Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Anyị Hà Na-ekpebi Ihe Anyị Ga-abụ?
“ANYỊ na-echebu na akara aka anyị dị na kpakpando. Anyị amatawo ugbu a, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, akara aka anyị dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị.” Otú ahụ ka James Watson kwuru, bụ́ onye e hotara ná mmalite nke akwụkwọ bụ́ Exploding the Gene Myth, nke Ruth Hubbard na Elijah Wald dere. Otú ọ dị, kpọmkwem n’okpuru nhota Watson, e hotara R. C. Lewontin, Steven Rose, na Leon J. Kamin dị ka ndị na-ekwu, sị: “Anyị apụghị iche banyere akparamàgwà ọha mmadụ ọ bụla nke a kpụnyere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị nke na ọnọdụ ọha mmadụ apụghị ịgbanwe ya.”
Mkpo akwụkwọ ahụ chịkọtara ụfọdụ n’ime isiokwu ya wee jiri ajụjụ dị oké mkpa meghee, “Akparamàgwà mmadụ ò sitere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa?” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ̀ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa nke na-ebufe njimara na àgwà ndị a pụrụ iketa eketa n’ihe dị ndụ na-ekpebizu akparamàgwà mmadụ? È kwesịrị ịnakwere omume ụfọdụ rụrụ arụ ná ndabere nke na ha sitere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa? È kwesịrị imeso ndị omekome dị ka ndị ụkpụrụ mkpụrụ ndụ ihe nketa na-achịkwa, na-enwe ike ịzọrọ ibu ọrụ dị ala n’ihi mkpụrụ ndụ ihe nketa e bu ụzọ kaa aka?
A pụghị ịgọnarị na ndị ọkà mmụta sayensị emewo ọtụtụ nchọpụta ndị bara uru na narị afọ a. N’ime nchọpụta ndị a, e nwere DNA dị ịtụnanya, ihe ahụ a na-akpọ ụkpụrụ nke ihe mejupụtara mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị. Ihe ọmụma dị n’ụkpụrụ mkpụrụ ndụ ihe nketa akpaliwo mmasị nke ma ndị ọkà mmụta sayensị ma ndị nkịtị. Gịnị ka nnyocha n’ihe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa chọpụtaworo n’ezie? Olee otú e si eji ihe ndị a chọpụtara eme ihe iji kwadoo ozizi ọgbara ọhụrụ nke nhazi e bu ụzọ mee ma ọ bụ akara aka?
Gịnị Banyere Ekwesịghị Ntụkwasị Obi na Ndina Ụdị Onwe?
Dị ka otu isiokwu e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Australian si kwuo, nnyocha ụfọdụ e mere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ekwusi ike na “ma eleghị anya ekwesịghị ntụkwasị obi dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị. . . . O yiri ka e mere obi aghụghọ anyị ịdị otú ahụ.” Chee nnọọ echiche ụdị ọgba aghara omume a pụrụ ịkpata n’alụmdi na nwunye na ezinụlọ site n’inye ohere maka onye na-achọ ịzọrọ ibu ọrụ dị ala maka ụzọ ịdị ndụ nke inwe mmekọahụ aghara aghara!
Banyere ndina ụdị onwe, magazin bụ́ Newsweek bu isi akụkọ bụ́ “Ọmụmụ Ka Ọ̀ Bụ Nzụlite?” Isiokwu ahụ sịrị: “Sayensị na nkà mmụta ịgwọ ọrịa uche na-agbalị ịghọta nnyocha ọhụrụ nke na-atụ aro na ndina ụdị onwe pụrụ ịbụ ihe mkpụrụ ndụ ihe nketa na-akpata, ọ bụghị nzụlite. . . . N’etiti ndị na-edina ụdị onwe ha, ọtụtụ na-ekweta mgbaàmà ahụ na ndina ụdị onwe na-amalite na chromosome.”
