Nchụpụ Ọ̀ Bụ Ndokwa Ịhụnanya?
“NSỌ, nsọ nsọ, ka Onye ahụ dị, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” (Mkpughe 4:8) N’ikwekọ ná nkọwa ahụ, Jehova bụ Isi Iyi nke ụkpụrụ ndị dị nsọ. E setịpụrụ ndị a ‘n’ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ,’ iwu jikwa ndị Kraịst ịgbaso ụkpụrụ nduzi ndị a. N’ezie, ha aghaghị izere ihe ọ bụla na-adịghị ọcha n’anya Jehova.—2 Timoti 3:15; Aịsaịa 52:11.
Bible nyere iwu n’ụzọ doro anya, sị: “Dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche; n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (1 Pita 1:15, 16) Eri mgbe ọgbakọ ndị Kraịst malitere ịdị na narị afọ 19 gara aga, ezi ndị Kraịst alụsiwo ọgụ ike iji chebe ya pụọ n’adịghị ọcha ime mmụọ na omume.—Jud 3.
Ihe Mere Nchebe Ji Dị Mkpa
Ndị ohu nile nke Chineke na-eche ihe ịma aka nke ịnọgide na-adị ọcha n’omume na n’ime mmụọ ihu. N’ihi nke ahụ, a ghaghị iguzogide ndị iro atọ dị ike—Setan, ụwa ya, na ọchịchọ anụ ahụ anyị na-emehie emehie. (Ndị Rom 5:12; 2 Ndị Kọrint 2:11; 1 Jọn 5:19) Ụwa Setan ga-anwa gị ime omume rụrụ arụ, ga-ama gị aka ịnakwere ụzọ ya nile, ọ ga-echekwa n’ihu gị ụba ihe onwunwe, iwu ewu, ọkwá, ịbụ onye a ma ama, na ike. Ma ndị kpebisiri ike ịgbaso ezi ofufe na-eguzogide ihe Setan na-eche mmadụ n’ihu ma nọgide “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” N’ihi gịnị? N’ihi na ha chọrọ ịnọ n’okpuru nlekọta na-enye nchebe na nke ịhụnanya nke nzukọ Jehova nke dị ọcha.—Jemes 1:27; 1 Jọn 2:15-17.
Jehova akwadebewo enyemaka maka onye òtù ọ bụla nke ọgbakọ ndị Kraịst nke dabara n’ọnwụnwa Setan n’ihi adịghị ike nile nke mmadụ. A họpụtawo ndị okenye ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ichebe ọgbakọ na iji ịhụnanya nyere ndị na-agahie ụzọ aka ichegharị site ná mmehie ha ma mee mgbanwe ndị dị mkpa maka mgbake. E kwesịrị iji ndidi nyere onye Kraịst ọ bụla dabara n’omume ọjọọ aka ichegharị ma gbanwee ụzọ ya nile.—Ndị Galetia 6:1, 2; Jemes 5:13-16.
Ụzọ Nchụpụ Si Bụrụ Ihe Ịhụnanya
A ghaghị ile ndị ohu Jehova e mere baptism bụ́ ndị kpachaara anya na-agbaso ụzọ ọjọọ ma jụ ịgbanwe anya dị ka ndị na-enweghị nchegharị wee si otú ahụ ghara ikwesị ekwesị maka mkpakọrịta ndị Kraịst. (Tụlee 1 Jọn 2:19.) A pụghị ikwere ka ndị dị otú ahụ nọgide n’ime ọgbakọ ndị Kraịst dị ọcha wee merụọ ya. A ghaghị ịchụpụ ha.
A pụrụ ime ihe atụ nke izi ezi ịchụpụ ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ site n’ọnọdụ na-esonụ: N’ihi mmụba nke mwakpo na mpụ ime ihe ike megide ụmụ akwụkwọ, ụlọ akwụkwọ ụfọdụ anabatawo ụkpụrụ nke “na-achọ ka a kwụsị ụmụ akwụkwọ na-eji ma ọ bụ na-eyi egwu iji ngwá ọgụ eme ihe akwụkwọ ná ndụ ha nile,” ka The Globe and Mail, akwụkwọ akụkọ na Toronto, Canada, na-akọ. A na-eme nchụpụ ahụ iji chebe ụmụ akwụkwọ chọrọ irite uru site n’usoro ihe omume agụmakwụkwọ n’anọghị n’egwu ime ihe ike dị iche iche.
