Gosi Ezi Nchegbu Maka Mmasị Nile A Chọtara
1 Mkpọsa Alaeze zuru ụwa ọnụ ga-abịa ná njedebe n’isi nso, mgbe ọ gasịrị a ga-ebibi ndị nile “na-amataghị Chineke.” (2 Tesa. 1:7-9) N’ihi ya, ezi nchegbu maka ndụ ndị ọzọ na-akwali ndị Jehova iji ozi Alaeze ahụ jekwuru ọtụtụ ndị ruo n’ókè o kwere omume.—Zef. 2:3.
2 Kwa ọnwa, a na-etinye ọtụtụ nde hour n’ịchọpụta ndị chọrọ ịnụrụ “ozi ọma nke ezi ihe.” (Aịsa. 52:7) Ná nzaghachi nye akwụkwọ a na-enyefe ugbu a, ọtụtụ ndị atụwo ụtụ maka ma ọ bụ nara Ụlọ Nche na Teta! ma ọ bụ broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ezi nchegbu maka ndị a kwesịrị ịkpali anyị isochi mmasị nile a chọtara.—Ilu 3:27.
3 Nwee Ihe Ndekọ Ziri Ezi: A ga-arụzukwu ọtụtụ ihe ma ọ bụrụ na i nwee ihe ndekọ zuru ezu ma zie ezie banyere mmasị na akwụkwọ ndị e tinyere. Ihe ọmụma ndị dị ka aha na adres onye nwe ụlọ, ụbọchị na oge ị gara, akwụkwọ i tinyere, na isiokwu a tụlere ga-enyere gị aka ịdịkwu irè mgbe ị na-alaghachi. Ọzọ, ọ bụrụ na i detuo okwu ụfọdụ nke onye nwe ụlọ kwuru ná mkparịta ụka mbụ unu, ị pụrụ inwe ike izo aka na ha n’ụzọ dị irè ka ị na-amalite nkwurịta okwu ahụ ná nletaghachi.
4 Dị Ngwa n’Ime Nletaghachi: Mmadụ ole n’ime ndị natara akwụkwọ n’aka gị n’ọnwa gara aga ka ị gbalịworo ileta ọzọ? Ọtụtụ izu ọ̀ gafewo n’enweghị mkpọtụrụ ọzọ? Ezi nchegbu maka ọdịmma ebighị ebi ha kwesịrị ịkwali gị ịlaghachi ozugbo o kwere omume, ọ kasị mma n’ụbọchị ole na ole, ka mkparịta ụka ahụ wee ka dị ọhụrụ n’echiche. Site n’ịlaghachi ngwa ngwa iji mụbaa mmasị ha, ị pụrụ inwe ike igbochi mgbalị Setan tupu ọ ‘bịa, wee napụ okwu nke a ghaworo n’ime ha.’—Mak 4:15.
5 Nkwadebe Dị Mkpa: Ịdị irè gị n’ime nletaghachi na-adabere kpọmkwem n’ókè ị kwadeberuru nke ọma. Dokwaa ụzọ njekwu gị tupu ị gawa. Azụ peji Ozi Alaeze Anyị nke April 1997 na-enye ụzọ iche ihe n’ihu dị iche iche nke a pụrụ iji mee ihe n’ụzọ gara nke ọma mgbe ị na-enyefe magazin ma ọ bụ broshuọ Na-achọ. Ihe ọzọ bụ iburu ihe ụfọdụ n’uche ikerịta mgbe ị laghachiri. Gịnị ka a pụrụ ikwu mgbe i sochiri mmasị? Olee otú a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible?
