“O Sighị M n’Aka”
UGBORO ole taa ka ị na-anụ ka mmadụ sịrị, ‘O wutere m. O si m n’aka. Ọ bụ m ka ihe nile si n’aka!’? A dịghị anụkebe eziokwu dị mfe otú ahụ ọzọ. N’eziokwu, n’ọtụtụ ọnọdụ, ọbụna mgbe e kwetara mmejọ, a na-eme mgbalị nile iji bufeere onye ọzọ ma ọ bụ ọnọdụ ndị a ga-agọpụrụ, ndị onye ahụ mere ihe ọjọọ na-azọrọ na ya enweghị nchịkwa n’ebe ha nọ, ụta ahụ.
Ụfọdụ ọbụna na-ata mkpụrụ ndụ ihe nketa ha ụta! Ma nke a ò kwesịrị ekwesị? Akwụkwọ bụ́ Exploding the Gene Myth na-agbagha nzube na ịdị irè nke akụkụ ụfọdụ nke nnyocha mkpụrụ ndụ ihe nketa. Ná ntụle ya nke akwụkwọ ahụ, onye nta akụkọ Australia bụ́ Bill Deane na-erute ná nkwubi okwu a ezi uche dị na ya: “Ndị mkpebi ọha mmadụ yiri ka ha amalitewo iche na nso nso a na ha achọpụtawo ihe àmà fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-apụghị ịgbagha agbagha iji kwadoo nkà ihe ọmụma ha na ọ dịghị ndị e kwesịrị ịta ụta n’ihi omume ha: ‘Ọ pụghị izere igbu ya mma n’akpịrị, Onyenwe M—ọ dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ya.’”
Ọ Bụchaghị Omume Ọhụrụ
Ka ọgbọ a ji oké ọsọ na-aghọ ihe otu onye na-ede akwụkwọ kpọrọ ọgbọ “ọ bụghị m,” omume a pụrụ iyi ihe na-arịwanye elu. Otú ọ dị, akụkọ ihe mere eme e dekọrọ edekọ na-ekpughe na iji ngọpụ nke “o sichaghị m n’aka” ebufere ndị ọzọ ụta adịgidewo kemgbe mmalite mmadụ. Mmeghachi omume Adam na Iv mgbe mmehie mbụ ha, bụ́ iri mkpụrụ osisi ahụ Chineke machibidoworo iwu, gasịrị, bụ ezi ihe atụ nke ibufe ụta. Ihe ndekọ Jenesis na-akọ mkparịta ụka ahụ weere ọnọdụ, nke ọ bụ Chineke bu ụzọ kwuo okwu, sị: “Ì riwo mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, nke M nyere gị iwu banyere ya, ka ị ghara iri mkpụrụ sitere na ya? Mmadụ ahụ wee sị, Nwanyị ahụ nke I nyere m ka mụ na ya biri, ya onwe ya nyere m mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, m wee rie. Jehova, bụ́ Chineke, wee sị nwanyị ahụ, Gịnị bụ nke a i meworo? Nwanyị wee sị, Agwọ ahụ rafuru m, m wee rie.”—Jenesis 3:11-13.
Kemgbe ahụ, ụmụ mmadụ echepụtawo ụdị nkwenkwe dị iche iche, ha achọwokwa ngọpụ dị iche iche nke ga-eme ka ha nwere onwe ha pụọ nnọọ n’ụta ọ bụla n’ihi omume ha. Nke dị ịrịba ama ná ndị a bụ nkweta oge ochie ahụ n’akara aka. Otu nwanyị Buddha ji obi ya nile kwere na Karma kwuru, sị: “Echere m na ezi uche adịghị n’ịta ahụhụ n’ihi ihe m bu pụta ụwa, nke ọ na-adịghịkwa ihe m maara banyere ya. Anakweere m ya dị ka akara aka m.” N’ịbụ nke ozizi akara aka nke John Calvin kụziri kwalitere, nkweta n’akara aka bụ ihe a na-ahụkarị n’ebe nile na Krisendọm. Ndị ụkọchukwu na-agwakarị ndị ikwu na-eru újú na ihe ọghọm ụfọdụ bụ uche Chineke. Mgbe ahụkwa, ụfọdụ ndị Kraịst bu ezi ihe n’obi na-ata Setan ụta maka ihe ọ bụla na-agazighị agazi ná ndụ ha.
Anyị na-amalite ugbu a ịhụ akparamàgwà na-enweghị ụta ndị nwere nkwado nke iwu na ọha mmadụ. Anyị bi n’ọgbọ nke ihe ruuru mmadụ na-arị elu na nke ibu ọrụ dịịrị mmadụ na-adalata adalata.
Nnyocha n’ihe banyere akparamàgwà mmadụ ewepụtawo ihe a sịrị na ọ bụ ihe àmà sayensị nke ụfọdụ chere na ọ pụrụ inye ohere maka àgwà ime ihe sọrọ onye, malite n’omume rụrụ arụ ruo n’igbu mmadụ. Nke a bụ ngosipụta nke ịnụ ọkụ n’obi ọha mmadụ nwere ibufere ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ụta, ma e wezụga onye ahụ.
Azịza nye ajụjụ ndị dị ka ndị a dị anyị mkpa: Gịnị ka sayensị chọpụtaworo n’ezie? Ọ̀ bụ nanị mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị na-ekpebi akparamàgwà mmadụ? Ka ma ikike dị n’ime ma nke dị n’èzí hà na-achịkwa akparamàgwà anyị? Gịnị ka ihe àmà na-egosi n’ezie?