N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ịhụnanya ịchụpụ onye na-eme ihe ọjọọ nke na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ? Ime otú ahụ bụ ngosipụta nke ịhụnanya maka Jehova na ụzọ ya nile. (Abụ Ọma 97:10) Ihe omume nke a na-egosi ịhụnanya maka ndị na-agbaso ụzọ ezi omume n’ihi na ọ na-ewepụ n’etiti ha onye pụrụ ịkpa ike ọjọọ n’ahụ ha. Ọ na-echebekwa ịdị ọcha nke ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:1-13) Ọ bụrụ na e kwere ka ajọ omume rụrụ arụ ma ọ bụ adịghị ọcha ime mmụọ dịgide n’ọgbakọ, ọ ga-abụ nke e metọrọ, gharakwa ịdị mma maka ijere Jehova bụ́ onye dị nsọ ozi dị nsọ. Ọzọkwa, nchụpụ a chụpụrụ onye ahụ na-eme ihe ọjọọ pụrụ inyere ya aka ịhụ otú ụzọ ọjọọ ya si bụrụ ihe siri ike, ichegharị, imekwa mgbanwe ndị dị mkpa, n’ihi ya bụrụ onye a nabataghachiri n’ime ọgbakọ.
Mmetụta Ya n’Ahụ Ndị Ọzọ
Mgbe onye òtù ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ, dị ka ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye, ọ dịghị eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Onye Kraịst ọ bụla dabara ná mmekọahụ rụrụ arụ adịghị nnọọ eche echiche ka Josef chere mgbe nwunye Pọtịfa nwara ime ka ya na ya nwee mmekọahụ. Mmeghachi omume Josef bụ: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” (Jenesis 39:6-12) Josef kwanyeere ụkpụrụ dị nsọ nke Jehova ùgwù ma gbapụ n’ebe ahụ. N’aka nke ọzọ, di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko yiri ka o nweghị ịhụnanya zuru ezu maka Chineke iji gbapụ n’imeju ahụ ire ọkụ ya.—Ndị Galetia 5:19-21.
Onye e mere baptism nke mebiri iwu Chineke adịghị egosipụta nchegbu banyere mbibi na ihe mgbu ọ ga-akpatara ndị ikwu ya kwere ekwe. Mmetụta uche ọ na-akpali karịrị ihe ụfọdụ ndị pụrụ idili. Mgbe ọ chọpụtara na nwa ya nwoke na-ebi ndụ rụrụ arụ, otu nwanyị onye Kraịst kwara arịrị, sị: “Ụmụnna nwoke na nwanyị ole na ole, ma ọ bụrụ na e nwere nke ọ bụla, yiri ka ha na-aghọta otú o si wute anyị ma kụnwụsịa anyị ahụ. . . . Obi gbariri anyị.” A pụrụ ịmalite inyo ezi aha nke ezinụlọ dum enyo. Ịda mbà n’obi na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi amamikpe pụrụ iti ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ihe otiti. Ụzọ ọjọọ nke onye ahụ na-eme ihe ọjọọ pụrụ isi otú ahụ wetara ezinụlọ ahụ obi mgbu.
Enyemaka Ịhụnanya Maka Ndị Òtù Ezinụlọ
Ọ dị ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi nke ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ mkpa icheta na nchụpụ bụ ma ihe ịhụnanya ma ihe nchebe. A na-eme mgbalị nile a pụrụ ime iji nyere onye ahụ na-eme ihe ọjọọ aka. Ma ọ bụrụ na ọ ghọọ onye na-enupụrụ Chineke isi ma jụwapụ isi ichegharị, ọ dị mkpa ichebe ọgbakọ, e nweghịkwa nhọrọ ọzọ ma ọ bụghị ime ihe dị ka Okwu Chineke tụziri: “Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu.” (1 Ndị Kọrint 5:13) Dị ka otu Onyeàmà kwuru, “nchụpụ bụ ihe banyere iguzosi ike n’ihe nye Jehova.”
Mgbe a chụpụrụ onye òtù ezinụlọ, ndị ikwu bụ́ ndị Kraịst na-enwe ihe mgbu. N’ihi ya ndị okenye a họpụtara ahọpụta kwesịrị ime ihe nile ha nwere ike ime iji nye ha ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ndị okenye pụrụ ikpere ha ekpere, sorokwa ha kpee. Ọtụtụ mgbe ọ na-ekwe omume ileta ndị Kraịst a na-ekwesị ntụkwasị obi iji tụlee echiche Akwụkwọ Nsọ ndị na-ewuli elu. Ndị na-azụ ìgwè atụrụ ahụ kwesịrị iji ohere ọ bụla gbaa ndị a a hụrụ n’anya ume n’ụzọ ime mmụọ tupu na mgbe nzukọ ndị Kraịst gasịrị. A pụrụ inyekwu agbamume site n’isonyere ha n’ozi ubi. (Ndị Rom 1:11, 12) Ọ dị ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ mkpa igosi ndị ohu a na-ekwesị ntụkwasị obi nke Jehova ịhụnanya na nlebara anya ruuru ha.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8.