Mgbe ahụ, isiokwu ahụ hotara Dr. Richard Pillard, bụ́ onye kwuru, sị: “Njikọ mkpụrụ ndụ ihe nketa n’ọchịchọ mmekọahụ na-ekwu, sị, ‘Nke a abụghị ntụpọ, o sighịkwa gị n’aka.’” Iji mesikwuo arụmụka “enweghị ntụpọ” nke a ike, Frederick Whitam, bụ́ ọkà ná nnyocha ndina ụdị onwe, na-ekwu na “e nwere omume nke ndị mmadụ ikuda ume mgbe a gwara ha na ndina ụdị onwe sitere n’ọmụmụ. Ọ na-eme ka ezinụlọ na ndị na-edina ụdị onwe ha kwụsị inwe ikpe ọmụma. Ọ pụtakwara na ọha mmadụ agaghị na-enwe nchegbu banyere ihe ndị dị ka ndị nkụzi na-edina ụdị onwe.”
Mgbe ụfọdụ, usoro mgbasa ozi na-enye ihe ahụ a sịrị na ọ bụ ihe àmà na mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ekpebi ọchịchọ idina ụdị onwe dị ka ihe bụ eziokwu na ihe ịrụ ụka na-adịghị ya kama ịbụ ihe pụrụ ikwe omume na nke a na-ekpebighị ekpebi.
Magazin bụ́ New Statesman & Society na-ewetu ụfọdụ n’abamuru e nwere maka okwu ire ụtọ bụ́: “Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na onye na-agụ ihe nke nwere oké mkpali elegharawo emighị emi nke ihe àmà a na-ahụ anya—ma ọ bụ, n’eziokwu, enweghị ihe ndabere ma ọlị maka ajọ nzọrọ ahụ [dị oké njọ] n’ụzọ mmụta sayensị na ‘e kenyere inwe mmekọahụ aghara aghara n’ime mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ndị ikom, tinyekwa ya n’usoro ụbụrụ isi ndị ikom.’” N’akwụkwọ ha bụ́ Cracking the Code, David Suzuki na Joseph Levine na-agbakwụnye nchegbu ha banyere nnyocha kasị ọhụrụ ná mkpụrụ ndụ ihe nketa, sị: “Ọ bụ ezie na a pụrụ ịrụ ụka na mkpụrụ ndụ ihe nketa na-emetụta akparamàgwà n’ozuzu ya, ọ bụ nnọọ okwu dị iche igosi na otu mkpụrụ ndụ ihe nketa a rịbara ama—ma ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa abụọ, ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ mkpụrụ ndụ ihe nketa—na-achịkwa n’ezie ụmụ irighiri ihe a rịbara ama nke mmeghachi omume anụmanụ na gburugburu ya. N’ebe a, o ziri ezi ịjụ ma ọ̀ dị onye chọpụtaworo akụkụ ọ bụla nke DNA nke na-emetụta kpọmkwem akparamàgwà dị iche iche n’ụzọ a kara aka, n’ikwu ya kpọmkwem n’echiche dịkarịsịrị nta nke ịchọpụta na ịgbanwe ihe.”
Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Maka Aṅụrụma na Omekome
Ihe ọmụmụ nke aṅụrụma akpaliwo mmasị nke ọtụtụ ndị nchọpụta nke mkpụrụ ndụ ihe nketa eri ọtụtụ afọ. Ụfọdụ na-azọrọ na ihe ọmụmụ na-egosi na ịdị adị ma ọ bụ adịghị adị nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ụfọdụ na-akpata aṅụrụma. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ The New England Journal of Medicine kọrọ na 1988 na “n’ime afọ iri gara aga, nchọpụta atọ dịgasị iche iche ewepụtawo ihe àmà na-enweghị mgbagha na aṅụrụma bụ àgwà a pụrụ iketa eketa.”
Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ihe iri ahụ na-akatọzi echiche ahụ bụ na ọ bụ ihe ndị sitere n’ọmụmụ na-akpatakarị aṅụrụma. Otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Boston Globe nke April 9, 1996, kwuru, sị: “O yighị ka ọ̀ dị mkpụrụ ndụ ihe nketa nke aṅụrụma a ga-achọpụta n’ọdịnihu, ndị nchọpụta ụfọdụ na-ekwetakwa na ihe kasịnụ ha pụrụ ịchọpụta bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa nke na-eme ka ụfọdụ mmadụ na-aṅụ oké mmanya n’azọhieghị ụkwụ—àgwà nke pụrụ ikpughepụ ha nye aṅụrụma.”
Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nyere akụkọ nke otu nzukọ e nwere na Mahadum nke Maryland nke isiokwu ya bụ́ “Ihe Nnyocha Pụtara ná Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa na Àgwà Omekome.” Echiche nke mkpụrụ ndụ ihe nketa nke onye omekome dị mfe n’ụzọ na-adọrọ adọrọ. O yiri ka ọ na-agụsi ọtụtụ ndị na-enye nkọwa agụụ ike ịkwado ya. Otu onye na-ede akwụkwọ sayensị na The New York Times Magazine kwuru na ihe ọjọọ pụrụ “ịdị n’ime usoro chromosome nne na nna anyị bufeere anyị n’oge a tụụrụ ime anyị.” Otu isiokwu dị na The New York Times kọrọ na nkwurịta okwu a na-enwe mgbe mgbe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa maka ime mpụ na-enye echiche nke na ime mpụ nwere “otu mmalite—adịzighị adịzi nke ụbụrụ.”
Jerome Kagan, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ na Harvard, na-ebu amụma na oge ga-abịa mgbe ntụle nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ga-eme ka a mata ụmụntakịrị ndị nwere omume ime ihe ike. Ụfọdụ na-ekwu na a pụrụ inwe olileanya maka ịchịkwa mpụ site n’imegharị ihe ndị sitere n’ọmụmụ kama ịbụ site ná mgbanwe ọha mmadụ.
Okwu ndị e ji eme ihe n’ịkọ banyere ịkọ nkọ ndị a banyere ihe ndabere mkpụrụ ndụ ihe nketa maka akparamàgwà na-abụkarị nke na-edoghị anya na nke a na-ejighị n’aka. Akwụkwọ bụ́ Exploding the Gene Myth na-ekwu banyere otu ihe ọmụmụ Lincoln Eaves, bụ́ ọkachamara n’akparamàgwà mkpụrụ ndụ ihe nketa mere, bụ́ onye kwuru na ya chọpụtara ihe àmà nke otu ihe sitere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke na-akpata ịda mbà n’obi. Mgbe o nyochasịrị ndị inyom e lere anya dị ka ndị na-enwekarị ịda mbà n’obi, Eaves “na-enye echiche bụ na ọdịdị ịda mbà n’obi na àgwà nke [ndị inyom ahụ] pụrụ imeworị ka nsogbu dị otú ahụ a na-achịkwaghị achịkwa yikarịa ihe ga-eme.” Hà bụ “nsogbu ndị a na-achịkwaghị achịkwa”? Ndị inyom ahụ e nyochara abụrụwo ndị “e dinara n’ike, mekpọọ ọnụ, ma ọ bụ ndị a chụrụ n’ọrụ.” Ya mere, ọ̀ bụ ịda mbà n’obi kpatara ime omume ọjọọ ndị a? “Olee ụdị iche echiche nke ahụ bụ?” ka akwụkwọ ahụ gara n’ihu ịjụ. “E dinawo ndị inyom n’ike, mekpọọ ha ọnụ, ma ọ bụ chụọ ha n’ọrụ ha, ha nwekwara ịda mbà n’obi. Ka a na-emesokwu ha ihe ọjọọ, otú ahụ ka ịda mbà n’obi ha na-akawanye njọ. . . . Ọ gaara ekwesị ekwesị ịchọ njikọ ya na mkpụrụ ndụ ihe nketa nwere ma ọ bụrụ na ọ [Eaves] chọpụtara na ịda mbà n’obi ahụ enweghị ihe jikọrọ ya na ahụmahụ ọ bụla nke ndụ.”
