịnị bụ mmeghachi omume e nwere banyere nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36 n’ókèala unu? Mmadụ ole na ole ga-edejupụta mpempe akwụkwọ ahụ a na-adọkapụta adọkapụta nke dị n’azụ ya, ma rịọ ka e zitere ha broshuọ Na-achọ na/ma ọ bụ ka e duziere ha ọmụmụ Bible ebe obibi. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị gosiri mmasị ná mmalite n’isiokwu metụtara narị afọ iri eyighị ka ha ga-eme ihe banyere ya ruo mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova gaghachiri. E kwesịrị iletaghachi ndị nile gosiworo mmasị. Olee mgbe ga-adị mma ime nke a? Nsochi ahụ kwesịrị ịbụ ngwa ngwa o kwere mee.
5 Rịba ama ahụmahụ ndị a si ná nletaghachi e mere n’ebe ndị e nyefere Akụkọ Alaeze nke 35 pụta. Otu ọsụ ụzọ na Ireland hapụụrụ onye nwe otu ụlọ nri Akụkọ Alaeze. Nwanyị ahụ nwere mmasị n’ozi ahụ ma gwa nwanna nwanyị ahụ ka ọ bịaghachi. Nwanna nwanyị ahụ gaghachiri n’ime ụbọchị abụọ, a malitekwara ọmụmụ Bible. Na Denmark, e debere otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze n’otu ụlọ bụ́ ebe mmadụ na-anọghị. N’otu ụbọchị ahụ, nwanyị bi n’ebe ahụ zigaara alaka ụlọ ọrụ mpempe akwụkwọ ahụ a na-adọkapụta adọkapụta, bụ́ ndị zigaara ya ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Tupu izu ahụ agafee, ụmụnna nwanyị abụọ kpọtụụrụ ya, e mere ndokwa maka ọmụmụ ihe, nwanyị ahụ gakwara nzukọ mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze!
6 Ihe Ị Ga-ekwu Mgbe Ị Gaghachiri: Ime nletaghachi n’ebe ndị e nyefere Akụkọ Alaeze dịtụ mfe ma bụrụkwa akụkụ ozi anyị nke na-enye ọṅụ. Mgbe ị na-aga, ọ ga-ekwesị ekwesị ka i jide Akụkọ Alaeze nke 36, ebe ọ pụrụ ịbụ na onye nwe ụlọ ejighị nke ya. Ị pụrụ ịnwale aro ndị a.
7 Mgbe i chetasịịrị onye nwe ụlọ onye ị bụ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Enyere m gị otu mpempe akwụkwọ a pịara apịa nke a kpọrọ ‘Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-ewetara Gị?’ Ọ́ bụghị ihe na-agba ume ịgụta na Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst Jisọs ga-amalite n’isi nso, na-eweta ọnọdụ Paradaịs n’ụwa? [Gosi ihe osise nke Paradaịs bụ́ nke dị n’Akụkọ Alaeze nke 36.] N’azụ ya, a gbara gị ume ikwu ka e wetara gị otu broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?” Gosi ya broshuọ ahụ, sapeta ihe ọmụmụ nke 5, gụpụta ajụjụ mbụ nakwa paragraf nke 1 na nke 2, ma gwa onye nwe ụlọ ka o tinye ọnụ. Gụọ ma kọwaa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ. Ọ bụrụ na o kwe mee, tụlee ajụjụ ọzọ nakwa paragraf ọzọ, mezie ndokwa ịbịaghachi iji gaa n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ.
8 Ebe ọ bụ na akwụkwọ a ga-enyefe na November dị ka ihe nsochi bụ broshuọ “Na-achọ” ma ọ bụ akwụkwọ “Ihe Ọmụma,” ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Mgbe m bịara na nke gị n’oge na-adịbeghị anya, enyere m gị otu akwụkwọ nta bụ́ ‘Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-ewetara Gị?’ Nkwa maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu dị n’ime ya. Abịaghachila m iji gosi gị ihe anyị na-eji amụ ihe. [Gosi ya broshuọ Na-achọ, ma tụgharịa azụ ya; ma ọ bụ gosi ya akwụkwọ Ihe Ọmụma, sapetakwa peeji nke 188-189.] Narị Afọ Iri ahụ e kwuru banyere ya n’ime Bible ga-eweta ọnọdụ ndị yiri ndị a ị na-ahụ n’ihe osise a. Iji ruo eruo ịdị ndụ n’ime Paradaịs, ọ dị anyị mkpa inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke. Biko nyetụ m ohere ka m gosi gị ná mkpirikpi otú anyị si amụ Bible.”
9 Nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36 akwaliwo anyị ịmụba òkè anyị na-ekere n’ozi, na-arụpụta ịgba àmà dị ukwuu. Ma eleghị anya nke a akpaliwo mmasị nke ọtụtụ ndị n’ókèala unu. Site n’enyemaka Jehova, mgbalị anyị gbakọrọ aka na-eme iji zụlite mmasị a ga-eme ka anyị jiri ọṅụ chọtakwuo ndị yiri atụrụ.—Mat. 10:11; Ọrụ 13:48, 49, 52.