6 Mgbe ị na-esochi nkwurịta okwu banyere ihe ọ ga-ewe ihicha ụwa ma mee ya ebe ka mma ibi, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “N’ọbịbịa m mbụ, anyị kwekọrịtara na ọ dị mkpa ime ihe ndị siri ike tupu e mee ụwa ka ọ ghọọ paradaịs udo. Ì chere na ụmụ mmadụ nwere ihe dị mkpa iji rụzuo ọrụ a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Biko rịba ama ihe mere ọ ga-eji dị mkpa Chineke itinye aka n’ihe omume nke mmadụ.” Gụọ Abụ Ọma 37:38. Mgbe ahụ sapeta n’ihe ọmụmụ nke 5 na broshuọ Na-achọ, jirikwa akụkụ ndị a họọrọ na paragraf nke 4-5 mee ihe iji gosi ụzọ Chineke ga-esi mezuo amụma a. Sochie ya site n’ikwu ka e jiri broshuọ ahụ nwee ọmụmụ Bible.
7 Ọ bụrụ na unu kwurịtara banyere Alaeze Chineke ma tinye broshuọ “Na-achọ” n’ọbịbịa mbụ, mgbe ị na-alaghachi ị pụrụ ikwu ihe dị ka nke a:
◼ “Mgbe ikpeazụ anyị kwurịtara okwu, anyị kọwara Alaeze Chineke dị ka ọchịchị dị adị n’ezie nke ga-achị ụwa dum. Bible na-egosi na Kraịst Jisọs ga-abụ onye ọchịchị ya. Ị̀ pụrụ ịhụ uru ọ bụla dị n’inwe ụdị ọchịchị na onye ndú a?” Nye ohere maka nzaghachi. Mepee broshuọ Na-achọ n’ihe ọmụmụ nke 6. N’iji isi ihe ndị a họtara na paragraf nke 6-7 na ihe osise dị na peji nke 13 mee ihe, gosi ihe Alaeze Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu. Gụọ Daniel 2:44, ọ bụrụkwa na o kwesị ekwesị, webata akwụkwọ Ihe Ọmụma ma kwuo ka a malite ọmụmụ Bible.
8 Ọ bụrụ na ị hụ onye kwetara na okpukpe ndị dị n’ụwa akpataworo ihe a kpọrọ mmadụ nsogbu, ị pụrụ ịjụ nke a ná nletaghachi:
◼ “Ì chetụwo echiche ụzọ anyị pụrụ isi mara okpukpe nke nwere nnwapụta Chineke? [Nye ohere maka nzaghachi.] Broshuọ a bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na-enye akara ndị e ji amata ezi okpukpe.” Sapeta n’ihe ọmụmụ nke 13, meekwa ka isi ihe ise ndị ahụ e depụtara n’ụdị dị iche na paragraf nke 3-7 pụta ìhè. Ị pụrụ ịga n’ihu site n’ikwu, sị: “Tinyere ịchọta ezi okpukpe ahụ, anyị aghaghị ịchọpụta ihe Chineke na-achọ n’aka anyị n’otu n’otu.” Gụọ Jọn 4:23, 24. Kwuo na unu ga-ekwurịtakwu okwu banyere nke a. Sapeta n’ihe ọmụmụ nke 1 na broshuọ ahụ, gosikwa ụzọ anyị si amụ ihe.
9 Mgbe ị laghachiri ịga n’ihu ná nkwurịta okwu banyere obi ụtọ ezinụlọ, ị pụrụ ikwu ihe yiri ihe na-esonụ:
◼ “Mgbe mbụ anyị zutere, esoro m gị kerịta isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ, nke bụ itinye ndụmọdụ a na-ahụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible n’ọrụ. Mgbe a bịara n’ikwu okwu banyere mkpa nke ezinụlọ oge a, ì kwere na Bible bụ ihe oge ya gafeworo ka ọ̀ bụ ihe kwesịrị oge a?” Nye ohere maka nzaghachi. Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma. Sapeta n’isi nke 2, gụpụtakwa nhota okwu dị na paragraf nke 13. N’iji isi ihe ndị dị na paragraf nke 3 eme ihe, kwuo ka e nwee ọmụmụ Bible ezinụlọ.
10 Site n’inwe ihe ndekọ ziri ezi, ime nkwadebe dị mkpa, na ịlaghachi ozugbo iji mụbaa mmasị ha, anyị pụrụ igosipụta ụdị ịhụnanya agbata obi nke ga-adọta ha n’ụzọ nke nzọpụta.—Mat. 22:39; Gal. 6:10.