Echiche nke Bible
Ihe Mere Ịchụpụ Mmadụ Ji Bụrụ Ndokwa Ịhụnanya
NKEWAPỤ—echiche ya nanị na-akpalite echiche gwara ọgwa n’etiti ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe.a Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ekweta na ụdị ụfọdụ nke inye ahụhụ dị okpukpe mkpa. Ma ọtụtụ ndị na-ele nkewapụ anya dị ka ihe omume sitere na mgbe gara aga—ụzọ inye ahụhụ aka ike dị obi ọjọọ, nke na-echetara ha banyere mkpagbu na njụta okwukwe.
Ihe na-etinyekwu ihe ná nsogbu ahụ bụ mmetụta rụrụ arụ nke ụwa. Ya mere, ihe ka ọtụtụ n’okpukpe Krisendọm enwewo echiche nke ịgbachi nkịtị ka ukwuu n’ebe mmehie dị. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere otu onye okwuchukwu Episcopal ji kwuo, sị: “Nkewapụ bụ akụkụ nke ọdịnala anyị, ma echeghị m na e mewo ya n’ime narị afọ a.”
Otú ọ dị, ọ pụrụ iju ọtụtụ ndị anya ịmata na n’etiti Ndịàmà Jehova, ịchụpụ mmadụ (nke ya na nkewapụ bụ otu ihe) ka bụ ihe a na-eme, bụrụkwa nke a na-ewere n’ihe dị mkpa. N’eziokwu, ọ bụghị ihe dị mfe omume, kama ọ bụ ndokwa ịhụnanya. Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ?
Ọ Na-ebuli Aha Chineke Elu
Jehova bụ Chineke dị nsọ. Ọ dịghị anabata mmehie a kpachara anya na-eme n’akụkụ nke ndị na-azọrọ na ha na-efe ya. Pita onyeozi degaara ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche; n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (1 Pita 1:15, 16) Ya mere, ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị na-ebuli aha nsọ Chineke elu; ọ na-egosi ịhụnanya maka aha ahụ.—Tụlee Ndị Hibru 6:10.
Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụrụ na onye Kraịst adaba n’adịghị ike ma ọ bụ ná mmehie dị oké njọ, na a ghaghị ịchụpụ ya n’ọgbakọ? Ọ dịghị ma ọlị! Jehova abụghị onye aka ike na-enweghị mmetụta. Ọ na-eme ebere, ọ na-aghọtakwa. Ọ na-echeta na anyị ezughị okè. (Abụ Ọma 103:14) Jehova na-aghọta na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Chineke emewo ndokwa maka enyemaka ime mmụọ n’ime ọgbakọ nke na ọ bụrụ na onye Kraịst adaba ná “ndahie ọ bụla” ma ọ bụ ọbụna mee mmehie dị oké njọ, a pụrụ iji ụzọ ịhụnanya mee ka o “guzozie” ná mmụọ nke ịdị nwayọọ. (Ndị Galetia 6:1) Site n’ịnakwere ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke na igosipụta mwute sitere n’obi na ezi nchegharị, onye kpafuworo site n’ụzọ nke ezi omume pụrụ ‘ịbụ onye e mere ka ahụ dị ya ike’ n’ụzọ ime mmụọ.—Jemes 5:13-16.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst e meworo baptism emehie n’ụzọ dị oké njọ ma mgbalị nile iji nyere ya aka abụrụ ihe kụrụ afọ n’ala? N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, gịnị ma ọ bụrụ na ọ gbaa isi akwara wee jụ imezi ụzọ mmehie ya?
Ọ Na-eme Ka Ọgbakọ Nọrọ ná Nchebe
Bible na-enye ndị Kraịst iwu, sị: “Ka unu na onye ọ bụla nke a na-akpọ aha ya na ọ bụ nwanna ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye anyaukwu, ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye nkwutọ, ma ọ bụ onye na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe; ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.”—1 Ndị Kọrint 5:11.
Iwu Bible a ọ̀ bụ nke obi ọjọọ na nke na-eweda n’ala? Chee nnọọ echiche banyere nke a: Mgbe a tụrụ onye omekome obi tara mmiri mkpọrọ n’ihi imebi iwu, à na-ele nke ahụ anya dị ka inwe obi ọjọọ ma ọ bụ enweghị mmetụta? Ee e, n’ihi na ọha mmadụ nwere ikike nke ichekwa udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ógbè. Ya bụ, a na-achụpụ onye omekome ahụ n’ebe ọha mmadụ na-edebe iwu nọ n’oge ịnọ na mkpọrọ ya.
N’otu aka ahụ, ọgbakọ ndị Kraịst ziri ezi n’ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị site n’etiti ha. N’ihi gịnị? N’ihi na ọgbakọ aghaghị ịbụ ebe nchebe pụọ ná ndị ndọgbu rụrụ arụ na ndị ọzọ na-akpachara anya eme mmehie.
