Sochie Mmasị E Gosiri n’Akụkọ Alaeze
1 N’ime izu ole na ole gara aga, anyị anọwo na-enwe ihe ùgwù nke ikesa Akụkọ Alaeze nke 35, nke isiokwu ya bụ “Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?” Ndị nkwusa n’ebe nile na-agbalịsi ike iji mbipụta nke a nke Akụkọ Alaeze agakwuru ọtụtụ ndị kwesịrị dị ka o kwere omume. (Mat. 10:11) Ọ bụ ezie na e dokwara mkpọsa ahụ ịgwụsị na Sunday, November 16, ọ bụrụ na a ka nwekwuru ókèala a ga-arụzu, ndị okenye pụrụ ịgwa gị ka ị nọgide na-ekesa Akụkọ Alaeze nke 35 ruo mgbe nke e bunyere ọgbakọ gwụrụ.
2 Mbipụta nke a nke Akụkọ Alaeze akpaliwo mmasị nke ọtụtụ mmadụ. Ha na-ahụ na ndị mmadụ n’ozuzu ha atụfuwo ịhụnanya ebumpụta ụwa ha, n’ihi ya na-echekwa ihe ọdịnihu ga-abụ. (2 Tim. 3:3) Anyị chọrọ isochi mmasị a kpaliworo.
3 Akụkọ Alaeze Arụpụta Ihe: N’oge e ji Akụkọ Alaeze na-eme mkpọsa na 1995, otu nwanyị onye natara otu bịara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihi na ọ chọrọ ịmụtakwu banyere ihe Ndịàmà Jehova kwere. Ná nzukọ ahụ o ji ngwa ngwa nakwere ọmụmụ Bible, mgbe nke ahụ gasịkwara, ọ naghị ahapụkebe ije nzukọ. N’oge na-adịghị anya, o deworo chọọchị ọ na-agabu akwụkwọ, na-akwụsị ịbụ onye òtù ya!
4 Ka ọ na-erule ugbu a, ọtụtụ narị mmadụ n’ókèala unu agụwo ozi ahụ dị n’Akụkọ Alaeze nke 35. Ma gịnị bụ mmeghachi omume ha n’ebe ọ dị? Ọ bụrụgodị na ihe ha gụrụ metụtara ha n’ụzọ dị mma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ agaghị eme ihe ruo mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ha ọzọ. Ị̀ na-eme atụmatụ ịgaghachi? Nchegbu ịhụnanya maka mmadụ ibe anyị kwesịrị ịkpali anyị ime otú ahụ. E kwesịrị ileta ndị nile gosiworo mmasị n’Akụkọ Alaeze ọzọ.
5 Gịnị Ka Ị Ga-ekwu Mgbe Ị Gaghachiri? Ị pụrụ ikwu ihe ole na ole banyere otú ozi dị n’Akụkọ Alaeze si kwesị oge a, mgbe ahụkwa jụọ ajụjụ na-akpali echiche. Gee ntị nke ọma ka onye nwe ụlọ na-ekwupụta echiche ya ka i wee nwee ike ịmata ihe dị n’uche ya. Mgbe ahụ dọrọ uche gaa n’isi ihe kwesịrị ekwesị dị na broshuọ Na-achọ, bụ́ nke e gosipụtara n’Akụkọ Alaeze. Ọ bụrụ na i nweta nzaghachi dị mma, gbalịa ịmalite ọmụmụ Bible ozugbo ahụ.
6 Nke a bụ ụfọdụ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a tụrụ aro ha ị pụrụ ịnwale mgbe ị na-agaghachi na nke ndị gosiri mmasị ‘n’Akụkọ Alaeze’ nke 35:
◼ “Ị pụrụ icheta ihe ọmụma e dere ede m hapụụrụ gị n’oge na-adịbeghị anya. Ozi ya na-emetụta okwu dị mkpa na-ekewa ihe a kpọrọ mmadụ taa—ụkọ ịhụnanya maka ndị ọzọ.” Dọrọ uche gaa n’ihe àmà ahụ e gosiri na peji nke 2 nke Akụkọ Alaeze n’okpuru isiokwu bụ́ “Ịhụnanya Maka Ndị Agbata Obi Ajụwo Oyi.” Mgbe ahụ jụọ, sị: “Ì chere na ọ bụ nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ ibi n’ụzọ a?” Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta ihe ọmụmụ nke 5 na broshuọ Na-achọ, ma gbalịa ịmalite ọmụmụ Bible.
◼ “Oge mbụ anyị zutere, ahapụụrụ m gị ụfọdụ ihe ọmụma n’isiokwu bụ́ ‘Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?’ Ì chere na ụwa dị otú ahụ pụrụ ikwe mee?” Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta ihe ọmụmụ nke 6 na broshuọ Na-achọ, ma gụọ paragraf nke 6. Mgbe ahụ gụọ nkwa Chineke dị na Maịka 4:3, 4. O yie ka onye nwe ụlọ o nwere mmasị, nyefee broshuọ ahụ na ọmụmụ ihe.
◼ “Mgbe ikpeazụ m letara gị, ahapụrụ m ihe ọgụgụ isiokwu ya bụ ‘Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?’ Aro maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu dị n’ime ya. M bịaghachiri igosi gị ihe enyemaka ọmụmụ ihe nke anyị ji eme ihe. [Gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Akwụkwọ a na-akọwa n’ụzọ doro anya mgbe mmadụ nile ga-ahụ ibe ha n’anya, ọ na-azakwa ajụjụ ndị ọzọ pụrụ iju gị anya: N’ihi gịnị ka anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ? N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? Gịnị na-eme ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?” Mgbe ahụ jụọ, sị: “M̀ pụrụ igosi gị otú e si amụ ya?” Ọ bụrụ na ọ nakwere ọmụmụ Bible ahụ, malite ọmụmụ ihe ahụ. Ma ọ bụrụ na ọ jụ ọmụmụ ihe ahụ, nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Mee atụmatụ ịgaghachi ọzọ.
7 Ozugbo e ji Akụkọ Alaeze nke 35 rụzuo ókèala nke ọma, anyị pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ime ụbọchị ndị fọdụrụ n’ọnwa ahụ. A pụrụ ịchọta nhọpụta mara mma nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a tụrụ aro ha maka akwụkwọ a na peji ikpeazụ nke Ozi Alaeze Anyị ná mbipụta nke March, June, na November 1996; na June 1997.
8 Nkesa nke a pụrụ iche nke Akụkọ Alaeze kwesịrị ịkpali anyị nile imesiwanye mgbalị anyị ike n’ọrụ nkwusa. Site n’enyemaka Jehova anyị pụrụ inwe obi ike na mkpọsa nke a ga-enwe ihe ịga nke ọma e ji n’aka, na-enyere ndị mmadụ aka ịhụ nzube Chineke maka ihe nile a kpọrọ mmadụ iji hụrịta ibe ha n’anya. Ka Jehova nọgide na-agọzi oké mgbalị anyị ka anyị na-esochi mmasị e gosiri n’Akụkọ Alaeze.