Otu akwụkwọ ahụ na-ekwu na akụkọ ndị a bụ “ihe atụ nke ihe ka ọtụtụ n’akụkọ ndị a na-akọ ugbu a banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa [nke akparamàgwà], ma n’usoro mgbasa ozi ọha na eze ma n’akwụkwọ nkà mmụta sayensị. Ha nwere ngwakọrịta nke eziokwu ndị na-akpali mmasị, nchepụta na-enweghị nkwado, na nkwubiga okwu ókè na-enweghị isi banyere ịdị mkpa nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ná ndụ anyị. Otu ihe pụtara ìhè n’ihe ka ukwuu n’ihe odide a bụ edoghị anya ya.” Ọ na-aga n’ihu, sị: “E nwere ọdịiche dị ukwuu n’etiti iji mkpụrụ ndụ ihe nketa atụnyere ọnọdụ ndị na-agbaso ụkpụrụ iwu Mendel nke ihe nketa na iji ‘ọchịchọ’ mkpụrụ ndụ ihe nketa e chepụtara echepụta kọwaa ọnọdụ ndị dị mgbagwoju anya dị ka ọrịa cancer ma ọ bụ ọbara mgbali elu. Ndị ọkà mmụta sayensị na-eru ná nkwubi okwu ngwa ngwa mgbe ha kwuru na nnyocha mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ inye aka ịkọwa akparamàgwà mmadụ.”
Otú ọ dị, n’ihi ihe ndị a nile e kwuworo, ajụjụ ahụ a na-ewelitekarị ka dị: Gịnị mere anyị ji enwe mgbanwe ụkpụrụ akparamàgwà ndị na-ebilite mgbe ụfọdụ ná ndụ anyị? Nchịkwa dịkwa aṅaa ka anyị nwere n’ọnọdụ ndị dị otú ahu? Olee otú anyị ga-esi nweta ma jigide nchịkwa nke ndụ anyị? Isiokwu na-esonụ pụrụ inye aka n’inye azịza ụfọdụ maka ajụjụ ndị a.
[Igbe dị na peeji nke 18]
Usoro Ọgwụgwọ Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa—È Mezuwo Atụmanya Ya?
Gịnị banyere usoro ọgwụgwọ mkpụrụ ndụ ihe nketa—ịgbanye mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị na-emezi ihe n’ahụ ndị ọrịa iji gwọọ ha ọrịa mkpụrụ ndụ ihe nketa? Ndị ọkà mmụta sayensị nwere atụmanya dị elu n’afọ ole na ole gara aga. “Usoro ọgwụgwọ mkpụrụ ndụ ihe nketa ọ̀ bụ nkà na ụzụ oge ya ruteworo?” ka magazin bụ́ The Economist nke December 16, 1995, na-ajụ, na-asị: “N’ile ya anya site n’okwu ndị ji ya eme ihe na-ekwu n’ihu ọha, na ọtụtụ akụkọ nke ndị nta akụkọ, ị pụrụ iche otú ahụ. Ma ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị America a ma ama jụrụ. Harold Varmus, bụ́ onye isi nke Ụlọ Ọrụ Ahụ Ike Mba (NIH), gwara ndị ọkà mmụta sayensị 14 a maara aha ha ka ha tụleghachi nkà mmụta ahụ. Mgbe ntụgharị uche ọnwa asaa gasịrị, ha kwuru n’otu akụkọ e bipụtara n’izu gara aga na, ọ bụ ezie na usoro ọgwụgwọ mkpụrụ ndụ ihe nketa yiri ihe ga-aga nke ọma, e ‘kwubigawo okwu ókè’ banyere ihe ndị ọ rụzuworo ruo ugbu a.” E mere nnwale ndị gụnyere 597 ndị na-arịa ọrịa ụkọ adenosine deaminase (ADA) ma ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ e chere na ọ na-anakwere ọgwụgwọ site ná ntinye nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị e wetara n’ebe ọzọ. “Dị ka ìgwè ahụ si kwuo,” ka The Economist na-ekwu, “ọ dịghị otu n’ime ndị ọrịa ahụ riteworo uru n’ụzọ doro anya site n’ikere òkè ná nnwale dị otú ahụ.”
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
N’agbanyeghị ihe ụfọdụ mmadụ pụrụ ịzọrọ banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa a kara aka, ụmụ mmadụ pụrụ ịhọrọ otú ha si eme omume