Ụzọ mmehie nke mmadụ abụghị ihe a ga-eji leghara onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ya nke nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova anya. Chineke jụrụ ajọ Eze Sọl nke Israel, ma Devid ekweghị ka nke a metụta ịhụnanya ya n’ebe nwa Sọl bụ́ Jonatan nọ. N’ezie, ihe nkekọ dị n’etiti Devid na Jonatan ghọrọ ihe siri ike nke ukwuu. (1 Samuel 15:22, 23; 18:1-3; 20:41) Ya mere mmadụ nile n’ọgbakọ kwesịrị ịdị na-enye ndị Kraịst ndị ikwu ha mehiere megide Jehova nkwado na ịhụnanya.
Lee ka o si ghara ịbụ ihe ịhụnanya ileghara ndị dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi anya ma ọ bụ gwa ha okwu obi ọjọọ! Ndị òtù ezinụlọ na-eguzosi ike n’ihe nwere mkpa pụrụ iche maka agbamume. Ọ pụrụ ịdị ha ka ha nọ nanị ha, ọnọdụ ha esiekwara ha ike nke ukwuu. Ma eleghị anya ị pụrụ iji telifon soro ha kerịta akụ̀ ime mmụọ ma ọ bụ ahụmahụ na-ewuli elu. Ọ bụrụ na onye nke a chụpụrụ azaa fon, nanị kwuo na ị chọrọ ịgwa onye ikwu ahụ bụ́ onye Kraịst okwu. Ị pụrụ ịkpọ ndị òtù nke ezinụlọ dị otú ahụ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi òkù ịbịa nnọkọ ntụrụndụ ma ọ bụ maka nri n’ụlọ gị. Ọ bụrụ na i zute ha ka ị na-azụ ahịa, ị pụrụ iji oge ahụ nwee mkpakọrịta na-ewuli elu. Cheta, ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị nwere ndị ikwu a chụpụrụ achụpụ ka bụkwa akụkụ nke nzukọ Jehova dị ọcha. Ọ pụrụ ịdị mfe ha ịbụ ndị nọ nanị ha ma nwee nkụda mmụọ. Ya mere, mụrụ anya igosi ha obi ọma na ịhụnanya. Nọgide na-eme ihe ọma ‘n’ebe ndị ezinụlọ nile nke okwukwe gị nọ.’—Ndị Galetia 6:10.
Nwee Ekele Maka Ndokwa Jehova
Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ekele na Jehova Chineke na-egosi nchegbu dị nro maka onye ọ bụla n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ya ofufe. Site ná nzukọ ya o jiwo ịhụnanya mee ndokwa nke ga-enyere anyị aka n’ije ije n’ihu ya n’ụzọ ezi omume. Ọ bụrụgodị na onye òtù ezinụlọ amara ụma nọgide na-eme mmehie, ọ bụrụkwa na a ghaghị ịchụpụ ya n’ọgbakọ, ụzọ nlata dị ma o chegharịa n’ezie. E gosiri nke a n’ihe atụ na-esonụ:
Ndị okenye agbalịwo inyere otu onye anyị ga-akpọ Anna aka, ma o chigharịkwuuru ise siga, ịṅụ mmanya, na ọgwụ ọjọọ. O chegharịghị, ọ nọgideghịkwa n’ime ọgbakọ. Ma, tupu ogologo oge agaa agụụ mkpakọrịta ịhụnanya nke ọgbakọ Jehova dị ọcha malitere ịgụ Anna, o kpeekwa ekpere ka o nyere ya aka. O kwetara na ya aghọtachabughị ókè hà aṅaa ndị okenye na-eche banyere ndị kpafuru akpafu. Anna malitere ịbịa nzukọ ọzọ, nke a dubakwara ná nchegharị. E mesịa, a nabataghachiri ya n’ime ọgbakọ ahụ na-ahụ n’anya ma na-enye nchebe. Otu ugbo ọzọkwa, Anna na-ejigide ụkpụrụ omume dị elu nke Jehova. O nwere obi ekele maka ịhụnanya ndị okenye gosiri ma na-ekwukwa, sị: “Ị pụghị iche n’echiche ókè hà aṅaa akwụkwọ ndị Kraịst baruru n’uru nye m. N’ezie, Jehova na-egbo mkpa anyị nke ọma.”
Ee, Chineke enyewo ụzọ nlata maka ndị a chụpụworo n’ọgbakọ ma ha mesịa chegharịa. Anyị ahụwo na ọbụna nchụpụ n’onwe ya bụ ndokwa ịhụnanya. Ma lee ka o si ka mma nke ukwuu izere ahụmahụ a dị mwute site n’ịrapagide mgbe nile n’ụzọ ezi omume nile nke Chineke anyị dị nsọ! Ka anyị nwee ekele mgbe nile maka ihe ùgwù nke ito Jehova dị ka akụkụ nke nzukọ ya dị ọcha, na-ahụ n’anya, na-enyekwa nchebe.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ị̀ na-egosi ndị ikwu na-ekwesị ntụkwasị obi nke ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ịhụnanya?