N’ịmata na “otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe n’iyi,” Pọl onyeozi nyere ndị kwere ekwe ibe ya iwu, sị: “Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu.” (Eklisiastis 9:18; 1 Ndị Kọrint 5:13) Nzọụkwụ a na-egbochi onye mmehie ahụ pụọ n’ịgbasa omume rụrụ arụ n’ọgbakọ, ọ na-echebekwa aha ọma nke ọgbakọ.—Tụlee 1 Timoti 3:15.
Nchebe Nye Ndị Mmadụ n’Otu n’Otu
Ịchụpụ mmadụ na-echebekwa ndị òtù nke ọgbakọ n’otu n’otu. Ka anyị mee ihe atụ: Chee echiche ịbụ onye oké ụda opi ụgbọala ma ọ bụ mgbịrịgba metere n’ụra. Ọ dịghị mfe ileghara ụda ahụ na-adasi ike anya; n’ezie, ọ na-eme ka ị kụja! N’otu aka ahụ, mgbe a chụpụrụ mmadụ n’ọgbakọ, a na-enwe olileanya na nzọụkwụ ahụ ga-anwụchi echiche nke onye òtù ọ bụla nke ìgwè atụrụ ahụ. Ọ na-enye ha nsogbu. A pụghị ileghara ya anya. Olee otú nke a pụrụ isi bụrụ nchebe?
“Mgbe mbụ m nụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na a chụpụwo mmadụ, mmeghachi omume mbụ m bụ nkụja,” ka otu Onyeàmà na-ekwu. “Mgbe ahụ o mere ka m weda onwe m n’ala. O mere ka m ghọta na mụ onwe m kwa pụrụ ịda.” Dị ka okwu ya na-egosipụta, ịchụpụ mmadụ pụrụ ịkpali ndị ọzọ ịtụle àgwà ha.—1 Ndị Kọrint 10:12.
Site n’ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka ‘È nwere akụkụ ọ bụla nke ndụ m ebe m pụrụ isi nwee mmerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ?’ a pụrụ inyere anyị aka inyocha nguzo anyị n’ebe Chineke nọ. N’ụzọ dị otú a anyị pụrụ ịnọgide ‘na-eji egwu na ịma jijiji na-arụpụta nzọpụta anyị.’—Ndị Filipaị 2:12.
Laghachikwute Chineke
“N’agbanyeghị na o siri oké ike,” ka otu onye Kraịst a chụpụrụ n’otu oge kwuru, “inye ahụhụ ahụ kwesịrị ekwesị, bụrụkwa ihe a chọrọ nke ukwuu, ọ ghọkwara ihe na-azọpụta ndụ.” Nke a na-eme ka akụkụ ọzọ dị mkpa nke ịchụpụ mmadụ pụta ìhè. Ọ pụrụ ịkpali ndị bụbu ndị mmehie na-enweghị nchegharị iwere nzọụkwụ ha mbụ iji lọghachikwute Chineke.
Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onye Onyenwe anyị hụrụ n’anya ka Ọ na-ezi ihe site n’inye ya ahụhụ.” (Ndị Hibru 12:6) Ebe ọ bụkwa eziokwu na “ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.”—Ndị Hibru 12:11.
Nke ahụ bụ ihe mere n’ebe Richard nọ. Mgbe a chụpụsịrị ya ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ, o chegharịrị, gbanwee àgwà ya nke asọpụghịrị Chineke, wee bụrụkwa onye a nabataghachiri n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. N’ileghachi anya azụ, ọ na-ekwu banyere ahụmahụ ahụ, sị: “Aghọtara m na o kwesịrị ka a chụpụ m, nakwa na ihe m nwetara kwesịịrị m n’ezie. O kwesịrị nnọọ ekwesị ma nyekwara m aka ịhụ kpọmkwem otú ụzọ m jọruru ná njọ na mkpa ọ dị ịrịọ maka mgbaghara Jehova.”
Ọ pụrụ ịbụ na inye ahụhụ agaghị adị mfe odidi. Ọ chọrọ ịdị umeala n’obi iji nakwere ya site n’aka Chineke, ma ndị na-amụta ihe site na ya na-eweta mkpụrụ bara ụba.
Ya mere, ịchụpụ mmadụ bụ ndokwa ịhụnanya n’ihi na ọ na-ebuli aha nsọ Chineke elu, ọ na-echebekwa ọgbakọ pụọ ná mmetụta na-emerụ emerụ nke mmehie. Ọzọkwa, ọ na-egosipụtakwa ịhụnanya n’ebe onye mmehie nọ site n’ịgba ya ume ka o chegharịa ma ‘chigharịa, ka e wee hichapụ mmehie ya nile, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu Jehova bịa.’—Ọrụ 3:19.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nkewapụ bụ ịdọ aka ná ntị nke na-arụpụta ngụpụ site n’ịbụ onye òtù nke okpukpe.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]
The New Testament: A Pictorial Archive from Nineteenth-Century Sources, nke Don Rice/Dover Publications, Inc.